Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu

Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu

Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu

“Jee, buoro ndị m . . . amụma.”—EMỌS 7:15.

1, 2. Ònye bụ Emọs, gịnịkwa ka Bible na-ekpughe banyere ya?

KA OTU onye àmà Jehova nọ na-eje ozi, otu onye nchụàjà zutere ya. Onye nchụàjà ahụ tiri mkpu, sị: ‘Kwụsị ime nkwusa! Pụọ n’ógbè a!’ Gịnị ka onye àmà ahụ mere? Ò mere ihe ahụ a gwara ya, ka ọ̀ nọgidere na-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu? Ị pụrụ ịchọpụta n’ihi na onye àmà ahụ dekọrọ ahụmahụ ya n’akwụkwọ nke bu aha ya. Ọ bụ akwụkwọ Bible bụ́ Emọs. Otú ọ dị, tupu anyị amụkwuo banyere nzute o zutere onye nchụàjà ahụ, ka anyị tụlee ihe ọmụma ụfọdụ banyere nzụlite Emọs.

2 Ònye bụ Emọs? Ole mgbe, ọ bụkwa n’ebee ka o biri ndụ? Anyị na-achọta azịza nke ajụjụ ndị ahụ n’Emọs 1:1, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Okwu Emọs, onye nọ n’etiti ndị nche anụ ụlọ nke Tekoa . . . n’ụbọchị Ụzaịa, bụ́ eze Juda, na n’ụbọchị Jeroboam nwa Joash, bụ́ eze Izrel.” Emọs biri na Juda. Ọ bụ onye Tekoa, nke dị kilomita 16 site n’ebe ndịda Jeruselem. Ọ dịrị ndụ ná ngwụsị narị afọ nke itoolu T.O.A., mgbe Eze Ụzaịa nọ na-achị na Juda, Jeroboam nke Abụọ ana-achịkwa alaeze ebo iri nke Izrel. Emọs bụ onye na-azụ atụrụ. N’ezie, Emọs 7:14 na-ekwu na ọ bụghị nanị “onye nche ehi,” kama ọ bụkwa “onye na-edozi mkpụrụ osisi sycomore.” Ya mere, o ji akụkụ ụfọdụ nke afọ rụọ ọrụ dị ka onye na-ewe ihe ubi. Ọ na-adụpu mkpụrụ osisi fig. A na-arụ ọrụ a iji mee ka mkpụrụ osisi fig chaa ngwa ngwa. Ọ bụ ọrụ na-agwụ ike.

‘Jee, Buo Amụma’

3. Olee otú ịmụ banyere Emọs ga-esi nyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị echee na anyị erughị eru ime nkwusa?

3 Emọs kwuru n’ezoghị ọnụ, sị: “Ọ dịghị onye amụma m bụ, ọ dịghịkwa nwa onye amụma m bụ.” (Emọs 7:14) A mụghị ya dị ka nwa onye amụma ma ọ bụ zụọ ya dị ka onye amụma. Otú ọ dị, n’ime ndị nile nọ na Juda, Jehova họọrọ Emọs ịrụrụ Ya ọrụ. N’oge ahụ, Chineke ahọrọghị eze dị ike, onye nchụàjà gụrụ oké akwụkwọ ma ọ bụ onyeisi bara ọgaranya. Nke a na-akụziri anyị ihe na-agba ume. Ọ pụrụ ịbụ na anyị anọchaghị n’ọkwá dị elu ma ọ bụ na anyị agụghị oké akwụkwọ. Ma nke ahụ ò kwesịrị ime ka anyị chee na anyị erughị eru ikwusa okwu Chineke? Ọ dịghị ma ọlị! Jehova pụrụ ịkwadebe anyị ịkpọsa ozi ya—ọbụna n’ókèala ndị siri ike. Ebe nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Jehova meere Emọs, ọ ga-abara ndị nile chọrọ ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu uru ịtụle ihe nlereanya onye amụma ahụ nwere obi ike setịpụrụ.

