Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịtụkwasị Obi ná Nlekọta Ịhụnanya Jehova

Ịtụkwasị Obi ná Nlekọta Ịhụnanya Jehova

Akụkọ Ndụ

Ịtụkwasị Obi ná Nlekọta Ịhụnanya Jehova

DỊ KA ANNA DENZ TURPIN SI KỌỌ

“Ị na-ajụkarị ajụjụ!” ka mama m ji ọnụ ọchị kwuo. Mgbe m bụ nwatakịrị, ajụrụ m ndị mụrụ m ọtụtụ ajụjụ. Ma ọ dịghị mgbe papa m na mama m baara m mba n’ihi ọchịchọ ịmata ihe m nwere na nwata. Kama nke ahụ, ha kụziiri m iche echiche na ime mkpebi n’onwe m dabere n’akọ na uche e ji Bible zụọ. Lee ka ọzụzụ dị otú ahụ si ghọọ ihe dị oké ọnụ ahịa! Otu ụbọchị mgbe m dị afọ 14, ndị Nazi kewara mụ na ndị mụrụ m m hụrụ n’anya, ọ dịghị mgbe m hụrụ ha anya ọzọ.

PAPA M, bụ́ Oskar Denz, na mama m, bụ́ Anna Maria, biri na Lörrach, bụ́ obodo Germany dịdebere ókè Germany na Switzerland. Mgbe ha bụ ndị ntorobịa, ha mikpuru onwe ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ógbè ahụ makwaara ha ma na-akwanyere ha ùgwù. Ma na 1922, oge na-adịghị anya ka ha lụsịrị, ndị mụrụ m gbanwere echiche ha nwere banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ. Mama m malitere iso Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, amụ Bible, o nwekwara ọṅụ ịmụta na Alaeze Chineke ga-eweta udo n’ụwa. N’oge na-adịghị anya, papa m sonyeere mama m n’ọmụmụ ihe ahụ, ha malitekwara ịga nzukọ nke Ndị Mmụta Bible. Ọbụna papa m nyere mama m akwụkwọ e ji amụ Bible, bụ́ The Harp of God, dị ka onyinye Krismas nke afọ ahụ. N’ịbụ nanị nwa ha ji, a mụrụ m na March 25, 1923.

Lee ka ihe ndị m na-echeta banyere ndụ ezinụlọ anyị si enye m ọṅụ—mkpapụ ndị anyị na-eme n’oge okpomọkụ gaa n’Ọhịa Ojii dị jụụ nakwa nkụzi ndị m na-enweta n’aka mama m banyere otú e si ahazi ụlọ! Aka m ji anya nke uche na-ahụ ka mama m na-eguzo na kichin ma na-eduzi obere osi nri ya. Nke kasị mkpa bụ na ndị mụrụ m kụziiri m ịhụ Jehova Chineke n’anya na ịtụkwasị ya obi.

Ọgbakọ anyị nwere ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze 40 dị uchu. Ndị mụrụ m nwere nkà n’imepụta ohere iji na-ekwu banyere Alaeze ahụ. N’ihi ihe ndị ha na-emebu n’obodo, ahụ́ na-eru ha ala ịgwa ndị mmadụ okwu, ndị mmadụ na-anabatakwa ha nke ọma. Mgbe m ruru afọ asaa, achọkwara m ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ụbọchị mbụ m, nanị ihe onye mụ na ya rụrụ mere bụ ịchịnye m akwụkwọ ụfọdụ, tụọrọ m otu ụlọ aka ma kwuo, sị, “Gaa lee ma hà chọrọ ya.” Na 1931, anyị gara mgbakọ Ndị Mmụta Bible na Basel, Switzerland. E mere ndị mụrụ m baptizim n’ebe ahụ.

Site n’Ọgba Aghara Gaa n’Ọchịchị Aka Ike

Germany nọ n’oké ọgba aghara n’oge ahụ, òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịgasị iche iche na-alụrịta ọgụ n’okporo ámá. N’otu abalị, mkpu si n’ụlọ onye agbata obi anyị kpọtere m. Ụmụaka abụọ nọ n’afọ iri na ụma ji ogologo fọk gbuo nwanne ha nwoke n’ihi na ha ekwenyeghị n’echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya. Iro a na-ebuso ndị Juu mụbakwara n’ụzọ dị ịrịba ama. N’ụlọ akwụkwọ, otu nwata nwanyị na-anọrọ nanị ya n’otu akụkụ nanị n’ihi na ọ bụ onye Juu. Emeteere m ya ebere, n’amaghị na n’oge na-adịghị anya m ga-ahụ otú ọ na-adị ịbụ onye a mapụrụ n’iwu.

