Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Paradaịs—Ọ̀ Bụ Maka Gị?

Paradaịs—Ọ̀ Bụ Maka Gị?

Paradaịs—Ọ̀ Bụ Maka Gị?

‘Amaara m otu onye ya na Kraịst dị n’otu, bụ́ onye e bupụrụ gaa na paradaịs.’—2 Ndị Kọrint 12:2-4.

1. Nkwa Bible ndị dị aṅaa na-akpali mmasị ọtụtụ ndị?

PARADAỊS. Ì chetara otú obi dị gị mgbe mbụ ị nụrụ nkwa Chineke banyere paradaịs elu ala? Ị pụrụ icheta mgbe ị nụrụ na ‘a ga-emeghe anya ndị ìsì na ntị nke ndị ntị chiri, nakwa na ọzara’ ga-ama mma dị egwu. Ma ọ bụ gịnị banyere amụma nke anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ịnọkọ nakwa agụ na nwa ewu ịmakpukọ? Ọ̀ bụ na i nweghị obi ụtọ ịgụta na ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-adịghachi ndụ, n’olileanya nke ịnọgide na Paradaịs ahụ?—Aịsaịa 11:6; 35:5, 6; Jọn 5:28, 29.

2, 3. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na olileanya gị nke dabeere na Bible abụghị nke na-enweghị ihe ndabere? (b) Ihe ndabere ọzọ dị aṅaa maka inwe olileanya ka anyị nwere?

2 Olileanya gị nwere ihe ndabere. I nwere ihe mere ị ga-eji kwere ná nkwa Bible banyere Paradaịs ahụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ntụkwasị obi n’ihe a Jizọs gwara onye mmebi iwu ahụ a kpọgidere n’osisi: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) I nwere ntụkwasị obi ná nkwa bụ́: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” I nwekwara ntụkwasị obi ná nkwa ahụ bụ́ na Chineke ga-ehicha anya mmiri anyị; ọnwụ agaghị adị ọzọ; iru újú, mkpu ákwá na ihe mgbu ga-agabiga. Nke a pụtara na paradaịs elu ala ga-adịghachi!—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:4.

3 N’agbanyeghị ihe ndị a, ihe ọzọ mere a ga-eji nwee olileanya na a ga-enwe Paradaịs a bụ ihe Ndị Kraịst n’ụwa nile nọ n’ime ya ugbu a. Gịnị ka ọ bụ? Chineke emewo ka e nwee paradaịs ime mmụọ ma kpọbata ndị ya n’ime ya. Okwu ahụ bụ́ “paradaịs ime mmụọ” pụrụ iyi echiche nkịtị, ihe siri ike nghọta, ma e buru amụma na a ga-enwe paradaịs dị otú ahụ, ọ dịkwa adị n’ezie.

Ọhụụ nke Paradaịs

4. Ọhụụ dị aṅaa ka 2 Ndị Kọrint 12:2-4 kwuru okwu ya, ònyekwa ka o yiri ka ọ̀ bụ ya ka e gosiri ya?

4 Banyere nke a, rịba ama ihe Pọl onyeozi dere: “Amaara m otu onye ya na Kraịst dị n’otu, bụ́ onye . . . e bupụrụ otú ahụ gaa n’eluigwe nke atọ. Ee, amaara m onye dị otú ahụ—ma ọ̀ bụ n’anụ ahụ́ ma ọ bụ na ọ bụghị n’anụ ahụ́, amaghị m, Chineke maara—na e bupụrụ ya gaa na paradaịs, o wee nụ okwu ndị ọnụ na-ekwesịghị ịkọ bụ́ nke iwu na-akwadoghị ka mmadụ kwuo.” (2 Ndị Kọrint 12:2-4) Okwu ndị a sochiri amaokwu ndị Pọl ji gbachitere ọbụbụ ọ bụ onyeozi. Ọzọkwa, Bible ekwughị banyere onye ọ bụla ọzọ nke nwere ahụmahụ dị otú ahụ, ọ bụkwa Pọl gwara anyị banyere ya. Ya mere, o yikarịrị ka ọ̀ bụ Pọl hụrụ ọhụụ a. N’ọhụụ a, na “paradaịs” dị aṅaa ka ọ banyere?—2 Ndị Kọrint 11:5, 23-31.

