Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ịhụ Chineke n’Anya Mere Ka Ha Dị n’Otu

Ndị Ịhụ Chineke n’Anya Mere Ka Ha Dị n’Otu

Ndị Ịhụ Chineke n’Anya Mere Ka Ha Dị n’Otu

MGBE e guzobere ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, otu n’ime njimara ya ndị pụtara ìhè—n’agbanyeghị ụdị ndị dị iche iche mejupụtara ya—bụ ịdị n’otu ya. Ndị ahụ na-efe ezi Chineke ahụ ofufe si ná mba ndị dị n’Eshia, Europe, na Africa. Ha bụ ndị nọ n’ọnọdụ dị iche iche—ndị ndú okpukpe, ndị soja, ndị ohu, ndị gbara ọsọ ndụ, ndị ahịa, ndị ọkachamara na ndị ọchụ nta ego. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Juu, ebe ndị ọzọ bụ ndị Jentaịl. Ọtụtụ n’ime ha bụbu ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị na-edina ụdị onwe ha, ndị aṅụrụma, ndị ohi ma ọ bụ na-apụnara mmadụ ihe. Otú ọ dị, mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst, ha hapụrụ ndụ ọjọọ ndị ahụ ma bụrụ ndị dị n’otu n’okwukwe.

Gịnị mere ka Iso Ụzọ Kraịst nke narị afọ mbụ nwee ike ime ka ndị a nile dị n’otu? Gịnị mere ha na ibe ha na ndị mmadụ n’ozuzu ji dị n’udo? Gịnị mere ha esonyeghị ná nnupụisi na agha? Gịnị mere Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ ji dị nnọọ iche n’okpukpe ndị bụ́ isi nke oge a?

Gịnị Mere Ka Ndị Nọ n’Ọgbakọ Dịrị n’Otu?

Ihe bụ́ isi mere ka ndị kwere ekwe na narị afọ mbụ dịrị n’otu bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ. Ndị Kraịst ahụ ghọtara ụgwọ bụ́ isi ha ji ịhụ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, n’anya, site n’obi ha nile, mkpụrụ obi ha nile, na uche ha nile. Dị ka ihe atụ, e nyere Pita onyeozi, bụ́ onye Juu, ntụziaka ịga n’ụlọ onye mba ọzọ, onye ya na ya na-agaraghị enwe mmekọrịta chiri anya. Ihe kwaliri ya irube isi bụ n’ụzọ bụ́ isi ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ. Pita na Ndị Kraịst oge mbụ ndị ọzọ na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya bụ́ nke hiwere isi n’ezi ihe ọmụma ha nwere banyere àgwà, ihe ndị na-amasị Ya na ihe ndị na-adịghị amasị Ya. Ka oge na-aga, ndị nile na-efe Jehova ghọtara na ọ bụ uche ya ka ha “dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu uche na n’otu ụzọ iche echiche.”—1 Ndị Kọrint 1:10; Matiu 22:37; Ọrụ 10:1-35.

Okwukwe ndị kwere ekwe nwere na Jizọs Kraịst jikọtakwuru ha ọnụ. Ha chọrọ ịgbasochi nzọụkwụ ya anya. O nyere ha iwu, sị: “Na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, . . . Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Nke a ga-abụ ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’aja, ọ bụghị nke elu ọnụ. Gịnị ga-esi na ya pụta? Jizọs kpere ekpere banyere ndị na-etinye okwukwe na ya, sị: “M na-arịọ, . . . ka ha nile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ dị n’otu, mụ onwe m na gị dịrịkwa n’otu, ka ha na anyị wee dị n’otu.”—Jọn 17:20, 21; 1 Pita 2:21.