4. N’ihi gịnị ka o ji buru ihe ịma aka nye Emọs ibu amụma n’Izrel?

4 Jehova nyere Emọs iwu, sị: “Jee, buoro ndị m, bụ́ Izrel, amụma.” (Emọs 7:15) Ọrụ ahụ e nyere ya siri ike. N’oge ahụ, alaeze ebo iri nke Izrel nọ n’udo na ná nchebe, baakwa ọgaranya. Ọtụtụ nwere “ụlọ mgbe oyi” nakwa “ụlọ mgbe okpomọkụ,” bụ́ ndị e ji “nkume a wara awa” ndị dara oké ọnụ wuo, ọ bụghị ndị e ji brik ụrọ nkịtị wuo. Ụfọdụ nwere arịa ụlọ ndị e ji ọdụ́ chọọ mma, ṅụọkwa mmanya sitere ‘n’ubi vaịn a na-achọsi ike.’ (Emọs 3:15; 5:11) N’ihi ya, ndị mmadụ ghọrọ ndị onwe ha juru afọ. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ókèala e kenyere Emọs ọrụ na ya yiri nke ụfọdụ n’ime anyị na-eje ozi na ya taa.

5. Olee ihe ndị na-ezighị ezi ụfọdụ ndị Izrel nọ na-eme?

5 Ndị Izrel inwe ihe onwunwe abụghị ihe ọjọọ. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị Izrel na-akpata akụ̀ ha n’ụzọ akwụwaghị aka ọtọ. Ndị ọgaranya nọ “na-emegbu ndị na-enweghị ike” ma “na-azọpịa ụmụ ogbenye.” (Emọs 4:1) Ndị ahịa, ndị ikpe, na ndị nchụàjà bụ́ ndị dịcha ike nọ na-akpa nkata irigbu ndị ogbenye. Ugbu a, ka anyị leghachi anya azụ ma hụ ihe ndị ikom a na-eme.

E Mebie Iwu Chineke

6. Olee otú ndị ahịa bụ́ ndị Izrel si aghọgbu ndị ọzọ?

6 Ka anyị buru ụzọ gaa n’ọma ahịa. N’ebe ahụ, ndị na-azụ ahịa n’akwụwaghị aka ọtọ nọ na-eme ka “ọ̀tụ̀tụ̀ ephah dị nta” ma na-eme ka “ego shekel dị ukwuu,” ọbụna na-ere ‘ihe ndị a fụchapụtara n’ọka,’ dị ka à ga-asị na ha bụ ọka n’onwe ha. (Emọs 8:5, 6) Ndị ahịa ahụ nọ na-aghọgbu ndị na-azụ ha ahịa n’otú ihe ha na-eresị ha hà, ha na-ere ihe oké ọnụ, ihe ha na-eresị ha abụghịkwa nke ezigbo ya. Mgbe ndị ahịa rigbusịrị ndị ogbenye ruo n’ókè nke na ha enweghịzi ego ọ bụla, ndị ogbenye na-erezi onwe ha ịbụ ndị ohu. Ọzọkwa, ndị ahịa ahụ na-azụ ha ‘n’ọnụ ego a na-ere akpụkpọ ụkwụ abụọ.’ (Emọs 8:6) Chegodị echiche! Ndị ahịa anyaukwu ahụ na-ele ndị Izrel ibe ha anya dị ka ndị na-abaghị uru karịa akpụkpọ ụkwụ nkịtị! Lee ka nke a si bụrụ iweda ndị nọ ná mkpa ala n’ụzọ jọgburu onwe ya, leekwa otú ha si na-emebi Iwu Chineke n’ụzọ dị oké njọ! N’agbanyeghị nke ahụ, ndị a na-ere ahịa na-edebe “ụbọchị izu ike.” (Emọs 8:5) Ee, ha ji okpukpe kpọrọ ihe ma ọ bụ nanị n’ọnụ.

