Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikpe Jehova Ga-abịakwasị Ndị Ajọ Omume

Ikpe Jehova Ga-abịakwasị Ndị Ajọ Omume

Ikpe Jehova Ga-abịakwasị Ndị Ajọ Omume

“Jikere izute Chineke gị.”—EMỌS 4:12.

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Chineke ga-eme ka ajọ omume kwụsị?

Ọ̀ DỊ mgbe Jehova ga-eme ka ajọ omume na nhụjuanya kwụsị n’ụwa a? Ná mmalite narị afọ nke 21, ajụjụ ahụ kwesịrị nnọọ ekwesị karịa mgbe ọ bụla ọzọ. O yiri ka ebe ọ bụla anyị lere anya, ànyị na-ahụ ihe àmà nke mmeso ọjọọ ụmụ mmadụ na-emeso ibe ha. Lee ka anyị si atụ anya ụwa nke ime ihe ike, iyi ọha egwu, na arụrụala na-adịghị na ya!

2 Ihe ọma merenụ bụ na anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na Jehova ga-eme ka ajọ omume kwụsị. Àgwà Chineke na-eme ka anyị jide n’aka na ọ ga-eme ihe megide ndị ajọ omume. Jehova bụ onye ezi omume na onye na-ekpe ikpe ziri ezi. N’Abụ Ọma 33:5, Okwu ya na-agwa anyị, sị: “Ọ na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya.” Abụ ọma ọzọ na-ekwu, sị: “Onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi [Jehova] na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) N’ezie, Jehova, bụ́ Chineke nke kachasị ike bụ́ nke na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya, agaghị anabata ihe ọ kpọrọ asị ruo mgbe ebighị ebi.

3. Gịnị ka a ga-emesi ike site n’ịtụlekwu amụma Emọs?

3 Tụlee ihe ọzọ mere anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova ga-ewepụ ajọ omume. Ihe ndekọ nke ihe ndị o mere n’oge ndị gara aga na-emesi anyị obi ike na ọ ga-eme ya. A na-achọta ihe atụ ndị dị ịrịba ama nke otú Jehova si mesoo ndị ajọ omume ihe n’akwụkwọ Bible bụ́ Emọs. Ịtụlekwu amụma Emọs ga-emesi ihe atọ banyere ikpe Chineke ike. Nke mbụ, ọ na-ekwesị ekwesị mgbe nile. Nke abụọ, a pụghị ịgbanahụ ya n’ọsọ. Nke atọ kwa, ọ bụ nanị ndị dara iwu ka a na-ekpe ya n’ihi na Jehova na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ ikpe ma na-emere ndị chegharịrịnụ na ndị nwere ezi ọchịchọ obi ebere.—Ndị Rom 9:17-26.

Ikpe Chineke Na-ekwesị Ekwesị Mgbe Nile

4. Ebee ka Jehova zigara Emọs, n’ihi nzube dịkwa aṅaa?

4 N’oge Emọs, e kewaworị mba Izrel ịghọ alaeze abụọ. Otu bụ alaeze ebo abụọ nke Juda nke dị n’ebe ndịda. Nke ọzọ bụ alaeze ebo iri nke Izrel nke dị n’ebe ugwu. Jehova nyere Emọs ọrụ ije ozi dị ka onye amụma, si n’obodo ya dị na Juda ziga ya n’Izrel. N’ebe ahụ, Chineke ga-eji Emọs mee ihe ịkpọsa ikpe ya.

5. Mba ndị dị aṅaa ka Emọs bu ụzọ buo amụma megide, oleekwa otu ihe mere ha ji kwesị inweta ikpe ọmụma Chineke?

5 Emọs amaliteghị ọrụ ya site n’ikwupụta ihe Jehova kpere n’ikpe megide alaeze ebe ugwu nke Izrel na-enupụ isi. Kama nke ahụ, ọ malitere site n’ịkpọsa ikpe Chineke mara mba isii dịdebere Izrel. Mba ndị a bụ Siria, Filistia, Taịa, Idọm, Amọn, na Moab. Ma hà kwesịrị inweta ikpe ọmụma Chineke n’ezie? Eenụ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ha bụ ajọ ndị iro nke ndị Jehova.

