Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lee Ka Ọrụ Gị Si Baa Ụba nke Ukwuu, Jehova!”

“Lee Ka Ọrụ Gị Si Baa Ụba nke Ukwuu, Jehova!”

Ịma Mma Nke Ihe Okike Jehova

“Lee Ka Ọrụ Gị Si Baa Ụba nke Ukwuu, Jehova!”

MA ÀNYỊ bi n’ime ime obodo ma ọ bụ n’obodo ukwu, n’elu ugwu ma ọ bụ n’akụkụ oké osimiri, ịma mma dị ebube nke ihe ndị e kere eke gbara anyị gburugburu. N’ụzọ dabara adaba, ihe osise nke aka ọrụ na-atụ n’anya nke Jehova Chineke dị na 2004 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

Ụmụ mmadụ ndị nwere ekele egosiwo mmasị mgbe nile n’ihe ndị Chineke kere. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Solomọn, bụ́ onye ‘amamihe ya bara ụba karịa amamihe ụmụ Ihu anyanwụ nile.’ Bible na-ekwu, sị: “O kwukwara banyere osisi, site na cedar nke dị na Lebanọn wee ruo hyssop nke na-epupụta ná mgbidi: o kwukwara okwu banyere anụ, banyekwara anụ ufe, banyekwara ihe nile na-akpụ akpụ, banyekwara azụ.” (1 Ndị Eze 4:30, 33) Nna Solomọn bụ́ Eze Devid, tụgharịrị uche ugboro ugboro n’ọrụ nkà Chineke. A kpaliri ya itiku Onye Mere ya mkpu, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.”—Abụ Ọma 104:24. *

Anyị kwesịkwara ikiri na ịmụ banyere ihe ndị e kere eke. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ‘iweli anya anyị elu’ ma jụọ, sị: “Ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a?” Ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ onye nwere ‘ike bara ụba’ nakwa onye nwere n’ezie “ume n’ike”!—Aịsaịa 40:26.

Olee otú ịtụgharị uche n’ihe ndị Jehova kere eke kwesịrị isi metụta anyị? Ọ pụrụ imetụta anyị ọ dịkarịa ala n’ụzọ atọ. Ọ pụrụ (1) ichetara anyị iji ndụ anyị akpọrọ ihe, (2) ịkpali anyị inyere ndị ọzọ aka ịmụ banyere ihe ndị e kere eke, na (3) ịkpali anyị ịmara na inwe ekele maka Onye Okike anyị n’ụzọ zuru ezu karị.

Ndụ anyị dị ka ụmụ mmadụ, bụ́ nke dị nnọọ elu karịa nke ụmụ “anụmanụ ndị na-adịghị eche echiche,” na-enyere anyị aka ikiri na iji ịdị ebube nke ihe e kere eke akpọrọ ihe. (2 Pita 2:12) Anya anyị pụrụ ịhụ ọdịdị ala mara mma. Ntị anyị pụrụ ịnụ abụ ụmụ nnụnụ ndị na-atọ ụtọ. Ikike anyị nwere ịmata oge na ebe ihe mere na-eme ka anyị nwee ihe ndị na-eme anyị obi ụtọ icheta. Ọ bụ ezie na ndụ anyị dị ugbu a ezughị okè, o kwesịrị nnọọ obibi!

Mmasị ebumpụta ụwa nke ụmụ ha nwere n’ihe ndị e kere eke pụrụ ime ndị nne na nna obi ụtọ. Lee ka ụmụaka si enwe obi ụtọ ịchọta mkpokoro eju n’ụsọ oké osimiri, ịzụ anụ ụlọ, ịrị elu osisi! Ndị nne na nna kwesịrị inyere ụmụ ha aka ịhụ njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke na Onye Okike. Ụjọ na nsọpụrụ nke ụmụaka na-enwe maka ihe ndị Jehova kere pụrụ ịdịgide ruo ogologo ndụ ha nile.—Abụ Ọma 111:2, 10.

Anyị ga-abụ nnọọ ndị na-enweghị nghọta ma ọ bụrụ na anyị enwee mmasị n’ihe ndị e kere eke ma ghara ito Onye Okike. Amụma Aịzaịa na-enyere anyị aka ịtụgharị uche na nke a mgbe ọ na-ekwu, sị: “Ị́ maghị? ị́ nụghị? Chineke nke mgbe ebighị ebi ka Jehova, Onye keworo nsọtụ nile nke ụwa, bụ; Ọ dịghị ada mbà, ike adịghị agwụkwa Ya; ọ dịghị ngwupụta a na-egwupụta nghọta Ya.”—Aịsaịa 40:28.

Ee, ihe ndị Jehova kere na-enye ihe àmà nke amamihe ya na-enweghị oyiri, ike ya a na-apụghị ịma aka, na ịhụnanya miri emi o nwere maka anyị. Mgbe anyị hụrụ ihe ndị mara mma gburugburu anyị ma ghọta àgwà ndị Onye mere ha nile nwere, ka a kpalie anyị ikwughachi okwu Devid bụ́: “Ọ dịghị onye dị ka Gị . . . , Onyenwe anyị; ọ dịghịkwa ọrụ dị ka ọrụ Gị nile.”—Abụ Ọma 86:8.

Anyị pụrụ ijide n’aka na ihe ndị Jehova kere ga-anọgide na-akpali mmasị ụmụ mmadụ na-erube isi. Ruo mgbe nile ebighị ebi, anyị ga-enwe ohere na-adịghị agwụ agwụ ịmụkwu banyere Jehova. (Eklisiastis 3:11) Ka anyị na-amụkwukwa banyere ya, otú ahụ ka anyị ga na-ahụ Onye Okike anyị n’anya karị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee 2004 Calendar of Jehovah’s Witnesses, November/December.

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ito Onye Okike

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ ndị nwere ekele na-ahụ aka ọrụ Chineke n’ihe ndị e kere eke. Ihe na-esonụ bụ ihe atụ ole na ole:

“Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na ndị na-enye m ọṅụ n’ihe ọmụmụ sayensị m bụ oge ndị m chọpụtara ihe ọhụrụ ma gwa onwe m, sị, ‘Ya bụ ọ bụ otú ahụ ka Chineke si mee ya.’ Ihe mgbaru ọsọ m bụ ịghọtatụ atụmatụ Chineke.”—Henry Schaefer, prọfesọ nke nkà mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe.

“Mgbe a na-ekwu maka mgbasawanye nke Eluigwe na Ala, ọ bụ ihe dịịrị onye na-agụ banyere ya ikpebi ihe kpatara Eluigwe na Ala ji dịrị, ma nghọta anyị agaghị ezu ezu ma e wepụ Ya [Chineke].”—Edward Milne, onye Britain bụ́ ọkà mmụta usoro mbara igwe na ụwa.

“Anyị maara na e ji ụdị kasị mma nke mgbakọ na mwepụ e nwere akọwa ihe ndị e kere eke n’ihi na Chineke kere ha.”—Alexander Polyakov, onye Russia bụ́ ọkachamara ná mgbakọ na mwepụ.

“N’ihe ọmụmụ anyị nke ihe ndị e kere eke, anyị na-atụle uche Onye Okike, na-aghọta echiche ya, na-akọwakwa usoro nke Ya onwe ya guzobere, ọ bụghị nke anyị.”—Louis Agassiz, onye America bụ́ ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Nnụnụ “Gentoo penguin,” Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Antarctic

[Foto dị na peeji nke 9]

Grand Teton National Park, Wyoming, U.S.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Jack Hoehn/Index Stock Photography