Jehova wụsara ezi ndị ohu ya mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ, ya. Mmụọ a kwalitere ịdị n’otu n’etiti ha. O mere ka ha ghọta ozizi Bible, a nakwerekwaara nghọta a n’ọgbakọ nile. Ndị na-efe Jehova kwusara otu ozi ahụ—ido aha Jehova nsọ site n’Alaeze Mezaịa Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe nke ga-achị ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ndị Kraịst oge mbụ ghọtara ibu ọrụ ha bụ́ “abụghị akụkụ nke ụwa.” N’ihi ya, mgbe ọ bụla e nwere ọgba aghara nke ndị nkịtị ma ọ bụ agha, Ndị Kraịst nọpụrụ iche. Ha sooro onye ọ bụla mee udo.—Jọn 14:26; 18:36; Matiu 6:9, 10; Ọrụ 2:1-4; Ndị Rom 12:17-21.

Ndị kwere ekwe nile mere òkè nke ha iji kwalite ịdị n’otu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ime ka ndụ ha kwekọọ na Bible. N’ihi ya, Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Yipụ ụdị mmadụ ochie ahụ bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga,” ma “yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ.”—Ndị Efesọs 4:22-32.

Ha Nọgidere Na-adị n’Otu

N’ezie, ndị kwere ekwe na narị afọ mbụ bụ ndị na-ezughị okè, ọnọdụ dị iche iche bilitekwara bụ́ ndị wetaara ịdị n’otu ha ihe ịma aka. Dị ka ihe atụ, Ọrụ 6:1-6 kọrọ na esemokwu bilitere n’etiti Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na-asụ Grik na ndị na-asụ Hibru. Ndị na-asụ Grik chere na a na-akpa ókè megide ha. Otú ọ dị, ozugbo e mere ka ndịozi mara banyere okwu ahụ, e doziri ya ngwa ngwa na n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Ka e mesịrị, okwu banyere ozizi bilitere bụ́ nke dugara n’esemokwu banyere iwu ndị ji ndị na-abụghị ndị Juu n’ọgbakọ Ndị Kraịst. E mere mkpebi dabere n’ụkpụrụ Bible, mmadụ nile nabatakwara mkpebi a.—Ọrụ 15:1-29.

Ihe atụ ndị a na-egosi na nghọtahie edugaghị ná nkewa agbụrụ ma ọ bụ nkewa na-adịgide adịgide n’ihe banyere ozizi n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ihe ndị na-eme ka a dị n’otu bụ́—ịhụnanya maka Jehova, okwukwe na Jizọs Kraịst, inwe ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’ebe ibe ha nọ, ịnakwere nduzi nke mmụọ nsọ, nghọta doro anya nke ozizi Bible na ịdị njikere ime mgbanwe n’akparamàgwà onwe onye—nwere ike zuru ezu ime ka ọgbakọ oge mbụ ahụ nọgide na-adị n’otu na n’udo.

Ịdị n’Otu n’Ofufe n’Oge A

À pụrụ inweta ịdị n’otu n’otu ụzọ ahụ taa? Ihe ndị a kpatara ịdị n’otu, hà ka pụrụ ijikọta ndị nọ n’otu okpukpe ọnụ ma mee ka ha na ndị agbụrụ nile n’akụkụ nile nke ụwa dịrị n’udo? Ee, ha pụrụ! Ndịàmà Jehova dị n’otu n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke jikọtara ihe karịrị narị ala, agwaetiti na ókèala, abụọ na iri atọ. Otu ihe ahụ mere ka Ndị Kraịst dị n’otu na narị afọ mbụ mekwara ka ha dị n’otu.

