Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-agbaso Ụkpụrụ Jizọs Setịpụrụ

Nọgide Na-agbaso Ụkpụrụ Jizọs Setịpụrụ

Nọgide Na-agbaso Ụkpụrụ Jizọs Setịpụrụ

“M na-esetịpụrụ unu ụkpụrụ, ka unu, dị nnọọ ka m meere unu, meekwa otú ahụ.”—JỌN 13:15.

1. N’ihi gịnị ka Jizọs ji bụrụ onye nlereanya Ndị Kraịst ga-eṅomi?

N’AKỤKỌ ihe mere eme nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ bụ nanị otu onye bụ onye na-emeghị mmehie ná ndụ ya nile. Onye ahụ bụ Jizọs. E wezụga Jizọs, “ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị emehie.” (1 Ndị Eze 8:46; Ndị Rom 3:23) N’ihi nke ahụ, ezi Ndị Kraịst na-ele Jizọs anya dị ka onye nlereanya zuru okè ha ga-eṅomi. N’ezie, na Naịsan 14, 33 O.A., obere oge tupu ọnwụ ya, Jizọs n’onwe ya gwara ụmụazụ ya ka ha na-eṅomi ya. O kwuru, sị: “M na-esetịpụrụ unu ụkpụrụ, ka unu, dị nnọọ ka m meere unu, meekwa otú ahụ.” (Jọn 13:15) N’abalị ikpeazụ ya, Jizọs kwuru ọtụtụ ụzọ Ndị Kraịst kwesịrị isi na-agbalị ịdị ka ya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ha.

Mkpa nke Ịdị Umeala n’Obi

2, 3. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jizọs si bụrụ onye nlereanya zuru okè nke ịdị umeala n’obi?

2 Mgbe Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịgbaso ụkpụrụ o setịpụrụ, ọ nọ na-ekwu kpọmkwem banyere ịdị umeala n’obi. O nyewo ụmụazụ ya ndụmọdụ ihe karịrị otu ugboro ka ha dị umeala n’obi, n’abalị Naịsan 14 kwa, o gosipụtara na ya dị umeala n’obi site n’ịsa ụkwụ ndịozi ya. Jizọs kwuziri, sị: “Ọ bụrụ na mụ onwe m, ọ bụ ezie na m bụ Onyenwenụ na Onye Ozizi, sara unu ụkwụ, unu kwesịkwara ịsarịta ụkwụ ibe unu.” (Jọn 13:14) Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gwara ndịozi ya ka ha na-agbaso ụkpụrụ ahụ o setịpụrụ. Leekwa ihe nlereanya magburu onwe ya nke ịdị umeala n’obi nke ahụ bụ!

3 Pọl onyeozi na-agwa anyị na tupu Jizọs abịa n’ụwa, Ọ “dị adị n’ọdịdị nke Chineke.” Otú o sina dị, o mere onwe ya ihe efu ma ghọọ onye dị ala. Nke ka nke, “o wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.” (Ndị Filipaị 2:6-8) Cheedị echiche banyere nke ahụ. Jizọs, bụ́ onye nke abụọ kasị elu n’eluigwe na ala, kwetara ịdị ala karịa ndị mmụọ ozi, ka a mụọ ya dị ka nwa ọhụrụ, irubere nne na nna na-ezughị okè isi ka ọ na-etolite, na imesị nwụọ dị ka omekome a na-asọ oyi. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16; Ndị Hibru 2:6, 7) Lee nnọọ ịdị umeala n’obi nke ahụ bụ! Ọ̀ ga-ekwe omume iṅomi “ụzọ iche echiche” ahụ na ịzụlite ‘ịdị nwayọọ n’obi’ dị otú ahụ? (Ndị Filipaị 2:3-5) Ee, ma ọ dịghị mfe.

