Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe

Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe

Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe

“Onye na-akwa emo ka mmanya vaịn bụ, onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya bụ; onye ọ bụla nke na-awagharị site na ya amaghị ihe.”—ILU 20:1.

1. Olee otú ọbụ abụ ahụ si gosipụta ekele o nwere maka ụfọdụ n’ime ezi onyinye ndị sitere n’aka Jehova?

“EZI onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè sitere n’elu, n’ihi na o si n’ebe Nna nke ìhè eluigwe nọ na-abịa,” ka Jems onye na-eso ụzọ dere. (Jems 1:17) N’ịbụ onye ekele o nwere maka ọtụtụ onyinye ọma nke Chineke kpaliri, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ị bụ Onye na-eme ka ahịhịa puoro anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ n’ala puoro ọrụ ubi mmadụ; ime ka nri si n’ala pụta: na mmanya vaịn nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa, ime ka ihu ya na-egbupụ site ná mmanụ, na achịcha nke na-eme ka mmadụ nwee ume n’obi.” (Abụ Ọma 104:14, 15) Dị ka ahịhịa ndụ, achịcha, na mmanụ, mmanya na ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya bụ ezi onyinye ndị sitere n’aka Chineke. Olee otú anyị kwesịrị isi jiri ha na-eme ihe?

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle banyere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe?

2 Onyinye na-enye ọṅụ dị mma nanị mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, mmanụ aṅụ “dị mma,” ma “ịracha mmanụ aṅụ hie nne adịghị mma.” (Ilu 24:13; 25:27) Ọ bụ ezie na ịṅụ “obere mmanya” pụrụ ịdị mma, iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi bụ ezigbo nsogbu. (1 Timoti 5:23) “Onye na-akwa emo ka mmanya vaịn bụ,” ka Bible na-adọ aka ná ntị, “onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya bụ; onye ọ bụla nke na-awagharị site na ya amaghị ihe.” (Ilu 20:1) Otú ọ dị, gịnị ka ịwagharị n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya gụnyere? * Ịṅụ mmanya ha aṅaa bụ ịṅụbiga ya ókè? Gịnị bụ echiche ziri ezi n’akụkụ a?

‘Ịwagharị’ Site n’Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya—N’ụzọ Dị Aṅaa?

3, 4. (a) Gịnị na-egosi na Bible katọrọ mmadụ ịṅụgide mmanya ruo mgbe o gbuwere ya egbuwe? (b) Olee ihe ụfọdụ e ji amata mgbe a ṅụbigara mmanya ókè?

3 N’Izrel oge ochie, a na-eji nkume atụgbu nwa ọ bụla nke na-eribiga ihe ókè ma na-aṅụbiga mmanya ókè ma ghara igosi nchegharị. (Deuterọnọmi 21:18-21) Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ọbụna unu na onye dị otú a erikọla ihe.” N’ụzọ doro anya, Akwụkwọ Nsọ kagburu mmadụ ịṅụgide mmanya ruo mgbe o gbuwere ya egbuwe.—1 Ndị Kọrint 5:11; 6:9, 10.

4 N’ịkọwa ihe e ji amata mgbe a ṅụbigara mmanya ókè, Bible na-ekwu, sị: “Elekwasịla mmanya vaịn anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-enye ụdị ya n’iko, mgbe ọ na-asụgharị n’iko nke ọma: n’ikpeazụ ya ọ bụ dị ka agwọ ka ọ na-ata, ọ bụkwa dị ka ajụala ka ọ na-atụ. Anya gị abụọ ga-ahụ ndị inyom na-abụghị nwunye gị [ma ọ bụ, “ihe ndị dị omimi”], obi gị ga-ekwukwa okwu ịgbakụta Chineke azụ.” (Ilu 23:31-33) Ịṅụbiga mmanya ókè na-ata ka agwọ, na-akpata ọrịa, uche mgbasasị, ọbụna ntụbọ. Onye aṅụrụma pụrụ ịhụ “ihe ndị dị omimi” n’ụdị na ọ pụrụ ịmụ anya na-arọ nrọ. O nwekwara ike ghara ịkwa ire ya nga n’ikwupụta echiche na ọchịchọ ndị rụrụ arụ bụ́ ndị a na-ekwesịghị ikwupụta.

5. N’ụzọ dị aṅaa ka ịṅụ oké mmanya si bụrụ ihe na-emerụ ahụ́?

5 Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ na-eji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe ma na-elezi anya ịghara ịṅụ ya ruo n’ókè ọ ga-apụta ìhè na ọ ṅụbigara mmanya ókè? Ihe àmà nke ịṅụbiga mmanya ókè adịghị apụtacha ìhè n’ahụ́ ụfọdụ ndị ọbụna mgbe ha ṅụsịworo ọtụtụ iko mmanya. Otú ọ dị, iche na omume dị otú ahụ adịghị ihe o mere bụ mmadụ iduhie onwe ya. (Jeremaịa 17:9) Nke nta nke nta, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ iri onye ahụ ahụ́, ya aghọọkwa “ohu nye oké mmanya.” (Taịtọs 2:3) Banyere otú mmadụ si aghọ onye aṅụrụma, onye edemede bụ́ Caroline Knapp na-ekwu, sị: “A na-eji nwayọọ nwayọọ, nke nta nke nta aghọ onye aṅụrụma.” Lee ka ịṅụ oké mmanya si bụrụ ọnyà na-egbu mmadụ!

6. N’ihi gịnị ka mmadụ ji kwesị izere ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè ya na iribiga nri ókè?

6 Tụleekwa ịdọ aka ná ntị Jizọs: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile.” (Luk 21:34, 35) Ọ dịghị mkpa ka mmanya gbuwe mmadụ egbuwe tupu ya emee ka onye ahụ mewe anya ụra ma ọ bụ dịrị umengwụ—n’ụzọ nkịtị nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Gịnị ma ọ bụrụ na ụbọchị Jehova abịakwasị onye ahụ n’ọnọdụ dị otú ahụ?

Ihe Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi Pụrụ Ịkpata

7. N’ihi gịnị ka iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ji megide ntụziaka ahụ e nyere ná 2 Ndị Kọrint 7:1?

7 Ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè na-etinye anyị n’ọtụtụ ihe ize ndụ—ma ndị nke ahụ́ ike ma ndị nke ime mmụọ. Ụfọdụ n’ime ọrịa ndị ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata bụ ọrịa imeju bụ́ cirrhosis, ịba ọcha n’anya na-esite n’ịṅụ mmanya, na ọrịa mkpasasị uche ndị dị ka delirium tremens. Ịnọgide jiri ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ruo ogologo oge pụkwara ịkpata ọrịa cancer, ọrịa shuga, na ọrịa obi na ọrịa afọ ụfọdụ. Iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi megidere nnọọ ntụziaka Akwụkwọ Nsọ, bụ́: “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.”—2 Ndị Kọrint 7:1.

8. Dị ka Ilu 23:20, 21 si kwuo, gịnị ka iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ ịrụpụta?

8 Iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụkwara ịkpata imefusị ego, ọbụna ọ pụrụ ime ka ọrụ mmadụ funahụ ya. Eze Solomọn nke Izrel oge ochie dọrọ aka ná ntị, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vaịn ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè.” N’ihi gịnị? Ọ kọwara, sị: “N’ihi na onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye na-eribiga ihe ókè ka a ga-anapụ ihe nile: ọ bụkwa nkịrịka ákwà ka òrù ụra ga-eyikwasị mmadụ.”—Ilu 23:20, 21.

9. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya mmadụ izere ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụrụ na ọ ga-anya ụgbọala?

