Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara Obi Ụtọ A Na-enweta Site n’Inye Ihe?

Ị̀ Maara Obi Ụtọ A Na-enweta Site n’Inye Ihe?

Ị̀ Maara Obi Ụtọ A Na-enweta Site n’Inye Ihe?

OJIWO ịdị uchu jee ozi Ndị Kraịst ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 50. Ọ bụ ezie na ihe ndị na-esi n’ịka nká emewo ka ọ gharazie ịgbasi ike, o kpebisiri ike ịga hụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ e wuru ọhụrụ. Site n’ijide otu nwanna nwoke bụ́ Onye Kraịst na-enyere ya aka aka, ọ bara n’ụlọ nzukọ ahụ, ma jiri nwayọọ nwayọọ na-aga kpọmkwem n’ebe o bu n’obi—igbe onyinye. N’ebe ahụ, o tinyere ego ọ nọworo na-echekwa maka nzube a. Ọ bụ ezie na ọ pụghị ịrụ ọrụ n’owuwu nke ụlọ nzukọ ahụ, ọ chọrọ inye aka.

Nwanyị a bụ́ Onye Kraịst pụrụ ichetara gị nwanyị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi—“nwanyị di ya nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye” bụ́ onye Jizọs hụrụ ka ọ na-atụnye obere mkpụrụ ego abụọ n’ime ihe ntụnye ego ụlọ nsọ. A gwaghị anyị ihe bụ ọnọdụ ya, ma ịbụ onye di ya nwụrụ n’oge ahụ pụrụ itinye nwanyị n’ọnọdụ akụ̀ na ụba jọgburu onwe ya. N’ezie, Jizọs meteere ya ebere, n’ihi na ọ ghọtara ọnọdụ ọjọọ nwanyị ahụ nọ na ya n’ụzọ zuru ezu. N’iji nwanyị ahụ emere ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ, o kwuru na obere onyinye ahụ bụ “ihe nile o nwere, ihe dum o ji biri.”—Mak 12:41-44.

Gịnị mere nwanyị nọ ná mkpa dị ka nwanyị a di ya nwụrụ ga-eji chụọ àjà dị otú a? N’ụzọ doro anya, ọ bụ n’ihi na ọ raara onwe ya kpam kpam nye Jehova Chineke, bụ́ onye ofufe ya hiwere isi n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Ọ bụ ezie na a kpaara ihe ọ pụrụ ime ókè, ọ chọrọ ịkwalite ozi dị nsọ. Ọ ghaghịkwa inwewo ọṅụ n’ezie inye ihe ọ bụla ọ pụrụ inye.

Inye Ihe Iji Kwado Ọrụ Jehova

Inye onyinye ihe onwunwe na ego abụwo mgbe nile akụkụ dị mkpa nke ofufe dị ọcha, ọ bụwokwa mgbe nile ihe na-eweta oké ọṅụ. (1 Ihe E Mere 29:9) N’Izrel oge ochie, e ji onyinye mee ihe ọ bụghị nanị iji chọọ ụlọ nsọ ahụ mma kamakwa iji mee ka akụkụ nile nke ofufe Jehova na-arụ ọrụ kwa ụbọchị. Iwu ahụ kwuru kpọmkwem ka ụmụ Izrel na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha rụtara iji na-akwado ndị Livaị, bụ́ ndị na-eje ozi ụlọ nsọ. Ma ndị Livaị ga-enyekwa Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị ha natara.—Ọnụ Ọgụgụ 18:21-29.

Ọ bụ ezie na a tọhapụwo Ndị Kraịst n’ihe ndị ọgbụgba ndụ Iwu ahụ chọrọ, ụkpụrụ nke ndị ohu Chineke inye onyinye n’ụzọ ihe onwunwe iji kwado ezi ofufe agbanwebeghị. (Ndị Galeshia 5:1) Tụkwasị na nke ahụ, Ndị Kraịst narị afọ mbụ lere ya anya dị ka ihe ọṅụ inye onyinye iji gboo mkpa ụmụnna ha. (Ọrụ 2:45, 46) Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst na dị nnọọ ka Chineke ji mmesapụ aka na-enye ha ezi ihe nile, otú ahụ ka ha kwesịrị isi na-emesapụrụ ndị ọzọ aka. O dere, sị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha tụkwasịkwa olileanya ha, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ; ka ha na-arụ ọrụ ọma, ka ha baa ọgaranya n’ezi ọrụ, ka ha na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe, na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:17-19; 2 Ndị Kọrint 9:11) N’ezie, site n’ahụmahụ nke onwe ya, Pọl hụtara ịbụ eziokwu nke okwu Jizọs bụ́: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

Inye Ihe nke Ndị Kraịst Taa

Taa, ndị ohu Jehova nọgidere na-eji ihe onwunwe ha eme ihe iji na-enyere ibe ha aka na iji na-akwado ọrụ Chineke. Ọbụna ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-enye ihe ọ bụla ha pụrụ inye. “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ele ya anya dị ka ibu ọrụ o nwere n’ebe Jehova nọ iji ego nile a e nyere n’onyinye eme ihe n’ụzọ kasị mma. (Matiu 24:45) A na-eji ego eme ihe iji mee ka alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na-arụ ọrụ, iji na-asụgharị ma na-ebipụta Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, iji na-eme ndokwa maka mgbakọ ndị buru ibu nke Ndị Kraịst, iji na-azụ ma na-ezipụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ozi ala ọzọ, iji na-enye ihe enyemaka maka ọdachi, tinyekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ka anyị lekwasị anya n’otu n’ime ihe ndị dị otú ahụ—inye aka n’iwu ebe ndị a na-anọ efe ofufe.

Ndịàmà Jehova na-ezukọ ugboro ugboro n’izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha iji rite uru ná mmụta ime mmụọ na ezi mkpakọrịta. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ala, ọnọdụ akụ̀ na ụba adịghị ekwe ka Ndịàmà bi ebe ahụ nwetalie ego a ga-eji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebughị ụzọ nweta enyemaka. N’ihi ya, na 1999, Ndịàmà Jehova malitere usoro iji ego ndị sitere n’ala ndị ka baa ọgaranya nye aka iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ndị ka daa ogbenye. Tụkwasị na nke a, ọtụtụ puku ndị ọrụ afọ ofufo enyewo oge na nkà ha, na-arụ ọrụ ọtụtụ mgbe n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ nke mba ndị a. N’oge a na-ewu ihe owuwu ndị ahụ, Ndịàmà nọ ná mba ndị a na-amụta nkà nke iwu ihe na ilekọta ya, Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-emekwa ka ọ dị mfe ịzụta ngwá ọrụ na ihe ndị e ji ewu ụlọ bụ́ ndị dị mkpa. Ndịàmà bụ́ ndị na-eji ụlọ nzukọ ọhụrụ ndị a eme ihe ugbu a na-enwe ekele miri emi na ndị kwere ekwe ibe ha nyere oge na ego ha n’afọ ofufo. Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ na-enyekwa onyinye site n’ọnwa ruo n’ọnwa iji na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ahụ na iji nye aka n’ịkwụghachi ego e ji wuo ya, si otú a na-enye aka n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọzọ.

A na-eji usoro e ji ewu ihe na ihe ndị e ji ewu ihe e nwere ná mba nke ọ bụla eme ihe iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ. Ọ bụ ezie na a chọghị ụlọ nzukọ ndị a mma n’ụzọ pụrụ iche, ha na-adọrọ mmasị, na-egbo mkpa e ji wuo ha, dịkwa ntụsara ahụ́. Mgbe a malitere usoro owuwu ihe a na 1999, ọ gụnyere ihe dị ka mba 40 na-enwechaghị ihe onwunwe. Kemgbe ahụ, usoro owuwu ihe ahụ agbasawo ruo n’ala 116 dị otú ahụ, na-agụnye ihe karịrị ọkara nke ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova n’ụwa. N’afọ ise a gara aga, e wuwo ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze 9,000 n’okpuru ndokwa a, nkezi nke ihe karịrị ụlọ nzukọ 5 kwa ụbọchị! N’agbanyeghị nke ahụ, n’ala 116 a, a ka nwere mkpa maka Ụlọ Nzukọ Alaeze 14,500 ọhụrụ. Site ná ngọzi Jehova nakwa site n’ịdị njikere na mmesapụ aka nke Ndịàmà gburugburu ụwa, e nwere olileanya na a ga-enwe ego ga-ezunụ iji gboo mkpa a.—Abụ Ọma 127:1.

Ụlọ Nzukọ Alaeze Na-akwalite Uto

Mmetụta dị aṅaa ka oké mgbalị a nweworo n’ebe Ndịàmà nọ ná mba ndị a nọ nakwa n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ? N’ọtụtụ ebe, a na-enwe mmụba dị ịrịba ama n’ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ mgbe e wusịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. A na-achọta otu ezigbo ihe atụ banyere nke a n’akụkọ a si Burundi: “Ozugbo e wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ na-eju. Dị ka ihe atụ, e wuuru otu ọgbakọ na-enwe nkezi nke ihe dị ka 100 mmadụ ná nzukọ ha Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ha ga-aba mmadụ 150 n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ka ọ na-erule mgbe e wuchara ya, ha na-enwezi mmadụ 250 ná nzukọ ha.”

N’ihi gịnị ka e ji enwe mmụba dị otú ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ na a na-enyo ìgwè ndị nkwusa Alaeze bụ́ ndị na-enweghị ụlọ nzukọ ma bụrụ ndị na-aghaghị izukọta n’okpuru osisi ma ọ bụ n’ubi enyo mgbe ụfọdụ. N’otu ala, e kwuwo na ọ bụ obere òtù okpukpe ndị dị otú ahụ na-akpalite ime ihe ike agbụrụ, iwu mba ahụ chọkwara ka a na-enwe nzukọ okpukpe nile n’ụlọ ofufe.

Inwe ụlọ nzukọ nke ha na-enyekwara Ndịàmà Jehova aka igosi ndị obodo na ha abụghị ndị na-eso ụzọ otu pastọ. Alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na Zimbabwe na-ede, sị: “N’oge gara aga, ụmụnna ndị nọ ebe a na-ezukọ n’ụlọ ndị mmadụ, ndị obodo na-ejikwa aha onye nwe ụlọ ebe ọgbakọ na-ezukọ amata ha. Ha na-ekwu na ụmụnna na-aga chọọchị Maazi Onye a ma ọ bụ Maazi Onye nke ọzọ. Ihe a nile na-agbanwe ugbu a ka ndị mmadụ na-ahụ saịn bọọdụ ndị na-egosi na ụlọ nzukọ nke ọ bụla bụ ‘Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.’”

Ndị Ji Ọṅụ Enye Ihe

“Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya,” ka Pọl onyeozi dere. (2 Ndị Kọrint 9:7) N’ezie, onyinye ndị buru ibu na-enye aka. Ma ihe ka ukwuu n’ego a na-enye n’ọrụ Ndịàmà Jehova na-abịa site n’igbe onyinye ndị dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma hà buru ibu ma hà dị nta, onyinye nile dị mkpa, ọ dịghịkwa nke e kwesịrị ileghara anya. Cheta na Jizọs guzo n’ebe ọ pụrụ ịhụ ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ bụ́ ogbenye na-atụnye obere mkpụrụ ego abụọ ya. Ndị mmụọ ozi na Jehova hụkwara ya. Anyị amaghị ọbụna aha nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma Jehova hụrụ na e dekọrọ omume nke achọghị ọdịmma onwe ya nanị n’ime Bible.

Tinyere owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze, e ji onyinye anyị akwado akụkụ ndị ọzọ nile nke ọrụ Alaeze ahụ dị mkpa. Inye nkwado n’ụzọ dị otú a na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ ma ‘na-ejupụta n’ọtụtụ okwu ekele nye Chineke.’ (2 Ndị Kọrint 9:12) Ụmụnna anyị Ndị Kraịst nọ na Benin na-akọ, sị: “Kwa ụbọchị, ọtụtụ ekpere nke ekele na-agara Jehova maka enyemaka ego anyị nwetara site n’aka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.” N’otu oge ahụ, anyị nile bụ́ ndị na-ekere òkè n’ịkwado ọrụ Alaeze ahụ n’ụzọ ego na-enweta obi ụtọ nke na-abịa site n’inye ihe Ndị Kraịst!

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22, 23]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ na-amawapụta, ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Contributions for the Worldwide Work—Matthew 24:14” (“Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14”).

Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba ha. A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo kpọmkwem na Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, c/o Office of the Secretary and Treasurer, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. E kwesịrị ide akwụkwọ ndọrọ ego ka ọ bụrụ nke a ga-akwụnye “Watch Tower.” A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọta onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

NDOKWA NKE ONYINYE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI

Mmadụ pụrụ inye Watch Tower ego ya ka ha jiri ya na-eme ihe ruo mgbe onye ahụ chọrọ ya. Otú ọ dị, a pụrụ inyeghachi ya onye ahụ ma ọ bụrụ na ọ rịọ ka e nyeghachi ya ya. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Ọfịs Odeakwụkwọ na Odebe Ego n’adres e dere n’elu.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye kpam kpam, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze uru n’ụwa nile. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ bụrụ nke a ga-akwụnye Watch Tower mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.

Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ, n’ọnọdụ ebe onye nwe ụlọ ahụ ka bi na ya, site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenye ala na ụlọ ọ bụla n’aha ya.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego e mere ka ọ baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego n’ụtụ isi ọ ga-akwụ.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ inye aka n’ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova site n’ụdị ụfọdụ nke atụmatụ ọrụ ebere aka, a kwadebewo otu broshuọ dị n’asụsụ Bekee na Spanish a kpọrọ Charitable Planning to Benefit Kingdom Service Worldwide (Atụmatụ Ọrụ Ebere Iji Baara Ozi Alaeze Uru n’Ụwa Nile). A kwadebere broshuọ a iji nye ihe ọmụma banyere ụzọ dịgasị iche iche a pụrụ isi nye onyinye ma ọ́ bụghị ugbu a, ya abụrụ site n’ikenye ya n’ekpe maka mgbe mmadụ nwụrụ. Mgbe ha gụsịrị broshuọ a ma soro ndị ndụmọdụ n’ihe metụtara iwu na ụtụ isi tụlesịa ya, ọtụtụ ndị enwewo ike inye aka kwado ọrụ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ma mụbaa ihe a na-esepụrụ ha n’ụtụ isi ka ha na-eme otú ahụ. A pụrụ inweta broshuọ a site n’ịrịọ maka ya kpọmkwem site n’aka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere.

Iji nwetakwuo ihe ọmụma, ị pụrụ ịkpọtụrụ Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba gị.

Charitable Planning Office

Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

100 Watchtower Drive,

Patterson, New York 12563-9204

Telifon: (845) 306-0707

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Ebe nzukọ ochie na ndị nke ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova

Zambia

Central African Republic