Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chọọnụ Jehova, Onye Na-enyocha Obi

Chọọnụ Jehova, Onye Na-enyocha Obi

Chọọnụ Jehova, Onye Na-enyocha Obi

“Chọọnụ m, wee dị ndụ.”—EMỌS 5:4.

1, 2. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu mgbe ọ sịrị na Jehova “na-ele obi”?

JEHOVA CHINEKE gwara Samuel onye amụma, sị: “Mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) Olee otú Jehova si ‘ele obi’?

2 N’Akwụkwọ Nsọ, a na-eji obi eme ihe n’ụzọ ihe atụ dị ka ihe na-anọchi anya ihe mmadụ bụ n’ime—ọchịchọ ya, echiche ya, mmetụta uche ya, na ịhụnanya ya. Ya mere mgbe Bible na-ekwu na Chineke na-ele obi, ọ pụtara na ọ na-ahụ ihe karịrị ọdịdị elu ahụ́ ma na-elekwasị anya n’ihe mmadụ bụ n’ezie.

Chineke Enyochaa Izrel

3, 4. Dị ka Emọs 6:4-6 si kwuo, olee ọnọdụ ndị e nwere n’alaeze ebo iri nke Izrel?

3 Mgbe Onye Na-enyocha obi lere alaeze ebo iri nke Izrel anya n’oge Emọs, gịnị ka Ọ hụrụ? Emọs 6:4-6 na-ekwu banyere ndị “na-edina n’elu ihe ndina ọdụ́, na-esetịkwa onwe ha n’elu ebe ndina ha.” Ha “na-erikwa ụmụ atụrụ ọma sitere n’ìgwè ewu na atụrụ, na ụmụ ehi site n’etiti ụlọ ebe a na-eme ka anụ maa abụba.” Ndị dị otú ahụ ‘azụtaworo onwe ha ụbọ abụ dị iche iche,’ ha ‘na-aṅụkwa mmanya vaịn n’ọkwa mwụsa.’

4 E lee ya anya elu elu, ọ pụrụ iyi ka ihe ọ̀ dịịrị ha ná mma. N’ịbụ ndị ahụ́ ruru ala n’ụlọ ha e doziri nke ọma, ndị ọgaranya nọ na-eri nri ma na-aṅụ mmanya kasị mma, na-ejikwa ngwá egwu ndị kasị mma na-atụrụ ndụ. Ha nwekwara “ihe ndina ọdụ́.” Ndị ọkà mmụta ihe ochie achọtawo imerime ọdụ́ ndị a tụrụ nke ọma na Sameria, bụ́ isi obodo nke alaeze Izrel. (1 Ndị Eze 10:22) O yikarịrị ka è ji ọtụtụ n’ime ha rụọ oche, jirikwa ha chọọ ahụ́ ụlọ mma.

5. N’ihi gịnị ka obi ji ghara ịdị Chineke mma n’ebe ndị Izrel nke oge Emọs nọ?

5 Ọ̀ bụ na obi adịghị Jehova Chineke mma na ndị Izrel na-ebi ndụ ntụsara ahụ́, na-eri nri ndị dị ụtọ, na-aṅụ mmanya ndị dị ụtọ, na-egekwa egwu ndị dị ụtọ? Ọ dịghị ma ọlị! E kwuwerị, ọ na-enye ihe ndị dị otú ahụ n’ụba ka ụmụ mmadụ wee na-enwe ọṅụ. (1 Timoti 6:17) Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ nke ndị ahụ, ajọ ọnọdụ obi ha, àgwà asọpụrụghị Chineke, na enweghị ịhụnanya maka ndị Izrel ibe ha bụ ihe wutere Jehova.

6. Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ nke Izrel n’oge Emọs?

