Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Zụrụ Ịgba Àmà nke Ọma

Ndị A Zụrụ Ịgba Àmà nke Ọma

Ndị A Zụrụ Ịgba Àmà nke Ọma

“Unu ga-agbakwa àmà banyere m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria dum nakwa ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.”—ỌRỤ 1:8.

1, 2. Olee ọrụ e nyere Pita, ònyekwa nyere ya ọrụ ahụ?

“JIZỌS onye Nazaret . . . nyere anyị iwu ime nkwusa nye ndị mmadụ na ịgba àmà nke ọma na onye a bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” (Ọrụ 10:38, 42) Pita onyeozi ji okwu ndị a kọwaara Kọniliọs na ezinụlọ ya ọrụ ọ natara ịghọ onye na-ezisa ozi ọma.

2 Olee mgbe Jizọs nyere ọrụ ahụ? O yiri ka Pita ọ̀ na-eche banyere ihe Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ kwuru kpọmkwem tupu ya arịgoro eluigwe. N’oge ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Unu ga-agbakwa àmà banyere m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria dum nakwa ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Otú ọ dị, ruo oge ụfọdụ tupu mgbe ahụ, Pita amarawo na, dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs, ya ga-agwa ndị ọzọ okwu banyere okwukwe ya na Jizọs.

Ọzụzụ Were Afọ Atọ

3. Olee ọrụ ebube Jizọs rụrụ, òkù dịkwa aṅaa ka ọ kpọrọ Pita na Andru?

3 Ọtụtụ ọnwa ka e mesịrị ya baptizim na 29 O.A., Jizọs mere nkwusa n’ebe Pita na nwanne ya nwoke bụ́ Andru rụrụ ọrụ dị ka ndị ọkụ azụ n’Oké Osimiri Galili. Ha anọwo ebe ahụ abalị ahụ dum n’egbuteghị azụ ọ bụla. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs gwara ha, sị: “Kwọpụ ụgbọ gaa n’ebe dị omimi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu wee gbute azụ.” Mgbe ha mere ihe Jizọs gwara ha, “ha gbutere azụ bara oké ụba. N’eziokwu, ụgbụ ha malitere ịdọwasị.” Mgbe Pita hụrụ ọrụ ebube ahụ, ụjọ tụrụ ya, ma Jizọs mere ka ahụ́ ruo ya ala, na-agwa ya, sị: “Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”—Luk 5:4-10.

4. (a) Olee otú Jizọs si kwadebe ndị na-eso ụzọ ya ịgba àmà? (b) Olee otú ozi ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-aha ma e jiri ya tụnyere nke ya onwe ya?

4 Ozugbo ahụ, Pita na Andru—nakwa Jems na Jọn, ụmụ Zebedi—hapụrụ ụgbọ ha ma soro Jizọs. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ, ha sooro Jizọs na njem nkwusa ya ma nata ọzụzụ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma. (Matiu 10:7; Mak 1:16, 18, 20, 38; Luk 4:43; 10:9) Ná ngwụsị nke ọzụzụ ahụ na Naịsan 14, 33 O.A., Jizọs gwara ha, sị: “Onye na-egosipụta okwukwe n’ebe m nọ, onye ahụkwa ga-arụ ọrụ ndị m na-arụ; ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ndị a.” (Jọn 14:12) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-agba àmà nke ọma dị ka Jizọs mere, kama nke ha ga-asa mbara karịa nke ya. Dị ka ha mụtara n’oge na-adịghị anya, ha na ndị nile ga-abụ ndị na-eso ụzọ n’ọdịnihu ga-agba àmà ná “mba nile” ruo nnọọ ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’—Matiu 28:19, 20.

5. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi rite uru n’ọzụzụ Jizọs nyere ụmụazụ ya?

5 Anyị na-ebi ná “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3) N’adịghị ka ndị na-eso ụzọ oge mbụ ahụ, anyị apụghị iso Jizọs ma hụ ka ọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ma, anyị pụrụ irite uru n’ọzụzụ o nyere site n’ịgụ banyere otú o si mee nkwusa na ntụziaka ndị o nyere ụmụazụ ya n’ime Bible. (Luk 10:1-11) Otú ọ dị, isiokwu a ga-atụle ihe ọzọ dị oké mkpa Jizọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya—àgwà ziri ezi e kwesịrị inwe banyere ọrụ nkwusa ahụ.

Nchegbu Maka Ndị Mmadụ

6, 7. Olee àgwà Jizọs nwere nke mere ka ozi ya dị irè, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya n’akụkụ a?

