Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebee ka ndị mmụọ ọjọọ ga-anọ n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst?

Bible enyeghị azịza a kapịrị ọnụ nke ajụjụ a. Otú ọ dị, anyị pụrụ iru ná nkwubi okwu ezi uche dị na ya banyere ebe ndị mmụọ ọjọọ ga-anọ n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst.

N’ikwu ihe ga-ewere ọnọdụ ná mmalite na n’ọgwụgwụ nke Narị Afọ Iri a, Jọn onyeozi na-ekwu, sị: “M wee hụ otu mmụọ ozi ka o si n’eluigwe na-agbadata, jiri mkpịsị ugodi nke abis na nnukwu agbụ ígwè n’aka ya. O wee jichie dragọn ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan, ma kee ya agbụ ruo otu puku afọ. Ọ tụbakwara ya n’ime abis ahụ, mechiekwa ya ma kaa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ ruo mgbe puku afọ ahụ ga-agwụsị. Ihe ndị a gasịa, a ghaghị ịtọpụ ya ruo nwa oge.” (Mkpughe 20:1-3) Amaokwu ndị a na-ekwu banyere ịtụba nanị Setan n’abis na imesị tọpụ ya ruo nwa oge. Ọ bụ ezie na a kpọtụghị ndị mmụọ ọjọọ aha, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na mgbe mmụọ ozi ahụ ji ugodi nke abis—Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube—ga-ejichi ma tụba Ekwensu n’abis, ọ ga-emekwa ndị mmụọ ọjọọ otu ihe ahụ.—Mkpughe 9:11.

Mgbe ọ ghọsịrị Eze n’eluigwe na 1914, Jizọs Kraịst mere ihe nwere mmetụta gbara ọkpụrụkpụ n’ebe Setan na ndị mmụọ ọjọọ nọ. Mkpughe 12:7-9 na-ekwu, sị: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya [ndị mmụọ ọjọọ] bukwara agha ma dragọn ahụ emerighị, e nwekwaghị ọnọdụ maka ha n’eluigwe. Otú ahụ ka e si chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ya na ndị mmụọ ozi ya.” Eri oge ahụ, e mewo ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ghara inwe ike isi n’ụwa pụọ. N’ụzọ ezi uche dị na ya, anyị pụrụ ikwu na mgbe Jizọs Kraịst ga-egbochikwu ọrụ Setan iji nwee ike iwepụ mmetụta ọjọọ ya n’ụwa, Ọ ga-emekwa ndị mmụọ ọjọọ otu ihe ahụ.

Tụleekwa amụma mbụ nke Bible. Ọ na-agụ, sị: “Iro ka M [Chineke] ga-etinyekwa n’etiti gị [Setan] na nwanyị ahụ [nzukọ eluigwe nke Jehova], na n’etiti mkpụrụ gị [mkpụrụ Setan] na mkpụrụ ya [Jizọs Kraịst]: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Ichifịa agwọ ahụ n’isi na-agụnye ịtụba Setan n’abis n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Amụma ahụ gara n’ihu ikwu na iro dị n’etiti Onye na-eme nchifịa ahụ na mkpụrụ Setan. Mkpụrụ, ma ọ bụ nzukọ a nwere akụkụ a na-adịghị ahụ anya nke ndị ajọ mmụọ ozi, ma ọ bụ mmụọ ọjọọ mejupụtara. Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na mgbe Jizọs ga-atụba Setan n’abis, ọ ga-ejichikwa ndị mmụọ ọjọọ ma tụba ha n’abis. Eziokwu bụ́ na ndị ajọ mmụọ egosipụtawo egwu ha na-atụ abis na-egosi na ha maara banyere njichi a na-abịanụ.—Luk 8:31.

Otú ọ dị, ọ̀ pụrụ ịbụ na Mkpughe 20:1-3 akpọtụghị ndị mmụọ ọjọọ aha n’ihi na e bibikọtawo ha na akụkụ a na-ahụ anya nke mkpụrụ Setan n’Amagedọn? Bible na-egosi na o yighị ka ọ̀ pụrụ ịbụ ihe kpatara ya. Banyere ihe ikpeazụ a kara aka ga-eme Setan, ọ na-ekwu, sị: “A tụbakwara Ekwensu ahụ nke na-eduhie ha n’ime ọdọ ọkụ na sọlfọ ahụ, bụ́ ebe ma anụ ọhịa ahụ ma onye amụma ụgha ahụ nọrịị; a ga-emekpakwa ha ahụ́ ehihie na abalị ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 20:10) Anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ bụ ndị ọchịchị, ha bụkwa akụkụ a na-ahụ anya nke nzukọ Setan. (Mkpughe 13:1, 2, 11-14; 16:13, 14) A ga-ebibi ha n’Amagedọn, mgbe Alaeze Chineke ga-etipịa ma weta alaeze nile nke ụwa ná njedebe. (Daniel 2:44) Bible na-ezo aka “n’ọkụ ebighị ebi nke a kwadebeere Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.” (Matiu 25:41) A ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’otu “ọdọ ọkụ na sọlfọ ahụ” dị ka a tụbara anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ n’echiche bụ́ na a ga-ebibikwa ha ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na e bibiwo akụkụ ka ike a na-adịghị ahụ anya nke mkpụrụ Setan n’Amagedọn, o doro anya na a ga-akpọworị ndị mmụọ ọjọọ ahụ aha dị ka ndị a tụbakọrọ ha na anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ n’ọdọ ihe atụ ahụ. Aha a na-akpọtụghị ha ná Mkpughe 20:10 na-egosi na e bibighị ndị mmụọ ọjọọ n’Amagedọn.

Ebe a na-ekwughị n’ụzọ doro anya banyere ndị mmụọ ọjọọ ịbụ ndị a tụbara n’ime abis, e kwukwaghị kpọmkwem banyere ha ịbụ ndị a tọpụrụ site na ya. Otú ọ dị, otu ihe ahụ ga-eme Ekwensu ga-emekwa ha. Mgbe a tọhapụsịrị ha na Ekwensu, ha esorokwa ya rụkọọ ọrụ n’oge ule ikpeazụ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ọgwụgwụ nke puku afọ ahụ, a ga-atụbakwa ndị mmụọ ọjọọ n’ọdọ ọkụ ahụ, ha esikwa otú ahụ nweta mbibi ebighị ebi.—Mkpughe 20:7-9.

N’ihi ya, ọ bụ ezie na Mkpughe 20:1-3 na-ekwu banyere nanị Setan ịbụ onye e jichiri ma tụba n’ime abis bụ́ ebe ọ na-agaghị na-arụ ọrụ, anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na a ga-ejichikwa ndị mmụọ ozi ya ma tụba ha n’abis. A gaghị enye ma Setan ma ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya ohere igbochi mmezu nke nzube Chineke nke ịgbanwe ụwa ka ọ ghọọ paradaịs na iweghachi ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst.