Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àgwà Nanị Ụmụ Mmadụ Nwere

Àgwà Nanị Ụmụ Mmadụ Nwere

Àgwà Nanị Ụmụ Mmadụ Nwere

Jodie nwere ụlọ ahịa na-erere ndị mmadụ ihe ha. Ọ nọ na-enyere otu nwanyị aka ịhazi na ire arịa ụlọ nke nwanne ya nwanyị nwụrụ anwụ. Ka ọ nọ na-enyogharị anya n’usekwu merela ochie, ọ hụrụ igbe abụọ e ji etinye ihe ndị e ji egbu azụ. Mgbe o nyonyere anya n’otu n’ime ha, ọ pụghị ikweta ihe anya ya hụrụ. Ọ hụrụ ọtụtụ ùkwù $100 a fụchiri afụchi—ngụkọta nke $82,000! Ọ bụ nanị Jodie nọ n’ime ụlọ ahụ. Olee ihe o kwesịrị ime? Ọ̀ bụ iburu igbe ahụ na nzuzo ka ọ̀ bụ ịgwa onye ahịa ya na ọ chọtara ego ahụ?

ỌNỌDỤ amaghị ihe a ga-eme Jodie nọ na ya na-eme ka otu n’ime àgwà ndị mere ka anyị dị iche n’ebe ụmụ anụmanụ na-enweghị uche dị pụta ìhè. The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Otu n’ime àgwà ndị pụrụ iche ụmụ mmadụ nwere bụ ịjụ ajụjụ ndị e chere echiche jụọ banyere ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụ ihe anyị na-ekwesịghị ime.” Nkịta agụụ ji nke hụrụ ọkpụrụkpụ anụ n’elu tebụl agaghị ajụ ma ò kwesịrị ịta ya. Otú ọ dị, Jodie nwere ikike nke ịtụle ma mkpebi ya ò ziri ezi. Ọ bụrụ na o were ego ahụ, o zuola ohi, ma o yighị ka à ga-ejide ya. Ọ bụghị ya nwe ego ahụ; ma onye ahịa ya amaghị na ego ahụ dị. Ọzọkwa, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ógbè Jodie ga-eche na ọ bụ onye iberibe ma o nye onye ahịa ya ego ahụ.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ Jodie? Otú ị ga-esi zaa ajụjụ ahụ ga-adabere n’ụkpụrụ omume ndị ị na-agbaso.

Gịnị Ka Ụkpụrụ Omume Pụtara?

Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Eric J. Easton na-ekwu, sị: “‘Ụkpụrụ omume’ na ‘omume ọma’ pụtara otu ihe n’asụsụ mbụ . . . , ha abụọ na-ezokwa aka n’ikike omenala na ọdịnala nwere.”

Ruo ogologo oge, okpukpe anọwo na-ekpebi ụkpụrụ omume nke ndị mmadụ ji ebi ndụ. Okwu Chineke, bụ́ Bible, emetụtawo ọtụtụ ndị. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị mmadụ n’ụwa nile ajụwo ụkpụrụ okpukpe dị iche iche dị ka ihe na-adịghị irè, werekwa ụkpụrụ omume nke Bible dị ka ihe oge ya gafeworo. Gịnị ka ha jiworo dochie anya ha? Akwụkwọ bụ́ Ethics in Business Life na-ekwu na “amamihe ụwa ewegharawo . . . ikike okpukpe nweburu.” Kama ilegara okpukpe anya, ọtụtụ ndị na-achọ nduzi nke ndị ọkachamara ụwa n’ihe metụtara ụkpụrụ omume. Prọfesọ ụkpụrụ omume bụ́ Paul McNeill na-ekwu, sị: “Ana m eche na ndị ọkachamara n’ihe banyere ụkpụrụ omume na-arụzi ọrụ ndị ụkọchukwu. . . . Ndị mmadụ na-ekwuzi banyere ụkpụrụ omume n’ebe ndị ọ pụrụ ịbụ na ha gaara adị na-ekwu banyere okpukpe.”

Mgbe i chere mkpebi ndị siri ike ihu, olee otú i si amata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ? Ọ̀ bụ Chineke na-ekpebi ụkpụrụ omume gị ka ọ̀ bụ gị na-ekpebiri ya onwe gị?