Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst si ele iri oké nri anya?

Okwu Chineke katọrọ ma ịṅụbiga mmanya ókè ma iri oké nri dị ka àgwà ndị na-ekwekọghị n’ijere Chineke ozi. Ya mere, ọgbakọ Ndị Kraịst na-ele onye a maara dị ka onye na-eri oké nri anya dị ka o si ele onye ịṅụbiga mmanya ókè riri ahụ́. Ma onye na-aṅụbiga mmanya ókè ma onye na-eri oké nri apụghị ịbụ akụkụ nke ọgbakọ Ndị Kraịst.

Ilu 23:20, 21 na-ekwu, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vaịn ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè: n’ihi na onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye na-eribiga ihe ókè ka a ga-anapụ ihe nile: ọ bụkwa nkịrịka ákwà ka oru ụra ga-eyikwasị mmadụ.” Na Deuterọnọmi 21:20, anyị na-agụ banyere onye “na-ewezụga onwe ya, na-enupụkwa isi,” bụ́ onye e kwesịrị ime ka ọ nwụọ n’okpuru Iwu Mozis. Dị ka amaokwu a si kwuo, àgwà abụọ e ji mara onye ahụ na-enupụ isi, nke na-enweghịkwa nchegharị bụ na ọ bụ “onye mmefu [ma ọ bụ, “onye na-eri oké nri”], na onye na-aṅụbiga mmanya ókè.” N’ụzọ doro anya, n’Izrel oge ochie, e lere iri oké nri anya dị ka àgwà na-ekwesịghị ndị chọrọ ijere Chineke ozi.

Otú ọ dị, gịnị ka iri oké nri gụnyere, gịnịkwa ka Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-ekwu banyere okwu a? A na-akọwa onye na-eri oké nri dị ka “onye anyaukwu maara ahụ́ na onye ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na-adịghị eju afọ.” Ya mere, otu ihe bụ na iri oké nri bụ otu ụdị nke anyaukwu, Okwu Chineke na-agwakwa anyị na “ndị anyaukwu” bụ ụdị mmadụ ndị na-agaghị eketa Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Filipaị 3:18, 19; 1 Pita 4:3) Tụkwasị na nke ahụ, mgbe Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị megide Ndị Kraịst ịrụ “ọrụ nke anụ ahụ́,” ọ kpọtụrụ “ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị ka ndị a” aha. (Ndị Galeshia 5:19-21) Iribiga nri ókè na ịṅụ oké mmanya na oriri oké mkpọtụ na-esokarị. Ọzọkwa, o doro anya na a gụnyere iri oké ihe n’okwu Pọl bụ́ “na ihe ndị dị ka ndị a.” Dị ka ọ dị n’ihe banyere ‘ọrụ ndị ọzọ nke anụ ahụ́,’ e kwesịrị ịchụpụ Onye Kraịst bụ́ onye a maara nnọọ dị ka onye na-eri oké nri, bụ́ onye jụwapụkwara isi ịgbanwe àgwà anyaukwu ya, n’ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 5:11, 13. *

Ọ bụ ezie na Okwu Chineke na-ele onye na-eri oké nri anya otú o si ele onye na-aṅụ oké mmanya, a pụrụ ịmata onye na-aṅụ oké mmanya ngwa ngwa karịa onye na-eri oké nri. Ihe ndị na-egosi ịṅụbiga mmanya ókè na-apụtakarị ìhè. Otú ọ dị, ikpebi ókè mmadụ ga-eriru nri wee ghọọ onye a maara dị ka onye na-eri oké nri na-esi nnọọ ike n’ihi na a pụghị ikpebi ya nanị site n’ọdịdị elu ahụ́. Ya mere, ime ihe banyere nsogbu a na-achọ nlebara anya na nghọta miri emi n’aka ndị okenye nọ n’ọgbakọ.

Dị ka ihe atụ, oké ibu pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà nke iri oké nri, ma ọ bụghị mgbe nile. Mmadụ ibu ibu gabiga ókè pụrụ ịbụ n’ihi ọrịa. Ebumpụta ụwa pụkwara ịkpata oké ibu. Anyị kwesịkwara iburu n’uche na oké ibu bụ ọnọdụ ahụ́ mmadụ, ebe iri oké nri bụ ọnọdụ uche. A kọwara oké ibu dị ka “ọnọdụ nke mmadụ inwe oké abụba n’ahụ́ ya,” ebe a kọwara iri oké nri dị ka “anyaukwu ma ọ bụ inwe agụụ gabigara ókè.” N’ihi ya, ihe e ji ama onye na-eri oké nri abụghị otú onye ahụ hà kama àgwà ya n’ebe nri dị. Mmadụ pụrụ ịha otú o kwesịrị ma ọ bụ ọbụna taa ahụ́ ma ka bụrụ onye na-eri oké nri. Ọzọkwa, ihe e lere anya dị ka ibu ma ọ bụ ọdịdị ahụ́ kwesịrị ekwesị pụrụ ịdịgasị nnọọ iche site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.

Gịnị bụ ihe mgbaàmà nke iri oké nri? Onye na-eri oké nri adịghị ejide onwe ya, ọbụna na-agba onwe ya nri ruo n’ókè nke inwe ahụ́ erughị ala ma ọ bụ ịrịa ọrịa. Enweghị njide onwe onye ya na-egosi na ọ dịghị echegbu onwe ya n’ezie banyere nkọcha ọ na-ewetara Jehova na ezi aha nke ndị Ya. (1 Ndị Kọrint 10:31) N’aka nke ọzọ, a gaghị ele onye ribigara nri ókè ugboro ole na ole anya ozugbo dị ka “onye anyaukwu.” (Ndị Efesọs 5:5) Ka o sina dị, n’ikwekọ n’ụkpụrụ dị ná Ndị Galeshia 6:1, enyemaka pụrụ ịdị Onye Kraịst dị otú ahụ mkpa. Pọl na-ekwu, sị: “Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, gbalịanụ ịgbazigharị onye dị otú ahụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ.”

N’ihi gịnị ka ndụmọdụ Bible nke izere iri oké nri ji dị mkpa karịsịa taa? Ọ bụ n’ihi na Jizọs dọrọ aka ná ntị, karịsịa banyere ụbọchị anyị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà.” (Luk 21:34, 35) Izere iribiga nri ókè bụ otu ụzọ dị mkpa isi jụ ụzọ ndụ na-emerụ ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ.

Imeru ihe n’ókè bụ àgwà Ndị Kraịst. (1 Timoti 3:2, 11) Ya mere, Jehova aghaghị inyere ndị nile ọ na-agụsi agụụ ike itinye ndụmọdụ Bible banyere iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ruo n’ókè kwesịrị ekwesị n’ọrụ aka.—Ndị Hibru 4:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” ná mbipụta Ụlọ Nche nke November 15, 1986.