Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mkpu ahụ Stivin tiri n’Ọrụ 7:59 ọ̀ na-egosi na e kwesịrị ịdị na-ekpegara Jizọs ekpere?

Ọrụ 7:59 na-ekwu, sị: “Ha wee malite ịtụ Stivin nkume ka ọ rịọrọ arịrịọ wee sị: ‘Onyenwe anyị Jizọs, nara mmụọ m.’” Okwu ndị ahụ akpalitewo ajụjụ n’uche ụfọdụ ndị ebe ọ bụ na Bible na-ekwu na ọ bụ Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Stivin ò kpegaara Jizọs ekpere n’ezie? Nke a ọ̀ na-egosi na Jizọs bụ Jehova?

King James Version na-ekwu na Stivin “na-akpọku Chineke.” Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ kwubiri ihe ahụ onye na-akọwa Bible bụ́ Matthew Henry kwubiri, bụ́ onye kwuru, sị: “N’ebe a, Stivin kpegaara Kraịst ekpere, anyị aghaghịkwa ime otú ahụ.” Otú ọ dị, echiche ahụ hiere ụzọ. N’ihi gịnị?

Akwụkwọ bụ́ Barnes’ Notes on the New Testament kwuru eziokwu a: “Okwu ahụ bụ́ Chineke adịghị n’ihe odide mbụ, a garaghịkwa etinye ya ná nsụgharị ya. Ọ dịghị [ihe odide] ma ọ bụ nsụgharị oge ochie ọ dị na ya.” Oleezi otú e si tinye okwu bụ́ “Chineke” n’amaokwu ahụ? Ọkà mmụta bụ́ Abiel Abbot Livermore kpọrọ nke a “ihe atụ nke ebe ndị nsụgharị sụgharịrị ihe ha chere.” N’ihi ya, ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị nke oge a wepụrụ okwu a bụ́ Chineke, nke e tinyere n’ebe ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi.

Ka o sina dị, ọtụtụ nsụgharị na-ekwu na Stivin “kpegaara” Jizọs ekpere. Ihe odide ala ala peeji nke New World Translation na-egosikwa na okwu ahụ bụ́ “rịọrọ arịrịọ” pụkwara ịpụta “mkpọku; ekpere.” Nke ahụ ọ́ gaghị egosi na Jizọs bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile? Ee e. Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words na-akọwa na n’ebe a, okwu Grik mbụ e ji mee ihe, bụ́ e·pi·ka·leʹo, pụtara: “Ịkpọku; . . . ịrịọ onye nọ n’ọkwá dị elu arịrịọ.” Pọl ji otu okwu a mee ihe mgbe o kwuru, sị: “Ana m arịọ ka Siza kpegharịa ikpe m!” (Ọrụ 25:11) Mgbe ahụ, n’ụzọ dabara adaba, The New English Bible na-ekwu na Stivin “na-akpọku” Jizọs.

Gịnị kpaliri Stivin ịrịọ arịrịọ dị otú ahụ? Dị ka Ọrụ 7:55, 56 si kwuo, “n’ịbụ onye jupụtara na mmụọ nsọ, [Stivin] legidere anya n’ime eluigwe ma hụ ebube Chineke, hụkwa Jizọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.” Dị ka o kwesịrị, Stivin gaara arịọ Jehova arịrịọ n’aha Jizọs. Ma n’ịhụ Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ n’ọhụụ, ihe àmà na-egosi na ahụ́ ruru Stivin ala ịrịọ Jizọs n’onwe ya arịrịọ, na-asị: “Onyenwe anyị Jizọs, nara mmụọ m.” Stivin maara na e nyewo Jizọs ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:27-29) N’ihi ya, ọ rịọrọ Jizọs ka o chebe mmụọ ya, ma ọ bụ ike ndụ ya, ruo mgbe Jizọs ga-akpọlite ya n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe.

Ihe ahụ dị mkpirikpi Stivin kwuru ọ̀ na-egosi na e kwesịziri ịdị na-ekpegara Jizọs ekpere? Ọ dịghị ma ọlị. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, Stivin mere ka ọdịiche dị n’etiti Jizọs na Jehova pụta ìhè n’ihi na ihe ndekọ ahụ na-ekwu na ọ hụrụ Jizọs “ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.” Ọzọkwa, ihe a bụ ọnọdụ a na-adịghị ahụkarị. Nanị onye ọzọ gwara Jizọs okwu n’ụzọ dị otú ahụ bụ Jọn onyeozi, bụ́ onye gwakwara Jizọs n’onwe ya okwu mgbe ọ hụrụ Ya n’ọhụụ.—Mkpughe 22:16, 20.

Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst taa na-ekpegara Jehova Chineke n’onwe ya ekpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ha onwe ha nwekwara okwukwe siri ike na Jizọs bụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 11:25) Dị ka o nyeere Stivin aka, okwukwe anyị nwere n’ikike Jizọs nwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ pụkwara inyere anyị aka ma kwagide anyị n’oge ọnwụnwa.