6. N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji mee ka ọdachi dakwasị Siria, Filistia, na Taịa?

6 Dị ka ihe atụ, Jehova mara ndị Siria ikpe ‘n’ihi na ha zọchara Gilied.’ (Emọs 1:3) Ndị Siria naara Gilied—ógbè Izrel dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan—ókèala ya ma mekpaa ndị Chineke nọ n’ebe ahụ ahụ́ n’ụzọ dị ukwuu. Gịnị banyere Filistia na Taịa? Ikpe mara ndị Filistia n’ihi ịdọrọ ndị Izrel n’agha, ma ọ bụ ijichi ha, na iresị ha ndị Idọm, ụfọdụ ndị Izrel bakwara n’aka ndị Taịa na-azụ ahịa ohu. (Emọs 1:6, 9) Chegodị echiche banyere nke ahụ—ire ndị Chineke ịghọ ndị ohu! Ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova ga-eme ka ọdachi dakwasị Siria, Filistia, na Taịa.

7. Olee ihe jikọrọ Idọm, Amọn, na Moab na ndị Izrel, ma olee otú ha si mesoo ndị Izrel ihe?

7 Idọm, Amọn, na Moab nwere ihe jikọtara ha na Izrel, o nwekwara ihe jikọtara ha onwe ha. Mba atọ ahụ bụcha ụmụnne ụmụ Izrel. Ndị Idọm sitere n’eriri Ebreham site n’ejima Jekọb, bụ́ Ịsọ. Ya mere, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha bụ ụmụnne Izrel. Ndị Amọn na ndị Moab sitere n’eriri Lọt, bụ́ nwa nwanne Ebreham. Ma Idọm, Amọn, na Moab hà mesoro ndị ikwu ha bụ́ ndị Izrel omume dị ka ụmụnne ha? Ọ dịghị ma ọlị! Idọm jiri mma agha megide “nwanne ya” n’enweghị obi ebere, ndị Amọn jikwa obi ọjọọ mesoo ndị Izrel ha ji eji ihe. (Emọs 1:11, 13) Ọ bụ ezie na Emọs ekwughị kpọmkwem mmeso ọjọọ Moab mesoro ndị Chineke, ọ dịla anya ndị Moab megidewere Izrel. Ntaramahụhụ a ga-enye mba atọ a bụ́ ndị ikwu ga-akpụ ọkụ n’ọnụ. Jehova ga-ebibi ha n’ụzọ dị egwu.

A Pụghị Ịgbanahụ Ikpe Chineke n’Ọsọ

8. N’ihi gịnị ka mba isii ndị ahụ dịdebere Izrel na-apụghị iji gbanahụ ikpe Chineke?

8 N’ụzọ doro anya, mba isii ahụ e kwuru okwu ha ná mmalite nke amụma Emọs aghaghị inweta ikpe ọmụma Chineke. Ọzọkwa, ọ dịghị ụzọ ọ bụla ha pụrụ isi gbanahụ ya. Malite n’isi 1, amaokwu 3, ruo n’isi 2, amaokwu 1, Jehova kwuru ugboro isii, sị: “M [gaghị] eme ka ahụhụ ya laghachi azụ.” Dị ka okwu ya si dị, ọ laghachighị azụ n’ịma mba ndị ahụ ikpe. Akụkọ ihe mere eme e dekọrọ edekọ na-egosi na ọdachi mesịrị dakwasị nke ọ bụla n’ime ha. Leenụ, ọ dịkarịa ala, anọ n’ime ha—Filistia, Moab, Amọn, na Idọm—mesịrị pụọ n’anya!