6 Gịnị mere Jizọs ji gbaa àmà dị irè otú ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ mmasị miri emi o nwere n’ahụ́ ndị mmadụ na nchegbu o nwere maka ha. Ọbụ abụ ahụ buru amụma na Jizọs “ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere.” (Abụ Ọma 72:13) O mezuru amụma ahụ n’ezie. Bible na-ekwu banyere otu oge, sị: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Ọbụna ajọ ndị mmehie hụtara nchegbu o nwere n’ahụ́ ha ma bụrụ ndị a dọtara n’ebe ọ nọ.—Matiu 9:9-13; Luk 7:36-38; 19:1-10.

7 Taa, anyị onwe anyị ga-adịkwa irè ma ọ bụrụ na anyị egosi otu nchegbu ahụ maka ndị mmadụ. Tupu ị gawa ozi ọma, gịnị ma i jiri obere oge chee echiche banyere otú ihe ị na-aga ịgwa ndị mmadụ dịruru ha ná mkpa? Chee echiche banyere nsogbu ndị ha pụrụ inwe bụ́ ndị ọ bụ nanị Alaeze ahụ ga-edozi. Kpebisie ike inwe echiche ziri ezi banyere onye ọ bụla, ebe ọ bụ na ị maghị onye ga-anabata ozi ahụ. Ma eleghị anya, onye ọzọ ị ga-agakwuru anọwo na-ekpe ekpere maka onye dị ka gị ịbịa nyere ya aka!

Onye Ịhụnanya Kpaliri

8. N’iṅomi Jizọs, gịnị na-akpali ụmụazụ ya ikwusa ozi ọma ahụ?

8 Ozi ọma ahụ Jizọs kwusara metụtara mmezu nke uche Jehova, ido aha Ya nsọ, igosi na o ruuru Ya ịbụ ọkaaka—ihe iseokwu ndị kasị mkpa na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu. (Matiu 6:9, 10) N’ihi na ọ hụrụ Nna ya n’anya, a kpaliri Jizọs ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ruo n’ọgwụgwụ na ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze ahụ, bụ́ nke ga-edozi ihe iseokwu ndị ahụ. (Jọn 14:31) N’ihi na otu ihe ahụ na-akpalikwa ụmụazụ Jizọs taa, ha na-adị uchu ka ha na-ekere òkè n’ozi ahụ. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu,” gụnyere iwu nke ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ.—1 Jọn 5:3; Matiu 28:19, 20.

9, 10. E wezụga ịhụnanya maka Chineke, olee ịhụnanya ọzọ na-akwali anyị ịgba àmà nke ọma?

9 Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-edebe ihe ndị m nyere n’iwu. Onye nwere ihe ndị m nyere n’iwu ma na-edebe ha, onye ahụ bụ onye hụrụ m n’anya.” (Jọn 14:15, 21) N’ihi ya, ịhụnanya anyị nwere maka Jizọs kwesịrị ịkwali anyị ịgba àmà banyere eziokwu ahụ na ime ihe ndị ọzọ Jizọs nyere n’iwu. N’otu n’ime oge ndị o mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Jizọs gbara Pita ume, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m. . . . Na-azụ obere ụmụ atụrụ m. . . . Na-azụ obere ụmụ atụrụ m.” Gịnị kwesịrị ịkpali Pita ime nke ahụ? Jizọs nyere azịza ya mgbe ọ jụrụ Pita ugboro ugboro, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya? . . . Ị̀ hụrụ m n’anya? . . . Ì nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe m nọ?” Ee, ịhụnanya Pita nwere maka Jizọs, mmetụta na-ekpo ọkụ o nwere n’ebe ọ nọ, ga-akpali ya ịgba àmà nke ọma, ịchọta “obere ụmụ atụrụ” Jizọs ma mesịa ghọọrọ ha onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ.—Jọn 21:15-17.

10 Taa, anyị amaghị Jizọs ihu na ihu dị ka Pita maara ya. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ghọtara ihe Jizọs meere anyị nke ọma. Oké ịhụnanya nke dugara ya ‘n’idetụ ọnwụ ire maka mmadụ nile,’ na-akpali obi anyị. (Ndị Hibru 2:9; Jọn 15:13) Ọ dị anyị otú ọ dị Pita mgbe o dere, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst ahụ nwere na-arụgide anyị . . . Ọ nwụkwara maka mmadụ nile ka ndị dị ndụ wee ghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe ha, kama maka onye ahụ nke nwụrụ maka ha.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Anyị na-egosi na anyị ji ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe anyị nọ kpọrọ ihe nke ukwuu nakwa na anyị hụkwara ya n’anya site n’iji ọrụ ahụ o nyere anyị nke ịgba àmà nke ọma akpọrọ nnọọ ihe. (1 Jọn 2:3-5) Ọ dịghị mgbe anyị ga-achọ ileghara ọrụ nkwusa anyị anya, ka à ga-asị na anyị ejighị àjà Jizọs kpọrọ ihe.—Ndị Hibru 10:29.