Na January 30, 1933, Adolf Hitler ghọrọ onyeisi ọchịchị Germany. Anyị nọ n’ebe na-adịghị anya na-ekiri ka ndị Nazi ji oké obi ụtọ welie ọkọlọtọ swastika n’ihu ụlọ ezumezu obodo ahụ. N’ụlọ akwụkwọ, onye nkụzi anyị na-anụ ọkụ n’obi kụziiri anyị ikele ekele bụ́ “Heil Hitler!” N’ehihie ahụ, agwara m papa m banyere ya. O wutere ya. “Enweghị m mmasị na ya,” ka o kwuru. “‘Heil’ pụtara nzọpụta. Ọ bụrụ na anyị na-asị ‘Heil Hitler!’ ọ ga-apụta na anyị na-ekwu na ọ bụ ya ga-enye anyị nzọpụta kama ịbụ Jehova. Echeghị m na o ziri ezi, ma kpebiere onwe gị ihe i kwesịrị ime.”

Ụmụ akwụkwọ ibe m malitere imeso m ihe dị ka osu n’ihi na m jụrụ ikele ekele Hitler. Ụfọdụ ụmụntakịrị nwoke na-akụ m ihe mgbe ndị nkụzi lefuru anya. Ha mesịrị kwụsị inye m nsogbu, ma ọbụna ndị enyi m gwara m na nna ha machibidoro ha iwu iso m gwuo egwu. E lere m anya dị ka onye dị nnọọ ize ndụ.

Ọnwa abụọ ka ndị Nazi weghasịịrị ọchịchị na Germany, ha machibidoro Ndịàmà Jehova iwu dị ka ndị dị ize ndụ nye Ọchịchị. Ndị agha mwakpo mechiri ụlọ ọrụ dị na Magdeburg ma machibido nzukọ anyị iwu. Ma n’ihi na anyị bi nso n’ókè Germany na Switzerland, papa m na-enweta ikike anyị ịgafere banye na Basel, bụ́ ebe anyị na-aga nzukọ Sunday. Ọ na-ekwukarị na ọ dị ya ka ya bụrụ na ụmụnna anyị ndị nọ na Germany ga-enweta nri ime mmụọ dị otú ahụ iji nyere ha aka iji obi ike chee ọdịnihu ihu.

Mkpapụ Ndị Dị Ize Ndụ

Mgbe e mechisịrị ụlọ ọrụ Magdeburg, onye na-arụbu ọrụ ebe ahụ, bụ́ Julius Riffel, bịara Lörrach, bụ́ obodo ya, ịhazi ọrụ nkwusa nzuzo. Papa m wepụtara onwe ya ozugbo inye aka. Ọ kpọrọ mụ na mama m ma kọwaara anyị na ya ekwetawo inye aka isi Switzerland na-ewebata akwụkwọ e ji amụ Bible na Germany. O kwuru na ọ ga-adị nnọọ ize ndụ, na a pụkwara ijide ya n’oge ọ bụla. Ọ chọghị ka anyị nwee nrụgide nke isonyere ya n’ihi na ọ ga-abụkwara anyị ihe ize ndụ. Ozugbo ahụ mama m kwuru, sị, “Akwụ m gị n’azụ.” Ha abụọ lere m anya, ekwukwara m, sị, “Akwụkwa m gị n’azụ!”

Mama m jiri aka kpaa otu obere akpa ha ka magazin Ụlọ Nche. Ọ na-etinye akwụkwọ ahụ n’akụkụ ghere oghe nke akpa ahụ ma kpachie ya. Ọ dụnyegasịrị akpa nzuzo n’uwe papa m, meekwa ajị̀ abụọ ndị mụ na ya pụrụ iji jiri akọ na-ebu obere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Oge ọ bụla anyị nwere ihe ịga nke ọma n’iwelata akụ̀ anyị dị oké ọnụ ahịa na nzuzo, anyị na-ekuda ume ma kelee Jehova. Anyị na-ezo akwụkwọ ndị ahụ n’uko ụlọ anyị.