7. Gịnị mere o ji kwe ndị ahịa bụ́ ndị Izrel omume imebi Iwu Chineke?

7 Olee otú ndị ahịa ahụ si emebi Iwu Chineke, bụ́ nke sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị,” n’enwetaghị ntaramahụhụ? (Levitikọs 19:18) Ihe nọ na-agaziri ha n’ihi na ndị kwesịrị ịhụ na a na-edebe Iwu ahụ—ndị ikpe—so ha na-emebi ya. N’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, bụ́ ebe a na-anọ ekpe ikpe, ndị ikpe ahụ ‘na-anara ihe mgbapụta, ma ọ bụ ụmụ ogbenye nọ n’ọnụ ụzọ ámá ha ka ha na-ewezụga n’ikpe ha.’ Kama ichebe ndị ogbenye, ndị ikpe ahụ na-arara ha nye iji nweta ihe iri ngo. (Emọs 5:10, 12) Ya mere, ndị ikpe ahụ nọkwa na-eleghara Iwu Chineke anya.

8. Omume dị aṅaa ka ajọ ndị nchụàjà nọ na-eleghara anya?

8 Ka ọ dị ugbu a, olee ọrụ ndị nchụàjà nọ n’Izrel na-arụ? Iji chọpụta, anyị aghaghị ile anya ebe ọzọ. Rịba ama mmehie ndị nchụàjà gbachiri nkịtị ka a na-eme ‘n’ụlọ chi ha’! Site n’ọnụ Emọs, Chineke kwuru, sị: “Nwoke na nna ya na-ejekwuru otu nwa agbọghọ ahụ, ka ha wee mee ka aha nsọ m ghara ịdị nsọ.” (Emọs 2:7, 8) Cheedị banyere nke ahụ! Nna bụ́ onye Izrel na nwa ya nwoke na-eso otu akwụna ụlọ nsọ enwe mmekọahụ. Ajọ ndị nchụàjà ahụ na-elegharakwa omume rụrụ arụ dị otú ahụ anya!—Levitikọs 19:29; Deuterọnọmi 5:18; 23:17.

9, 10. Ikpe nke imebi Iwu Chineke ndị dị aṅaa mara ndị Izrel, myirịta dịkwa aṅaa ka e nwere n’etiti oge ahụ na oge anyị?

9 N’ikwu banyere mmehie ndị ọzọ, Jehova kwuru, sị: “Ọ bụkwa n’elu uwe a narawooro n’ihe ibé ka ha na-esetị onwe ha n’akụkụ ebe ịchụàjà nile ọ bụla, ọ bụkwa mmanya vaịn nke ndị e riworo ha nhá ka ha na-aṅụ n’ụlọ [chi] ha.” (Emọs 2:8) Ee, ndị nchụàjà na ndị obodo ahụ n’ozuzu ha leghakwaara iwu ahụ e dekọrọ n’Ọpụpụ 22:26, 27 anya, bụ́ nke na-ekwu na a ga-eweghachi uwe a natara n’ibé tupu chi ejie. Kama nke ahụ, ha na-eji ya emere blanket ha na-atụ n’ebe ha na-edina mgbe ha na-eme ememe ma na-aṅụ mmanya n’ihu chi ụgha ha. Ha na-ejikwa nhá ha ritere ndị ogbenye azụ mmanya ha ga-aṅụ n’ememe okpukpe ụgha. Lee ókè ha kpafuruworo site n’ụzọ nke ofufe dị ọcha!

10 Ndị Izrel nọ na-emebi iwu abụọ ndị kasịnụ n’Iwu ahụ—ịhụ Jehova n’anya na ịhụ mmadụ ibe ha n’anya—n’emeghị ihere ọ bụla. N’ihi ya, Chineke zigara Emọs ka ọ katọọ ha n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha. Taa, mba nke ụwa a, gụnyere ndị nke Krisendọm, na-eme ụdị omume rụrụ arụ Izrel oge ochie mere. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma, ọtụtụ ndị ọzọ na-abụ ndị ndị isi n’azụmahịa, n’ọchịchị, nakwa n’okpukpe ụgha, bụ́cha ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu, gwuru wayo ma kpatara obi mgbawa. Ma Jehova na-eche banyere ndị na-ata ahụhụ ma bụrụ ndị a kpaliri ịchọ ya. N’ihi ya, o kenyewo ndị ohu ya nke oge a ọrụ dị ka nke ahụ Emọs rụrụ—ikwusa okwu Ya n’atụghị egwu.

11. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Emọs?