4. Olee ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ dị mpako, ma n’ihi gịnị ka mpako ji dị ize ndụ?

4 Adịghị umeala n’obi bụ ịdị mpako. (Ilu 6:16-19) Ọ bụ mpako mere Setan ji daa. (1 Timoti 3:6) Ọ na-agbanye mkpọrọgwụ n’obi mmadụ n’ụzọ dị mfe, ozugbo ọ gbanyekwara mkpọrọgwụ, ọ na-esi ike mwepụ. Ndị mmadụ na-adị mpako n’ihi mba ha, agbụrụ ha, ihe onwunwe ha, agụmakwụkwọ ha, ihe ndị ha rụzuru n’ọrụ ego, ọkwá ha n’obodo, ịma mma ha, nkà ha n’egwuregwu, nakwa n’ihi ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a dị mkpa n’anya Jehova. (1 Ndị Kọrint 4:7) Ọ bụrụkwa na ha emee ka anyị dị mpako, ha na-emebi mmekọrịta anyị na ya. “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka Ọ na-ahụ anya: ma onye mpako, Ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.”—Abụ Ọma 138:6; Ilu 8:13.

Ịdị Umeala n’Obi n’Etiti Ụmụnna Anyị

5. Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka ndị okenye na-adị umeala n’obi?

5 Ọbụna ụtụ anyị na-atụnye na ihe ndị anyị rụzuru n’ozi Jehova ekwesịghị ime ka anyị dị mpako; ibu ọrụ anyị nwere n’ọgbakọ ekwesịghịkwa ime ka anyị dị mpako. (1 Ihe E Mere 29:14; 1 Timoti 6:17, 18) N’ezie, ka ibu ọrụ anyị na-ebuwanye ibu, otú ahụ ka ọ na-adịkwu mkpa ka anyị dị umeala n’obi. Pita onyeozi gbara ndị okenye ume ka ha ghara ‘ime ndị bụ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ bụ ha nwe ha, kama ka ha na-aghọ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ.’ (1 Pita 5:3) A na-ahọpụta ndị okenye ịbụ ndị ohu na ndị nlereanya, ọ bụghị ndị nwenụ na ndị nna ukwu.—Luk 22:24-26; 2 Ndị Kọrint 1:24.

6. N’akụkụ ndị dị aṅaa nke ndụ Ndị Kraịst ka ịdị umeala n’obi dị anyị mkpa?

6 Ọ bụghị nanị ndị okenye ka ịdị umeala n’obi dị mkpa. Nye ụmụ okorobịa, bụ́ ndị pụrụ ịdị mpako n’ihi inwe uche na-aghọ nkọ na ịbụ ndị gbasiri ike karị ma e jiri ha tụnyere ndị meworo agadi, Pita dere, sị: “Werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’ebe ibe unu nọ, n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala obiọma na-erughịrị mmadụ.” (1 Pita 5:5) Ee, ịdị umeala n’obi yiri nke Kraịst dị mmadụ nile oké mkpa. Ịdị umeala n’obi dị mkpa iji na-ekwusa ozi ọma ahụ, karịsịa mgbe a na-eche enweghị mmasị ma ọ bụ ibu iro ihu. Ịdị umeala n’obi dị mkpa iji nakwere ndụmọdụ ma ọ bụ iji mee ka ndụ anyị dị mfe ka anyị wee mụbawanye òkè anyị na-ekere n’ozi. Tụkwasị na nke ahụ, ịdị umeala n’obi, tinyere obi ike na okwukwe dị anyị mkpa mgbe a na-agbasa akụkọ ọjọọ banyere anyị, mgbe a gbara anyị akwụkwọ ma ọ bụ na-akpagbu anyị n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ.—1 Pita 5:6.

7, 8. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi zụlite ịdị umeala n’obi?

7 Olee otú mmadụ pụrụ isi merie mpako ma dị ‘nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka ya’? (Ndị Filipaị 2:3) Ọ dị ya mkpa ịdị na-ele onwe ya anya otú Jehova si ele ya. Jizọs kọwara ụzọ kwesịrị ekwesị isi na-eme nke ahụ mgbe o kwuru, sị: “Unu onwe unu kwa, mgbe unu meworo ihe nile e kenyere unu, kwuonụ, sị, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị meworo bụ ihe anyị kwesịrị ime.’” (Luk 17:10) Cheta, ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime ga-eru ihe Jizọs mere. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs dị umeala n’obi.