Ná mmalite, ndị Nazi enyoghị anyị enyo n’ụzọ ọ bụla. Ha ajụghị anyị ajụjụ ọ bụla ma ọ bụ nyochaa ụlọ anyị. Ka o sina dị, anyị kpebiri ihe mgbaàmà anyị ga-eji na-agwa ụmụnna anyị mgbe e nwere nsogbu—4711, aha otu sent na-ewu ewu a na-agba n’ahụ́. Ọ bụrụ na ọ dị ize ndụ ịbịa n’ụlọ anyị, anyị na-agwa ha—na-eji nọmba ahụ eme ihe. Papa m gwakwara ha ka ha na-adị na-ele anya na windo palọ anyị tupu ha abata n’ụlọ anyị. Ọ bụrụ na windo dị n’aka ekpe mepere emepe, ọ pụtara na nsogbu dị, ha ekwesịghịkwa ịbata.

Na 1936 na 1937, ndị Gestapo nwụchiri ọtụtụ ndị mmadụ ma tụba ọtụtụ puku Ndịàmà n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ, bụ́ ebe e mekpọrọ ha nnọọ ọnụ. Alaka ụlọ ọrụ dị na Bern, Switzerland, malitere ịchịkọta akụkọ, gụnyere ụfọdụ ndị e si n’ogige ndị ahụ zopụta, iji bipụta akwụkwọ a kpọrọ Kreuzzug gegen das Christentum (Agha Ntụte Megide Iso Ụzọ Kraịst), nke kpughere mpụ ndị Nazi. Anyị malitere ọrụ dị ize ndụ nke iburu akụkọ nzuzo ndị ahụ gafee ókè anyị na Switzerland gaa Basel. A sị na ndị Nazi hụrụ ihe ndekọ ndị ahụ a machibidoro iwu n’aka anyị, a gaara atụba anyị n’ụlọ mkpọrọ ozugbo. Ebere m ákwá ka m na-agụ banyere ọnụ a nọ na-emekpọ ụmụnna anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, egwu atụghị m. Enwere m obi ike na Jehova na ndị mụrụ m, bụ́ ezigbo ndị enyi m, ga-elekọta m.

Agụsịrị m akwụkwọ mgbe m dị afọ 14 ma nweta ọrụ dị ka onye na-elekọta ụlọ ahịa ebe a na-ere ngwá ahịa dị iche iche. Anyị na-arụkarị ọrụ obu ozi anyị n’ehihie Saturday ma ọ bụ Sunday, mgbe papa m na-anaghị aga ọrụ. Ná nkezi, anyị na-aga ya kwa izu abụọ. Anyị na-adị nnọọ ka ezinụlọ ndị ọzọ na-eme mkpapụ ná ngwụsị izu, ruokwa ihe fọrọ nta ka ọ bụrụ afọ anọ, ndị nche nọ n’ókè anyị na Switzerland akwụsịghị anyị ma ọ bụ gbalịa inyocha anyị—ya bụ, ruo otu ụbọchị na February 1938.

A Nwụde Anyị!

Agaghị m echefu otú ihu papa m dị mgbe anyị rutere ebe anyị na-ebu akwụkwọ bụ́ nke dịdebere Basel ma hụ ùkwù akwụkwọ buru ibu na-eche anyị. N’ihi na a nwụchiri ezinụlọ ọzọ na-ebu ozi, anyị nwekwuru akwụkwọ anyị ga-ebu. N’ókè anyị na Switzerland, otu onye ọrụ mbupụ na mbubata ngwá ahịa lere anyị anya abụọ ma kwuo na a ga-enyocha anyị. Mgbe ọ chọtara akwụkwọ ndị ahụ, ọ tụwara anyị égbè ma duru anyị gawa ebe a dọwara ụgbọala ndị uwe ojii. Ka ndị uwe ojii kwọọrọ anyị pụọ, papa m jidere aka m ma gbanyere m izu, sị: “Aghọla onye sabo. Agbala onye ọ bụla àmà!” “Agaghị m eme otú ahụ,” ka m mesiri ya obi ike. Mgbe anyị laghachiri Lörrach, ha kpọọrọ papa m m hụrụ n’anya pụọ. Ahụrụ m ya nke ikpeazụ ka e mechibidoro ya ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ.