11 N’ihi myirịta ndị e nwere n’etiti ọrụ anyị na nke Emọs, anyị ga-erite uru dị ukwuu site n’ịtụle ihe nlereanya ya. N’ezie, Emọs na-egosi anyị (1) ihe anyị kwesịrị ikwusa, (2) otú anyị kwesịrị isi na-eme nkwusa, na (3) ihe mere na ndị mmegide agaghị akwụsịli ọrụ nkwusa anyị. Ka anyị tụlee isi ihe ndị a n’otu n’otu.

Otú Anyị Pụrụ Isi Ṅomie Emọs

12, 13. Olee otú Jehova si gosi na obi adịghị ya mma n’ebe ndị Izrel nọ, oleekwa otú ha si meghachi omume?

12 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị na-eme ka ozi Ndị Kraịst anyị hiwe isi n’ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20; Mak 13:10) Ka o sina dị, anyị na-adọrọkwa uche gaa n’ịdọ aka ná ntị Chineke, ọbụna dị ka Emọs kpọsara na Jehova ga-eweta amamikpe n’ahụ́ ndị ajọ mmadụ. Dị ka ihe atụ, Emọs 4:6-11 na-egosi na Jehova mere ka ọ pụta ìhè ugboro ugboro na obi adịghị ya mma n’ebe Izrel nọ. O mere ka ha nwee “ụkọ nri,” ‘gbochiere ha oké mmiri ozuzo,’ jiri ‘nchakpọ na ọmụma ebu’ tigbuo ha, zitekwara ha “ajọ ọrịa na-efe efe.” Ihe ndị a hà mere ka Izrel chegharịa? “Unu alaghachikwuteghị m,” ka Chineke kwuru. N’ezie, ndị Izrel jụrụ Jehova ọtụtụ ugboro.

13 Jehova nyere ndị Izrel na-enweghị nchegharị ntaramahụhụ. Otú ọ dị, nke mbụ, e ji okwu amụma dọọ ha aka ná ntị. N’ikwekọ na nke a, Chineke kwuru, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” (Emọs 3:7) Chineke mere ka Noa mara na Iju Mmiri ahụ na-abịa ma gwa ya ka ọ dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova gwara Emọs ka o nye ịdọ aka ná ntị ikpeazụ. N’ụzọ dị mwute, Izrel leghaara ozi ahụ sitere n’aka Chineke anya ma ghara ime ihe ziri ezi.

14. Myirịta ndị dị aṅaa ka e nwere n’etiti oge Emọs na oge anyị?

14 Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekweta na e nwere myirịta ụfọdụ dị ịrịba ama n’etiti oge Emọs na oge anyị. Jizọs Kraịst buru amụma na ọtụtụ ọdachi ga-ewere ọnọdụ n’oge ọgwụgwụ. O bukwara amụma na a ga-arụ ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. (Matiu 24:3-14) Otú ọ dị, dị ka ọ dị n’oge Emọs, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa na-eleghara ihe ịrịba ama nke oge a na ozi Alaeze ahụ anya. Nye ndị dị otú ahụ, ihe ọ ga-akpatara ha ga-abụ otu ihe ahụ chere ndị Izrel na-enweghị nchegharị ihu. Jehova dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Jikere izute Chineke gị.” (Emọs 4:12) Ha zutere Chineke site n’inweta amamikpe ya mgbe ndị agha Asiria meriri ha. Taa, ụwa a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke ‘ga-ezute Chineke’ n’Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) Ka ọ dịgodị, ruo ogologo oge Jehova ga-anọgide na-enwe ndidi, anyị ga na-agba ọtụtụ mmadụ ruo ókè o kwere mee ume, sị: “Chọọnụ Jehova, wee dị ndụ.”—Emọs 5:6.

Iche Mmegide Ihu Dị Ka Emọs Chere

15-17. (a) Ònye bụ Amazaịa, oleekwa otú o si meghachi omume n’amụma Emọs? (b) Ebubo ndị dị aṅaa ka Amazaịa boro Emọs?