9. Gịnị ka e kwesịrị ime ndị bi na Juda, n’ihi gịnịkwa?

9 Amụma Emọs lekwasịziri anya ná mba nke asaa—obodo ya bụ́ Juda. Ọ pụrụ ijuwo ndị na-ege ya ntị bụ́ ndị bi n’alaeze ebe ugwu nke Izrel anya ịnụ ka Emọs na-agwa alaeze Juda okwu amamikpe. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka a maa ndị bi na Juda ikpe? ‘N’ihi na ha jụrụ iwu Jehova,’ ka Emọs 2:4 na-ekwu. Jehova elegharaghị ịma ụma emebi Iwu ya n’ụzọ dị otú a anya. Dị ka Emọs 2:5 si kwuo, o buru amụma, sị: “M ga-ezite ọkụ na Juda, ọ ga-eripịakwa ụlọ elu nile nke Jeruselem.”

10. N’ihi gịnị ka Juda na-apụghị iji gbanahụ ntaramahụhụ?

10 Ndị Juda na-ekwesịghị ntụkwasị obi apụghị ịgbanahụ ahụhụ ahụ na-abịanụ. Jehova na-ekwu na nke ugboro asaa, sị: “M [gaghị] eme ka ahụhụ ya laghachi azụ.” (Emọs 2:4) Juda nwetara ntaramahụhụ ahụ e buru n’amụma mgbe ndị Babilọn bibiri ya na 607 T.O.A. Anyị ahụwokwa ọzọ na ndị ajọ omume apụghị ịgbanahụ ikpe Chineke n’ọsọ.

11-13. Mba dị aṅaa ka Emọs buru amụma megide n’ụzọ bụ́ isi, ụdị mmegbu ndị dịkwa aṅaa dị ná mba ahụ?

11 Emọs onye amụma ka kwupụtara nnọọ ikpe Jehova mara mba asaa. Otú ọ dị, onye ọ bụla chere na o buchawo amụma ya hiere ụzọ. Emọs ebuchabeghị amụma ya! E nyewo ya ọrụ bụ́ isi nke ịkpọsa ozi ikpe siri nnọọ ike megide alaeze ebo iri nke Izrel bụ́ nke dị n’ebe ugwu. Izrel kwesịkwara inweta ikpe ọmụma Chineke n’ihi na otú omume na okpukpe nke mba ahụ si jọgbuo onwe ya abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

12 Ibu amụma Emọs gbara mmegbu nke jupụtara ebe nile n’alaeze Izrel n’anwụ. Banyere nke a, Emọs 2:6, 7 na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova sịrị: N’ihi njehie atọ nke Izrel, ee, n’ihi anọ, ka M na-agaghị eme ka ahụhụ ya laghachi azụ; n’ihi na ha reworo onye ezi omume n’ọlaọcha, reekwa ogbenye n’ihi akpụkpọ ụkwụ abụọ: ha bụ ndị [“ọ na-agụsi agụụ ike ka ájá ala dị,” NW] n’isi ndị na-enweghị ike, ọ bụkwa ụzọ ndị dị umeala n’obi ka ha na-ewezụga.”

13 A nọ na-ere ndị ezi omume “n’ọlaọcha,” ikekwe ihe ọ pụtara bụ na ndị ikpe bụ́ ndị na-anara ọlaọcha dị ka aka azụ nọ na-ama ndị aka ha dị ọcha ikpe. Ndị e ji ụgwọ na-erenye ndị ogbenye n’ịbụ ohu n’ọnụ ego e ji azụ “akpụkpọ ụkwụ abụọ,” ikekwe, n’ihi obere ụgwọ ha ji. ‘Ọ na-agụsi ndị obi tara mmiri agụụ ike’ ma ọ bụ ha na-achọsi ike, iweda “ndị na-enweghị ike” ala ruo n’ókè nke na ndị ogbenye a ga-ekpokwasị ájá n’isi ha onwe ha dị ka ihe na-egosi nhụjuanya, iru újú, ma ọ bụ mweda n’ala. Nrụrụ aka jupụtara nnọọ ebe nile nke na “ndị dị umeala n’obi” apụghị inwe olileanya inweta ikpe ziri ezi ọ bụla.

14. Olee ndị a nọ na-emegbu n’alaeze ebo iri nke Izrel?

14 Rịba ama ndị a nọ na-emegbu. Ha bụ ndị ezi omume, ndị ogbenye, ndị na-enweghị ike, na ndị dị umeala n’obi bi n’ala ahụ. Ọgbụgba ndụ Iwu nke Jehova na Izrel gbara kwuru ka a na-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị na-enweghị ike na ndị nọ ná mkpa. Otú ọ dị, ọnọdụ ndị dị otú ahụ bi n’ókèala nke alaeze ebo iri nke Izrel bịara jọgbuo onwe ya.

“Jikere Izute Chineke Gị”

15, 16. (a) N’ihi gịnị ka e ji dọọ ndị Izrel aka ná ntị, sị: “Jikere izute Chineke gị”? (b) Olee otú Emọs 9:1, 2 si egosi na ndị ajọ omume apụghị ịgbanahụ mmezu nke ikpe Chineke? (ch) Gịnị mere alaeze ebo iri nke Izrel na 740 T.O.A.?

15 Ebe ọ bụ na omume rụrụ arụ na mmehie ndị ọzọ jupụtara n’Izrel, e nwere ezi ihe mere Emọs onye amụma ji dọọ mba ahụ na-enupụ isi aka ná ntị, sị: “Jikere izute Chineke gị.” (Emọs 4:12) Ndị Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi apụghị ịgbanahụ mmezu ikpe Chineke nke na-abịanụ n’ọsọ n’ihi na Jehova kwuru nke ugboro asatọ ya, sị: “M [gaghị] eme ka ahụhụ ya laghachi azụ.” (Emọs 2:6) Banyere ndị ajọ omume bụ́ ndị pụrụ ịgbalị izopụ onwe ha, Chineke kwuru, si: “Onye ha nke na-agbalaga agbalaga agaghị agbalaga; ọzọ, onye ha nke na-agbapụ agbapụ agaghị ewepụga onwe ya. Ọ bụrụ na ha egwuba [“na Shiol,” NW], site n’ebe ahụ ka aka m ga-ewere ha; ọ bụrụkwa na ha arịgoruo eluigwe, M ga-eme ka ha si n’ebe ahụ rịdata.”—Emọs 9:1, 2.

16 Ndị ajọ omume apụghị ịgbanahụ mmezu nke ikpe Jehova nke na-abịakwasị ha site ‘n’igwu ala banye na Shiol,’ bụ́ nke na-egosi n’ụzọ ihe atụ mgbalị ndị ha na-eme iji zoo onwe ha n’ime ime ala. Ha apụghịkwa ịgbanahụ ikpe Chineke site ‘n’ịrịgoru eluigwe,’ ya bụ, ịgbalị inweta nchebe n’ugwu ndị dị elu. Ịdọ aka ná ntị Jehova doro anya: Ọ dịghị ebe nzuzo nke ọ na-apụghị iru. Ikpe ziri ezi nke Chineke chọrọ ka alaeze Izrel zaa ajụjụ maka ihe ọjọọ ndị o mere. Oge ime otú ahụ rukwara. Na 740 T.O.A.—ihe dị ka afọ 60 mgbe Emọs dekọsịrị amụma ya—ndị Asiria meriri alaeze Izrel.

Ọ Bụ Nanị Ndị Dara Iwu Na-enweta Ikpe Chineke

17, 18. Gịnị ka Emọs isi 9 na-ekpughe banyere ebere Chineke?

17 Amụma Emọs enyeworo anyị aka ịhụ na ikpe Chineke na-ekwesị ekwesị mgbe nile, nakwa na a pụghị ịgbanahụ ya n’ọsọ. Ma akwụkwọ Emọs na-egosikwa na ọ bụ nanị ndị dara iwu na-enweta ikpe Jehova. Chineke pụrụ ịchọta ndị ajọ omume n’ebe ọ bụla ha zoro ma mezuo ikpe ya n’ahụ́ ha. Ọ pụkwara ịchọta ndị nwere nchegharị na ndị ziri ezi—bụ́ ndị ọ chọrọ imere ebere. E mere ka nke a pụta ìhè n’ụzọ magburu onwe ya n’isi nke ikpeazụ nke akwụkwọ Emọs.

