Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ohu Jehova Bụ́ Ndị Nwere Obi Ụtọ

Ndị Ohu Jehova Bụ́ Ndị Nwere Obi Ụtọ

Ndị Ohu Jehova Bụ́ Ndị Nwere Obi Ụtọ

“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.”—MATIU 5:3.

1. Gịnị bụ ezi obi ụtọ, gịnịkwa ka ọ na-egosi?

OBI ỤTỌ bụ ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa nke ndị Jehova. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.” (Abụ Ọma 144:15) Obi ụtọ bụ inwe mmetụta nke ịbụ onye ihe dịịrị ná mma. Obi ụtọ kasị mie emie—nke na-eru nnọọ ná mmadụ ime anyị—na-abịa site n’ịmara na anyị bụ ndị Jehova gọziri. (Ilu 10:22) Obi ụtọ dị otú ahụ na-egosi na anyị na Nna anyị nke eluigwe nwere mmekọrịta chiri anya nakwa na anyị maara na anyị na-eme uche ya. (Abụ Ọma 112:1; 119:1, 2) N’ụzọ na-akpali mmasị, Jizọs kwupụtara ihe itoolu mere anyị pụrụ iji nwee obi ụtọ. Ịtụle ihe ndị a a na-akpọ okwu obi ụtọ ma ọ bụ okwu ngọzi n’isiokwu a na nke na-esonụ ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị pụrụ inweru obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova, bụ́ “Chineke onye obi ụtọ,” ozi.—1 Timoti 1:11.

Ịmara Mkpa Ime Mmụọ Anyị

2. N’oge dị aṅaa ka Jizọs kwuru banyere obi ụtọ, okwu dịkwa aṅaa ka o ji malite?

2 Na 31 O.A., Jizọs kwuru otu n’ime okwu ndị kasị wuo ewuo a nụtụrụla. A na-akpọ ya Ozizi Elu Ugwu n’ihi na Jizọs kwuru ya n’akụkụ ugwu nke chere ihu n’Osimiri Galili. Oziọma Matiu na-akọ, sị: “Mgbe [Jizọs] hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ọ rịgooro n’elu ugwu; mgbe ọ nọdụsịrị ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya; o wee meghee ọnụ ya malite izi ha ihe, na-asị: ‘Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha, ebe ọ bụ na alaeze nke eluigwe bụ nke ha.’” A sụgharịa ya n’ụzọ nkịtị, okwu mmeghe Jizọs na-agụ, sị: “Ngọzi [ma ọ bụ “obi ụtọ”] na-adịrị ndị bụ́ ogbenye n’ime mmụọ ha.” (Matiu 5:1-3; Bible Nsọ nke Union Version) Today’s English Version na-agụ, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara na ha dara ogbenye n’ụzọ ime mmụọ.”

3. Olee otú àgwà obi umeala si atụnye ụtụ n’obi ụtọ anyị?

3 N’ozizi o ziri n’akụkụ ugwu, Jizọs mere ka ọ pụta ìhè na mmadụ ga-enwe obi ụtọ ka nnọọ ukwuu mgbe ọ maara na ya nwere mkpa ime mmụọ. N’ịmara nke ọma banyere ọnọdụ mmehie ha, Ndị Kraịst dị umeala n’obi na-arịọ Jehova maka mgbaghara ná ndabere nke àjà mgbapụta Kraịst. (1 Jọn 1:9) Ha si otú a enweta udo nke uche na ezi obi ụtọ. “Onye ihe na-agara nke ọma [ma ọ bụ “onye obi ụtọ”] ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya.”—Abụ Ọma 32:1; 119:165.

4. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị maara mkpa nke ime mmụọ anyị nakwa nke ndị ọzọ? (b) Gịnị na-eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ mgbe anyị maara mkpa nke ime mmụọ anyị?