5. Gịnị ka ihe Pọl hụrụ na-abụghị, n’ihi ya kwa, ụdị “paradaịs” dị aṅaa ka ọ bụ?

5 Ihe gbara ya gburugburu adịghị enye echiche na ‘eluigwe nke atọ’ na-ezo aka na mbara ikuku dị n’ụwa anyị, ma ọ bụ na mbara igwe, ma ọ bụ n’eluigwe na ala ndị ọzọ ndị ọkà mmụta na-enyocha mbara igwe chepụtara. Bible na-ejikarị ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ atọ emesi ihe ike. (Eklisiastis 4:12; Aịsaịa 6:3; Matiu 26:34, 75; Mkpughe 4:8) Ya mere, ihe Pọl hụrụ n’ọhụụ bụ ihe e buliri elu ma ọ bụ ihe e mere ka ọ dị elu. Ọ bụ ihe ime mmụọ.

6. Ihe dị aṅaa mere eme na-eme ka a ghọtakwuo ihe Pọl hụrụ?

6 Amụma Bible ndị bu ya ụzọ na-eme ka anyị ghọtakwuo ya. Mgbe ndị ya n’oge ochie kwụsịrị ikwesị ntụkwasị obi nye ya, Chineke kpebiri ikwe ka ndị Babilọn wakpoo Juda na Jeruselem. Nke ahụ dujere ná mbibi na 607 T.O.A., dị ka ọgụgụ oge Bible si gosi. E buru n’amụma na ala ahụ ga-atọgbọ n’efu ruo afọ 70; e mesịa, Chineke ga-ekwe ka ndị Juu chegharịrịnụ laghachi ma weghachi ezi ofufe. Nke a mere site na 537 T.O.A. gaa n’ihu. (Deuterọnọmi 28:15, 62-68; 2 Ndị Eze 21:10-15; 24:12-16; 25:1-4; Jeremaịa 29:10-14) Otú ọ dị, gịnị banyere ala ahụ n’onwe ya? N’ime afọ 70 ahụ, ọ ghọrọ ebe ahịhịa ọhịa jupụtara, ebe kpọrọ nkụ, na ebe obibi nke nkịta ọhịa. (Jeremaịa 4:26; 10:22) Otú o sina dị, e nwere nkwa a: “Jehova akasiwo Zaịọn obi: Ọ kasiwo mkpọmkpọ ebe ya nile, mee ka ọzara ya dị ka Iden, mee ka ala ya nke ihe na-adịghị dị ka ubi Jehova a gbara ogige [ma ọ bụ Paradaịs, Septuagint].”—Aịsaịa 51:3; ihe odide ala ala peeji nke NW.

7. Gịnị gaje ime mgbe afọ 70 nke ịtọgbọrọ n’efu gasịrị?

7 Nke ahụ mere mgbe afọ 70 ahụ gasịrị. Site ná ngọzi Chineke, ọnọdụ kara mma. Were anya nke uche gị hụ ọnọdụ a: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. Ọ ga-agbawa nke ukwuu, tegharịakwa egwu ọṅụ, ee, n’itegharị egwu ọṅụ na n’iti mkpu ọṅụ. . . . Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ: n’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị. Mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara na mmiri: n’ebe obibi nkịta ọhịa, ebe ha na-amakpu amakpu, ogige nke dịịrị amị na papaịrọs.”—Aịsaịa 35:1-7.