15 Ọ bụghị nanị n’ihe anyị ga-ekwusa ka anyị pụrụ iṅomi Emọs kamakwa n’otú anyị si ekwusa ya. E mere ka eziokwu ahụ pụta ìhè n’isi nke 7, bụ́ ebe a gwara anyị banyere onye nchụàjà ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite nke ntụle anyị. Ọ bụ “Amazaịa, bụ́ onye nchụàjà Betel.” (Emọs 7:10) Obodo Betel bụ ebe okpukpe nke ndị si n’ezi ofufe dapụ n’Izrel hiwere isi, bụ́ nke gụnyere ofufe nwa ehi. Ya mere, Amazaịa bụ onye nchụàjà nke okpukpe obodo ahụ. Olee otú o si meghachi omume n’okwu ndị ahụ Emọs kwuru n’atụghị egwu?

16 Amazaịa gwara Emọs, sị: “Gị onye ọhụ ụzọ, jee, gbalaga n’ala Juda, rie nri n’ebe ahụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ị ga-ebu amụma: ma ebukwala amụma ọzọ n’ime Betel: n’ihi na ebe nsọ nke eze ka ọ bụ; ọzọ, ụlọ alaeze ka ọ bụ.” (Emọs 7:12, 13) N’ụzọ bụ́ isi, Amazaịa kwuru, sị: ‘Lawa! Anyị nwere okpukpe nke anyị.’ Ọ gbalịkwara ịkpali ndị ọchịchị ka ha machibido ọrụ Emọs iwu, na-agwa Eze Jeroboam nke Abụọ, sị: “Emọs ekekọtawo mmadụ imegide gị n’etiti ụlọ Izrel.” (Emọs 7:10) Ee, Amazaịa boro Emọs ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru! Ọ gwara eze ahụ, sị: “Otú a ka Emọs sịrị, Site ná mma agha ka Jeroboam ga-anwụ, a ghaghị imekwa ka Izrel si n’ala ya jee biri n’ala ọzọ.”—Emọs 7:11.

17 N’okwu ndị ahụ, Amazaịa kwuru ihe atọ na-eduhie eduhie. Ọ sịrị: “Otú a ka Emọs sịrị.” Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla Emọs kwuru na ọ bụ n’ọnụ ya ka amụma ahụ sitere. Kama nke ahụ, ọ nọwo na-ekwu mgbe nile, sị: “Otú a ka Jehova sịrị.” (Emọs 1:3) E bokwara Emọs ebubo na ọ sịrị: “Site ná mma agha ka Jeroboam ga-anwụ.” Otú ọ dị, dị ka e dekọrọ n’Emọs 7:9, Emọs buru amụma, sị: “M [Jehova] ga-ejikwa mma agha bilie imegide ụlọ Jeroboam.” Ọ bụ Chineke buru amụma ọdachi megide “ụlọ” Jeroboam, ụmụ ya. Ọzọkwa, Amazaịa boro ebubo na Emọs sịrị: ‘Izrel aghaghị ije biri n’ala ọzọ.’ Ma Emọs bukwara amụma na onye Izrel ọ bụla nke laghachikwutere Chineke ga-enweta ngọzi. N’ụzọ doro anya, Amazaịa jiri ihe ndị na-abụchaghị eziokwu mee ihe ná mgbalị ya ime ka eze machibido ọrụ nkwusa Emọs iwu.

18. Myirịta dị aṅaa ka e nwere n’etiti ụzọ Amazaịa si mee ihe na ụzọ ndị ụkọchukwu nke taa si eme ihe?

18 Ị̀ rịbara ama myirịta dị n’etiti ụzọ Amazaịa si mee ihe na ụzọ ndị na-emegide ndị Jehova taa si eme ihe? Dị nnọọ ka Amazaịa si gbalịa imechi Emọs ọnụ, otú ahụ ka ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị bishọp ukwu na ndị nta nke oge anyị si agbalị igbochi ọrụ nkwusa nke ndị ohu Jehova. Amazaịa boro Emọs ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru. Taa, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-ebokwa Ndịàmà Jehova ebubo ụgha na ha na-eme ka mba ghara ịnọ ná nchebe. Dịkwa nnọọ ka Amazaịa jekwuuru eze maka inyere ya aka imegide Emọs, otú ahụ ka ndị ụkọchukwu si ejekwuru ndị ọchịchị mgbe mgbe inyere ha aka ịkpagbu Ndịàmà Jehova.

