Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa—Kwenụ Ka Ndị Mụrụ Unu Nyere Unu Aka Ichebe Obi Unu!

Ndị Ntorobịa—Kwenụ Ka Ndị Mụrụ Unu Nyere Unu Aka Ichebe Obi Unu!

Ndị Ntorobịa—Kwenụ Ka Ndị Mụrụ Unu Nyere Unu Aka Ichebe Obi Unu!

GỊNỊ ka i chere bụ́ ihe kasị esiri onyeisi ụgbọ mmiri ike? Ọ̀ bụ ịkwọfe oké osimiri n’udo? Ọ naghị abụkarị ya. Ihe ka ọtụtụ n’ụgbọ ndị kpuru ekpu kpuru na nso ọdụ ụgbọ mmiri, ọ bụghị n’etiti oké osimiri. N’ezie, ịkwụsị ụgbọ n’ọdụ ụgbọ mmiri pụrụ ọbụna ịdị ize ndụ karịa ịnyadata ụgbọelu. N’ihi gịnị?

Tupu onyeisi ụgbọ mmiri enwee ike ịkwụsị ụgbọ ya n’udo, ọ ghaghị izere ihe ize ndụ nile pụrụ ịdị n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Ọ dị ya mkpa iburu n’uche otú mmiri si asọsi ike n’ala ala osimiri ka ọ na-ezere ụgbọ mmiri ndị ọzọ. Ọ ghaghịkwa izere ikpo ájá, nkume ma ọ bụ mkpọmkpọ ụgbọ mmiri ọ bụla mebiri emebi bụ́ ndị dị n’ime mmiri ahụ. Nke ka njọ bụ na nke ahụ pụrụ ịbụ nke mbụ ọ na-aga n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ.

Iji nyere ya aka imeri nsogbu ndị a, onyeisi ụgbọ mmiri maara ihe pụrụ ịchọ enyemaka nke onye nduzi ụgbọ mmiri nke maara mmiri ahụ nke ọma. Onye nduzi ụgbọ mmiri na-anọ n’akụkụ onyeisi ụgbọ mmiri ahụ n’ebe a na-anọ anya ụgbọ mmiri ma na-enye nduzi sitere n’ahụmahụ. Ha na-atụlekọ ihe ize ndụ ndị e nwere ma nyara ụgbọ mmiri ahụ site na warara ọwa mmiri ọ bụla e nwere ruo n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ.

Nkà bara oké uru nke onye nduzi ụgbọ mmiri bụ ihe atụ nke enyemaka dị oké ọnụ ahịa ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-aghaghị ịgabiga ọnọdụ ndị siri ike nke ndụ nwere. Gịnị bụ enyemaka a? N’ihi gịnị ka o ji dị ndị nọ n’afọ iri na ụma mkpa?

Ka anyị gaa n’ihu n’ihe atụ nke ụgbọ mmiri ahụ. Ọ bụrụ na ị bụ onye nọ n’oge uto, i yiri onyeisi ụgbọ mmiri ahụ n’akụkụ ụfọdụ n’ihi na ị ghaghị imesị buru ibu ọrụ nke ịchịkwa ndụ gị. Ndị mụrụ gị na-arụkwa ọrụ yiri nke onye nduzi ụgbọ mmiri ka ha na-agbalị iduzi gị gabiga ụfọdụ n’ime ọnọdụ ndị kasị sie ike ị na-aghaghị iche ihu ná ndụ. Otú ọ dị, n’oge ị nọ n’afọ iri na ụma, ọ pụrụ isiri gị ike ịnakwere ndụmọdụ nke ndị mụrụ gị. Gịnị mere o ji dị otú ahụ?

Ebe nsogbu na-esitekarị bụ n’obi. Obi ihe atụ gị pụrụ ịkpali gị inwe ọchịchọ maka ihe a machibidoro iwu ma ọ bụ ime mkpesa banyere ihe ọ bụla yiri ka ọ̀ na-egbochi gị inwere onwe gị. “Nchepụta nke obi mmadụ,” ka Bible na-ekwu, “dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) Jehova na-eme ka o doo gị anya na ezi ihe ịma aka na-eche gị ihu. “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ọ na-akpafukwa nnọọ akpafu,” ka ọ na-adọ aka ná ntị. (Jeremaịa 17:9, Rotherham) Tụkwasị n’inwe ọchịchọ ọjọọ, obi onye ntorobịa pụrụ ịghọgbu ya ịmalite iche na ya maara ihe karịa ndị mụrụ ya, n’agbanyeghị na ha nwere nnọọ ahụmahụ karịa ya. Otú ọ dị, e nwere ezi ihe mere ị ga-eji chọọ enyemaka ndị mụrụ gị mgbe ị na-agabiga afọ iri na ụma ndị siri ike.