6 Ndị ‘na-esetị onwe ha n’elu ebe ndina ha, na-eri ụmụ atụrụ ọma sitere n’ìgwè ewu na atụrụ, na-aṅụ mmanya vaịn ma na-azụtara onwe ha ụbọ abụ dị iche iche’ na-aga inweta ihe ijuanya. A gwara ndị ahụ, sị: “Unu ndị na-achụpụ ụbọchị ọjọọ.” Ọnọdụ dị n’Izrel kwesịrị ịdị na-ewute ha, ma ha “arịaghị ọrịa n’ihi mkpaji a kpajiri Josef.” (Emọs 6:3-6) N’ile anya gabiga ihe ịga nke ọma mba ahụ nwere n’ọnọdụ akụ̀ na ụba, Chineke hụrụ na Josef—ma ọ̀ bụ Izrel—nọ n’ajọ ọnọdụ ime mmụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmadụ nọ na-eme ihe ndị dịịrị ha n’enweghị nchegbu ọ bụla. Ọtụtụ ndị taa na-egosipụta àgwà yiri nke ahụ. Ha pụrụ ikweta na anyị na-ebi n’oge ndị siri ike, ma ọ bụrụhaala na ọ dịghị emetụta ha onwe ha, ọnọdụ nke ndị ọzọ adịghị emetụ ha n’obi, ha adịghịkwa egosi mmasị ọ bụla n’ihe ime mmụọ.

Izrel—Mba Nọ n’Ọnọdụ Dị Njọ

7. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị Izrel egeghị ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke?

7 Akwụkwọ Emọs na-akọwa mba nke nọ n’ọnọdụ dị njọ n’agbanyeghị na o nwere ihe ịga nke ọma. N’ihi na ha egeghị ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke ma gbazie echiche ha, Jehova ga-agbahapụ ha n’aka ndị iro ha. Ndị Asiria ga-adọkpụpụ ha n’ihe ndina ọdụ́ ha mara mma, dọrọkwa ha n’agha. Ha agaghịzi na-ebi ndụ ntụsara ahụ́!

8. Olee otú Izrel si baa n’ajọ ọnọdụ ime mmụọ?

8 Olee otú ndị Izrel si baa n’ọnọdụ dị otú ahụ? Ọnọdụ a malitere ibilite na 997 T.O.A., mgbe nwa Eze Solomọn bụ́ Rehoboam nọchisịrị ya, ebo iri nke Izrel ekewapụkwa onwe ha site n’ebo Juda na Benjamin. Eze mbụ nke alaeze ebo iri nke Izrel bụ Jeroboam nke Mbụ, “nwa Nebat.” (1 Ndị Eze 11:26) Jeroboam mere ka ndị ọ na-achị kweta na ịga Jeruselem iji fee Jehova ofufe ga-esiri ha ike. Otú ọ dị, o bughị ọdịmma nke ndị ahụ n’obi n’ezie. Kama nke ahụ, ọ na-achọ ọdịmma nke ya. (1 Ndị Eze 12:26) Jeroboam nọ na-atụ ụjọ na ọ bụrụ na ndị Izrel anọgide na-eje n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem maka ememe ndị a na-eme kwa afọ iji sọpụrụ Jehova, ha ga-emesị malite iguzosi ike n’ihe nye alaeze Juda. N’ịchọ igbochi nke a, Jeroboam guzobere nwa ehi abụọ e ji ọlaedo kpụọ, otu na Dan nke ọzọ na Betel. N’ụzọ dị otú ahụ, ofufe nke nwa ehi bịara ghọọ okpukpe mba n’alaeze Izrel.—2 Ihe E Mere 11:13-15.

9, 10. (a) Ememe okpukpe ndị dị aṅaa ka Eze Jeroboam nke Mbụ haziri? (b) Olee otú Chineke si lee ememe ndị e mere n’Izrel n’oge Eze Jeroboam nke Abụọ anya?

9 Jeroboam gbalịrị ime ka okpukpe ọhụrụ ahụ ghọọ ihe a nakweere. Ọ haziri ememe ndị yitụrụ ndị ahụ a na-eme na Jeruselem. Ná 1 Ndị Eze 12:32, anyị na-agụ, sị: “Jeroboam wee mee ememe n’ọnwa nke asatọ, n’ụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, dị ka ememe nke dị na Juda, o wee rịgoruo ebe ịchụàjà ahụ; otú a ka o mere na Betel.”

10 Jehova akwadotụghị ememe okpukpe ụgha ndị ahụ. O si nnọọ n’ọnụ Emọs mee ka nke ahụ doo anya ihe karịrị otu narị afọ ka e mesịrị n’oge ọchịchị Jeroboam nke Abụọ, bụ́ onye ghọrọ eze nke alaeze ebo iri nke Izrel n’ihe dị ka 844 T.O.A. (Emọs 1:1) Dị ka Emọs 5:21-24 si kwuo, Chineke kwuru, sị: “Akpọwo m ememe nile unu asị, jụ ha, M gaghị anụkwa ísì ụtọ n’ụbọchị mgbochi nile unu. N’ihi na ọ bụrụ na unu esureere m àjà nsure ọkụ nile na onyinye ịnata ihu ọma nile unu, ha agaghị atọ m ụtọ: ọ bụkwa àjà udo nke anụ mara abụba nile unu ka M na-agaghị elegide. Wezuga n’ahụ́ m ụ̀zụ̀ abụ gị nile; ọ bụkwa ọkpụkpọ une gị nile ka M na-agaghị anụ. Ma ka ikpe ziri ezi na-erudasi ike dị ka mmiri, ezi omume kwa dị ka mmiri iyi nke na-eru mgbe dum.”

Ihe Ndị Ha na Ya Yiri n’Oge A

11, 12. Myirịta dị aṅaa dị n’etiti ofufe Izrel oge ochie na nke a na-ahụ na Krisendọm?

11 N’ụzọ doro anya, Jehova nyochara obi nke ndị ahụ na-eme ememe ndị Izrel ma jụ ememe ha na àjà nsure ọkụ ha. N’ụzọ yiri nke ahụ taa, Chineke na-ajụ ememe ikpere arụsị nke Krisendọm, ndị dị ka Krismas na Ista. Nye ndị na-efe Jehova, njikọ ọ bụla apụghị ịdị n’etiti ezi omume na mmebi iwu, ọ dịghị mkpakọrịta dị n’etiti ìhè na ọchịchịrị.—2 Ndị Kọrint 6:14-16.

12 E nwere ebe ndị ọzọ ofufe ndị Izrel fere chi nwa ehi na ofufe a na-ahụ na Krisendọm si yie ibe ha. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst kweere n’ịbụ eziokwu nke Okwu Chineke, ọ bụghị ezi ịhụnanya Krisendọm nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali ya ife ofufe. A sị na ọ bụ ya, ọ gaara anọgide na-efe Jehova ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu,” n’ihi na ọ bụ ụdị ofufe na-atọ Ya ụtọ. (Jọn 4:24) Ọzọkwa, Krisendọm adịghị ekwe “ka ikpe ziri ezi na-erudasi ike dị ka mmiri, ezi omume kwa dị ka mmiri iyi nke na-eru mgbe dum.” Kama nke ahụ, ọ nọgidere na-ewetulata ụkpụrụ omume Chineke. Ọ na-anabata ịkwa iko na mmehie ndị ọzọ jọgburu onwe ha, o rukwara n’ókè nke ịkwado nwoke ịlụ nwoke ibe ya na nwanyị ịlụ nwanyị ibe ya!

“Hụnụ Ezi Ihe n’Anya”

13. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịdị na-eme ihe dị n’Emọs 5:15?