Ruo awa anọ, ndị Gestapo anọ gbara m ajụjụ ọnụ, na-achọ ka m gwa ha aha na adres Ndịàmà ndị ọzọ. Mgbe m jụrụ, otu onye ọrụ ha were oké iwe ma yie m egwu, sị, “Anyị nwere ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi mee ka i kwuo okwu!” Ekpugheghị m ihe ọ bụla. Mgbe ahụ ha kpọghachiri mụ na mama m n’ụlọ anyị, bụ́ nke ha nyochara nke mbụ ya. Ha jichiri mama m ma ziga m n’ụlọ nwanne mama m ma nyefee m n’aka ya ilekọta n’amaghị na ọ bụkwa Onyeàmà. Ọ bụ ezie na a na-ekwe ka m gaa ọrụ, ndị Gestapo anọ na-anọ n’ime ụgbọala a kwụwara n’ihu ụlọ na-ele ihe ọ bụla m na-eme, otu onye uwe ojii ana-agagharịkwa n’akụkụ ụzọ.

Ka ụbọchị ole na ole gasịrị, n’ehihie, apụtara m n’èzí ma hụ ka otu nwanna nwanyị na-eto eto ji ịnyịnya ígwè na-agbata n’ebe m nọ. Ka ọ na-erute nso, apụrụ m ịhụ na ọ chọrọ ịtụrụ m otu mpempe akwụkwọ. Ozugbo m tụtụụrụ mpempe akwụkwọ ahụ, atụgharịrị m ile ma ndị Gestapo hà hụrụ ihe m mere. N’ụzọ juru m anya, kpọmkwem n’oge ahụ, ha nile hulatara ala na-achị ọchị!

Mpempe akwụkwọ ahụ nwanna nwanyị ahụ nyere m kwuru ka m gaa n’ụlọ ndị mụrụ ya n’ehihie. Ma ka ndị Gestapo nọ na-ele m, olee otú m ga-esi mee ihe ga-etinye ndị mụrụ ya ná nsogbu? Elere m ndị ọrụ Gestapo anọ ahụ nọ n’ime ụgbọala anya, leekwa onye uwe ojii ahụ nọ na-agagharị n’okporo ámá. Amaghị m ihe m ga-eme, ekpesikwara m ekpere ike nye Jehova maka enyemaka. Na mberede, onye uwe ojii ahụ gara n’ụgbọala ndị Gestapo ahụ ma gwa ndị ikom ahụ okwu. Mgbe ahụ, ọ banyere n’ụgbọala ha, ha kwọpụkwara!

Ozugbo ahụ, nwanne mama m pụtara. Ọ gafewo ehihie. Ọ gụrụ mpempe akwụkwọ ahụ ma chee na anyị kwesịrị ịga n’ụlọ ahụ a gwara m gaa, na-eche na ụmụnna emewo ndokwa ịkpọfe m Switzerland. Mgbe anyị rutere, ezinụlọ ahụ kọwaara m otu nwoke m na-amaghị, bụ́ Heinrich Reiff. Ọ gwara m na obi dị ya ụtọ na m pụtara n’udo nakwa na ya bịara inyere m aka ịgbaga Switzerland. O nyere m ọkara awa iji zute ya n’ọhịa.

Ndụ ná Mba Ọzọ

Ejiri m anya mmiri zute Nwanna Reiff, na-enwe mwute n’echiche nke ịhapụ ndị mụrụ m. Ihe a nile mere ngwa ngwa. Mgbe oge ụfọdụ nke obi erughị ala gasịrị, anyị sooro otu ìgwè na-eme njem nleta ma gafee ókè anyị na Switzerland n’udo.

Mgbe m rutere n’alaka ụlọ ọrụ dị na Bern, achọpụtara m na ọ bụ ụmụnna nọ ebe ahụ mere ndokwa maka mgbapụ m. Ha ji obiọma nye m ebe m ga-anọ. Arụrụ m ọrụ na kichin bụ́ nke m nwere nnọọ mmasị na ya. Ma lee ka o si sie ike ibi ná mba ọzọ, n’amaghị ihe ga-eme ndị mụrụ m, bụ́cha ndị a mara ikpe ịga mkpọrọ afọ abụọ! Mgbe ụfọdụ, mwute na nchegbu na-erikpu m, m na-agbachigidekwa onwe m ụzọ n’ebe ịsa ahụ́ ma na-ebe ákwá. Ma mụ na ndị mụrụ m derịtara akwụkwọ ozi mgbe mgbe, ha gbakwara m ume ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe.

N’ịbụ onye ihe nlereanya nke okwukwe nke ndị mụrụ m kwaliri, araara m ndụ m nye Jehova, e meekwa m baptizim na July 25, 1938. Mgbe m nọsịrị otu afọ na Betel, agara m ịrụ ọrụ na Chanélaz, ubi nke alaka ụlọ ọrụ Switzerland zụtara iji na-emepụta nri maka ezinụlọ Betel nakwa maka ịbụ ebe obibi nye ụmụnna ndị gbara ọsọ n’ihi mkpagbu.

