Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-echeta Jizọs Kraịst?
Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-echeta Jizọs Kraịst?
Jizọs Kraịst “bụ [n’ezie] otu n’ime ndị a kasị mara amara dịworo ndụ.”—“The World Book Encyclopedia.”
A NA-ECHETAKARỊ ndị ukwu n’ihi ihe ha mere. Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere ọtụtụ mmadụ ji echeta Jizọs n’ihi ọmụmụ ya kama icheta ya n’ihi ihe ndị o mere? Na chọọchị nile nke Krisendọm, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ pụrụ ịkọ akụkọ banyere ihe omume ndị metụtara ọmụmụ ya. Mmadụ ole na-echeta ma na-agbalị itinye ọmarịcha ihe ndị ọ kụziri n’Ozizi Elu Ugwu ya n’ọrụ?
N’ikwu eziokwu, ọmụmụ Jizọs dị ịrịba ama, ma ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ ji ihe o mere na ihe ọ kụziri kpọrọ nnọọ ihe karị. O doro anya na Chineke ezubetụghị ka
ọmụmụ Kraịst kpuchie ndụ ya dị ka nwoke tozuru okè. Ma, Krismas enweela ihe ịga nke ọma n’iji ọtụtụ akụkọ ifo banyere ọmụmụ Kraịst kpuchie onye ọ bụ n’ezie.Ajụjụ ọzọ na-enye nsogbu n’obi na-ebilite banyere otú e si agba Krismas. Ọ bụrụ na Jizọs alọghachi n’ụwa taa, gịnị ka ọ ga-eche banyere otú e si jiri nnọọ Krismas mere oge azụmahịa? Puku afọ abụọ gara aga, Jizọs gara n’ụlọukwu dị na Jeruselem. O were oké iwe megide ndị na-agbanwe ego na ndị na-ere ihe bụ́ ndị ji ememe okpukpe ndị Juu na-akpa ego. “Wepụsịanụ ihe ndị a n’ebe a!” ka o kwuru. “Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!” (Jọn 2:13-16) N’ụzọ doro anya, Jizọs akwadoghị ịgwakọta azụmahịa na okpukpe.
Ọtụtụ ndị Spen bụ́ ndị ji ezi obi na-ekpe okpukpe Katọlik na-ekwupụta nchegbu ha banyere otú Krismas si aghọwanye ihe e ji akpa ego. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na a pụghị izere ọchịchọ nke iji Krismas akpa ego ezere n’ihi ebe e si nweta ọtụtụ ememe ya. Odeakụkọ bụ́ Juan Arias na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ ndị na-akatọ otú Krismas siworo ghọọ ‘ememe ndị ọgọ mmụọ,’ na oge e ji ekpori ndụ na nke e ji azụ ihe karịa ịbụ oge e ji ekpe okpukpe, amaghị na ọbụna mgbe ọ malitere, ememe ọmụmụ Jizọs . . . agụnyeworị akụkụ dị iche iche nke ememe [ife anyanwụ] ndị ọgọ mmụọ nke Rom.”—El País, December 24, 2001.
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị Spen na-ede akwụkwọ na akwụkwọ nkà ihe ọmụma Spen ekwuwo okwu banyere otú ememe ndị e ji mara Krismas si bụrụ ndị e si n’ememe ndị ọgọ mmụọ nweta, nakwa otú e si eji ha akpa ego. Banyere ụbọchị e ji agba Krismas, Enciclopedia de la Religión Católica na-ekwu n’ezoghị ọnụ, sị: “Ihe mere Chọọchị Rom ji kpebie itinye ememe a n’ụbọchị a yiri ka ọ̀ bụ n’ihi ọchịchọ ya iji ememe Ndị Kraịst dochie nke ndị ọgọ mmụọ. . . . Anyị maara na n’oge ahụ na Rom, ndị ọgọ mmụọ doro December 25 nsọ dị ka ụbọchị ememe natalis invicti, ọmụmụ nke ‘chi anyanwụ a na-apụghị imeri emeri.’”
Enciclopedia Hispánica na-ekwukwa n’otu aka ahụ, sị: “Nhọrọ a họọrọ December 25 dị ka ụbọchị a ga na-agba Krismas abụghị n’ihi nnyocha e leziri anya mee nke ụbọchị a mụrụ Jizọs, kama nke ahụ, ọ bụ n’ihi mgbanwe a gbanwere ememe etiti oge oyi a na-eme na Rom ịghọ ememe Ndị Kraịst.” Olee otú ndị Rom si eme ememe mpụta nke anyanwụ n’oge oyi? Ọ bụ site n’oriri oké mkpọtụ na inyerịta onyinye. Ebe ọ bụ na o siiri ndị isi chọọchị ike iwepụ ememe dị otú ahụ a maara nke ọma, ha “mere ka ọ ghọọ nke Ndị Kraịst” site n’ịkpọ ya ụbọchị ọmụmụ Jizọs kama ịbụ ụbọchị ọmụmụ chi anyanwụ.
Ná mmalite, na narị afọ nke anọ na nke ise, o siiri ndị mmadụ ike ịhapụ ofufe chi anyanwụ na omenala ya. “Senti” Augustine nke ndị Katọlik (354-430 O.A.) lere ya anya dị ka ihe dị mkpa ịgba ndị kwere ekwe ibe ya ume ịghara ịdị na-eme ememe na December 25 dị ka ndị ọgọ mmụọ na-eme iji kwanyere chi anyanwụ ùgwù. Ọbụna taa, o yiri ka ọ̀ bụ ememe ndị Rom oge ochie kasị ewu ewu.
Ememe Dị Mma Maka Oriri na Nkwari na Ịkpa Ego
Na narị afọ ndị gafeworonụ, ọtụtụ ihe ekerewo òkè pụtara ìhè n’ime ka Krismas bụrụ ememe kasị ewu ewu n’ụwa nile nke a na-eme maka oriri na nkwari na azụmahịa. Ọzọkwa, e ji nwayọọ nwayọọ webata omenala nke ememe ndị ọzọ a na-eme n’oge oyi, karịsịa ndị a na-eme n’ebe ugwu Europe, n’ememe ahụ yiri nke ndị Rom. * Na narị afọ nke 20 kwa, ndị na-ere ahịa na ndị ọkà n’atụmatụ azụmahịa ji ịnụ ọkụ n’obi kwalite omenala ọ bụla pụrụ iweta nnukwu uru ahịa.
Gịnị siworo na ya pụta? Ememe ọmụmụ Kraịst dịzi mkpa karịa ihe mere e ji mụọ ya. Ọtụtụ mgbe, a dịghịzidị ekwute okwu Kraịst n’ememe Krismas. “[Krismas] bụ ememe ezinụlọ nke zuru ụwa ọnụ, onye ọ bụla na-emekwa ya otú o si ghọta ya,” ka akwụkwọ akụkọ Spen bụ́ El País na-ekwu.
Okwu a na-egosi echiche ọnụ ọgụgụ mmadụ na-arịwanye elu na Spen na n’ọtụtụ mba ndị ọzọ gburugburu ụwa nwere. Ka ememe Krismas nọgidere na-aghọwanye nke oké oriri na nkwari, ihe ọmụma banyere Kraịst na-ebelata ebelata. N’ikwu eziokwu, ememe Krismas alaghachiwo n’ụzọ dị ukwuu n’ihe ha bụbu n’oge ndị Rom—oriri oké mkpọtụ na inyerịta onyinye.
A Mụworo Anyị Otu Nwa
Ọ bụrụ na ọ dịchaghị ihe jikọrọ Krismas na Kraịst, olee otú ezi Ndị Kraịst kwesịrị isi na-echeta ọmụmụ na ndụ Kraịst? Narị afọ asaa tupu a mụọ Jizọs, Aịzaịa buru amụma banyere ya, sị: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya.” (Aịsaịa 9:6) N’ihi gịnị ka Aịzaịa ji kwuo ihe na-egosi na ọmụmụ Jizọs na ihe ndị ọ ga-emesị mee ga-adị nnọọ ịrịba ama? Ọ bụ n’ihi na Jizọs ga-aghọ onye ọchịchị dị ike. A ga-akpọ ya Onyeisi Udo, udo ya ma ọ bụ ịbụ onyeisi ya agaghịkwa agwụ agwụ. Ọzọkwa, ‘ikpe ziri ezi na ezi omume’ ga-akwagide ọchịchị Jizọs.—Aịsaịa 9:7.
Mmụọ ozi Gebriel kwughachiri ihe Aịzaịa kpọsara mgbe ọ gwara Meri na ọ ga-amụ Jizọs. “Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu,” ka o buru n’amụma. “Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nke Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:32, 33) O doro anya na isi ihe mere e ji mụọ Jizọs bụ ọrụ ọ ga-arụ dị ka Eze a họpụtara ahọpụta nke Alaeze Chineke. Ọchịchị Kraịst pụrụ ịbara mmadụ nile uru, gụnyere gị na ndị ị hụrụ n’anya. N’ezie, ndị mmụọ ozi ahụ kwuru na ọmụmụ ya ga-eweta “udo . . . n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị [Chineke] ezi mma.”—Luk 2:14, Bible Nsọ nke Union Version.
Olee onye ibi n’ụwa ebe e nwere udo na ikpe ziri ezi na-adịghị agụ agụụ? Ma iji nweta udo nke ọchịchị Kraịst ga-eweta, ọ dị anyị mkpa ime ihe dị Chineke ezi mma na iso ya nwee ezi mmekọrịta. Jizọs kwuru na nzọụkwụ mbụ na-eduga ná mmekọrịta dị otú ahụ bụ ịmụ banyere Chineke na Kraịst. “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi,” ka Jizọs kwuru, “ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
Ozugbo anyị matara Jizọs nke ọma, ọ dịghịzi anyị mkpa ichewe otú ọ ga-achọ ka anyị si na-echeta ya. Ọ̀ ga-abụ site n’iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ na inyerịta onyinye n’otu ụbọchị ahụ ndị ọgọ mmụọ oge ochie ji eme ememe ha? Nke ahụ eyighị ihe ọ ga-achọ? N’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ọ chọrọ. “Onye nwere ihe ndị m nyere n’iwu ma na-edebe ha, onye ahụ bụ onye hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya, m ga-ahụkwa ya n’anya.”—Jọn 14:21.
Ndịàmà Jehova ejiriwo oge dị ukwuu mụọ Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke nyewooro ha aka ịghọta ihe ndị Chineke na Jizọs nyere n’iwu. Ọ ga-amasị ha inyere gị aka ịghọta ihe ndị ahụ dị mkpa e nyere n’iwu ka i wee nwee ike icheta Jizọs otú e kwesịrị isi cheta ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Osisi Krismas na ihe oyiyi Fada Krismas bụ ihe atụ abụọ dị ịrịba ama.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]
Bible Ọ̀ Na-akagbu Oriri na Inye Onyinye?
Inye Onyinye
Bible na-akwado inye onyinye, ọ kpọkwara Jehova n’onwe ya Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.” (Jems 1:17) Jizọs gosiri na ezi nne na nna ga-enye ụmụ ha onyinye. (Luk 11:11-13) Ndị enyi na ndị ezinụlọ Job nyere ya onyinye mgbe ọ gbakere n’ọrịa ya. (Job 42:11) Otú ọ dị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime onyinye ndị dị otú ahụ chọrọ ụbọchị ememe pụrụ iche. O sitere n’obi.—2 Ndị Kọrint 9:7.
Mgbakọta Ezinụlọ
Mgbakọta ezinụlọ pụrụ nnọọ ijikọta ndị òtù ezinụlọ, karịsịa ma ọ bụrụ na ha ebikọtaghịzi n’otu ụlọ. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gara oriri agbamakwụkwọ na Kena, obi abụọ adịghịkwa ya na ọ bụ nnukwu nnọkọ nke ndị ezinụlọ na ndị enyi. (Jọn 2:1-10) N’ilu Jizọs nke nwa mmefu ahụ kwa, nna ya ji nnukwu oriri ezinụlọ mee ememe nlọta nke nwa ya nwoke, bụ́ nke gụnyere ịgụ na ịgba egwú.—Luk 15:21-25.
Iri Ezigbo Nri
Bible kwuru mgbe mgbe banyere ndị ohu Chineke dị ka ndị ha na ndị ezinụlọ, ndị enyi ma ọ bụ ndị ha na ha na-efekọ ofufe, rikọrọ ezigbo nri. Mgbe ndị mmụọ ozi atọ letara Ebreham, o meere ha oriri nke gụnyere anụ ehi, mmiri ara ehi, mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na ogbe achịcha. (Jenesis 18:6-8) Solomọn kọwara ‘iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ na ịṅụrị ọṅụ’ dị ka onyinye sitere n’aka Chineke.—Eklisiastis 3:13; 8:15.
N’ụzọ doro anya, Chineke chọrọ ka anyị na ndị enyi na ndị ezinụlọ anyị na-erikọ ezigbo nri, ọ kwadokwara inye onyinye. Anyị nwere ohere dị ukwuu ime nke ahụ n’oge ọ bụla n’afọ.