Ndị E Weghachiri Eweghachi na Ndị A Gbanwere Agbanwe

8. Olee otú anyị si mara na Aịsaịa isi 35 na-ekwu banyere ndị mmadụ?

8 Ọ bụ oké mgbanwe n’ezie! Site ná ntọgbọrọ n’efu gaa na paradaịs. N’agbanyeghị nke ahụ, amụma a na amụma ndị ọzọ a pụrụ ịdabere na ha gosiri na a ga-enwekwa mgbanwe n’ebe ndị mmadụ nọ, nke ga-eyi ala tọgbọrọ n’efu ịghọ ala na-amị mkpụrụ. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo otú ahụ? Aịzaịa na-ekwu banyere “ndị Jehova a gbapụtara agbapụta,” bụ́ ndị ga-eji “iti mkpu ọṅụ” lọghachite n’ala ha, ha ga-abịarukwa “obi ụtọ na ọṅụ.” (Aịsaịa 35:10) Nke ahụ metụtara, ọ bụghị ala nkịtị, kama ndị mmadụ. Tụkwasị na nke ahụ, n’ebe ọzọ, Aịzaịa buru amụma banyere ndị e mere ka ha lọghachi na Zaịọn: “Ka e wee kpọọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe ọkụkụ nke Jehova . . . N’ihi na dị ka ala si eme ka ihe opupu ya pụta, . . . Jehova ga-eme ka ezi omume na otuto pute n’ihu mba nile.” Aịzaịa kwukwara banyere ndị Chineke, sị: “Jehova ga na-edukwa gị mgbe nile . . . , Ọ ga-emekwa ka ọkpụkpụ gị nile dị ike; ị ga-adịkwa [ka] ubi a gbara ogige nke dere mmiri nke ọma.” (Aịsaịa 58:11; 61:3, 11; Jeremaịa 31:10-12) N’ihi ya, dị nnọọ ka ọnọdụ nke ala nkịtị ga-agbanwe, a ga-enwe mgbanwe n’ebe ndị Juu e mere ka ha lọghachi n’ala ha nọ.

9. Olee “paradaịs” Pọl hụrụ, oleekwa mgbe o mezuru?

9 Ihe atụ a mere eme na-enyere anyị aka ịghọta ihe Pọl hụrụ n’ọhụụ. Ọ ga-emetụta ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke ọ kpọrọ “ubi Chineke nke a na-arụ ọrụ na ya,” bụ́kwa nke kwesịrị ịmị mkpụrụ. (1 Ndị Kọrint 3:9) Olee mgbe a ga-emezu ọhụụ ahụ? Pọl kpọrọ ihe ọ hụrụ ‘mkpughe,’ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ maara na mgbe ọ nwụsịrị, a ga-enwe oké ndapụ n’ezi ofufe. (2 Ndị Kọrint 12:1; Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 7) Ka ndapụ n’ezi ofufe mụbara ma yie ka ò kpuchiri ha, a pụghị iji ezi Ndị Kraịst tụnyere ubi na-eme nnọọ nke ọma. Ma, oge ga-abịa mgbe a ga-ebuli ezi ofufe elu ọzọ. A ga-eweghachi ndị Chineke ka ‘ndị ezi omume wee nwee ike inwupụ enwupụ dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.’ (Matiu 13:24-30, 36-43) Nke ahụ mere n’ezie afọ ole na ole ka e guzobesịrị Alaeze Chineke n’eluigwe. Ka ọtụtụ iri afọ gafesịrị, ọ bịara pụta nnọọ ìhè na ndị Chineke nọ na paradaịs ime mmụọ, bụ́ nke Pọl hụrụ n’ọhụụ ahụ.

10, 11. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na anyị nọ na paradaịs ime mmụọ n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè?

10 N’ezie, anyị maara na anyị nile n’otu n’otu bụ ndị na-ezughị okè, n’ihi ya ọ dịghị eju anyị anya na nsogbu na-ebilite mgbe ụfọdụ, ọbụna dị ka o bilitere n’etiti Ndị Kraịst n’oge Pọl. (1 Ndị Kọrint 1:10-13; Ndị Filipaị 4:2, 3; 2 Ndị Tesalonaịka 3:6-14) Otú ọ dị, chee banyere paradaịs ime mmụọ nke anyị nọ na ya ugbu a. E jiri ya tụnyere ọnọdụ ọjọọ nke anyị nọbu na ya, a gwọwo anyị n’ụzọ ime mmụọ. Leekwa ọdịiche dị n’etiti ụnwụ nri ime mmụọ anyị nọbu na ya na afọ anyị na-eriju n’ụzọ ime mmụọ ugbu a. Kama ịnọ na-ata ahụhụ n’ala kpọrọ nkụ n’ụzọ ime mmụọ, ndị Chineke nwere ihu ọma ya, ha na-enwetakwa ọtụtụ ngọzi. (Aịsaịa 35:1, 7) Kama ịbụ ndị kpuru ìsì n’ọchịchịrị ime mmụọ yiri ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala, anyị na-ahụ ìhè nke nnwere onwe na nke ihu ọma Chineke. Ọtụtụ ndị na-anụtụbeghị amụma Bible na-anụ ma na-aghọta ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. (Aịsaịa 35:5) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa amụwo amụma Daniel n’amaokwu n’amaokwu. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha tụlere isiakwụkwọ nke ọ bụla nke akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa n’ụzọ miri emi. Nri ime mmụọ dị otú a na-enye ume ọhụrụ ọ́ bụghị ihe àmà na anyị nọ na paradaịs ime mmụọ?