18 Dị ka Emọs isi 9, amaokwu 8 si kwuo, Jehova kwuru, sị: “M gaghị ekpochapụsị ụlọ Jekọb.” Dị ka amaokwu nke 13 ruo nke 15 si kwuo, Jehova na-ekwe nkwa na ya ga-eme ‘ka ndị ya a dọtara n’agha lọta.’ A ga-emere ha ebere, ha ga-enwetakwa nchebe na ọganihu. “Onye plough ga-ekwudo onye na-ebi ọka,” ka Jehova kwere ná nkwa. Chegodị echiche banyere nke ahụ—ihe ubi ga-aba ụba nke na a gaghị ewecha ụfọdụ n’ime ha ruo mgbe oge ịkọ ihe na ịkụ mkpụrụ ọzọ ga-eru!

19. Gịnị mere ndị Izrel na Juda fọdụrụnụ?

19 A pụrụ ikwu na ikpe Jehova megide ndị ajọ omume ma na Juda ma n’Izrel bụ nanị maka ndị dara iwu n’ihi na a ga-emere ndị chegharịrịnụ na ndị nwere ezi ọchịchọ obi ebere. Ná mmezu nke amụma mweghachi ahụ e dekọrọ n’Emọs isi 9, ndị Izrel na Juda fọdụrụnụ, bụ́ ndị chegharịrịnụ, si ná ndọrọ a dọọrọ ha n’agha gaa Babilọn lọta na 537 T.O.A. Ha weghachiri ezi ofufe n’obodo ha ha hụrụ n’anya. Ha wughachikwara ụlọ ha ma kụọ ubi vaịn ná nchebe.

Ikpe Ọmụma Jehova Ga-abịa!

20. Gịnị ka ntụle a anyị tụlere ozi ikpe ndị Emọs kpọsara kwesịrị ime ka anyị jide n’aka?

20 Ntụle a anyị tụlere ozi ikpe Chineke nke Emọs kpọsara kwesịrị ime ka anyị jide n’aka na Jehova ga-eme ka ajọ omume kwụsị n’oge anyị. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwere nke ahụ? Nke mbụ, ihe atụ ndị a nke otú Chineke si mesoo ndị ajọ omume ihe n’oge gara aga na-egosi ihe ọ ga-eme n’oge anyị. Nke abụọ, mmezu e mezuru ihe Chineke kpere n’ikpe n’ahụ́ alaeze Izrel si n’ezi ofufe dapụ na-eme ka o doo anya na Chineke ga-ebibi Krisendọm bụ́ akụkụ ụta kasị dịrị nke “Babịlọn Ukwu ahụ,” alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.—Mkpughe 18:2.

21. N’ihi gịnị ka Krisendọm ji kwesị ịnata ikpe ọmụma Chineke?

21 Obi abụọ ọ bụla adịghị ya na o kwesịrị ekwesị ka Chineke kpee Krisendọm ikpe. Ọnọdụ okpukpe na nke omume dị mwute e nwere na ya pụtara nnọọ ìhè. Ikpe Jehova mara Krisendọm—nakwa akụkụ ndị ọzọ nke ụwa Setan—kwesịrị ekwesị. A pụghịkwa ịgbanahụ ya n’ọsọ, n’ihi na mgbe oge ruru imezu ihe e kpere n’ikpe, ihe e kwuru n’Emọs isi 9, amaokwu 1, ga-emezu: “Onye ha nke na-agbalaga agbalaga agaghị agbalaga; ọzọ, onye ha nke na-agbapụ agbapụ agaghị ewepụga onwe ya.” Ee, n’agbanyeghị ebe ọ bụla ndị ajọ omume pụrụ izo, Jehova ga-achọta ha.

22. Isi ihe ndị dị aṅaa banyere ikpe Chineke ka e mere ka ha pụta ìhè ná 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8?

22 Ikpe Chineke na-ekwesị ekwesị mgbe nile, a pụghị ịgbanahụ ya n’ọsọ, ọ bụkwa nanị ndị dara iwu ka a na-ekpe ya. A pụrụ ịhụ nke a n’okwu Pọl onyeozi: “Ọ bụ ezi omume n’ebe Chineke nọ iji mkpagbu kwụghachi ndị ahụ na-eme ka unu nwee mkpagbu, ma, nye unu ndị na-enwe mkpagbu, iwetara anyị na unu ahụ́ efe ná mkpughe nke Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu, ka ọ na-eweta ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8) “Ọ bụ ezi omume n’ebe Chineke nọ” iji ikpe ọmụma kwụghachi ndị kwesịrị ịnata ya ụgwọ n’ihi iwetara ndị e tere mmanụ mkpagbu. A pụghị ịgbanahụ ikpe ahụ n’ọsọ n’ihi na ndị ajọ omume agaghị alanahụ ‘mkpughe nke Jizọs site n’eluigwe ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike n’ọkụ na-enwu enwu.’ Ọ bụkwa nanị ndị dara iwu ga-enweta ikpe Chineke n’ihi na Jizọs ga-eweta ịbọ ọbọ “n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma.” Mmezu nke ikpe Chineke ga-ewetara ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị a na-akpagbu, nkasi obi.

Olileanya Dịịrị Ndị Ziri Ezi

23. Olileanya na nkasi obi dị aṅaa ka a pụrụ ịchọta n’akwụkwọ Emọs?

23 Amụma Emọs nwekwara ozi olileanya na nke nkasi obi magburu onwe ya maka ndị nwere ezi ọchịchọ obi. Dị ka e buru n’amụma n’akwụkwọ Emọs, Jehova ekpochapụghị ndị ya nke oge ochie kpamkpam. O mesịrị chịkọta ndị Izrel na Juda a dọọrọ n’agha, mee ka ha laghachi n’obodo ha ma jiri ịnọ ná nchebe na ọganihu gọzie ha n’ụba. Gịnị ka nke a pụtara maka oge anyị? Ọ na-eme ka anyị jide n’aka na n’oge a ga-emezu ikpe Chineke, Jehova ga-achọpụta ndị ajọ omume n’ebe ọ bụla ha zoro, ọ ga-achọpụtakwa ndị kwesịrị ka o meere ha ebere, n’agbanyeghị ebe ha pụrụ ibi n’ụwa a.

24. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e siworo gọzie ndị ohu Jehova nke oge a?

24 Ka anyị na-echere oge ikpe Jehova ga-abịakwasị ndị ajọ omume, gịnị bụ ahụmahụ anyị dị ka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi? Leenụ, Jehova ejiriwo ụbara ọganihu ime mmụọ gọzie anyị! Anyị na-anụ ụtọ ụdị ofufe nke okwu ụgha na okwu ndị e tinyere nnu na ose, bụ́ ndị sitere n’ozizi ụgha Krisendọm, na-adịghị na ya. Jehova ejiriwokwa nri ime mmụọ gọzie anyị n’ụba. Otú ọ dị, cheta na ngọzi ndị a bara ụba sitere n’aka Jehova na-eweta ibu ọrụ dị ukwuu. Chineke na-atụ anya ka anyị na-adọ ndị ọzọ aka ná ntị banyere ikpe na-abịanụ. Anyị chọrọ ime ihe nile anyị pụrụ ime iji chọta “ndị nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Ee, anyị chọrọ inyere ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee aka irite uru n’ọganihu ime mmụọ nke anyị na-anụ ụtọ ya ugbu a. Anyị chọkwara ịlanahụ mmezu nke ikpe Chineke megide ndị ajọ omume bụ́ nke na-abịanụ. N’ezie, iji rite uru ná ngọzi ndị a, anyị aghaghị inwe ọnọdụ obi dị mma. Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, e mekwara ka nke a pụta ìhè n’amụma Emọs.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú amụma Emọs si gosi na ọmụma ikpe Jehova na-ekwesị ekwesị mgbe nile?

• Olee ihe àmà Emọs nyere iji gosi na a pụghị ịgbanahụ ikpe Chineke n’ọsọ?

• Olee otú akwụkwọ Emọs si egosi na ọ bụ nanị ndị dara iwu na-enweta ikpe Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Alaeze Izrel agbanahụghị ikpe Chineke

[Foto dị na peeji nke 18]

Na 537 T.O.A., ndị Izrel na Juda fọdụrụnụ si ná ndọrọ a dọọrọ ha n’agha gaa Babilọn lọta