Ihe kasị atụnye ụtụ n’ịdị n’otu nke Ndịàmà Jehova bụ nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke. Nke a pụtara na ha na-etinye mgbalị siri ike iguzosi ike n’ihe nye ya n’ọnọdụ nile. Ndịàmà Jehova na-egosipụtakwa okwukwe na Jizọs Kraịst na n’ozizi ya. Ndị Kraịst a na-egosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ ma na-ekwusa otu ozi ọma nke Alaeze Chineke ahụ n’ala nile ebe ha na-ekwusa ozi ọma. Ha na-enwe obi ụtọ iso ndị okpukpe, agbụrụ, mba na ndị nọ n’ọnọdụ nile ekwurịta banyere Alaeze a. Ndịàmà Jehova na-anọpụkwa iche n’ihe omume ụwa, bụ́ nke na-enyere ha aka iguzogide nrụgide ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke ọdịnala, na nke azụmahịa bụ́ ndị na-akpatakarị nkewa n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. Ndịàmà nile na-anakwere ibu ọrụ ha nke ịkwalite ịdị n’otu site n’ime ka ndụ ha na-ekwekọ n’ụkpụrụ Bible.

Ịdị n’Otu Na-adọta Ndị Ọzọ

Mgbe mgbe, ịdị n’otu a akpaliwo mmasị nke ndị na-abụghị Ndịàmà. Dị ka ihe atụ, Ilse, * bụbu onye nọn Katọlik bi n’ebe obibi ndị nọn dị na Germany. Gịnị dọtara mmasị ya n’ebe Ndịàmà Jehova nọ? Ilse kwuru, sị: “Ha bụ ndị kasị mma m hụtụrụla. Ha anaghị aga agha; ha anaghị eme ihe ọ bụla ga-emerụ onye ọ bụla ahụ́. Ha chọrọ inyere ndị mmadụ aka ibi ndụ obi ụtọ na paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze Chineke.”

E nwekwara Günther, bụ́ onye agha Germany e zigara France n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Otu ụbọchị, onye ụkọchukwu ndị Protestant kwuuru òtù ndị agha Günther nọ na ya okwuchukwu. Ụkọchukwu ahụ kpere ekpere maka ngọzi, nchebe na mmeri. Ka okwuchukwu ahụ gasịrị, Günther gara ebe ọ na-eche nche. N’iji ihe e ji ahụ ihe dị n’ebe dị anya, ọ hụrụ ndị agha bụ́ ndị iro ha ka ha nọ n’akụkụ nke ọzọ na-egere okwuchukwu onye ụkọchukwu na-ekwu. Günther mesịrị kwuo, sị: “O yiri ka ụkọchukwu ahụ ò kpekwara ekpere maka ngọzi, nchebe na mmeri. Anọ m na-eche otú ọ ga-esi kwe omume chọọchị Ndị Kraịst ibusorịta onwe ha agha.” Ihe omume ndị a ekweghị apụ apụ n’obi Günther. Mgbe o mesịrị zute Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-adịghị etinye aka n’agha, Günther sonyere n’òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ.

Ashok na Feema nọbu n’otu okpukpe a na-ekpe n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. N’ụlọ ha, ha nwere ụlọ arụsị nke ha wuru maka otu chi. Mgbe ọrịa siri ike dakwasịrị ezinụlọ ha, ha nyochagharịrị okpukpe ha. Ka ha na Ndịàmà Jehova na-akparịta ụka, ozizi Bible na ịhụnanya dị n’etiti Ndịàmà dọọrọ mmasị Ashok na Feema. Ha bụzi ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi ọma Alaeze Jehova.

Ilse, Günther, Ashok, na Feema na ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova dị n’otu n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Ha kweere ná nkwa Bible bụ́ na otu ihe ndị ahụ mere ka ha dị n’otu n’ofufe taa ga-eme ka ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi dị n’otu n’isi nso. Mgbe ahụ, a gaghịzi enwe arụrụala, adịghị n’otu na nkewa n’aha okpukpe. Ụwa nile ga-adị n’otu n’ofufe nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—Mkpughe 21:4, 5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 A gbanwere aha ụfọdụ e ji mee ihe n’isiokwu a.

[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]

N’agbanyeghị na ha nọ n’ọnọdụ dị iche iche, Ndị Kraịst oge mbụ dị n’otu