11 Cheekwa banyere mgbanwe ndị e nweworo n’àgwà ka ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị a zụlitere n’ụzọ dị iche iche gbalịsiworo ike ịghọta na itinye Okwu Chineke n’ọrụ. N’ụzọ bụ́ isi, ha arụsiwo ọrụ ike ịhapụ àgwà ndị yiri nke anụ ọhịa bụ́ ndị e jibu mara ha. Eleghị anya, i mewo otú ahụ ma rụpụta ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ, otú ahụkwa ka ụmụnna ime mmụọ gị ndị nwoke na ndị nwanyị meworo. (Ndị Kọlọsi 3:8-14) N’ihi ya, ka ị na-eso ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-akpachi anya, ọ bụ gị na ndị na-eme udo na ndị nwere omume enyi na-akpakọrịta. Ee e, ha ezubeghị okè, ma a pụtụghị ịkọwa ha dị ka ọdụm na-eme ihe ike ma ọ bụ anụ ndọgbu. (Aịsaịa 35:9) Gịnị ka mkpakọrịta ime mmụọ a magburu onwe ya na-egosi? N’ụzọ doro anya, anyị nọ n’ọnọdụ ime mmụọ nke anyị na-akpọ n’ụzọ ziri ezi, paradaịs ime mmụọ. Paradaịs ime mmụọ anyị na-esekwa onyinyo paradaịs elu ala nke anyị ga-ebi na ya ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke.

12, 13. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nọgide na paradaịs ime mmụọ anyị?

12 N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị ihe anyị na-agaghị anwa anwa leghara anya. Chineke gwara ụmụ Izrel, sị: “Unu ga-edebekwa ihe nile e nyere n’iwu nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ka unu wee dị ike, baa n’ime, nweta ala ahụ, ebe unu onwe unu na-agabiga inweta ya.” (Deuterọnọmi 11:8) Na Levitikọs 20:22, 24, a kpọtụkwara otu ala ahụ aha: “Unu ga-edebekwa ụkpụrụ m nile, na ikpe m nile, mee ha: ka o wee ghara ịgbọpụta unu, bụ́ ala ahụ nke Mụ onwe m na-eme ka unu baa n’ebe ahụ ibi n’ime ya. Ma asị m unu, Unu onwe unu ga-enweta ala ha, Mụ onwe m ga-enyekwa unu ya inweta ya, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Ee, inweta Ala Nkwa ahụ dabeere n’iso Jehova Chineke na-enwe ezi mmekọrịta. Ọ bụ n’ihi na ụmụ Izrel erubereghị Chineke isi ka o ji kwe ka ndị Babilọn merie ha ma kpọpụ ha n’ebe obibi ha.

13 A pụrụ inwe ọtụtụ ihe na-amasị anyị banyere paradaịs ime mmụọ anyị. Gburugburu ya dị mma n’anya ma dị jụụ n’ahụ́. Anyị na Ndị Kraịst bụ́ ndị meworo mgbali ịgbanwe àgwà ndị yiri nke anụ ọhịa dị n’udo. Ha na-agbalịsi ike ịdị obiọma na inyere ndị ọzọ aka. Ma, ịnọgide na paradaịs ime mmụọ anyị chọrọ ihe karịrị iso ndị a na-enwe ezi mmekọrịta. Nke ahụ chọrọ ka anyị soro Jehova na-enwe ezi mmekọrịta ma na-eme uche ya. (Maịka 6:8) Anyị ji aka anyị bata na paradaịs ime mmụọ a, ma anyị pụrụ isi na ya kpafuo—ma ọ bụ bụrụ ndị a chụpụrụ na ya—ma ọ bụrụ na anyị arụsighị ọrụ ike iji nọgide soro Chineke na-enwe mmekọrịta.

14. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na paradaịs ime mmụọ?