13 Jehova na-agwa ndị nile ọ na-agụsi agụụ ike ife ya ofufe n’ụzọ ọ na-anara nke ọma, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụnụ ezi ihe n’anya.” (Emọs 5:15) Ịhụnanya na ịkpọasị bụ mmetụta ndị siri ike na-esite n’obi ihe atụ. Ebe ọ bụ na obi dị aghụghọ, anyị aghaghị ime ike anyị nile iji chebe ya. (Ilu 4:23; Jeremaịa 17:9) Ọ bụrụ na anyị eburu ọchịchọ ndị na-ezighị ezi n’obi, anyị pụrụ ịhụta onwe anyị dị ka ndị na-ahụ ihe ọjọọ n’anya ma na-akpọ ezi ihe asị. Ọ bụrụkwa na anyị ana-emejụ ọchịchọ ndị ahụ site n’ime mmehie, anyị igosipụta ịnụ ọkụ n’obi nile dị n’ụwa a agaghị eme ka anyị nwetaghachi ihu ọma Chineke. N’ihi ya, ka anyị na-ekpe ekpere maka enyemaka Chineke iji ‘na-akpọ ihe ọjọọ asị ma na-ahụ ezi ihe n’anya.’

14, 15. (a) N’Izrel, olee ndị so ná ndị na-eme ezi ihe, ma olee otú e si mesoo ụfọdụ n’ime ha? (b) Olee otú anyị pụrụ isi na-agba ndị nọ n’ozi oge nile ume taa?

14 Ọ bụghị ndị Izrel nile na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova. Dị ka ihe atụ, Hosea na Emọs ‘hụrụ ezi ihe n’anya’ ma jiri ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi dị ka ndị amụma. Ndị ọzọ kwere nkwa ibi ndụ dị ka ndị Naziraịt. N’ogologo oge nile ha biri ndụ dị ka ndị Naziraịt, ha zeere iji ihe ndị si na vaịn pụta eme ihe, karịsịa mmanya vaịn. (Ọnụ Ọgụgụ 6:1-4) Olee otú ndị Izrel ndị ọzọ si lee ụzọ ndụ ịchụ onwe onye n’àjà nke ndị dị otú ahụ na-eme ezi ihe anya? Azịza na-awụ akpata oyi n’ahụ́ nke ajụjụ ahụ na-ekpughe ọ̀tụ̀tụ̀ nretọ ime mmụọ nke mba ahụ. Emọs 2:12 na-ekwu, sị: “Unu wee mee ka ndị Naziraịt ṅụọ mmanya vaịn; ọ bụkwa ndị amụma ka unu nyere iwu, sị, Unu ebula amụma.”

15 Ịhụ ihe nlereanya nke ndị Naziraịt na ndị amụma ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi kwesịrị imewo ka ihere mee ndị Izrel ahụ ma kpalie ha ịgbanwe ụzọ ha. Kama nke ahụ, ha ji enweghị ịhụnanya gbalịa ịkụda mmụọ nke ndị na-eguzosi ike n’ihe ka ha wee ghara inye Chineke otuto. Ka anyị ghara ịnwa anwa gbaa Ndị Kraịst ibe anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ Betel ume ịkwụsị ozi oge nile ha nanị iji laghachi n’ụzọ ndụ nke a sịrị na ọ dị otú o kwesịrị. Kama nke ahụ, ka anyị na-agba ha ume ịnọgide n’ezi ọrụ ha!

16. N’ihi gịnị ka ndị Izrel ji nọrọ n’ọnọdụ ka mma n’oge Mozis karịa n’oge Emọs?

16 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị Izrel nọ na-ebi ndụ na-enye afọ ojuju n’ụzọ ihe onwunwe n’oge Emọs, ha abụghị “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Luk 12:13-21) Ndị nna nna ha riri nanị mana n’ọzara ruo afọ 40. Ha erighị oké ehi a zụrụ n’ụlọ anụ ma ọ bụ dinaa dị ka ndị umengwụ n’ihe ndina e ji ọdụ́ mee. Otú ọ dị, Mozis gwara ha n’ụzọ ziri ezi, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, agọziwo gị n’omume aka gị nile: . . . [iri afọ anọ] ndị a ka Jehova, bụ́ Chineke gị, nọnyeere gị; ọ dịghị ihe kọrọ gị.” (Deuterọnọmi 2:7) Ee, ndị Izrel nwetara ihe ndị na-akpa ha n’ezie n’oge nile ha nọrọ n’ịkpa. Nke kasịnụ, ha nwetara ịhụnanya, nchebe na ngọzi Chineke!

17. N’ihi gịnị ka Jehova ji duba ndị Izrel oge mbụ n’Ala Nkwa ahụ?

17 Jehova chetaara ndị ha na Emọs dịkọrọ ndụ na Ọ kpọbatara ndị nna nna ha n’Ala Nkwa ahụ ma nyere ha aka ikpochapụ ndị iro ha nile. (Emọs 2:9, 10) Ma n’ihi gịnị ka Chineke ji si n’ala Ijipt dupụta ndị Izrel oge mbụ ahụ ma duba ha n’Ala Nkwa ahụ? Ọ̀ bụ ka ha wee nwee ike ibi ndụ okomoko ma jụ Onye Okike ha? Ee e! Kama, o mere otú ahụ ka ha wee nwee ike ife ya ofufe dị ka ndị nweere onwe ha na ndị dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ. Ma ndị bi n’alaeze ebo iri nke Izrel akpọghị ihe ọjọọ asị ma hụ ezi ihe n’anya. Kama nke ahụ, ha nọ na-enye ihe oyiyi otuto, ọ bụghị Jehova Chineke. Lee ihe ihere ọ bụ!

Jehova Ejiri Ajọ Omume Ha Leta Ha

18. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka anyị nwere onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ?

18 Chineke agaghị eleghara omume ọjọọ nke ụmụ Izrel anya. O mere ka ebe ọ kwụ doo nnọọ anya mgbe o kwuru, sị: “M ga-eji ajọ omume nile unu leta unu.” (Emọs 3:2) Okwu ndị a kwesịrị ime ka anyị tụgharịa uche ná nnapụta a napụtara anyị site n’ịbụ ohu Ijipt nke oge a, ajọ usoro ihe dị ugbu a. Jehova emeghị ka anyị nwere onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ ka anyị wee nwee ike ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke onwe anyị. Kama nke ahụ, o mewo otú ahụ ka anyị wee nwee ike inye ya otuto sitere n’obi dị ka ndị nweere onwe ha bụ́ ndị na-efe ofufe dị ọcha. Anyị nile kwa ga-aza ajụjụ banyere ụzọ anyị si eji nnwere onwe Chineke nyere anyị eme ihe.—Ndị Rom 14:12.

19. Dị ka Emọs 4:4, 5 si kwuo, gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị Izrel malitere ịhụ n’anya?

19 N’ụzọ dị mwute, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’Izrel egeghị ntị n’ozi ahụ siri ike Emọs ziri. Onye amụma ahụ na-ekpughe ọnọdụ ime mmụọ ha retọrọ eretọ n’okwu ndị a e dekọrọ n’Emọs 4:4, 5: “Bịanụ na Betel, jehie; bịanụ na Gilgal, mee ka njehie baa ụba; . . . n’ihi na ihe dị otú a ka unu hụworo n’anya, ụmụ Izrel.” Ndị Izrel azụlitebeghị ọchịchọ ziri ezi. Ha echekwabeghị obi ha. N’ihi ya, ihe ka ọtụtụ n’ime ha amalitewo ịhụ ihe ọjọọ n’anya na ịkpọ ezi ihe asị. Ndị ahụ kpọrọ ekwo nkụ n’ofufe nke nwa ehi agbanweghị. Ha ga-aza Jehova ajụjụ, ha ga-anwụkwa ná mmehie ha!

20. Olee otú mmadụ pụrụ isi gbasoo ụzọ ndụ kwekọrọ n’Emọs 5:4?

20 Ọ gaghị adịworo onye ọ bụla bi n’Izrel n’oge ahụ mfe ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova. Ọ dịghị mfe ịjụ ime ihe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eme, dị ka Ndị Kraịst taa, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, maara nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, ịhụnanya ụfọdụ ndị Izrel nwere n’ebe Chineke nọ na ọchịchọ nke ime ihe na-atọ ya ụtọ kpaliri ha ife ezi ofufe. Jehova kpọrọ ha òkù ahụ e dekọrọ n’Emọs 5:4: “Chọọnụ m, wee dị ndụ.” Taa, n’ụzọ yiri nke ahụ, Chineke na-emere ndị chegharịrịnụ ma chọọ ya site n’ịnara ezi ihe ọmụma nke Okwu ya ma na-eme uche ya ebere. Ọ dịghị mfe ịgbaso ụzọ ndụ a, ma ime otú ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

Ọganihu n’Agbanyeghị Ụnwụ Ime Mmụọ

21. Ụnwụ dị aṅaa na-adakwasị ndị na-adịghị efe ezi ofufe?

21 Gịnị na-echere ndị ahụ na-akwadoghị ezi ofufe? Ọ bụ ụdị ụnwụ kasị njọ—ụnwụ ime mmụọ! “Ụbọchị na-abịa,” ka Eze Onyenwe anyị Jehova kwuru, “mgbe M ga-ezite oké ụnwụ n’ala, ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) Krisendọm nọ n’oké ụnwụ ime mmụọ dị otú ahụ. Ma ndị obi ha ziri ezi n’etiti ya pụrụ ịhụ ọganihu ime mmụọ nke ndị Chineke, ha na-enubakwa ná nzukọ Jehova. A kọwara ọdịiche dị n’etiti ọnọdụ nke Krisendọm na nke ezi Ndị Kraịst n’ụzọ dabara adaba n’okwu Jehova: “Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu: lee ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma akpịrị ga-akpọ unu onwe unu nkụ: lee, ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ, ma ihere ga-eme unu onwe unu.”—Aịsaịa 65:13.

22. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ?

22 Dị ka ndị ohu Jehova, ànyị na-eji ndokwa na ngọzi ime mmụọ ndị anyị nwere akpọrọ ihe? Mgbe anyị na-amụ Bible na mbipụta Ndị Kraịst ma na-aga nzukọ ọgbakọ, mgbakọ ukwu na nke nta anyị, ọ na-adị anyị nnọọ ka anyị tiwe mkpu ọṅụ n’ihi obi ịdị mma. Anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi nghọta doro anya anyị nwere banyere Okwu Chineke, tinyere amụma Emọs nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke.

23. Gịnị ka ndị na-enye Chineke otuto na-anụ ụtọ ya?

23 Nye mmadụ nile bụ́ ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-achọ inye ya otuto, amụma Emọs nwere ozi olileanya. N’agbanyeghị ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị nọ na ya ugbu a ma ọ bụ ule anyị na-aghaghị iche ihu n’ụwa a nọ ná nsogbu, anyị bụ́ ndị hụrụ Chineke n’anya na-anụ ụtọ ngọzi Chineke na nri ime mmụọ ndị kasị mma. (Ilu 10:22; Matiu 24:45-47) Mgbe ahụ, otuto nile na-agara Chineke, bụ́ onye na-enye anyị ihe nile n’ụba maka abamuru anyị. Ya mere, ka anyị kpebisie ike inye ya otuto sitere n’obi anyị ruo mgbe ebighị ebi. Nke ahụ ga-abụ ihe ùgwù na-enye ọṅụ anyị ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị achọọ Jehova, bụ́ Onye Na-enyocha obi.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ọnọdụ ndị dị n’Izrel n’oge Emọs?

• Myirịta ndị dị aṅaa dị n’etiti ọnọdụ e nwere n’alaeze ebo iri nke Izrel na n’oge anyị?

• Ụnwụ dị aṅaa e buru n’amụma ka e nwere ugbu a, ma ole ndị ka ọ na-adịghị emetụta?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ọtụtụ ndị Izrel biri ndụ okomoko ma ha enweghị ọganihu ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Na-agba ndị ozi oge nile ume ịnọgide n’ezi ọrụ ha

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ụnwụ ime mmụọ adịghị n’etiti ndị Jehova nwere obi ụtọ