Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Obi Dị M Ụtọ Maka Ọzụzụ M Nwetara’

‘Obi Dị M Ụtọ Maka Ọzụzụ M Nwetara’

‘Obi Dị M Ụtọ Maka Ọzụzụ M Nwetara’

O RIRI Kazuna na-eto eto ọnụ mgbe onye nkụzi ya tụrụ aro ka o sonye n’otu asọmpi ịsụ Bekee. Ụlọ akwụkwọ kọleji nile dị ná nnukwu agwaetiti Hokkaido nke dị n’ebe ugwu Japan pụrụ ikere òkè n’asọmpi ahụ, ma ụlọ akwụkwọ ya ewepụtatụbeghị nwa akwụkwọ ga-eso n’asọmpi ahụ. N’ụbọchị asọmpi ahụ, ụjọ jidere Kazuna n’ihi na ọ bụ ya na ihe dị ka ụmụ akwụkwọ 50 ndị ọzọ ga-asọ mpi. Ụjọ jidesikwuru ya ike mgbe ọ hụrụ ndị ikpe abụọ bụ́ ndị asụsụ obodo ha bụ Bekee.

A kpọrọ aha ndị meririnụ, na-amalite n’onye nwetara ihe nrite kasị ala. Mgbe a kpọrọ aha Kazuna n’ikpeazụ, o nyeghị ya ọnụ okwu. Ya na onye nkụzi ya, nke nọdebere ya, lerịtara onwe ha anya n’ijuanya. N’ịbụ onye nke ahụ ka riri ọnụ, Kazuna gara n’elu ikpo okwu ma nara ihe nrite ya—ihe nrite nke mbụ!

“Nke a kwere omume nanị n’ihi ọzụzụ nzukọ Jehova na-enye site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke,” ka Kazuna ji obi ụtọ kọwaa. “Obi dị m nnọọ ụtọ na m nwetara ọzụzụ a.” Ụlọ akwụkwọ ahụ nke Kazuna nọworo na-aga kemgbe ọ bụ nwatakịrị, bụ otu n’ime nzukọ ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Iji kwadebe maka asọmpi ahụ, Kazuna lebaara nnọọ iji ígwè okwu eme ihe, iji mmetụta na ikpo ọkụ ekwu okwu, mmegharị ahụ́, ile ndị na-ege ntị anya na ihe ndị ọzọ a na-akụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke anya.

Biko, anyị na-akpọ gị òkù ịbịa hụrụ ụlọ akwụkwọ a a na-eduzi kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị. Bịa jiri anya gị hụrụ otú ma ụmụaka ma ndị okenye si erite uru na ya. Onye ọ bụla pụrụ ịbịa nzukọ ahụ. Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ụlọ akwụkwọ ahụ nke kasị dịrị nso n’ụlọ gị, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.