8 Ọzọkwa, anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ile onwe anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Dị ka ọbụ abụ ahụ, anyị pụrụ ikpe ekpere, sị: “Zi m ịdị mma nke ezi uche na ihe ọmụma; n’ihi na ọ bụ n’ihe nile I nyere n’iwu ka m kwereworo.” (Abụ Ọma 119:66) Jehova ga-enyere anyị aka iji ezi uche na-ele onwe anyị anya, ọ ga-agọzikwa anyị n’ihi ịdị umeala n’obi anyị. (Ilu 18:12) Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Matiu 23:12.

Ụzọ Kwesịrị Ekwesị Isi Na-ele Ihe Ziri Ezi na Ihe Ọjọọ Anya

9. Olee otú Jizọs si lee ihe ziri ezi na ihe ọjọọ anya?

9 N’agbanyeghị na ọ dịrị ndụ ruo afọ 33 n’etiti ụmụ mmadụ na-ezughị okè, Jizọs ‘enweghị mmehie.’ (Ndị Hibru 4:15) N’ezie, mgbe ọ na-ebu amụma banyere Mezaịa ahụ, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ị hụwo ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.” (Abụ Ọma 45:7; Ndị Hibru 1:9) Ndị Kraịst na-agbalịkwa iṅomi Jizọs na n’akụkụ a. Ọ bụghị nanị na ha maara ihe ziri ezi na ihe ọjọọ; ha na-akpọ ihe ọjọọ asị ma na-ahụ ezi ihe n’anya. (Emọs 5:15) Nke a na-enyere ha aka ịlụso ọchịchọ ime mmehie ha bu pụta ụwa ọgụ.—Jenesis 8:21; Ndị Rom 7:21-25.

10. Ọ bụrụ na anyị na-eme “ihe ọjọọ” n’enweghị nchegharị, olee àgwà anyị na-egosipụta?

10 Jizọs gwara onye Farisii bụ́ Nikọdimọs, sị: “Onye na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghịkwa abịa n’ìhè ahụ, ka e wee ghara ịkatọ ọrụ ya. Ma onye na-eme ezi ihe na-abịa n’ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè dị ka ndị a rụworo n’ụzọ kwekọrọ na Chineke.” (Jọn 3:20, 21) Tụlee nke a: Jọn mere ka a mata Jizọs dị ka “ezi ìhè ahụ nke na-enye ụdị mmadụ ọ bụla ìhè.” (Jọn 1:9, 10) Otú ọ dị, Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị na-eme “ihe ọjọọ”—ihe ndị na-adịghị mma, bụ́ ndị na-adịghị amasị Chineke—anyị kpọrọ ìhè ahụ asị. Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ịkpọ Jizọs na ụkpụrụ ndị o setịpụrụ asị? Ma, nke ahụ bụ ihe ndị na-eme mmehie n’enweghị nchegharị na-eme. Ikekwe ha adịghị ele ya anya otú ahụ, ma n’ụzọ doro anya, ọ bụ otú ahụ ka Jizọs si ele ya anya.

Ụzọ Isi Malite Ile Ihe Ziri Ezi na Ihe Ọjọọ Anya Dị Ka Jizọs Si Ele Ha

11. Gịnị dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-amalite ile ihe ziri ezi na ihe ọjọọ anya dị ka Jizọs si ele ha?

