Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Ga-agụ—Ndụmọdụ Solomọn nke Amamihe Dị na Ya

Ihe A Ga-agụ—Ndụmọdụ Solomọn nke Amamihe Dị na Ya

Ihe A Ga-agụ—Ndụmọdụ Solomọn nke Amamihe Dị na Ya

“IME ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ; ọtụtụ mmụta bụkwa ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ́.” (Eklisiastis 12:12) N’ide okwu ndị ahụ ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, Eze Solomọn maara ihe nke Izrel adịghị akagbu ịgụ akwụkwọ. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu banyere mkpa ọ dị ime nhọrọ. Lee ka ihe ncheta ahụ si bụrụ ihe kwesịrị oge a ka a na-ebipụta ọtụtụ ijeri akwụkwọ ọgụgụ n’ụwa kwa afọ!

O doro anya na “ọtụtụ akwụkwọ” ndị Solomọn zoro aka na ha adịghị ewuli elu ma ọ bụ na-enye ume ọhụrụ. N’ihi ya, o kwuru na itinye uche na ha na-akpata “ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ́” kama ịdị na-enye ezi ụgwọ ọrụ, na nke na-adịgide adịgide.

Otú ọ dị, Solomọn ọ̀ na-ekwu na ọ dịghị akwụkwọ ndị na-enye ezi nduzi a pụrụ ịdabere na ya, nke pụrụ ịbara onye na-agụ ha uru? Ee e, n’ihi na o dekwara, sị: “Okwu nile nke ndị maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi, ọzọ, dị ka ntú a kụmiri nke ọma ka okwu nke ndị nwe nzukọ dị, bụ́ okwu e nyere site n’aka otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Eklisiastis 12:11) N’ezie, e nwere okwu ndị e dere ede, bụ́ ndị, “dị ka ndụdụ e ji achụ ehi,” pụrụ ịkpali mmadụ n’ụzọ ziri ezi. Ha pụrụ ịkpali mmadụ ime ihe dị mma. Ọzọkwa, “dị ka ntú a kụmiri nke ọma,” ha pụrụ inye aka iwusi mkpebi mmadụ ike ma mee ka ọ kwụsie ike.

Olee ebe anyị pụrụ ịchọta okwu amamihe ndị dị otú ahụ? Ebe kachasị ndị ọzọ a pụrụ ịchọta ha, dị ka Solomọn si kwuo, bụ n’okwu ndị ahụ sitere n’aka otu Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ, bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 23:1) N’ihi ya, akwụkwọ kasị mma mmadụ pụrụ ịhọrọ bụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke—Bible. Ịgụchi okwu ndị dị otú ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ anya pụrụ inye aka mee ka mmadụ “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.