4 Ịmara mkpa ime mmụọ anyị na-akpali anyị ịgụ Bible kwa ụbọchị, iri nri ime mmụọ nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye “n’oge kwesịrị ekwesị,” na ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya. (Matiu 24:45; Abụ Ọma 1:1, 2; 119:111; Ndị Hibru 10:25) Ịhụnanya maka ndị agbata obi na-eme ka anyị mara mkpa ime mmụọ nke ndị ọzọ ma na-eme ka anyị na-adị uchu n’ikwusa na ịkụzi ozi ọma Alaeze ahụ. (Mak 13:10; Ndị Rom 1:14-16) Iso ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu Bible na-ewetara anyị obi ụtọ. (Ọrụ 20:20, 35) Obi ụtọ anyị na-emiwanye emi mgbe anyị na-atụgharị uche n’olileanya magburu onwe ya nke Alaeze ahụ na ngọzi ndị Alaeze ahụ ga-eweta. Nye “ìgwè atụrụ nta” nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, olileanya Alaeze ahụ pụtara ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe dị ka akụkụ nke ọchịchị Alaeze Kraịst. (Luk 12:32; 1 Ndị Kọrint 15:50, 54) Nye “atụrụ ọzọ” ahụ, ọ pụtara ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ.—Jọn 10:16; Abụ Ọma 37:11; Matiu 25:34, 46.

Otú Ndị Na-eru Újú Pụrụ Isi Nwee Obi Ụtọ

5. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ndị na-eru újú” pụtara? (b) Olee otú e si akasi ndị na-eru újú dị otú ahụ obi?

5 Okwu obi ụtọ ọzọ Jizọs kwuru yiri ka ọ̀ na-emegide onwe ya. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eru újú, ebe ọ bụ na a ga-akasi ha obi.” (Matiu 5:4) Olee otú mmadụ pụrụ isi na-eru újú ma nwee obi ụtọ n’otu oge ahụ? Iji ghọta ihe okwu Jizọs pụtara, ọ dị anyị mkpa ịtụle ụdị iru újú ọ na-ekwu maka ya. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems na-akọwa na ọnọdụ mmehie nke anyị onwe anyị kwesịrị ịdị na-eme ka anyị na-eru újú. O dere, sị: “Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere uche abụọ. Hụsienụ anya, ruokwanụ újú ma kwaanụ ákwá. Ka e mee ka ọchị unu ghọọ iru újú, ka ọṅụ unu ghọọkwa nkụda mmụọ. Wedanụ onwe unu ala n’anya Jehova, ọ ga-ebulikwa unu elu.” (Jems 4:8-10) Ndị ọnọdụ mmehie ha na-ewute n’ezie na-abụ ndị a kasiri obi mgbe ha matara na a pụrụ ịgbaghara ha mmehie ha ma ha gosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst ma gosi ezi nchegharị site n’ime uche Jehova. (Jọn 3:16; 2 Ndị Kọrint 7:9, 10) Ha pụziri iso Jehova nwee mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa ma nwee olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi iji na-ejere ya ozi ma na-enye ya otuto. Nke a na-ewetara ha obi ụtọ miri emi.—Ndị Rom 4:7, 8.

6. N’echiche dị aṅaa ka ụfọdụ na-eru újú, oleekwa otú e si akasi ha obi?

6 Okwu Jizọs na-agụnyekwa ndị na-eru újú n’ihi ihe arụ ndị jupụtara n’ụwa. Jizọs ji amụma ahụ dị n’Aịsaịa 61:1, 2 mee ihe n’ebe ya onwe ya nọ, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, dị n’ahụ́ m; n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; O zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, . . . ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” Ọrụ ahụ metụtakwara Ndị Kraịst e tere mmanụ ka nọ n’ụwa, bụ́ ndị na-emezu ya site n’enyemaka nke ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ.” Ha nile na-ekere òkè n’ọrụ ịka akara ihe atụ ahụ n’egedege ihu nke “ndị ahụ ndị na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme n’etiti ya [Jeruselem si n’ezi ofufe dapụ, nke Krisendọm na-anọchi anya ya].” (Ezikiel 9:4) A na-eji ‘ozi ọma alaeze’ ahụ akasi ndị dị otú ahụ na-eru újú obi. (Matiu 24:14) Ha nwere obi ụtọ ịmata na a ga-eji ụwa ọhụrụ ezi omume nke Jehova dochie ajọ usoro ihe Setan n’oge na-adịghị anya.

Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Dị Nwayọọ n’Obi

7. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘ịdị nwayọọ n’obi’ na-apụtaghị?