11 Ọ dị anyị mkpa ịghọta nke ọma ihe bụ́ ihe ziri ezi na ihe ọjọọ n’anya Jehova. Anyị na-enweta nghọta ahụ nanị site n’ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ka anyị na-enwe ọmụmụ ihe dị otú ahụ, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere dị ka ọbụ abụ ahụ kpere, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile.” (Abụ Ọma 25:4) Otú ọ dị, cheta na Setan dị aghụghọ. (2 Ndị Kọrint 11:14) Ọ pụrụ ime ka ihe ọjọọ yie ihe ziri ezi n’anya Onye Kraịst na-amụghị anya. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịtụgharị uche n’ụzọ miri emi n’ihe ndị anyị na-amụ ma na-agbasochi ndụmọdụ nke ohu ahụ “na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” anya. (Matiu 24:45-47) Ịmụ ihe, ikpe ekpere na ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị na-amụ ga-enyere anyị aka itozu okè ma soro ná “ndị siteworo n’iji ikike nghọta ha eme ihe zụọ ikike a ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Mgbe ahụ, anyị ga-enwe ọchịchọ nke ịkpọ ihe ọjọọ asị na ịhụ ihe ziri ezi n’anya.

12. Olee ndụmọdụ Bible na-enyere anyị aka ịghara ịghọ ndị na-emebi iwu?

12 Ọ bụrụ na anyị kpọrọ ihe ọjọọ asị, anyị agaghị ekwe ka ọchịchọ ime ihe ọjọọ tolite n’obi anyị. Ọtụtụ afọ ka Jizọs nwụsịrị, Jọn onyeozi dere, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna ahụ adịghị n’ime ya; n’ihi na ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa.”—1 Jọn 2:15, 16.

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ịhụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya ji dị ize ndụ nye Ndị Kraịst? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịmalite ịhụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya?

13 Ụfọdụ pụrụ iche na ọ bụghị ihe nile dị n’ụwa dị njọ. Ya bụrụgodị otú ahụ, ụwa na ihe ndọrọ ya pụrụ ịdọpụ uche anyị n’ụzọ dị mfe n’ijere Jehova ozi. Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ụwa na-enye nke e mere iji dọtakwuo anyị n’ebe Chineke nọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị amalite ịhụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya, ọbụna ihe ndị ọ pụrụ ịbụ na ha adịghị njọ n’onwe ha, anyị na-agbaso ụzọ dị ize ndụ. (1 Timoti 6:9, 10) E wezụga nke ahụ, n’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị dị n’ụwa dị njọ, ha pụkwara imebi anyị. Ọ bụrụ na anyị na-ekiri fim ma ọ bụ ihe omume telivishọn ndị na-egosi ime ihe ike, ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ, ihe ndị ahụ pụrụ ịmalite dịwa anyị mma—mgbe ahụzi nwawa anyị ọnwụnwa. Ọ bụrụ na anyị esoro ndị ihe bụ́ isi ná ndụ ha bụ ịkwalite ọnọdụ obibi ndụ ha ma ọ bụ inweta ohere achụmnta ego dị iche iche na-akpakọrịta, ihe ndị ahụ pụkwara ịghọrọ anyị onwe anyị ihe ndị kasị mkpa.—Matiu 6:24; 1 Ndị Kọrint 15:33.

14 N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na Okwu Jehova na-atọ anyị ụtọ, “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” agaghịzi na-adọrọ mmasị anyị. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị esoro ndị na-etinye ihe ndị metụtara Alaeze Chineke n’ọnọdụ mbụ na-akpakọrịta, anyị ga-adị ka ha, na-ahụ ihe ndị ha hụrụ n’anya n’anya ma na-ezere ihe ndị ha na-ezere.—Abụ Ọma 15:4; Ilu 13:20.

15. Olee otú ịhụ ezi omume n’anya na ịkpọ mmebi iwu asị ga-esi wusie anyị ike dị ka o wusiri Jizọs?

15 Ịkpọ mmebi iwu asị na ịhụ ezi omume n’anya nyeere Jizọs aka ilekwasị anya ‘n’ọṅụ ahụ e setịpụrụ n’ihu ya.’ (Ndị Hibru 12:2) Ọ pụkwara inyere anyị aka. Anyị maara na “ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya.” Ihe ụtọ ọ bụla ụwa na-enye na-adịru nanị nwa oge. Otú ọ dị, “onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) N’ihi na Jizọs mere uche Chineke, o megheere ụmụ mmadụ ụzọ inweta ndụ ebighị ebi. (1 Jọn 5:13) Ka anyị nile ṅomie ya ma rite uru site n’iguzosi ike n’ezi ihe ya.