Mgbe ndị mụrụ m nọzuru oge mkpọrọ ha na 1940, ndị Nazi kwere nkwa ịtọhapụ ha ma ọ bụrụ na ha ga-ajụ okwukwe ha. Ha jisiri okwukwe ha ike, e zigakwara ha n’ogige ịta ahụhụ, e zigara papa m na Dachau, zigakwa mama m na Ravensbrück. N’oge oyi nke 1941, mama m na ụmụ nwanyị ọzọ bụ́ Ndịàmà nọ n’ogige ahụ jụrụ ịrụ ọrụ agha. Iji taa ha ahụhụ, e mere ka ha guzoro n’oyi ruo ụbọchị 3 ehihie na abalị, mgbe nke ahụ gasịkwara a tụkpuru ha n’ụlọ nga gbara ọchịchịrị ma na-enye ha obere nri ruo ụbọchị 40. Mgbe ahụ, a pịara ha ihe. Mama m nwụrụ na January 31, 1942, izu atọ ka e jisịrị obi ọjọọ tie ya ihe.

E si Dachau ziga papa m na Mauthausen nke dị n’Austria. N’ogige a, ndị Nazi ji nwayọọ nwayọọ na-egbu ndị mkpọrọ site n’ịkwụ ha agụụ na ime ka ha na-arụ ọrụ ike. Ma ọnwa isii ka mama m nwụsịrị, ndị Nazi ji ụzọ ọzọ—nnwale nke ọgwụ—gbuo papa m. Ndị dọkịta ogige ahụ ma ụma gbanye ndị e ji mee nnyocha ọrịa ụkwara nta n’ahụ́. Mgbe nke ahụ gasịrị, a gbanyere ndị mkpọrọ ahụ ọgwụ na-egbu egbu n’obi. Ihe ndekọ ogige ahụ kwuru na papa m nwụrụ n’ihi “uru ahụ́ obi nke na-esighị ike.” Ọ gbara afọ 43. Anụrụ m banyere ogbugbu obi ịta mmiri ndị ahụ ọnwa ole na ole ka e mesịrị. Icheta ndị mụrụ m m hụrụ n’anya ka na-agba m anya mmiri. Ma, dị ka ọ dị ugbu a na n’oge ahụ, ana m enweta nkasi obi n’ịmara na mama m na papa m, bụ́ ndị nwere olileanya nke ndụ eluigwe, nọ ná nchebe n’aka Jehova.

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, enwere m ihe ùgwù nke ịga klas nke 11 nke Watchtower Bible School of Gilead na New York. Lee ihe ọṅụ ọ bụ imikpu onwe m n’ọmụmụ nke Akwụkwọ Nsọ ruo ọnwa ise! Mgbe m gụsịrị akwụkwọ na 1948, e zigara m Switzerland ije ozi dị ka onye ozi ala ọzọ. Oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị amatara m James L. Turpin, bụ́ nwanna nwoke kwesịrị ntụkwasị obi nke gụsịrị akwụkwọ na klas nke ise n’ụlọ akwụkwọ Gilead. Mgbe e guzobere alaka ụlọ ọrụ nke mbụ na Turkey, o jere ozi dị ka onye nlekọta ya. Anyị lụrụ na March 1951, n’oge na-adịghịkwa anya ka nke ahụ gasịrị, anyị ghọtara na anyị na-aga ịghọ nne na nna! Anyị kwagara United States ma nabata nwa anyị nwanyị, bụ́ Marlene, n’ụwa na December nke afọ ahụ.

Kemgbe ọtụtụ afọ ndị a, mụ na Jim achọtawo ọṅụ n’ozi Alaeze anyị. Ana m eji obi ụtọ echeta otu onye m mụụrụ Bible, bụ́ nwa agbọghọ onye China aha ya bụ Penny, bụ́ onye nwere nnọọ mmasị n’ịmụ Bible. E mere ya baptizim, ya emesịakwa lụọ Guy Pierce, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ndị dị otú ahụ m hụrụ n’anya enyewo aka mejuo oghere nke ọnwụ ndị mụrụ m hapụrụ.

