Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua

N’ỊBỤ ndị mara ụlọikwuu ha n’Ala Dị Larịị nke Moab na 1473 T.O.A., ọ ghaghị ịbụ na ndị Izrel nwere obi ụtọ ịnụ okwu ndị a: “Doziere onwe unu ihe unu ga-eri n’ụzọ; n’ihi na ọ fọdụrụ ụbọchị atọ unu ewee gabiga Jọdan nke a, ịba n’ime inweta ala ahụ nke Jehova, bụ́ Chineke unu, na-enye unu inweta ya.” (Joshua 1:11) Njem afọ 40 ha n’ịkpa na-abịa ná njedebe.

Ihe gafetụrụ iri afọ abụọ ka e mesịrị, onye ndu ha bụ́ Jọshụa guzo n’etiti ala Kenan ma kpọsaara ndị okenye nke Izrel, sị: “Leenụ, emewo m ka mba ndị a ndị fọdụrụ danyere unu n’ihe nketa dịịrị ebo nile unu, site na Jọdan, ha na mba ahụ nile ndị m bipụworo, wee ruo oké osimiri ukwu ahụ n’ọdịda anyanwụ. Jehova, bụ́ Chineke unu, Ya onwe ya ga-akwapụkwa ha n’ihu unu, napụkwa ha ala ha n’ihu unu; unu ga-enwetakwa ala ha, dị ka Jehova, bụ́ Chineke unu, gwara unu okwu.”—Joshua 23:4, 5.

N’ịbụ nke Jọshụa dere na 1450 T.O.A., akwụkwọ Joshua bụ akụkọ na-akpali akpali nke ihe mere n’afọ 22 ndị ahụ. Ka anyị na-eguzo n’ọnụ ọnụ nke ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ọnọdụ anyị yiri nke ụmụ Izrel ahụ dị njikere inweta Ala Nkwa ahụ. Ka anyị jirizie ezi mmasị tụlee akwụkwọ Joshua.—Ndị Hibru 4:12.

“N’ALA IHE NA-ADỊGHỊ NKE JERIKO”

(Joshua 1:1–5:15)

Lee ọrụ dị mkpa Jọshụa nwetara mgbe Jehova gwara ya, sị: “Mozis, bụ́ ohu m, anwụrụwo; ma ugbu a bilie, gabiga Jọdan nke a, gị onwe gị, na ndị nke a nile, ruo ala ahụ nke Mụ onwe m na-enye ha, bụ́ ụmụ Izrel”! (Joshua 1:2) Jọshụa na-aga iduru mba nke dị ọtụtụ nde mmadụ banye n’Ala Nkwa ahụ. Iji kwadebe, ya ezipụ ndị nledo abụọ gaa Jeriko—bụ́ obodo a ga-ebu ụzọ merie. Rehab bụ́ nwanyị na-akwa iko, onye nụworo banyere ọrụ ndị dị ike Jehova rụwooro ndị ya, bi n’obodo ahụ. Ya echebe ma nyere ndị nledo ahụ aka, ha ekwekwa ya nkwa ichebe ya.

Mgbe ndị nledo ahụ lọtara, Jọshụa na ndị obodo ahụ ejikere ịgafe Jọdan. Ọ bụ ezie na osimiri ahụ tojuru etoju, ọ bụghịrị ha ihe mgbochi n’ihi na Jehova mere ka mgbago mgbago nke mmiri ahụ kpụkọọ dị ka ihe mgbochi mmiri ma mee ka ebe mgbada ya rubanye n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Mgbe ndị Izrel gafesịrị Jọdan, ha amaa ụlọikwuu ha na Gilgal, na nso Jeriko. Ụbọchị anọ ka e mesịrị, n’anyasị nke ụbọchị nke 14 nke Abib, ha emee Ememe Ngabiga n’ala ihe na-adịghị nke Jeriko. (Joshua 5:10) N’echi ya, ha amalite iri ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ala ahụ, mana akwụsịkwa ịda. N’oge a, Jọshụa ebie ụmụ nwoke nile a mụrụ n’ịkpa úgwù.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:4, 5—Gịnị mere Rehab ji duhie ndị ozi eze bụ́ ndị na-achọ ndị nledo ahụ? Rehab chebere ndị nledo ahụ, na-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ihi na o nwewo okwukwe na Jehova. N’ihi ya, iwu ejighị ya ịgwa ndị ahụ na-achọ imerụ ndị Chineke ahụ́ ebe ndị nledo ahụ nọ. (Matiu 7:6; 21:23-27; Jọn 7:3-10) N’ezie, e ‘sitere n’ọrụ kpọọ Rehab onye ezi omume,’ tinyere ọrụ nke iduhie ndị ozi eze.—Jems 2:24-26.