14 Otu ihe dị mkpa nke ga-enyere anyị aka bụ na anyị ga-anọgide bụrụ ndị Okwu Chineke na-ewusi ike. Rịba ama okwu ihe atụ e ji mee ihe n’Abụ Ọma 1:1-3: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu . . . Kama n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” Tụkwasị na nke ahụ, akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na-ebipụta na-enye nri ime mmụọ na paradaịs ime mmụọ a.—Matiu 24:45-47.

Ịghọtakwu Otú Paradaịs Dị

15. N’ihi gịnị ka Mozis na-ejighị nwee ike iduru ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, ma gịnị ka ọ hụrụ?

15 Tụlee ihe atụ ọzọ nke Paradaịs. Mgbe ndị Izrel wagharịsịrị n’ịkpa ruo afọ 40, Mozis duuru ha gaa n’Ala Dị Larịị nke Moab, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan. N’ihi ihe Mozis mehiere n’oge gara aga, Jehova kpebiri na Mozis agaghị edu Izrel gafee Jọdan. (Ọnụ Ọgụgụ 20:7-12; 27:12, 13) Mozis rịọrọ Chineke, sị: “Biko, ka m gabiga, hụ ezi ala ahụ nke dị n’ófè Jọdan.” N’agbanyeghị na ọ gaghị aba n’ime ya, mgbe ọ rịgosịrị Ugwu Pisga ma hụ akụkụ dị iche iche nke ala ahụ, Mozis aghaghị ịghọtawo na ọ bụ “ezi ala.” Gịnị ka i chere ala ahụ dị ka ya?—Deuterọnọmi 3:25-27.

16, 17. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka otú Ala Nkwa ahụ dị n’oge ochie si dị iche n’otú ọ dị n’oge a? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwere na ọ dị mgbe Ala Nkwa ahụ dị ka paradaịs?

16 Ọ bụrụ na i lee ya anya dabere n’otú ógbè ahụ dịworo n’oge ndị na-adịbeghị anya, ị pụrụ iche na ọ bụ ala kpọrọ nkụ nke ájá jupụtara na ya, ọzara bụ́ nkume nkume, na ebe na-ekpo nnọọ ọkụ. Otú ọ dị, e nwere ihe mere a ga-eji kwubie na ógbè ahụ dum dị nnọọ iche n’oge Bible. N’akwụkwọ bụ́ Scientific American, ọkachamara n’ihe banyere mmiri na ájá bụ́ Dr. Walter C. Lowdermilk kọwara na “e mebiwo ala ahụ site ná mmetọ a nọworo na-emetọ ya kemgbe otu puku afọ.” Ọkà mmụta a n’ihe banyere mkpụrụ akụ́kụ́ na ala dere, sị: “‘Ọzara’ ahụ nke weghaara ala ahụ na-emebu ihe nke ọma bụ ọrụ aka mmadụ, ọ bụghị nke okike.” N’ezie, ihe ndị ọ chọpụtara gosiri na “ala a bụbu paradaịs anụ na-ata nri na ya.” O doro anya na ejighị ihe kpọrọ ihe nke ụmụ mmadụ emebiwo ihe bụbu “paradaịs anụ na-ata nri na ya.” *

17 N’ịtụgharị uche n’ihe ị gụtara na Bible, ị pụrụ ịhụ otú nkwubi okwu ahụ si bụrụ ihe ezi uche dị na ya. Cheta mmesi obi ike Jehova nyere ndị ya site n’aka Mozis: “Ala ahụ, ebe unu na-agabiga inweta ya, bụ ala ugwu na ndagwurugwu; site na mmiri ozuzo nke eluigwe ka ọ na-aṅụ mmiri: ọ bụ ala nke dị Jehova, bụ́ Chineke gị, n’obi.”—Deuterọnọmi 11:8-12.

18. Olee otú Aịsaịa 35:2 na-aghaghị isiwo mee ka ụmụ Izrel ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ghọtatụ ihe Ala Nkwa ahụ ga-adị ka ya?