7 Jizọs gara n’ihu n’Ozizi Elu Ugwu ya na-ekwu, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Mgbe ụfọdụ, a na-eche na ịdị nwayọọ n’obi bụ adịghị ike. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. N’ịkọwa ihe okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘ịdị nwayọọ n’obi’ pụtara, otu onye ọkà mmụta Bible dere, sị: “Ihe kasịnụ e ji amata onye dị [nwayọọ n’obi] bụ na ọ na-ejide nnọọ onwe ya. Ịdị nwayọọ n’obi abụghị ịdị nro gabiga ókè, inwe mmetụta gabigara ókè banyere ihe, ịjụbiga oyi ókè. Ọ bụ ike a chịkwara achịkwa.” Jizọs kwuru banyere onwe ya, sị: “Enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi.” (Matiu 11:29) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs ji obi ike gbachitere ụkpụrụ ezi omume.—Matiu 21:12, 13; 23:13-33.

8. Gịnị ka ya na ịdị nwayọọ n’obi nwere njikọ chiri anya, n’ihi gịnịkwa ka àgwà a ji dị anyị mkpa ná mmekọrịta nke anyị na ndị ọzọ?

8 Mgbe ahụ, ịdị nwayọọ n’obi na njide onwe onye nwere njikọ chiri anya. N’ezie, Pọl onyeozi denyere ịdị nwayọọ na njide onwe onye mgbe o depụtara “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) A ghaghị ịzụlite ịdị nwayọọ n’obi site n’enyemaka nke mmụọ nsọ. Ọ bụ àgwà Ndị Kraịst nke na-eme ka udo dị n’etiti anyị na ndị nọ n’èzí na ndị nọ n’ọgbakọ. Pọl dere, sị: “Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi. Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam.”—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.

9. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ nanị ná mmekọrịta nke anyị na ụmụ mmadụ ndị ọzọ ka anyị pụrụ igosipụta ịdị nwayọọ n’obi? (b) Olee otú ndị dị nwayọọ n’obi si ‘eketa ụwa’?

9 Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ná mmekọrịta nke anyị na ụmụ mmadụ ndị ọzọ ka anyị pụrụ igosipụta ịdị nwayọọ n’obi. Site n’iji ọchịchọ obi anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ọbụbụeze Jehova, anyị na-egosi na anyị dị nwayọọ n’obi. Jizọs Kraịst, bụ́ onye gosipụtara ịdị nwayọọ n’obi ma doo onwe ya n’okpuru uche Nna ya n’ụzọ zuru ezu mgbe ọ nọ n’ụwa, bụ onye nlereanya kasịnụ n’akụkụ a. (Jọn 5:19, 30) Jizọs bụ onye mbụ ketara ụwa n’ihi na ọ bụ Onye Ọchịchị ya a họpụtara ahọpụta. (Abụ Ọma 2:6-8; Daniel 7:13, 14) Ya na ‘ndị ha na ya na-eketakọ ihe’ bụ́ 144,000, ndị a họpụtara site “n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ” “ịchị ụwa dị ka ndị eze,” ga-eso nweta ihe nketa a. (Ndị Rom 8:17; Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3, 4; Daniel 7:27) Kraịst na ndị òtù ya ga-achị ọtụtụ nde ndị ikom na ndị inyom yiri atụrụ, bụ́ ndị abụ amụma a ga-emezu n’isi ha: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11; Matiu 25:33, 34, 46.

Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Agụụ Na-agụ, Maka Ezi Omume

10. Olee otu ụzọ a pụrụ isi mee ka afọ ju ‘ndị agụụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume’?

10 Okwu obi ụtọ ọzọ Jizọs kwuru mgbe ọ na-ekwu okwu n’akụkụ ugwu Galili ahụ bụ: “Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, ebe ọ bụ na a ga-eme ka afọ ju ha.” (Matiu 5:6) Nye Ndị Kraịst, ọ bụ Jehova na-esetịpụ ihe nlereanya nke ezi omume. N’ihi ya, a pụrụ ikwu na ndị agụụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume na-achọ nduzi Chineke. Ndị dị otú ahụ maara mmehie na ezughị okè ha nke ọma ma bụrụ ndị ọ na-agụ agụụ inwe ezi nguzo n’ihu Jehova. Lee obi ụtọ ha na-enwe mgbe ha mụtara site n’Okwu Chineke na ọ bụrụ na ha echegharịa ma rịọ mgbaghara ná ndabere nke àjà mgbapụta Kraịst, ha ga-anọ n’ọnọdụ inweta nguzo ezi omume n’ihu Chineke!—Ọrụ 2:38; 10:43; 13:38, 39; Ndị Rom 5:19.