Ndị Mmegide Apụghị Ịkwụsị Ọrụ Nkwusa Anyị

19, 20. Olee otú Emọs si meghachi omume ná mmegide sitere n’aka Amazaịa?

19 Olee otú Emọs si meghachi omume ná mmegide Amazaịa? Nke mbụ, Emọs jụrụ onye nchụàjà ahụ, sị: “Ị̀ na-asị, ‘Ebula amụma megide Izrel?’” N’egbughị oge, onye amụma Chineke nke nwere obi ike kwuziri okwu ndị o doro anya na Amazaịa achọghị ịnụ. (Emọs 7:16, 17, NW) Emọs atụghị egwu. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya ọ bụụrụ anyị! Mgbe a bịara n’ikwu okwu Chineke, anyị agaghị enupụrụ Chineke anyị isi, ọbụna n’ala ndị Amazaịa ndị nke oge a na-akpalite mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. Dị ka Emọs, anyị ga-anọgide na-akpọsa, sị: “Jehova sịrị otú a.” Ndị mmegide apụghịkwa ịkwụsị ọrụ nkwusa anyị n’ihi na “aka Jehova” dịnyeere anyị.—Ọrụ 11:19-21.

20 Amazaịa kwesịrị ịmataworị na iyi egwu ya ga-akụ afọ n’ala. Emọs akọwaworị ihe mere na ọ dịghị onye pụrụ ịkwụsị ya ikwu okwu—nke ahụ bụkwa isi ihe nke atọ anyị ga-atụle. Dị ka Emọs 3:3-8 si kwuo, Emọs ji ajụjụ na ihe atụ dị iche iche mee ihe iji gosi na ọ dịghị ihe ga-eme n’enweghị ihe kpatara ya. Mgbe ahụ, o kwuru, sị: “Ọdụm agbọwo ụja, ọ̀ bụ onye na-agaghị atụ egwu? Onyenwe anyị Jehova ekwuwo, ọ̀ bụ onye na-agaghị ebu amụma?” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Emọs na-agwa ndị na-ege ya ntị, sị: ‘Dị nnọọ ka egwu na-aghaghị ịtụ unu mgbe unu nụrụ ụja ọdụm, n’otu aka ahụ, agaghị m ahapụ ikwusa okwu Chineke mgbe m nụrụ ka Jehova kwuru ka e mee otú ahụ.’ Egwu Chineke ma ọ bụ nsọpụrụ miri emi Emọs nwere n’ebe Jehova nọ kwaliri ya ikwu okwu n’atụghị egwu.

21. Olee otú anyị si emeghachi omume n’iwu Chineke nyere anyị ikwusa ozi ọma?

21 Anyị onwe anyị kwa na-anụ ka Jehova na-ekwu ka e mee nkwusa. Olee otú anyị si emeghachi omume? Dị ka Emọs, nakwa dị ka ụmụazụ Jizọs nke oge mbụ, site n’enyemaka Jehova, anyị na-ekwu okwu Ya n’atụghị egwu. (Ọrụ 4:23-31) Ma mkpagbu ndị mmegide kpalitere ma enweghị mmasị nke ndị anyị na-ekwusara ozi ọma adịghị nke ga-eme ka anyị kpuchie ọnụ. Site n’igosi ịnụ ọkụ n’obi yiri nke Emọs, a na-akwali Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ n’atụghị egwu. Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ikpe Jehova nke na-abịanụ. Gịnị ka ikpe ahụ na-agụnye? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Emọs rụzuru ọrụ Chineke nyere ya?

• Dị ka Emọs, gịnị ka anyị kwesịrị ikwusa?

• Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji na-arụ ọrụ nkwusa anyị?

• N’ihi gịnị ka ndị mmegide na-agaghị eji nwee ike ịkwụsị ọrụ ịgba àmà anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Chineke họọrọ Emọs, onye na-edozi mkpụrụ osisi sycomore, ịrụrụ Ya ọrụ

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Dị ka Emọs, ị̀ na-akpọsa ozi Jehova n’atụghị egwu?