Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Chọrọ Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?

Ị̀ Chọrọ Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?

Ị̀ Chọrọ Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?

“ANAGHỊ M atụ egwu ọnwụ,” ka otu nwanyị katara ahụ́ bi na Japan kwuru. “Kama ọ na-ewute m na m ga-ahapụ okooko osisi ndị a.” Onye ozi bụ́ Onye Kraịst nke letara ya n’ụlọ ya ghọtara ihe ahụ o kwuru, n’ihi na nwanyị ahụ nwere ogige mara mma. Ọtụtụ ndị na-ekwu na ha anaghị atụ egwu ọnwụ na-enwe nnọọ mmasị n’ịdị ebube nke ihe ndị e kere eke, ọ pụkwara ịdị na-agụ ha agụụ n’ezie ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ànyị sịrị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọtụtụ mmadụ ga-ajụ echiche dị otú ahụ. Ụfọdụ pụrụ ọbụna ikwu na ha enweghị mmasị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi gịnị ka mmadụ pụrụ iji nwee mmetụta dị otú ahụ?

Ndụ Ebighị Ebi—Ọ̀ Ga-abụ Ihe Na-agwụ Ike?

Ụfọdụ na-eche na ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ga-abụ ihe na-agwụ ike. Ha pụrụ izo aka ná ndụ na-agbụ agbụ nke ọtụtụ ndị lara ezumike nká na-ebi bụ́ ndị na-enweghịzi ihe ha na-eme ma ọ́ bụghị ịnọ ọdụ na-ekiri telivishọn. Ọ bụrụ otú ahụ ka ị na-eche, tụlee ihe onye na-enyocha mbara igwe bụ́ Robert Jastrow kwuru mgbe a jụrụ ya ma ndụ ebighị ebi ọ̀ ga-abụ ngọzi ka ọ̀ ga-abụ nkọcha. Jastrow zara, sị: “Ọ ga-abụ ngọzi nye ndị nwere uche na-achọ ịmata ihe na agụụ na-adịghị akwụsị akwụsị maka ịmụta ihe. Echiche nke na ha ga-anọgide na-enweta ihe ọmụma ruo mgbe ebighị ebi ga-abụ nnọọ ihe nkasi obi nye ha. Ma nye ndị ọzọ bụ́ ndị na-eche na ha amụtachaala ihe nile na ndị uche ha mechiri emechi, ọ ga-abụ ọbụbụ ọnụ na-atụ ụjọ. Ọ dịghị ihe ha ga-eji oge ha na-eme.”

Ma ndụ ebighị ebi ọ̀ ga-abụ ihe na-agwụ ike nye gị ma ọ bụ na ọ gaghị abụ dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’àgwà gị. Ọ bụrụ na i nwere “uche na-achọ ịmata ihe na agụụ na-adịghị akwụsị akwụsị maka ịmụta ihe,” cheedị echiche ihe ị pụrụ ịrụzu na nkà nke ise ihe, egwú, ụkpụrụ ụlọ, ịkọ ubi, ma ọ bụ ezi ihe omume ọ bụla ọzọ na-amasị gị. Ndụ ebighị ebi n’ụwa ga-enye gị ohere magburu onwe ya iji zụlite nkà gị n’ihe omume dịgasị iche iche.

Ịhụ ndị ọzọ n’anya ma bụrụ onye ha hụrụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi ga-eme ka ndụ agwụghị agwụ na-eju afọ n’ezie. E kenyere n’ime anyị ikike nke igosipụta ịhụnanya, anyị na-emekwa nke ọma mgbe anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya. Anyị na ndị ọzọ inwerịta ezi ịhụnanya na-eweta ezi afọ ojuju nke na-adịghị ebelata ka oge na-aga. Ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ga-enye mmadụ ohere na-adịghị agwụ agwụ ịzụlite ịhụnanya ọ bụghị nanị maka ụmụ mmadụ ibe ya kama karịsịa maka Chineke. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya,” ka Pọl onyeozi kwuru, “onye a bụ onye Ọ maara.” (1 Ndị Kọrint 8:3) Lee atụmanya magburu onwe ya nke ahụ bụ—ịmara Eze eluigwe na ala na ịbụ onye ọ maara! Ọzọkwa, ihe a ga-amụta banyere Onye Okike anyị na-ahụ n’anya adịghị agwụ agwụ. Oleezi otú ịdị ndụ ebighị ebi pụrụ isi bụrụ ihe na-agwụ ike na nke na-adịghị akwụghachi ụgwọ?

Ndụ—Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Adịte Aka Ma Dị Oké Ọnụ Ahịa?

Ụfọdụ na-eche na ọ bụ ịdị mkpụmkpụ nke ndụ na-eme ka ọ dị nnọọ oké ọnụ ahịa. Ha pụrụ iji ndụ tụnyere ọlaedo, bụ́ nke dị ụkọ. Ọ bụrụ na a pụrụ ịchọta ọlaedo ebe nile, ka ha na-ekwu, ọnụ ahịa ya ga-adalata. Ma, ọlaedo ga-anọgide na-ama mma. N’ezie, otú ahụ ka ndụ dịkwa.

Anyị pụrụ iji ịdị ndụ agwụghị agwụ tụnyere inwe ikuku n’ụba. Ndị ọkwọ ụgbọ nọ n’ụgbọ okpuru mmiri na-adịghị arụ ọrụ nke ọma ga-ele ikuku anya dị ka ihe kasị mkpa. Mgbe a napụtasịrị ha, ị̀ ga-eche na ha ga-eme mkpesa banyere ikuru ikuku bara ụba ọzọ? Ọ dịghị ma ọlị!

Dị ka ndị ọkwọ ụgbọ dị otú ahụ, a pụrụ ịnapụta anyị na ọbụna ime ka anyị nwee atụmanya ka ukwuu nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi. “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ,” ka Pọl onyeozi dere, “ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Site n’àjà mgbapụta Jizọs, Chineke ga-ewepụ ezughị okè mmadụ na ọnwụ ma nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi onyinye nke ndụ ebighị ebi. Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele maka ndokwa ịhụnanya dị otú ahụ!

Gịnị Banyere Ndị Ị Hụrụ n’Anya?

Ụfọdụ pụrụ iche, sị: ‘Gịnị banyere ndị m hụrụ n’anya? Ndụ agwụghị agwụ n’elu ala agaghị abara m nnọọ uru ma ọ bụrụ na ha anọghị ya.’ Ikekwe, i nwetawo ihe ọmụma Bible ma mụta na ọ ga-ekwe omume ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Luk 23:43; Jọn 3:16; 17:3) Dị ka o kwesịrị, ị chọrọ ka ndị òtù ezinụlọ gị, ndị ọzọ ị hụrụ n’anya na ezigbo ndị enyi gị nọrọ ya, na-enwe ụdị ọṅụ ndị ị na-enwe olileanya inweta n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13.

Ma gịnị ma ọ bụrụ na ndị enyi gị na ndị ị hụrụ n’anya adịghị egosi mmasị n’ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na paradaịs elu ala? Ekwela ka nke ahụ kụda gị mmụọ. Nọgide na-enweta ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ ma na-eme ihe kwekọrọ na ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Olee otú i si mara, gị nwunye bụ́ Onye Kraịst, na ị gaghị azọpụta di gị? Ma ọ bụ, olee otú i si mara, gị di bụ́ Onye Kraịst, na ị gaghị azọpụta nwunye gị?” (1 Ndị Kọrint 7:16, Today’s English Version) Ndị mmadụ pụrụ ịgbanwe. Dị ka ihe atụ, otu nwoke guzogidere Iso Ụzọ Kraịst gbanwere ma mesịa ghọọ okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ na-ekwu, sị: “Enwere m nnọọ ekele na ezinụlọ m m hụrụ n’anya jigidesiri ụkpụrụ ha ndị dabeere na Bible ike n’oge nile m kpagburu ha.”

Chineke na-eche nnọọ banyere ndụ gị na nke ndị ị hụrụ n’anya. N’ezie, ‘Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Jehova Chineke chọrọ ka gị na ndị ị hụrụ n’anya dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịhụnanya ya karịrị ịhụnanya nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè. (Aịsaịa 49:15) Ya mere, gịnị ma i soro Chineke nwee ezi mmekọrịta? Mgbe ahụ, ị pụrụ inyere ndị ị hụrụ n’anya aka ime otu ihe ahụ. Ọ bụrụgodị na ha enweghị olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, àgwà ha pụrụ ịgbanwe mgbe ha hụrụ ka ị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma Bible.

Gịnị banyere ndị ị hụrụ n’anya nwụnahụworo gị? Banyere ọtụtụ nde mmadụ ndị nwụrụ anwụ, Bible na-enye olileanya magburu onwe ya nke mbilite n’ọnwụ—iteta n’ụra ọnwụ ma biri na Paradaịs elu ala. Jizọs Kraịst kwere nkwa, sị: ‘Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-apụta.’ (Jọn 5:28, 29) Ọbụna ndị nwụrụ n’amaghị Chineke ga-abịaghachi ná ndụ, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ịnabata ndị dị otú ahụ ná ndụ!

Ndụ Agwụghị Agwụ —Atụmanya Na-enye Ọṅụ

Ọ bụrụ na ị pụrụ ịchọta obi ụtọ na afọ ojuju ugbu a n’agbanyeghị nsogbu nile dị n’ụwa a, ị ga-enwe nnọọ ike ịnụ ụtọ ndụ agwụghị agwụ na paradaịs elu ala. Otú ọ dị, mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova kwuru banyere ngọzi ndị ndụ ebighị ebi ga-eweta, otu nwanyị kwuru, sị: “Achọghị m ịdị ndụ ebighị ebi. Ndụ afọ 70 ma ọ bụ 80 a ezuworo m.” Otu Onye Kraịst bụ́ okenye nọ ebe ahụ jụrụ ya, sị: “Ì chetụwo echiche banyere mmetụta ụmụ gị ga-enwe ma ị nwụọ?” Anya mmiri gbara ya mgbe o chere echiche banyere mwute ha ga-enwe n’ịbụ ndị nne ha nwụnahụrụ. “Na nke mbụ ya, achọpụtara m otú m siworo na-eche banyere nanị onwe m,” ka o kwetara, “apụkwara m ịhụ na ndụ ebighị ebi abụghị olileanya ịchọ ọdịmma onwe onye nanị kama ọ gụnyere ịdị ndụ maka ndị ọzọ.”

Ụfọdụ pụrụ iche na ọ gbasaghị onye ọ bụla ma hà dị ndụ ma hà nwụrụ anwụ. Ma, ọ gbasara Onye Na-enye anyị Ndụ, bụ́ onye na-ekwu, sị: “Mụ onwe m na-adị ndụ, . . . ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ.” (Ezikiel 33:11) Ebe ọ bụ na Chineke na-eche banyere ndụ nke ọbụna ndị ajọ omume, n’ezie, ọ na-eche nnọọ banyere ndị hụrụ ya n’anya.

Eze Devid nke Izrel oge ochie nwere obi ike na Jehova ga-eji ịhụnanya lekọta ya. Devid kwuru n’otu oge, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) O yiri ka Devid ò ji n’aka na ndị mụrụ ya hụrụ ya n’anya. Ma ọ bụrụgodị na ndị mụrụ ya—bụ́ ụmụ mmadụ ya na ha kasị nwee mmekọrịta chiri anya—ahapụ ya, ọ maara na Chineke agaghị ahapụ ya. N’ihi na Jehova hụrụ anyị n’anya ma na-eche banyere anyị, ọ na-ekwe nkwa inye anyị ndụ ebighị ebi na ọbụbụenyi na-adịghị agwụ agwụ nke anyị na ya. (Jems 2:23) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji obi ekele nara onyinye ndị a magburu onwe ha?

[Foto dị na peeji nke 7]

Ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi ga-eme ka ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi bụrụ ihe bara uru