Ịnagide Mkpagbu

16. N’ihi gịnị ka Jizọs ji gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume ịhụrịta ibe ha n’anya?

16 Jizọs kwuru ụzọ ọzọ ndị na-eso ụzọ ya ga-esi ṅomie ya, na-asị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya.” (Jọn 15:12, 13, 17) E nwere ọtụtụ ihe mere Ndị Kraịst ji ahụ ụmụnna ha n’anya. Na nke a, ihe bụ́ isi Jizọs bu n’uche bụ asị ụwa ga-akpọ ha. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo m asị tupu ọ kpọọ unu asị. . . . Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:18, 20) Ee, ọbụna n’ịbụ ndị a na-akpagbu, Ndị Kraịst dị ka Jizọs. Ọ dị ha mkpa ịzụlite nkekọ ịhụnanya siri ike iji nyere ha aka ịnagide ịkpọasị ahụ.

17. N’ihi gịnị ka ụwa ji akpọ ezi Ndị Kraịst asị?

17 N’ihi gịnị ka ụwa ga-eji kpọọ Ndị Kraịst asị? Ọ bụ n’ihi na, dị ka Jizọs, ha “abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:14, 16) Ha anaghị etinye aka n’ihe ndị metụtara agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha na-agbasokwa ụkpụrụ Bible, na-akwanyere ndụ ùgwù dị ka ihe dị nsọ ma na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ihe bụ́ isi ha na-achụso bụ ihe ime mmụọ, ọ bụghị ihe anụ ahụ́. Ha bi n’ụwa, ma dị ka Pọl dere, ha adịghị “eji ya eme ihe n’újú.” (1 Ndị Kọrint 7:31) N’ezie, ụfọdụ ekwupụtawo mmasị ha nwere n’ụkpụrụ dị elu nke Ndịàmà Jehova. Ma Ndịàmà Jehova adịghị emebi ụkpụrụ ha iji mee ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ha nọ ma ọ bụ nabata ha. N’ihi ya, ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ụwa adịghị aghọta ha, ọtụtụ ndị kpọkwara ha asị.

18, 19. N’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs, olee otú Ndị Kraịst si eme ihe banyere mmegide na mkpagbu?

18 Ndịozi Jizọs hụrụ oké ịkpọasị ụwa nwere mgbe e jidere Jizọs ma gbuo ya, ha hụkwara otú Jizọs si mee ihe maka ịkpọasị ahụ. N’ogige Getsemeni, ndị okpukpe na-emegide Jizọs bịara ijide ya. Pita gbalịrị iji mma chebe ya, ma Jizọs gwara Pita, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya, n’ihi na ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52; Luk 22:50, 51) N’oge mbụ, ndị Izrel ji mma agha lụso ndị iro ha ọgụ. Otú ọ dị, ihe agbanweela ugbu a. Alaeze Chineke “abụghị akụkụ nke ụwa a,” o nweghịkwa ókèala ọ na-echebe. (Jọn 18:36) N’oge na-adịghị anya, Pita ga-eso ná mba ime mmụọ ahụ, bụ́ nke ndị òtù ya ga-abụ ụmụ amaala eluigwe. (Ndị Galeshia 6:16; Ndị Filipaị 3:20, 21) N’ihi ya, site na mgbe ahụ gaa n’ihu, ụmụazụ Jizọs ga na-eme ihe banyere ịkpọasị na mmegide dị ka Jizọs mere—n’atụghị egwu na n’udo. Ha ga-eji obi ike hapụrụ Jehova ihe ga-esi n’okwu ahụ pụta ma dabere n’ebe ọ nọ maka ike iji tachie obi.—Luk 22:42.