11, 12. (a) Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-esi aghọ ndị ezi omume? (b) Olee otú a ga-esi mejụọ akpịrị na-akpọ ndị enyi nke ndị ahụ e tere mmanụ nkụ maka ezi omume?

11 Jizọs kwuru na ndị dị otú ahụ ga-enwe obi ụtọ ebe ọ bụ na “a ga-eme ka afọ ju ha.” (Matiu 5:6) A gụrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị a kpọrọ iso Kraịst ‘chịa dị ka ndị eze,’ ná “ndị ezi omume maka ndụ.” (Ndị Rom 5:1, 9, 16-18) Jehova kuchiri ha dị ka ụmụ ime mmụọ ya. Ha ghọrọ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe, bụ́ ndị a kpọrọ ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà n’ọchịchị Alaeze eluigwe ya.—Jọn 3:3; 1 Pita 2:9.

12 A gụbeghị ndị enyi nke ndị ahụ e tere mmanụ ná ndị ezi omume maka ndụ. Otú ọ dị, Jehova na-agụ ha ná ndị ezi omume ruo n’ókè ụfọdụ site n’okwukwe ha nwere n’ọbara Kraịst a wụfuru. (Jems 2:22-25; Mkpughe 7:9, 10) A gụrụ ha ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Jehova ruru eru ịbụ ndị a napụtara n’oge “oké mkpagbu ahụ.” (Mkpughe 7:14) A ga-emejụkwu akpịrị na-akpọ ha nkụ maka ezi omume mgbe ha ga-aghọ akụkụ nke ụwa ọhụrụ ahụ nke ‘ezi omume gaje ibi n’ime ya’ n’okpuru “eluigwe ọhụrụ.”—2 Pita 3:13; Abụ Ọma 37:29.

Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-eme Ebere

13, 14. N’ụzọ ndị dị aṅaa dị irè ka anyị kwesịrị isi gosi na anyị bụ ndị na-eme ebere, oleekwa uru ọ ga-abara anyị?

13 N’ịga n’ihu n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, ebe ọ bụ na a ga-emere ha ebere.” (Matiu 5:7) N’ụzọ iwu, a na-aghọta ebere dị ka ihe na-ezo aka n’obiọma nke ọkàikpe ịghara inyezu onye mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ iwu kwadoro. Otú ọ dị, dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, okwu mbụ a sụgharịrị ịbụ “ebere” na-ezo aka karịsịa n’iji obiọma echebara mmadụ echiche ma ọ bụ obi ebere nke na-ewetara ndị e wedara n’ala ahụ́ efe. N’ihi ya, ndị na-eme ebere na-egosipụta ọmịiko. Ilu Jizọs nke onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi na-enye anyị ezi ihe atụ nke onye ‘mesoro onye nọ ná mkpa ihe n’obi ebere.’—Luk 10:29-37.

14 Iji nweta obi ụtọ nke na-abịa site n’ịbụ ndị ebere, ọ dị anyị mkpa ịdị na-egosi ndị nọ ná mkpa obiọma. (Ndị Galeshia 6:10) Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị ọ hụrụ. “O nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Jizọs ghọtara na mkpa kasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ nke ime mmụọ. Anyị onwe anyị pụkwara igosi na anyị bụ ndị nwere ọmịiko na ndị na-eme ebere site n’isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe kasị dịrị ha mkpa—‘ozi ọma nke alaeze’ ahụ. (Matiu 24:14) Anyị pụkwara inyere Ndị Kraịst ibe anyị meworo agadi, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ na ụmụ mgbei, aka ma ‘na-agụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14; Ilu 12:25; Jems 1:27) Ọ bụghị nanị na nke a ga-ewetara anyị obi ụtọ kama ọ ga-emekwa ka anyị nweta ebere Jehova.—Ọrụ 20:35; Jems 2:13.

Ndị Dị Ọcha n’Obi na Ndị Na-eme Udo

15. Olee otú anyị pụrụ isi dị ọcha n’obi, bụrụkwa ndị na-eme udo?

15 Jizọs kwuru okwu obi ụtọ nke isii na nke asaa na-esonụ: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-ahụ Chineke. Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo, ebe ọ bụ na a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’” (Matiu 5:8, 9) Obi dị ọcha abụghị nanị na ọ dị ọcha n’omume kamakwa ọ bụ nke a na-emerụghị emerụ n’ụzọ ime mmụọ na nke dị n’otu ná nrara ya nye Jehova. (1 Ihe E Mere 28:9; Abụ Ọma 86:11) Ndị na-eme udo na ụmụnna ha bụ́ Ndị Kraịst na-ebi n’udo, ọ bụrụhaalakwa na ọ dị ha n’aka, ha na ndị agbata obi ha na-ebikwa n’udo. (Ndị Rom 12:17-21) Ha ‘na-achọ udo, na-achụsokwa ya.’—1 Pita 3:11.

16, 17. (a) N’ihi gịnị ka e ji kpọọ ndị e tere mmanụ “ụmụ Chineke,” oleekwa otú ha si ‘ahụ Chineke’? (b) Olee otú “atụrụ ọzọ” ahụ si ‘ahụ Chineke’? (ch) N’ụzọ dị aṅaa, ọ̀ bụkwa ole mgbe ka “atụrụ ọzọ” ahụ ga-aghọ “ụmụ Chineke” n’ụzọ zuru ezu?

16 E kwere ndị na-eme udo bụ́ ndị dị ọcha n’obi nkwa na a “ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke,’” nakwa na ha “ga-ahụ Chineke.” Jehova kuchiri Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka “ụmụ” ka ha ka nọ n’ụwa. (Ndị Rom 8:14-17) Mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ ịnọnyere Kraịst n’eluigwe, ha ga-eje ozi n’ihu Jehova ma hụ Ya anya n’ezie.—1 Jọn 3:1, 2; Mkpughe 4:9-11.

17 “Atụrụ ọzọ” ahụ bụ́ ndị na-eme udo na-ejere Jehova ozi n’okpuru Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Kraịst Jizọs, onye ghọọrọ ha “Nna mgbe nile ebighị ebi.” (Jọn 10:14, 16; Aịsaịa 9:6) A ga-ekuchi ndị gafere ule ikpeazụ ahụ n’ụzọ gara nke ọma dị ka ụmụ elu ala nke Jehova mgbe Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst gasịrị, ha enweekwa ‘inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke.’ (Ndị Rom 8:21; Mkpughe 20:7, 9) Ka ha nọ na-atụ anya nke a, ha na-akpọ Jehova Nna ha ebe ọ bụ na ha ararawo ndụ ha nye ya, na-ewere ya dị ka Onye Na-enye ha Ndụ. (Aịsaịa 64:8) Dị ka Job na Mozis nke oge ochie, ha pụrụ iji anya nke okwukwe ha ‘hụ Chineke.’ (Job 42:5; Ndị Hibru 11:27) Site ‘n’anya nke obi ha,’ nakwa site n’ezi ihe ọmụma banyere Chineke, ha na-ahụ àgwà ndị dị ebube nke Jehova ma na-agbalị iṅomi ya site n’ime uche ya.—Ndị Efesọs 1:18; Ndị Rom 1:19, 20; 3 Jọn 11.

18. N’ikwekọ n’okwu obi ụtọ asaa ndị ahụ Jizọs kwuru, ole ndị taa na-enweta ezi obi ụtọ?

18 Anyị ahụwo na ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha, ndị na-eru újú, ndị dị nwayọọ n’obi, ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, ndị na-eme ebere, ndị dị ọcha n’obi na ndị na-eme udo na-achọta ezi obi ụtọ n’ijere Jehova ozi. Ma, a na-emegide ndị dị otú ahụ mgbe nile, ọbụna na-akpagbu ha. Nke a ọ̀ na-anapụ ha obi ụtọ ha? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

Ná Ntụleghachi

• Obi ụtọ dị aṅaa ka ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha na-enwe?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si akasi ndị na-eru újú obi?

• Olee otú anyị si egosi ịdị nwayọọ n’obi?

• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji bụrụ ndị na-eme ebere, ndị dị ọcha n’obi na ndị na-eme udo?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha”

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere”

[Foto dị na peeji nke 10]

“Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume”