Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa nke Egwu Na-adịghị na Ya Ọ̀ Na-agụ Gị Agụụ?

Ụwa nke Egwu Na-adịghị na Ya Ọ̀ Na-agụ Gị Agụụ?

Ụwa nke Egwu Na-adịghị na Ya Ọ̀ Na-agụ Gị Agụụ?

“Anyị na-ebi ‘n’oge chọrọ ịnọ nnọọ na nche mgbe nile na . . . nke enweghị enyemaka,’ n’ihi ‘ihe ize ndụ a na-amaghị nke ọma . . . nke pụrụ itiwapụ na mberede n’oge ọ bụla n’ụdị ọ bụla.’”

OKWU ndị a e hotara n’afọ gara aga na magazin Newsweek na-egosi mmetụta ọtụtụ ndị bi n’ụwa taa nke jupụtara ná nsogbu na-enwe. Jizọs Kraịst gosiri na mmetụta ndị dị otú ahụ ga-akawanye njọ n’ọdịnihu dị nso. O buru amụma banyere oge nke mba dị iche iche ga-anọ ná nhụjuanya nke na ha agaghị ama ihe ha ga-eme, ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu na atụmanya nke ihe ndị na-abịakwasị ụwa. Otú ọ dị, ọ dịghị anyị mkpa ịtụ egwu ma ọ bụ ịdị ka ndị na-enweghị enyemaka, n’ihi na Jizọs gbakwụnyere, sị: “Mgbe ihe ndị a nile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:25-28.

N’ịkọwa ọnọdụ obibi ndụ nke ndị ya n’ụwa mgbe a napụtasịrị ha, Jehova Chineke kwuru, sị: “Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.” (Aịsaịa 32:18) Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Maịka, Jehova kwuru, sị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.

Lee nnọọ ka nke ahụ si dị iche ná ndụ nke taa! Ọ dịghị ihe ize ndụ a na-amaghị ama ga-eyi ihe a kpọrọ mmadụ egwu. Kama oge chọrọ ịnọ nnọọ na nche mgbe nile na nke enweghị enyemaka, a ga-enwe ọnọdụ udo na nke obi ụtọ na-adịghị agwụ agwụ.