19 Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Pita dere, sị: “Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya. . . . Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, ọ nọghị na-eyi egwu, kama ọ nọgidere na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ na-ekpe ikpe n’ezi omume.” (1 Pita 2:21-23) Dị nnọọ ka Jizọs dọrọ aka ná ntị, Ndị Kraịst enwetawo mkpagbu siri ike ruo ọtụtụ afọ. Ma na narị afọ mbụ ma n’oge nke anyị, ha agbasowo ihe nlereanya Jizọs ma bụrụ ndị a maara dị ka ndị ji nnọọ ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi, na-egosi na ha bụ ndị udo na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Mkpughe 2:9, 10) Ka anyị nile n’otu n’otu ṅomie ha mgbe ọnọdụ chọrọ ka anyị mee otú ahụ.—2 Timoti 3:12.

“Yikwasịnụ Onyenwe Anyị Jizọs Kraịst”

20-22. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndị Kraịst si ‘eyikwasị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst’?

20 Pọl degaara ọgbakọ dị na Rom akwụkwọ, sị: “Yikwasịnụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, gharakwanụ ịdị na-ebu ụzọ eme atụmatụ maka ihe anụ ahụ́ na-achọ.” (Ndị Rom 13:14) Ndị Kraịst na-eyi Jizọs dị ka ákwà, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ha na-agbalịsi ike iṅomi àgwà na omume ya ruo n’ókè nke na ha na-adị ka Nna ha Ukwu—ọ bụ ezie na ha ezughị okè.—1 Ndị Tesalonaịka 1:6.

21 Anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma ‘n’iyikwasị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst’ ma ọ bụrụ na anyị amata ndụ Nna Ukwu ahụ ma na-agbalịsi ike ibi ndụ dị ka o si bie. Anyị na-eṅomi ịdị umeala n’obi ya, ịhụnanya o nwere maka ezi omume, asị ọ kpọrọ mmebi iwu, ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụnna ya nọ, ya abụghị akụkụ nke ụwa na ya iji ndidi tachie obi n’ahụhụ. Anyị adịghị “ebu ụzọ eme atụmatụ maka ihe anụ ahụ́ na-achọ”—ya bụ, anyị adịghị eme ka iru ihe mgbaru ọsọ n’ihe nke ụwa ma ọ bụ imejụ ọchịchọ nke anụ ahụ́ bụrụ ihe bụ́ isi ná ndụ anyị. Kama nke ahụ, mgbe anyị na-eme mkpebi ma ọ bụ na-ahụ maka nsogbu, anyị na-ajụ, sị: ‘Gịnị ka Jizọs gaara eme n’ọnọdụ a? Gịnị ka ọ ga-achọ ka m mee?’

22 N’ikpeazụ, anyị na-eṅomi Jizọs site n’iji ọrụ n’aka ‘n’ikwusa ozi ọma ahụ.’ (Matiu 4:23; 1 Ndị Kọrint 15:58) N’ụzọ dị otú ahụkwa, Ndị Kraịst na-agbaso ụkpụrụ Jizọs setịpụrụ, isiokwu na-esonụ ga-atụlekwa otú ha si eme nke ahụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ihi gịnị ka ịdị umeala n’obi ji dị Onye Kraịst oké mkpa?

• Olee otú anyị pụrụ isi zụlite echiche ziri ezi banyere ihe ziri ezi na ihe ọjọọ?

• N’ụzọ dị aṅaa ka Ndị Kraịst si eṅomi Jizọs n’ime ihe banyere mmegide na mkpagbu?

• Olee otú o si kwe omume ‘iyikwasị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 7]

Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè nke ịdị umeala n’obi

[Foto dị na peeji nke 8]

Akụkụ nile nke ndụ Onye Kraịst, gụnyere ime nkwusa, chọrọ ịdị umeala n’obi

[Foto dị na peeji nke 9]

Setan pụrụ ime ka ntụrụndụ na-ezighị ezi yie ihe dị mma n’anya Onye Kraịst

[Foto dị na peeji nke 10]

Ịhụnanya ụmụnna nwere n’ebe anyị nọ ga-ewusi anyị ike ịnagide mmegide