N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Na-erubere Ndị Mụrụ Gị Isi?

Nke kasị mkpa bụ na Jehova, Onye Malitere ezinụlọ, na-agwa gị ka i gee ntị ná nduzi nke ndị mụrụ gị. (Ndị Efesọs 3:15) Ebe ọ bụ na Chineke ahọpụtawo ndị mụrụ gị ilekọta gị, ọ na-enye gị ndụmọdụ a: “Ụmụ, ezi ihe unu ga-eme bụ irubere ndị mụrụ unu isi dị ka ndị Onyenwe anyị nyere ọrụ ilekọta unu.” (Ndị Efesọs 6:1-3, Phillips; Abụ Ọma 78:5) Ọ bụ ezie na ị pụrụ ịnọ n’afọ iri na ụma ugbu a, ndị mụrụ gị ka nwere ibu ọrụ nke iduzi gị, iwu jikwa gị ịnakwere nduzi ha. Mgbe Pọl onyeozi dere na ụmụ ga na-erubere ndị mụrụ ha isi, o ji okwu Grik nke pụrụ imetụta ụmụ ndị nọ n’afọ ndụ nile mee ihe. Iji maa atụ, dị ka e dekọrọ na Matiu 23:37, Jizọs kpọrọ ndị bi na Jeruselem “ụmụ” Jeruselem, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị toro eto.

Ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie nọgidere na-erubere ndị mụrụ ha isi ogologo oge ka ha ghọsịworo ndị toro eto. Ọ bụ ezie na Jekọb bụ nwoke toruworo ogo mmadụ, ọ ghọtara na o kwesịrị irubere iwu nna ya isi ịghara ịlụ nwanyị na-adịghị efe Jehova. (Jenesis 28:1, 2) Obi abụọ adịghị ya na Jekọb chọpụtara na mkpebi nwanne ya nwoke mere ịlụ ndị inyom Kenan na-ekpere arụsị ewetaworo nnọọ ndị mụrụ ya obi mgbawa.—Jenesis 27:46.

E wezụga ọrụ Chineke nyere ha ilekọta gị, o yiri ka ndị mụrụ gị bụ́ Ndị Kraịst hà bụ ndị kasị ruo eruo ịrụ ọrụ dị ka ndị ndụmọdụ gị. N’ụzọ bụ́ isi, nke ahụ bụ n’ihi na ha maara gị nnọọ nke ọma, obi abụọ adịghịkwa ya na ha egosipụtawo ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị ha nwere n’ebe ị nọ ruo ọtụtụ afọ. Dị ka onye nduzi ụgbọ mmiri, ha na-ekwu okwu site n’ahụmahụ. Ha onwe ha enwewokwa “ọchịchọ nke oge ntorobịa.” Dịkwa ka ezi Ndị Kraịst, ha ahụwokwa n’onwe ha uru nke ịgbaso ụkpụrụ Bible bara.—2 Timoti 2:22.

N’inwe ndị dị otú ahụ nwere ahụmahụ n’akụkụ gị inyere gị aka, a na-eme ka i nwee ike ịnagide ọbụna ọnọdụ ndị kasị sie ike n’ụzọ gara nke ọma. Were mmekọrịta nke gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị dị ka ihe atụ. Olee otú ndị mụrụ gị bụ́ Ndị Kraịst pụrụ isi duzie gị n’okwu a chọrọ nlezianya?

Inwe Mmasị n’Ebe Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe Gị Nọ

Ndị nduzi ụgbọ mmiri na-enye ndị isi ụgbọ mmiri ndụmọdụ ka ha ghara iru nso n’ikpo ájá ndị dị n’okpuru mmiri. Ikpo ájá ndị a esighị ike, ha na-arafukwa mmadụ ebe ọ bụ na ha na-agbanwe ọnọdụ ha mgbe nile. N’otu aka ahụ, ndị mụrụ gị ga-achọ ka ị ghara ịnọ ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ị ma n’ọnyà n’ụzọ mmetụta uche nso. Dị ka ihe atụ, ndị mụrụ ụmụ maara na mmetụta mmadụ na-enwe n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nọ na-emi emi ma sie ike nkọwa. Ma ozugbo a kpaliri ha, mmetụta ndị a pụrụ ime ka ụgbọ gị kpuo.