Ná mmalite afọ 2004, ụmụnna ndị nọ na Lörrach, bụ́ obodo ndị mụrụ m, wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’Okporo Ámá Stich. Iji gosi na ha nwere ekele maka ihe Ndịàmà Jehova mere, kansụl obodo ahụ kpebiri inye okporo ámá ahụ aha bụ́ Denzstraße (Okporo Ámá Denz) iji kwanyere ndị mụrụ m ùgwù. N’okpuru isi akụkọ bụ́ “Iji Cheta Maazị na Oriakụ Denz E Gburu Egbu: Aha Ọhụrụ nke Okporo Ámá,” akwụkwọ akụkọ bụ́ Badische Zeitung bụ́ nke a na-ebipụta n’ógbè anyị kwuru na ‘e gburu ndị mụrụ m n’ogige ịta ahụhụ n’oge Ọchịchị Alaeze Ukwu nke Atọ n’ihi okwukwe ha.’ Nye m, ihe ahụ kansụl obodo anyị mere bụ ihe a na-atụghị anya ya na mgbanwe ọnọdụ nke na-enye nnọọ obi ụtọ.

Papa m na-ekwukarị na anyị kwesịrị ịdị na-eme atụmatụ maka ọdịnihu dị ka à ga-asị na Amagedọn agaghị abịa n’oge anyị ma na-ebi ndụ dị ka à ga-asị na ọ ga-abịa echi—ndụmọdụ dị oké ọnụ ahịa nke m na-agbalị itinye n’ọrụ mgbe nile. Inwe ndidi ma n’otu oge ahụ nwee atụmanya siri ike adịghị adịrị m mfe mgbe nile, karịsịa ebe ọ bụ na ihe ndị ime agadi na-akpata emewo ka m gharazie ịdị na-apụta èzí. Ma ọ dịbeghị mgbe m nwere obi abụọ banyere nkwa a Jehova kwere ndị ohu ya nile na-ekwesị ntụkwasị obi: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, . . . n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]

OKWU NDỊ DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA E DERE N’OGE GARA AGA

Otu nwanyị si n’obodo nta dịtụ anya site na Lörrach bịara Lörrach n’afọ ndị 1980. N’oge ahụ, ndị obodo ahụ nọ na-ebupụtasị ihe onwunwe ha ndị ha na-achọghịzi n’ámá obodo bụ́ ebe ndị ọzọ pụrụ ịhọrọ ndị ha chọrọ. Nwanyị a chọtara igbe e tinyere ihe ndị e ji akwa ákwà ma were ya laa. Ka e mesịrị, ọ hụrụ foto ụfọdụ nke otu nwata nwanyị na akwụkwọ ozi ndị e ji akwụkwọ ndị e ji ede ihe n’ogige ịta ahụhụ dee n’ala ala igbe ahụ. Akwụkwọ ozi ndị ahụ kpaliri mmasị nwanyị ahụ, ọ nọkwa na-eche onye obere nwata nwanyị ahụ a kpara isi bụ.

Otu ụbọchị n’afọ 2000, nwanyị ahụ hụrụ otu isiokwu akwụkwọ akụkọ na-ekwu banyere ihe ngosi akụkọ ihe mere eme e mere na Lörrach. Isiokwu ahụ kọwara akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova n’afọ ndị Nazi chịrị, gụnyere nke ezinụlọ anyị. Foto ndị m sere mgbe m nọ n’afọ iri na ụma dị na ya. N’ijikọta ya na ihe ndị ọ hụrụ n’igbe ahụ, nwanyị ahụ kpọtụụrụ onye dere akụkọ ahụ ma gwa ya banyere akwụkwọ ozi ndị ahụ—ha dị 42 n’ọnụ ọgụgụ! Izu ole na ole ka nke ahụ gasịrị, enwetara m ha. Nke ahụ bụ ihe ndị mụrụ m dere bụ́ ndị ha ji na-ajụ nwanne mama m banyere m. Nchegbu ịhụnanya ha nwere n’ebe m nọ adịghị mgbe ọ kwụsịrị. Ọ bụ ihe ịtụnanya na akwụkwọ ozi ndị ahụ lanarịrị ma pụtaghachi mgbe ihe karịrị afọ 60 gasịrị!

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

E tisara ezinụlọ anyị nwere obi ụtọ mgbe Hitler banyere n’ọchịchị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Hitler: Foto Ndị Agha U.S.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

1. Ụlọ ọrụ ahụ dị na Magdeburg

2. Ndị Gestapo nwụchiri ọtụtụ puku Ndịàmà

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na Jim nwetara ọṅụ dị ukwuu n’ozi Alaeze anyị