5:14, 15—Ònye bụ “onye isi usuu ndị agha Jehova”? Onye isi ahụ nke bịara iwusi Jọshụa ike ka a malitere imeri Ala Nkwa ahụ eyighị ka ọ̀ bụ onye ọ bụla ọzọ karịa “Okwu ahụ”—Jizọs Kraịst tupu ya aghọọ mmadụ. (Jọn 1:1; Daniel 10:13) Lee ihe na-ewusi ike ọ bụ inwe mmesi obi ike bụ́ na Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube na-anọnyere ndị Chineke taa ka ha na alụ agha ime mmụọ!

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:7-9. Ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịtụgharị uche mgbe nile n’ihe ọ na-ekwu na itinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ dị oké mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ.

1:11. Jọshụa gwara ụmụ Izrel ka ha doziere onwe ha ihe ha ga-eri ma ghara iji umengwụ na-eche ka Chineke nye ha ihe. Ndụmọdụ Jizọs bụ́ ka anyị kwụsị ichegbu onwe anyị banyere ihe ndị dị mkpa ná ndụ, tinyere nkwa o kwere bụ́ na “a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile,” apụtaghị na anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla iji nyere onwe anyị aka.—Matiu 6:25, 33.

2:4-13. Mgbe Rehab nụsịrị banyere oké ọrụ ndị Jehova rụrụ, ghọtakwa na oge ahụ dị mkpa, o kpebiri ịdịnyere ndị na-efe Jehova. Ọ bụrụ na ị nọwo na-amụ Bible ruo oge ụfọdụ ma ghọta na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ,” ọ̀ bụ na i kwesịghị ikpebi ijere Chineke ozi?—2 Timoti 3:1.

3:15. Ebe ọ bụ na ndị nledo ahụ e zigara Jeriko wetara ozi dị mma, Jọshụa mere ihe ngwa ngwa, n’echeghị ka mmiri Jọdan talata. Mgbe a bịara n’ihe ndị metụtara ezi ofufe, anyị aghaghị iji obi ike mee ihe kama igbu oge ruo mgbe ọnọdụ yiri ka ọ̀ katụla mma.

4:4-8, 20-24. Nkume 12 ndị ahụ e butere n’ala osimiri Jọdan ga-abụrụ ndị Izrel ihe ncheta. Nnapụta Jehova na-anapụta ndị ya nke oge a site n’aka ndị iro ya bụkwa ihe ncheta na ọ na-anọnyere ha.

MMERI AHỤ AGAA N’IHU

(Joshua 6:1–12:24)

E “mechiri ọnụ ụzọ ámá [Jeriko]: ọ dịghị onye na-apụ n’èzí, ọ dịghịkwa onye na-aba n’ime.” (Joshua 6:1) Olee otú a ga-esi weghara obodo ahụ? Jehova agwa Jọshụa otú ọ ga-esi mee ya. N’oge na-adịghị anya, mgbidi ya adaa, e bibiekwa obodo ahụ. A zọpụta nanị Rehab na ezinụlọ ya.

Ebe ọzọ e meriri bụ obodo alaeze bụ́ E-aị. Ndị nledo e zigara ebe ahụ ekwuo na ndị bi n’obodo ahụ dị ole na ole, n’ihi ya na a chọghị ọtụtụ mmadụ iji bibie ya. Otú ọ dị, ihe dị ka ndị agha 3,000 e zigara ịwakpo obodo ahụ agbalaga site n’ihu ndị ikom E-aị. N’ihi gịnị? Jehova anọnyereghị ndị Izrel. Ekan bụ́ onye si n’ebo Juda mehiere mgbe a na-awakpo Jeriko. Mgbe ọ hụchara maka okwu ahụ, Jọshụa awakpo E-aị. Ebe o meriworo ndị Izrel na mbụ, eze E-aị dị njikere izute ha n’agha. Ma Jọshụa ejiri atụmatụ lekwasịrị anya n’obi ike gabigara ókè ndị ikom E-aị nwere mee ihe, Jọshụa ewegharakwa obodo ahụ.

Gibiọn bụ ‘obodo ukwu—nke dị ukwuu karịa E-aị, ndị ikom ya nile bụkwa ndị dike.’ (Joshua 10:2) Otú ọ dị, mgbe ha nụrụ na ndị Izrel emeriwo Jeriko na E-aị, ndị ikom Gibiọn aghọọ Jọshụa aghụghọ site n’iso ndị Izrel gbaa ọgbụgba ndụ udo. Mba ndị bidebere ha elee mgbahapụ a anya dị ka ihe iyi egwu nye ha. Ise n’ime ndị eze ha ejikọọ aka ma wakpoo Gibiọn. Izrel anapụta ndị Gibiọn ma merie ndị mwakpo ahụ kpamkpam. Ndị ọzọ Izrel meriri n’okpuru idu ndu Jọshụa gụnyere obodo ndị dị na ndịda na n’ọdịda anyanwụ, nakwa mmeri ha meriri ndị eze jikọtara aka nke ebe ugwu. Ndị eze nile e meriri n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Jọdan eruo 31.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

10:13—Olee otú ihe ịtụnanya dị otú ahụ si kwe omume? “Ọ̀ dị ihe karịrị Jehova,” bụ́ Onye Okike nke eluigwe na ala, “ime”? (Jenesis 18:14) Ọ bụrụ na Jehova achọọ, ọ pụrụ ịchịkwa ịgba gburugburu nke ụwa ka anyanwụ na ọnwa wee yie ka hà kwụ otu ebe nye onye si n’ụwa na-ekiri ha. Ma ọ bụ ọ pụrụ ikwe ka ngagharị nke ụwa na ọnwa dịgide otú ha dị ma mee ka a nọgide na-ahụ ìhè nke anyanwụ na ọnwa. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, “ọ [dịghị] ụbọchị dị ka nke ahụ” n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.—Joshua 10:14.

10:13—Gịnị bụ akwụkwọ Jasha? A kpọtụghachiri akwụkwọ ahụ aha na 2 Samuel 1:18 mgbe a na-ekwu banyere uri a na-akpọ “abụ ụta”—abụ e ji ruoro Eze Sọl nke Izrel na nwa ya nwoke bụ́ Jonatan újú. Eleghị anya, akwụkwọ ahụ bụ nchịkọta nke abụ na uri ndị metụtara ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’akụkọ ihe mere eme, o yikwara ka ọ̀ bụ nke a maara nke ọma n’etiti ndị Hibru.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

6:26; 9:22, 23. Ọbụbụ ọnụ ahụ Jọshụa kwupụtara n’oge mbibi Jeriko mezuru ihe dị ka afọ 500 ka e mesịrị. (1 Ndị Eze 16:34) Ọnụ Noa bụrụ nwa nwa ya bụ́ Kenan mezuru mgbe ndị Gibiọn ghọrọ ndị ọrụ. (Jenesis 9:25, 26) Okwu Jehova na-emezu mgbe nile.

7:20-25. Ụfọdụ ndị pụrụ ikwubi na ohi Ekan zuru bụ obere ịda iwu, eleghị anya na-eche na ọ dịghị nsogbu o wetaara ndị ọzọ. Ha pụrụ ịdị na-ele obere ohi na obere mmehie megide iwu Bible anya n’otu ụzọ ahụ. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịdị ka Jọshụa ná mkpebisi ike anyị iguzogide nrụgide nke ime ihe ndị iwu na-akwadoghị ma ọ bụ ndị rụrụ arụ.

9:15, 26, 27. Anyị aghaghị ịdị na-eji nkwekọrịta ndị anyị mere akpọrọ ihe ma na-emezu okwu anyị.

JỌSHỤA AMALITE ỌRỤ IKPEAZỤ YA TARA AKPỤ

(Joshua 13:1–24:33)

Ugbu a o meworo okenye—na-eru afọ 90—Jọshụa amalite ike ala ahụ. Nnukwu ọrụ n’ezie! Ebo Ruben na Gad na ọkara ebo Manase enwetaworị ihe nketa nke ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan. E nyezie ebo ndị fọdụrụnụ ihe nketa n’akụkụ ọdịda anyanwụ site n’ife nza.

E guzobe ụlọikwuu na Shaịlo n’ókèala Ifrem. Keleb enweta obodo Hibrọn, Jọshụa enwetakwa Timnat-sira. E nye ndị Livaị obodo 48, tinyere obodo mgbaba 6. Ka ha nọ na-alaghachi n’ihe nketa ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan, ndị dike nke Ruben, Gad na ọkara ebo Manase eguzobe ebe ịchụàjà nke dị “ukwuu n’ile ya anya.” (Joshua 22:10) Ebo nile bi n’akụkụ ọdịda anyanwụ Jọdan elee nke a anya dị ka ndapụ n’ezi ofufe, ya afọkwa nke nta ka agha ebo na ebo daa ma e gbochie mwụfu ọbara site n’ezi nkwurịta okwu.

Ka Jọshụa bisịrị na Timnat-sira ruo oge ụfọdụ, ya akpọkọta ndị okenye, ndị isi, ndị ikpe na ndị ọchịagha nke Izrel ma gbaa ha ume inwe obi ike na ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova. N’ikpeazụ, Jọshụa akpọkọta ebo nile nke Izrel na Shikem. N’ebe ahụ, ya atụleghachi ihe ndị Jehova meworo malite n’oge Ebreham gaa n’ihu, gbaakwa ha ume ọzọ ka ha ‘na-atụ egwu Jehova, na-efekwa Ya ofufe n’izu okè na n’eziokwu.’ A kpalie mba ahụ ịzaghachi, sị: “Jehova, bụ́ Chineke anyị, ka anyị ga-efe ofufe, olu Ya ka anyị ga-egekwa ntị.” (Joshua 24:14, 15, 24) Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jọshụa anwụọ mgbe ọ dị afọ 110.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

13:1—Ọ̀ bụ na nke a adịghị emegide ihe e kwuru na Joshua 11:23? Ee e, n’ihi na mmeri e meriri Ala Nkwa ahụ nwere akụkụ abụọ: agha mba e ji merie ndị eze 31 nke ala Kenan, bụ́ nke bibiri ike ndị Kenan, na mweghara nke ala ahụ n’ụzọ zuru ezu site ná mwakpo ebo dị iche iche na ndị mmadụ n’otu n’otu mere. (Joshua 17:14-18; 18:3) Ọ bụ ezie na ụmụ Izrel achụpụchaghị ndị Kenan kpamkpam, ndị fọdụrụnụ abụghịrị ndị Izrel ihe iyi egwu. (Joshua 16:10; 17:12) Joshua 21:44 na-ekwu, sị: “Jehova wee mee ka ha zuru ike gburugburu.”

24:2—Nna Ebreham bụ́ Tira, ọ̀ bụ onye na-ekpere arụsị? Na mbụ, Tira adịghị efe Jehova Chineke. O yiri ka ò fere chi ọnwa a na-akpọ Sin—chi a ma ama na Ọọ. Dị ka omenala ndị Juu si dị, ọ pụrụrịị ịbụ na Tira bụ onye na-akpụ arụsị. Otú ọ dị, mgbe Ebreham na-ahapụ Ọọ dị ka Chineke gwara ya, Tira sooro ya gaa Heran.—Jenesis 11:31.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

14:10-13. Ọ bụ ezie na ọ dị afọ 85, Keleb rịọrọ ka e nye ya ọrụ tara akpụ nke ịchụpụ ndị bi na Hibrọn. Ndị bi ebe ahụ bụ ndị Anakịm—ndị gbara agba nke ukwuu. Site n’enyemaka Jehova, onye agha a nwere ahụmahụ nwere ihe ịga nke ọma, Hibrọn ghọkwara obodo mgbaba. (Joshua 15:13-19; 21:11-13) Ihe atụ Keleb na-agba anyị ume ịghara izere ọrụ ọchịchị Chineke ndị tara akpụ.

22:9-12, 21-33. Anyị aghaghị ịkpachara anya ịghara ịkọwahie ebumnobi ndị ọzọ.

“Ọ Dịghị Otu Ihe Dapụrụ”

Mgbe o meworo nnọọ agadi, Jọshụa gwara ndị ikom Izrel nwere ibu ọrụ, sị: “Ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu.” (Joshua 23:14) Lee ka ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke Joshua si egosi nke a nke ọma!

“Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka,” ka Pọl onyeozi dere, “ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Anyị pụrụ ijide n’aka na olileanya anyị nwere ná nkwa ndị Chineke kwere agaghị efu ọhịa. Ọ dịghị nkwa ya nke ga-ada ada; ha nile ga-emezu.

[Map dị na peeji nke 10]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ala e meriri n’okpuru idu ndu Jọshụa

BESHAN

GILIED

ARABA

NEGEB

Osimiri Jọdan

Oké Osimiri Nnu

N.M.I. Jabọk

N.M.I. Anọn

Hezọ

Medọn

Lasharọn

Shimrọn

Jọkniam

Dọọ

Megido

Kidesh

Teanak

Hifa

Teza

Efek

Tapua

Betel

E-aị

Gilgal

Jeriko

Giza

Jeruselem

Makida

Jamọt

Adullam

Libna

Lekish

Eglọn

Hibrọn

Diba

Erad

[Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ maara ihe mere e ji kpọọ Rehab bụ́ nwanyị na-akwa iko onye ezi omume?

[Foto dị na peeji nke 10]

Jọshụa gbara ndị Izrel ume ka ha ‘tụọ egwu Jehova ma fee ya’

[Foto dị na peeji nke 12]

Ohi Ekan zuru abụghị obere mmehie—ọ rụpụtara ihe ndị dị njọ

[Foto dị na peeji nke 12]

“Site n’okwukwe mgbidi Jeriko daruru ala.”—Ndị Hibru 11:30