9 N’izo aka n’ihe ize ndụ ọzọ, akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Alcoholism na-ekwu, sị: “Nnyocha ndị e mere egosiwo na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-akpata mbelata nke ikike mmadụ nwere ịnya ụgbọala, gụnyere ikike o nwere imeghachi omume n’oge, ime ihe ndị o kwesịrị ime, itinye uche n’ihe, ịhụ ụzọ nke ọma na ime ezi mkpebi.” Ihe na-esi n’ibu anya mmanya anya ụgbọala apụta bụ ọdachi. Na United States nanị, ọtụtụ iri puku na-anwụ, ọtụtụ narị puku na-emerụkwa ahụ́ kwa afọ n’ihe ọghọm ndị ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-akpata. Ihe ize ndụ a na-emetụta ndị ntorobịa karịsịa, bụ́ ndị na-enwechaghị ahụmahụ n’ịnya ụgbọala nakwa n’ịṅụ mmanya. Mmadụ ọ̀ pụrụ ịnya ụgbọala mgbe ọ ṅụchara mmanya na-aba n’anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu ma n’otu oge ahụ kwuo na ya na-akwanyere ndụ ùgwù dị ka onyinye sitere n’aka Jehova Chineke? (Abụ Ọma 36:9) N’ihi ịdị nsọ nke ndụ, ọ kasị mma ka mmadụ ghara ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọlị mgbe ọ na-anya ụgbọala.

10. Olee otú ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ isi metụta uche anyị, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji dịrị ize ndụ?

10 Ọ bụghị nanị na ịṅụbiga mmanya ókè na-emerụ ndị mmadụ ahụ́ n’ụzọ nkịtị, kamakwa ọ na-emerụ ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. “Mmanya vaịn na mmanya vaịn ọhụrụ na-ewepụ obi amamihe,” ka Bible na-ekwu. (Hosea 4:11) Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-emetụta uche. “Mgbe mmadụ ṅụrụ mmanya,” ka akwụkwọ Ụlọ Ọrụ Mba U.S. Maka Iji Ọgwụ Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi na-akọwa “ihe ọṅụṅụ ahụ na-aba n’anya na-esi n’usoro nri si agbari abanye n’ọbara ma na-eru n’ụbụrụ ngwa ngwa. Ọ na-amalite ibelata ikike nke akụkụ ụbụrụ ndị na-achịkwa echiche na mmetụta uche. Onye ahụ na-akwụsịlata inwe njide onwe onye.” N’ọnọdụ dị otú ahụ, o yikarịrị ka ànyị ‘ga na-awagharị,’ na-eme ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime, bụrụkwa ndị ọ ga-adịrị mfe ịdaba n’ọtụtụ ọnwụnwa.—Ilu 20:1.

11, 12. Mmerụ ahụ́ ime mmụọ dị aṅaa pụrụ isite ná mmadụ ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè?

11 Ọzọkwa, Bible na-enye iwu, sị: “Ma unu na-eri ihe, ma unu na-aṅụ ihe, ma unu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.” (1 Ndị Kọrint 10:31) Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu si ewetara Chineke otuto? Onye Kraịst aghaghị nnọọ ịgbalị izere ịbụ onye e ji ịṅụ oké mmanya mara. Ịbụ onye e ji omume dị otú ahụ mara ga-ewetara aha Jehova nkọcha ọ bụghị otuto.

12 Gịnị ma ọ bụrụ na ịṅụ oké mmanya nke Onye Kraịst emee ka onye kwere ekwe ibe ya, ikekwe onye ọhụrụ na-eso ụzọ, sụọ ngọngọ? (Ndị Rom 14:21) “Onye ọ bụla nke na-eme ka otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe na m sụọ ngọngọ,” ka Jizọs dọrọ aka ná ntị, “ọ baara ya uru karị na e ji nkume igwe nri, ụdị nke ịnyịnya ibu na-akwagharị konye ya n’olu ya ma tụba ya n’ime ogbu oké osimiri.” (Matiu 18:6) Ịṅụbiga mmanya ókè pụrụ ime ka ihe ùgwù ndị mmadụ nwere n’ọgbakọ funahụ ya. (1 Timoti 3:1-3, 8) Iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụkwara ịkpata nsogbu n’ime ezinụlọ.

Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya —N’ụzọ Dị Aṅaa?

13. Olee ihe dị oké mkpa n’izere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

13 Isi ihe na-enye aka n’izere ihe ize ndụ ndị dị n’iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi bụ ime ya ihe mgbaru ọsọ anyị izere ịṅụ oké mmanya ọ bụghị nanị izere ịṅụbiga mmanya ókè. Ònye pụrụ ikpebi ókè ị ga-aṅụ? Ebe ọ bụ na o metụtara ọtụtụ ihe, a pụghị inwe iwu a kapịrị ọnụ banyere ókè mmanya gafere ókè. Onye ọ bụla aghaghị ịma ókè o kwesịrị ịṅụ ma ghara ịṅụfe ya. Gịnị ga-enyere gị aka ikpebi ókè ga-akarị akarị nye gị? È nwere ụkpụrụ pụrụ iduzi gị?

14. Olee ụkpụrụ ga-eduzi gị n’ikpebi ọ̀tụ̀tụ̀ mmanya na-aba n’anya i kwesịrị ịṅụdebe?

14 Bible na-ekwu, sị: “Chebe nzube ihe na izuzu; ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ, bụkwaara olu gị amara.” (Ilu 3:21, 22) Ya mere, ụkpụrụ a ga-agbaso bụ nke a: Ókè mmanya ọ bụla nke metụtara izuzu gị ma mee ka ikike iche echiche gị ghara ịdị nkọ karịrị akarị nye gị. Ma ị ghaghị ịgwa onwe gị eziokwu n’ịghọta ókè ị ga-aṅụ!

15. Olee mgbe ọbụna otu iko mmanya pụrụ ịkarị akarị?

15 N’ọnọdụ ụfọdụ, ọbụna otu iko mmanya pụrụ ịkarị akarị. N’ihi otú mmanya si etinye nwa e bu n’afọ n’ihe ize ndụ, nwanyị dị ime nwere ike ịhọrọ ịghara ịṅụ mmanya ma ọlị. Ọ́ gaghị abụ ihe na-egosi obiọma ịghara ịṅụ mmanya mgbe gị na onye bụ́bu onye aṅụrụma ma ọ bụ onye akọ na uche ya na-adịghị anabata ịṅụ mmanya nọ? Jehova nyere ndị na-arụ ọrụ ndị nchụàjà n’ụlọikwuu ahụ iwu, sị: “Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya . . . mgbe unu na-aba n’ụlọikwuu nzute, ka unu wee ghara ịnwụ.” (Levitikọs 10:8, 9) N’ihi ya, zere ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya kpọmkwem tupu gị agawa nzukọ Ndị Kraịst, mgbe ị na-ekere òkè n’ozi, na mgbe ị na-ahụ maka ibu ọrụ ime mmụọ ndị ọzọ. Ọzọkwa, ná mba ụfọdụ ebe a machibidoro ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya iwu ma ọ bụ ebe ọ bụ nanị ndị ruru afọ ndụ ụfọdụ ka a na-ekwe ka ha ṅụọ ya, e kwesịrị ịkwanyere iwu ala ahụ ùgwù.—Ndị Rom 13:1.

16. Olee otú i kwesịrị isi kpebie ihe i kwesịrị ime mgbe e chere gị ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ihu?

16 Mgbe e nyere gị ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ajụjụ mbụ ị ga-ajụ bụ: ‘M̀ kwesịdịrị ịṅụ ya?’ Ọ bụrụ na i kpebie ịṅụ ya, mara ókè i kwesịrị ịṅụ, aṅụfekwala ya. Ekwela ka mmesapụ aka nke onye ị bịara na nke ya mee ka ị ṅụfee ókè i kwesịrị ịṅụ. Kpachara anya maka ememe, dị ka nke agbamakwụkwọ, bụ́ ebe ndị a na-enwe mmanya n’ụba. N’ọtụtụ ebe, iwu kwere ka ụmụaka na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ndị nne na nna inye ụmụ ha ntụziaka banyere otú e kwesịrị isi jiri ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-eme ihe nakwa ịchịkwa omume ha n’akụkụ a.—Ilu 22:6.

Ị Pụrụ Imeri Nsogbu Ahụ

17. Olee ihe pụrụ inyere gị aka ịmata ma ị̀ na-eji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

17 Ị̀ na-eji mmanya na ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? Buru nke a n’uche, ọ bụrụ na ị na-eme mmehie nzuzo nke iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ ga-enwe mmetụta n’ahụ́ gị n’oge na-adịghị anya. Ya mere, jiri ezi obi leruo onwe gị anya nke ọma. Jụọ onwe gị ajụjụ nnyocha onwe onye ndị dị ka: ‘M̀ na-aṅụ mmanya ọtụtụ ugboro ugbu a karịa ka m na-aṅụbu? M̀ na-aṅụzi mmanya ndị dị ike karị? M̀ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya iji gbanahụ nchegbu, nrụgide, ma ọ bụ nsogbu? Onye òtù ezinụlọ ma ọ bụ enyi m ò kwuola okwu megide ịṅụ mmanya m? Ịṅụ mmanya m ọ̀ kpatawo nsogbu n’ime ezinụlọ m? Ọ̀ na-esiri m ike ịnọ n’aṅụghị ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ruo otu izu, otu ọnwa, ma ọ bụ ọnwa ole na ole? M̀ na-ezochiri ndị ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ mmanya m na-aṅụ?’ Gịnị ma ọ bụrụ na azịza nye ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị a bụ ee? Adịla ka nwoke nke ‘kiriri ihu nkịtị ya n’enyo ma chefuo ozugbo ahụ ụdị mmadụ ọ bụ.’ (Jems 1:22-24) Mee ihe iji dozie nsogbu ahụ. Gịnị ka ị pụrụ ime?

18, 19. Olee otú ị pụrụ isi kwụsị ịṅụbiga mmanya ókè?

18 Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Unu adịla na-aṅụ mmanya gabiga ókè, bụ́ nke ndụ ịla n’iyi dị na ya, kama nọgidenụ na-ejupụta na mmụọ nsọ.” (Ndị Efesọs 5:18) Kpebie ihe bụụrụ gị ịṅụbiga mmanya ókè, ma mata ókè i kwesịrị ịdị na-aṅụ. Kpebie ịghara ịṅụfe ya; gosipụta njide onwe onye. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ì nwere ndị enyi na-arụgide gị ịṅụ oké mmanya? Kpachara anya. “Na-ejeso ndị maara ihe ị ga-amakwa ihe,” ka Bible na-ekwu, “ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.

19 Ọ bụrụ na ị na-aṅụ mmanya iji gbanahụ nsogbu, kwụrụ ma lụsoo nsogbu ahụ ọgụ. A pụrụ imeri nsogbu site n’itinye ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke n’ọrụ. (Abụ Ọma 119:105) Alala azụ ịchọ enyemaka nke Onye Kraịst bụ́ okenye nke ị tụkwasịrị obi. Jiri ndokwa ndị Jehova mere na-eme ihe nke ọma iji wulite ọnọdụ ime mmụọ gị. Mee ka mmekọrịta gị na Chineke sikwuo ike. Na-ekpegara ya ekpere mgbe nile—karịsịa banyere adịghị ike gị. Rịọ Chineke ka ọ ‘nụchaa akụrụ na obi gị.’ (Abụ Ọma 26:2) Dị ka a tụlere n’isiokwu bu ụzọ, mee ihe nile i nwere ike ime iji na-eje ije n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe.

20. Olee ihe ndị ị pụrụ ime iji merie nsogbu nke ịṅụbiga mmanya ókè na-ekweghị gị nkwụsị?

20 Gịnị ma ọ bụrụ na nsogbu nke ịṅụ oké mmanya akwụsịghị n’agbanyeghị mgbalị gị? Mgbe ahụ ị ghaghị ịgbaso ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Ọ bụrụkwa na aka gị anwaa anwaa mee ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya; ọ kaara gị mma ibu nkwarụ banye ná ndụ karịa ibu aka abụọ wee baa n’ime Gehena.” (Mak 9:43) Ihe ngwọta ya bụ: Aṅụla ma ọlị. Nke ahụ bụ ihe otu nwanyị nke anyị ga-akpọ Irene kpebiri ime. “Ka m zeresịịrị ịṅụ mmanya ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ na ọkara,” ka ọ na-ekwu, “amalitere m iche na ọ pụrụ ịbụ na nanị otu iko mmanya adịghị ihe ọ ga-eme m, ọ bụ nanị iji hụ ma isi m ọ̀ ga-ebuli ya. Ma ngwa ngwa m chere otú ahụ, m na-ewegara Jehova okwu ahụ n’ekpere ozugbo. Ekpebisiwo m ike ịghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya ọzọ ruo usoro ihe ọhụrụ—ma ọ bụrụdị na m ga-aṅụ ya mgbe ahụ.” Ịghara ịṅụ mmanya ma ọlị abụghị ihe karịrị akarị ime iji nweta ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—2 Pita 3:13.

“Na-agbanụ Ọsọ n’Ụzọ Ga-eme Ka Unu Wee Nweta Ya”

21, 22. Olee ihe mkpọbi ụkwụ pụrụ igbochi anyị ịgbaru ọsọ nke ndụ ahụ n’isi, oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ya?

21 N’iji ụzọ ndụ Onye Kraịst tụnyere ọsọ, ma ọ bụ asọmpi, Pọl onyeozi sịrị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị nile na-agba ọsọ n’ọsọ egwuregwu na-agba, ma nanị otu onye na-enweta ihe nrite? Na-agbanụ ọsọ n’ụzọ ga-eme ka unu wee nweta ya. Ọzọkwa, onye ọ bụla nke na-ekere òkè n’ịsọ mpi na-egosipụta njide onwe onye n’ihe nile. Otú ọ dị, ha na-eme ya ka ha wee nweta okpu mmeri pụrụ ire ure, ma anyị na-eme ya ka anyị wee nweta nke na-apụghị ire ure. Ya mere, otú m si agba ọsọ abụghị nke a na-ejighị n’aka; otú m si eti ọkpọ bụ ka m wee ghara ịdị na-eti ikuku; ma m na-etipụta ahụ́ m ọnyá ma na-achịkwa ya dị ka ohu, ka a ghara inwe ụzọ ọ bụla m ga-esi bụrụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịwooro ndị ọzọ ozi ọma.”—1 Ndị Kọrint 9:24-27.

22 Ọ bụ nanị ndị gbaruru ọsọ ahụ n’isi ga-enweta ihe nrite. N’ọsọ nke ndụ, iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ igbochi anyị ịgbaru ya n’isi. Anyị aghaghị igosipụta njide onwe onye. Iji obi ike na-agba ọsọ ahụ chọrọ ka anyị ghara “ịṅụ oké mmanya.” (1 Pita 4:3) N’aka nke ọzọ, ọ dị anyị mkpa igosipụta njide onwe onye n’ihe nile. Mgbe a bịara n’ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, anyị ga-abụ ndị maara ihe “ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa na ibi ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke.”—Taịtọs 2:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 “Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya” a na-ekwu banyere ya n’isiokwu a bụ biya na ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi gụnyere?

• Nsogbu ndị dị aṅaa na-esi n’iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi apụta?

• Olee otú ị pụrụ isi zere ihe ize ndụ ndị dị n’iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

• Olee otú anyị pụrụ isi merie nsogbu nke iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 19]

Mmanya “na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa”

[Foto dị na peeji nke 20]

Anyị aghaghị ịma ọ̀tụ̀tụ̀ mmanya anyị kwesịrị ịṅụ ma ghara ịṅufe ya

[Foto dị na peeji nke 21]

Tupu i bido ịṅụ mmanya, kpebie ókè ị ga-aṅụ

[Foto dị na peeji nke 22]

Na-ekpegara Jehova ekpere mgbe nile banyere adịghị ike gị

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ndị nne na nna inye ụmụ ha ntụziaka n’ihe banyere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe