Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Ji Enwe Obi Abụọ Ma Okpukpe Ọ̀ Pụrụ Ime Ka Ihe A Kpọrọ Mmadụ Dị n’Otu
Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Ji Enwe Obi Abụọ Ma Okpukpe Ọ̀ Pụrụ Ime Ka Ihe A Kpọrọ Mmadụ Dị n’Otu
‘HỤ ONYE agbata obi gị n’anya.’ (Matiu 22:39) Ọtụtụ okpukpe na-ekwusa ụkpụrụ a bụ́ isi. Ọ bụrụ na okpukpe ndị dị otú ahụ kụziliiri ndị òtù ha ịhụ ndị agbata obi ha n’anya, ndị òtù ha gaara abụ ndị e jikọtara ọnụ na ndị dị n’otu. Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ bụ ihe ị na-ahụ? Okpukpe ọ̀ bụ ihe na-eme ka a dị n’otu? A jụrụ ajụjụ a ná nchọpụta e mere na Germany na nso nso a: “Okpukpe ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ dị n’otu, ka ò yikarịrị ka ọ̀ na-ekewa ha?” Pasent 22 nke ndị zaghachirinụ chere na okpukpe na-eme ka ndị mmadụ dị n’otu, ebe pasent 52 chere na ọ na-ekewa ndị mmadụ. Ikekwe, ndị bi ná mba gị nwere echiche ndị yiri nnọọ ndị a.
Gịnị mere na ọtụtụ ndị enwechaghị obi ike na okpukpe pụrụ ime ka ihe a kpọrọ mmadụ dị n’otu? Ikekwe ọ bụ n’ihi ihe ndị ha chọpụtara site n’akụkọ ihe mere eme. Kama ime ka ndị mmadụ dị n’otu, mgbe mgbe, okpukpe ekewawo ha. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị mmadụ ezowo n’azụ okpukpe rụọ arụrụala ndị kasị njọ a rụtụrụla. Tụlee ihe atụ ụfọdụ e nweworo n’ime nanị 100 afọ gara aga.
Ndị Okpukpe Kwaliri
N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ndị Croatia bụ́ ndị Roman Katọlik na ndị Serbia bụ́ ndị Chọọchị Ọtọdọks, bụ́cha ndị bi n’ógbè Balkan, gburịtara onwe ha. Òtù abụọ a na-azọrọ na ha na-eṅomi Jizọs bụ́ onye kụziiri ụmụazụ ya ịhụ onye agbata obi ha n’anya. Ma, ọgụ ha dugara “n’otu n’ime ogbugbu kasị njọ e gbutụworo ndị nkịtị n’akụkọ ihe mere eme,” dị ka otu onye nchọpụta si kwuo. Ihe karịrị narị puku ise nwụrụnụ, bụ́ nke gụnyere ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị, wụrụ ụwa akpata oyi n’ahụ́.
Na 1947, ihe dị ka narị nde mmadụ anọ—ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ ise nke ihe a kpọrọ mmadụ—karịsịa ndị Hindu, Alakụba na ndị Sikh, bi n’obodo ukwu bụ́ India. Mgbe e kere India, e kewapụtara mba na-ekpe Alakụba bụ́ Pakistan. N’oge ahụ, a kpọrọ ọtụtụ narị puku ndị gbara ọsọ ndụ si mba abụọ ahụ ọkụ, tie ha ihe, taa ha ahụhụ ma gbagbuo ụfọdụ n’ime ha n’ọtụtụ mgbuchapụ ndị okpukpe mere.
Ka à ga-asị na nke a ezughị, ná mmalite nke narị afọ a, iyi ọha egwu jupụtara ebe nile. Taa, iyi ọha egwu na-echu ụwa ụra, ma ọtụtụ ndị na-eyi ọha egwu na-azọrọ na ha nwere okpukpe
ndị ha na-ekpe. A dịghị ele okpukpe anya dị ka ihe na-akwalite ịdị n’otu. Kama nke ahụ, a na-ejikọtakarị ya na ime ihe ike na adịghị n’otu. Ka a sịkwanụ ihe mere magazin na-ebu akụkọ bụ́ FOCUS nke Germany ji jiri okpukpe ndị bụ́ isi n’ụwa—okpukpe Buddha, Krisendọm, okpukpe Confucius, Hindu, Alakụba, okpukpe ndị Juu, na nke Tao—tụnyere nsí égbè.Esemokwu n’Etiti Ndị Nọ n’Otu Okpukpe
Ka okpukpe ụfọdụ na-ebusorịta ibe ha agha, ndị ọzọ nwere esemokwu n’etiti onwe ha. Dị ka ihe atụ, n’afọ ndị na-adịbeghị anya chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ekewaala n’ihi arụmụka ndị na-aga n’ihu n’ihe banyere nkwenkwe. Ma ndị ụkọchukwu ma ndị aghasa na-ajụ, sị: Nchịkwa ọmụmụ ọ̀ bụ ihe kwesịrị ekwesị? Gịnị banyere nsikwopụ afọ ime? È kwesịrị ichi ụmụ nwanyị ụkọchukwu? Olee otú chọọchị kwesịrị isi na-ele ndina ụdị onwe anya? Okpukpe ò kwesịrị ịkwado agha? N’ihi adịghị n’otu dị otú ahụ, ọtụtụ ndi na-eche, sị, ‘Olee otú okpukpe pụrụ isi mee ka ihe a kpọrọ mmadụ dị n’otu ma ọ bụrụ na ọ pụghị ime ka ọbụna ndị òtù ya dị n’otu?’
N’ụzọ doro anya, okpukpe n’ozuzu ya adaala n’iweta ịdị n’otu. Ma è ji nkewa mara okpukpe nile? È nwere okpukpe nke dị iche—nke pụrụ ime ka ihe a kpọrọ mmadụ dị n’otu?
[Foto dị na peeji nke 3]
Ndị uwe ojii e merụrụ ahụ́ n’oge òtù okpukpe dị iche iche na-alụrịta ọgụ n’India na 1947
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto Keystone sere/Getty Images