18 Ala Nkwa ahụ jupụtara n’ahịhịa ndụ mara mma ma na-amị mkpụrụ nke na ịkpọtụ ebe ụfọdụ dị na ya aha na-echetara anyị ọnọdụ yiri paradaịs. Nke ahụ pụtara ìhè n’amụma dị n’Aịsaịa isi 35, bụ́ nke nwere mmezu mbụ ya mgbe ndị Izrel si Babilọn lọta. Aịzaịa buru amụma, sị: “Ọ ga-agbawa nke ukwuu, tegharịakwa egwu ọṅụ, ee, n’itegharị egwu ọṅụ na n’iti mkpu ọṅụ; nsọpụrụ Lebanọn ka a ga-enye ya, ee, ịma mma nke Kamel na Sharọn: ndị a ga-ahụ ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.” (Aịsaịa 35:2) Aha a kpọtụrụ Lebanọn, Kamel, na Sharọn aghaghị ịkpaliwo ụmụ Izrel iche banyere ebe na-enye obi ụtọ na nke mara mma.

19, 20. (a) Kọwaa ebe Sharọn oge ochie dị. (b) Olee otu ụzọ anyị pụrụ isi mee ka olileanya anyị maka Paradaịs sikwuo ike?

19 Tụlee ihe banyere Sharọn, bụ́ ala dị larịị nke dịdebere mmiri nke dị n’agbata ugwu nta ndị dị na Sameria na Osimiri Ukwu ahụ, ma ọ bụ Mediterenian. (Lee foto dị na peeji nke 10.) E ji ahịhịa ndụ ndị mara mma na imepụta ihe mara ya. N’ịbụ ala mmiri na-ede nnọọ nke ọma, ọ dị mma maka ịzụ anụ, ma o nwere ọhịa ndị osisi oak juru na ha n’ebe ugwu ya. (1 Ihe E Mere 27:29; Abụ nke Abụ 2:1, ihe odide ala ala peeji nke NW; Aịsaịa 65:10) N’ihi ya, Aịsaịa 35:2 na-ebu amụma banyere mweghachi na banyere ala nke mara nnọọ mma, nke ga-adị ka paradaịs. Amụma ahụ na-arụtụkwa aka na paradaịs ime mmụọ nke na-enye ọṅụ, n’ikwekọ n’ihe Pọl mesịrị hụ n’ọhụụ. N’ikpeazụ, amụma a, na ndị ọzọ, na-ewusi olileanya anyị nke paradaịs elu ala maka ihe a kpọrọ mmadụ ike.

20 Ka anyị na-ebi na paradaịs ime mmụọ anyị, anyị pụrụ inwekwu ekele maka ya ma mee ka olileanya anyị maka Paradaịs elu ala sikwuo ike. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịghọtakwu ihe ndị anyị na-agụ na Bible. Ihe ndekọ na amụma Bible kpọrọ ebe ụfọdụ aha kpọmkwem ọtụtụ ugboro. Ọ̀ ga-amasị gị ịghọtakwu ebe ha dị na ihe jikọrọ ha na ebe ndị ọzọ a kpọtụrụ aha? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ị pụrụ isi mee nke ahụ ma rite uru na ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Denis Baly na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ The Geography of the Bible, sị: “Ọ ghaghị ịbụ na e nwewo mgbanwe dị ukwuu n’ụdị ihe ọkụkụ na-eto n’ebe ahụ kemgbe oge Bible.” Gịnị kpatara ya? “Osisi dị mmadụ mkpa maka nkụ na iwu ụlọ n’ihi ya kwa . . . mmadụ malitere igbutusị osisi ma si otú ahụ mee ka ihu igwe na-akpa ala ahụ aka ọjọọ. Ihe si ná ntinye aka dị otú a na mbara ala ahụ pụta bụ na ihu igwe . . . ji nwayọọ nwayọọ ghọọ ihe kasị ebibi ya.”

Ị̀ Na-echeta?

• Olee “paradaịs” Pọl onyeozi hụrụ n’ọhụụ?

• Gịnị bụ mmezu mbụ nke Aịsaịa isi 35, oleekwa ihe jikọrọ ya na ihe Pọl hụrụ n’ọhụụ?

• Olee otú anyị pụrụ isi nwekwuo ekele maka paradaịs ime mmụọ anyị ma mee ka olileanya anyị maka paradaịs elu ala sikwuo ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ala Dị Larịị nke Sharọn, ala na-amị mkpụrụ nke dị n’Ala Nkwa ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 12]

Mozis ghọtara na ọ bụ “ezi ala”