Ihe atụ Daịna na-egosi ihe pụrụ isi n’iru nnọọ ihe ize ndụ nso apụta. Eleghị anya, ọ bụ ọchịchọ ịmata ihe na nke ikpori ndụ kpaliri Daịna ịchọ iso ụmụ agbọghọ Kenan na-akpakọrịta, bụ́ ndị obi abụọ na-adịghị ya na ha enweghị ụkpụrụ. Ihe yiri ihe na-adịghị njọ na mbụ mesịrị duga n’ọdachi jọgburu onwe ya—nwa okorobịa “[nwere] nsọpụrụ karịa” ndị ọzọ nile n’obodo dinara ya n’ike.—Jenesis 34:1, 2, 19.

Oge ndị anyị bi na ha, bụ́ mgbe ara mmekọahụ na-agba ndị mmadụ, na-amụba ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ. (Hosea 5:4) Ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa pụrụ inye echiche na iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe mmadụ na-ekpori ndụ bụ ihe kasị ụtọ e nwere. Ọ pụrụ ịbụ ihe na-akpali akpali nye gị iche banyere nanị gị na onye i lere anya dị ka onye mara mma ịnọ. Ma nne na nna na-ahụ n’anya ga-agbalị ichebe gị pụọ ná mkpakọrịta nke gị na ndị na-eto eto bụ́ ndị na-adịghị akwanyere ụkpụrụ Chineke ùgwù.

Laura na-ekweta na ọchịchọ ịmata ihe pụrụ ime ka ndị nọ n’afọ iri na ụma ghara ịhụ ihe ize ndụ. “Mgbe ụmụ agbọghọ mụ na ha nọ na klas gwara m na ha na ụmụ okorobịa mara mma gbagidere egwú ruo n’ime abalị, ha na-eme ka o yie ahụmahụ a na-apụghị ichefu echefu. Amaara m na ha na-etinyekarị nnu na ose n’akụkọ ha, ma ọ ka na-agụ m agụụ, ana m echekwa na ma eleghị anya, ezigbo mkpori ndụ na-akwa m. Ọ bụ ezie na m maara na ndị mụrụ m ziri ezi n’ịghara ikwe ka m gaa n’ebe ndị dị otú ahụ, ọ ka na-agụ m agụụ.”

Ụgbọ mmiri enweghị brek, n’ihi ya ọ na-ewe ya ogologo oge iji kwụsị. Ndị mụrụ ụmụ maara na ndọrọ mmekọahụ dịkwa otú ahụ. Akwụkwọ Ilu ji onye nwere agụụ mmekọahụ a na-achịkwaghị achịkwa tụnyere ehi a dọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya. (Ilu 7:21-23) Ị gaghị achọ ikwe ka ihe dị otú ahụ mee gị, na-eduga n’ụgbọ gị ikpu n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ. Ndị mụrụ gị pụrụ ịmata mgbe obi gị malitere iduhie gị n’akụkụ a, ha pụkwara inye gị ndụmọdụ kwekọrọ na ya. Ị̀ ga-eji amamihe gee ha ntị ma si otú a zere ọdachi?—Ilu 1:8; 27:12.

Nkwado ndị mụrụ gị dịkwa gị mkpa mgbe ị na-aghaghị ịnagide nrụgide ndị ọgbọ. Olee otú ha pụrụ isi nyere gị aka?

Mmetụta Siri Ike nke Ndị Ọgbọ

Osimiri ịsọsi ike pụrụ ibufu ụgbọ mmiri. Iji lụsoo ikike a ọgụ, a ghaghị iche ụgbọ mmiri ahụ ihu n’ebe ọzọ. N’otú aka ahụ, mmetụta siri ike nke ndị ntorobịa ndị ọzọ pụrụ ibufu gị n’ụzọ ime mmụọ, ọ gwụla ma ì mere ihe iji guzogide ya.

Dị ka ahụmahụ Daịna na-egosi, “i mee ndị nzuzu enyi, ị ga-ala n’iyi.” (Ilu 13:20, Today’s English Version) Cheta na dị ka e si eji ya eme ihe n’ime Bible, onye “nzuzu” bụ onye na-amaghị Jehova ma ọ bụ onye họọrọ ịghara ije ije n’ụzọ ya.

Otú ọ dị, ọ pụrụ isi ike ịjụ echiche ma ọ bụ àgwà ụmụ klas gị. María José na-akọwa, sị: “Achọrọ m ka ndị ntorobịa ndị ọzọ nabata m. Ebe ọ bụ na achọghị m ka ha chee na m dị iche, eṅomiri m ha ruo n’ókè o kwere m mee.” N’amaghị ama, ndị ọgbọ gị pụrụ inwe mmetụta n’ebe ị nọ—ná nhọrọ ndị ị na-eme n’egwú, n’ihe ị na-achọ iyi ma ọ bụ ọbụna n’otú i si ekwu okwu. Ikekwe, ahụ́ na-eru gị ala mgbe gị na ndị ọgbọ gị nọ. Ọ dịghị ihe ọjọọ dị na ya, ma ọ na-eme ka ọ dịrị ha mfe inwe mmetụta siri ike n’ahụ́ gị bụ́ nke pụrụ ibibi ihe.—Ilu 1:10-16.

Caroline na-echeta ihe isi ike o chere ihu afọ ole na ole gara aga: “Malite n’oge m dị afọ 13, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ agbọghọ mụ na ha na-akpa nwere ndị enyi nwoke, ruokwa ọtụtụ afọ, anọgidere m na-enwe nrụgide nke ịgbaso ihe nlereanya ha. Otú ọ dị, mama m duziri m n’oge ndị a siri ike. O ji ọtụtụ awa gee m ntị, soro m na-atụgharị uche ma na-enyere m aka ịhụ mkpa ọ dị m ịhapụ mmekọrịta ndị dị otú ahụ ruo mgbe m tozuru okè.”

Dị ka mama Caroline, ndị mụrụ gị pụrụ iche na ha aghaghị ịdọ gị aka ná ntị banyere nrụgide ndị ọgbọ ma ọ bụ ọbụna igbochi gị ime ihe ụfọdụ ma ọ bụ imeta ụfọdụ ndị enyi. Nathan na-echeta ọtụtụ ugboro ya na ndị mụrụ ya nweworo nghọtahie n’okwu ndị dị otú ahụ. “Ndị enyi m na-akpọkarị m iso ha kpapụ,” ka ọ na-akọwa, “ma ndị mụrụ m achọghị ka m na-anọ n’ìgwè buru ibu ma ọ bụ na-aga nnọkọ oriri ndị a na-achịkwaghị achịkwa. N’oge ahụ, apụghị m ịghọta ihe mere ndị nne na nna ndị ọzọ ji anabata ihe karịa ndị nke m.”

Otú ọ dị, n’ikpeazụ Nathan ghọtara ihe kpatara ya. “Amaara m na n’ọnọdụ m, ‘uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata,’” ka ọ na-ekweta. “Uche a gbagọrọ agbagọ yikarịrị ka ọ̀ na-apụta ìhè mgbe ndị ntorobịa gbakọtara n’ìgwè. Otu n’ime ha ga-amalite ime ihe ọjọọ, onye nke ọzọ ga-eme nke ka njọ, onye nke atọ kwa na-atụkwasị ya ihe. N’oge na-adịghị anya, a na-agba ndị ọzọ nile ume isonye. Ọbụna ndị na-eto eto bụ́ ndị na-ekwu na ha na-ejere Jehova ozi pụrụ ịdaba n’ọnyà a.”—Ilu 22:15.

Ma Nathan ma María José lụsochara ọchịchọ obi ha ọgụ mgbe ndị mụrụ ha na-ekweghị ka ha mee ihe ndị ọgbọ ha tụrụ aro ha. Otú ọ dị, ha gere ntị, ka e mesịkwara, ha nwere obi ụtọ na ha mere otú ahụ. Ilu na-ekwu, sị: “Tọọ ntị gị n’ala, nụ okwu nile nke ndị maara ihe, tụkwasịkwa obi gị n’ihe ọmụma m.”—Ilu 22:17.

Ndị Ruru Eru Ka A Sọpụrụ Ha

Ụgbọ mmiri nke na-adala n’otu akụkụ na-esi ike nchịkwa, ọ bụrụkwa na ọ dalaa n’otu akụkụ gabiga ókè, ọ pụrụ ikpu n’ụzọ dị mfe. N’ihi ọdịdị ezughị okè anyị, anyị nile na-adala n’ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na n’ịchọ ime ihe a machibidoro iwu. N’agbanyeghị ọchịchọ ndị a, ndị na-eto eto ka pụrụ iru n’ọdụ ụgbọ mmiri, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma ọ bụrụ na ha ejiri nlezianya na-agbaso nduzi nke ndị mụrụ ha.

Dị ka ihe atụ, ndị mụrụ gị pụrụ inyere gị aka ịjụ echiche bụ́ na e nwere ụzọ dị n’etiti nke dị n’agbata ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ na ụzọ dị obosara nke na-eduba ná mbibi. (Matiu 7:13, 14) Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya iche na ị pụrụ imetụ obere ihe ọjọọ ma ghara imebiga ya ókè, na ị pụrụ ‘iji ezé eke òké ma ghara ịta ya ata.’ Ndị na-anwa ịgbaso ụzọ ndụ dị otú ahụ ‘na-erugharị n’etiti ụzọ abụọ’—ha na-ejere Jehova ozi ruo n’ókè ụfọdụ ma na-ahụkwa ụwa na ihe ndị dị n’ụwa n’anya—ọ pụkwara ịdịrị ụgbọ ha mfe ikpu n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Eze 18:21; 1 Jọn 2:15) N’ihi gịnị ka nke a ji eme? Ọ bụ n’ihi ọchịchọ mmehie anyị.

Ọchịchọ ezughị okè anyị na-esiwanye ike ma anyị malite ikwenyere ya. Nanị idetụ ihe ọjọọ ire agaghị ezuru ‘obi anyị dị aghụghọ.’ Ọ ga-achọ ihe karịrị nke ahụ. (Jeremaịa 17:9) Ozugbo anyị malitere ịkpafu n’ụzọ ime mmụọ, ụwa ga-enwekwu mmetụta ka nnọọ ukwuu n’ahụ́ anyị. (Ndị Hibru 2:1) O nwere ike ị gaghị ama na ị malitela ịdala otu akụkụ n’ụzọ ime mmụọ, ma o yiri ka ndị mụrụ gị bụ́ Ndị Kraịst hà ga-ama. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ha agaghị amụta ihe omume kọmputa ngwa ngwa dị ka gị, ma ha maara otú obi pụrụ isi kpafuo karịa nnọọ ka ị maara. Ha chọkwara inyere gị aka ime ka “obi gị gazie agazie n’ụzọ” nke pụrụ ịrụpụtara gị ndụ.—Ilu 23:19.

N’ezie, atụla anya ka mkpebi nile ndị mụrụ gị mere zuchaa okè mgbe ha na-aghaghị inye gị ụkpụrụ nduzi n’ihe ndị siri ike dị ka egwú, ntụrụndụ na ejiji. Ọ pụrụ ịbụ na ndị mụrụ gị enweghị amamihe Solomọn ma ọ bụ ndidi Job. Dị ka onye nduzi ụgbọ mmiri, mgbe ụfọdụ, ha pụrụ igbochibiga gị ókè. N’agbanyeghị nke ahụ, nduzi ha ga-abara gị uru ma ọ bụrụ na ị nụrụ ‘ịdọ aka ná ntị nke nna gị ma ghara ịhapụ iwu nne gị.’—Ilu 1:8, 9.

Ndị ntorobịa ndị ọzọ pụrụ ịdị na-ekwu okwu ndị na-adịghị mma banyere ndị mụrụ ha. Ma, ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-agbalị ịgbaso ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ha kwụ gị n’akụkụ, n’ọnọdụ ọ bụla, n’oge ọ bụla, n’oge ihe isi ike ọ bụla. Dị ka onyeisi ụgbọ mmiri nke onye nduzi ụgbọ mmiri nwere ahụmahụ na-enye ndụmọdụ, nduzi ndị mụrụ gị dị gị mkpa iji duru gị gaa n’ụzọ nke amamihe. Ụgwọ ọrụ ọ na-eweta pụrụ ịdị nnọọ ukwuu.

“N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ, n’aka mmadụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ; bụ́ ndị na-ahapụ okporo ụzọ nile nke izi ezi, ka ha wee jee ije n’ụzọ nile nke ọchịchịrị . . . N’ihi na ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya.”—Ilu 2:10-13, 21.

[Foto dị na peeji nke 22]

Mmetụta nke ndị ntorobịa ndị ọzọ pụrụ ibufu gị n’ụzọ ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Cheta ahụmahụ Daịna

[Foto dị na peeji nke 24]

Dị ka onyeisi ụgbọ mmiri si achọ ndụmọdụ nke onye nduzi ụgbọ mmiri nwere ahụmahụ, ndị na-eto eto kwesịrị ịdị na-achọ nduzi nke ndị mụrụ ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto: www.comstock.com