Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ji gwa Tọmọs ka o metụ ya aka ma gbochie Meri Magdalin ime otú ahụ tupu mgbe ahụ?

Ụfọdụ nsụgharị Bible ndị ka mee ochie na-enye echiche na Jizọs gwara Meri Magdalin ka ọ ghara imetụ ya aka. Dị ka ihe atụ, Bible Nsọ nke Union Version si otú a tinye ihe ahụ Jizọs kwuru: “Emetụla m aka; n’ihi na akarịgoghị m lakwuru Nna m.” (Jọn 20:17) Otú ọ dị, ngwaa Grik mbụ, bụ́ nke a na-asụgharịkarị ịbụ “metụ,” pụtara “ịrapara, ijidesi ike, ijide, ịbagide, ijide aka.” N’ụzọ ezi uche dị na ya, ihe Jizọs na-ekwu abụghị ka Meri Magdalin ghara imetụ ya aka nkịtị ebe o kwere ka ndị inyom ọzọ bịara n’ili ya “jide ya n’ụkwụ.”—Matiu 28:9.

Ọtụtụ nsụgharị ndị e ji asụsụ ndị e ji eme ihe n’oge a mee, dị ka Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, The New Jerusalem Bible, na The New English Bible, na-enyere anyị aka ịghọta ihe okwu Jizọs pụtara n’ezie site n’isi otú a tinye ya: “Kwụsị ịrapara m n’ahụ́.” Gịnị mere Jizọs ga-eji gwa Meri Magdalin, bụ́ ezigbo enyi ya, okwu dị otú ahụ?—Luk 8:1-3.

O yiri ka egwu ọ̀ nọ na-atụ Meri Magdalin na Jizọs na-aga ịhapụ ya ma rịgoro n’eluigwe. N’ịbụ onye ọchịchọ siri ike o nwere ịnọnyere Onyenwe ya kpaliri, ọ nọ na-ejigidesi Jizọs ike, n’ekweghị ka ọ laa. Iji mesie ya obi ike na ya alawabeghị, Jizọs gwara Meri ka ọ kwụsị ịrapara ya n’ahụ́ ma kama nke ahụ ka ọ gaa gwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ebilitewo n’ọnwụ.—Jọn 20:17.

Nkwurịta okwu dị n’etiti Jizọs na Tọmọs dị iche. Mgbe Jizọs pụtara n’ihu ụfọdụ ndị na-eso ụzọ, Tọmọs anọghị ya. Ka e mesịrị, Tọmọs kwupụtara obi abụọ ya banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs, na-ekwu na ya agaghị ekweta ọ gwụla ma ya hụrụ ọnyá ebe a kụrụ Jizọs ntú ma rụnye aka n’ebe a mara Jizọs ube n’akụkụ. Ụbọchị asatọ ka e mesịrị, Jizọs pụtaghachiri n’ihu ndị na-eso ụzọ ya. N’oge a, Tọmọs nọ ya, Jizọs gwakwara ya ka o metụ ọnyá ya aka.—Jọn 20:24-27.

N’ihi ya, a bịa n’ihe banyere Meri Magdalin, Jizọs na-eme ihe banyere ọchịchọ na-ezighị ezi e nwere igbochi ya ịla; n’akụkụ nke Tọmọs, Jizọs nọ na-enyere onye nwere obi abụọ aka. N’ọnọdụ abụọ ahụ, Jizọs nwechara ezi ihe mere o ji mee ihe o mere.