Ilekwasị Anya n’Ebe Kwesịrị Ekwesị

11, 12. Nzube dị aṅaa ka Jizọs ji bịa n’ụwa, oleekwa otú o si gosipụta na ọ bụ n’ebe ahụ ka o lekwasịrị anya?

11 Mgbe Jizọs nọ n’ihu Pọntiọs Paịlet, o kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya n’ịgbara eziokwu ahụ àmà. Nke ahụ bụ uche Chineke maka ya.

12 N’ezie, Setan nwara Jizọs na nke a. Obere oge ka e mesịrị Jizọs baptizim, Setan kwere nkwa ime ya oké mmadụ n’ụwa, inye ya “alaeze nile nke ụwa na ebube ha.” (Matiu 4:8, 9) Ka e mesịrị, ndị Juu chọrọ ime ya eze. (Jọn 6:15) Ụfọdụ ndị pụrụ iche echiche uru ndị a pụrụ irite site na Jizọs ịnakwere ihe ndị ahụ, ikekwe na-eche na dị ka eze bụ́ mmadụ, Jizọs pụrụ imere ihe a kpọrọ mmadụ ọtụtụ ihe. Otú ọ dị, Jizọs jụrụ ụdị echiche ahụ. O lekwasịrị anya n’ịgbara eziokwu ahụ àmà.

13, 14. (a) Olee ihe na-adọpụlighị uche Jizọs? (b) Ọ bụ ezie na Jizọs bụ ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, gịnị ka ọ rụzuru?

13 Tụkwasị na nke ahụ, nchụso nke akụ̀ na ụba adọpụghị uche Jizọs. N’ihi ya, o bighị ndụ ọgaranya. O nweghịdị ụlọ nke aka ya. N’otu oge, o kwuru, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ịtọgbọ isi ya.” (Matiu 8:20) Mgbe Jizọs nwụrụ, nanị ihe e dekọrọ na Bible dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa o nwere bụ uwe ya ndị agha Rom feere nza. (Jọn 19:23, 24) Mgbe ahụ, ndụ Jizọs ọ̀ bụ nke na-enweghị isi? Ọ dịghị ma ọlị!

14 Jizọs rụzuru ihe omepụrụ onye ọ dịịrị kasị baa ọgaranya na-apụghị ịrụzu. Pọl kwuru, sị: “Unu maara obiọma na-erughịrị mmadụ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na ọ bụ ezie na ọ bara ọgaranya, ọ dara ogbenye n’ihi unu, ka unu wee baa ọgaranya site n’ịda ogbenye ya.” (2 Ndị Kọrint 8:9; Ndị Filipaị 2:5-8) Ọ bụ ezie na ọ bụ ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, Jizọs megheere ndị dị umeala n’obi ụzọ ịnụ ụtọ ndụ ebighị ebi n’izu okè. Lee ka anyị si nwee ekele maka ihe o meere anyị! Leekwa ka anyị si aṅụrị ọṅụ ná nkwụghachi ụgwọ o nwetara n’ihi ilekwasị anya n’ime uche Chineke!—Abụ Ọma 40:8; Ọrụ 2:32, 33, 36.

15. Olee ihe bara uru karịa akụ̀ na ụba?

15 Ndị Kraịst taa bụ́ ndị na-agbalị iṅomi Jizọs na-ajụkwa ịbụ ndị nchụso nke ihe onwunwe dọpụrụ uche ha. (1 Timoti 6:9, 10) Ha kwetara na akụ̀ na ụba pụrụ ime ka mmadụ bie ndụ ntụsara ahụ́, ma ha maara na ọdịnihu ebighị ebi ha adabereghị n’akụ̀ na ụba. Mgbe Onye Kraịst nwụrụ, akụ̀ na ụba ya adịghị abara ya uru dị nnọọ ka uwe Jizọs na-abaghịrị ya uru mgbe ọ nwụrụ. (Eklisiastis 2:10, 11, 17-19; 7:12) Mgbe Onye Kraịst nwụrụ, nanị otu ihe o nwere na-abara ya nnọọ uru bụ mmekọrịta ya na Jehova na nke ya na Jizọs Kraịst.—Matiu 6:19-21; Luk 16:9.

Mmegide Emeghị Ka Ọ Daa Mbà

16. Olee otú Jizọs si meghachi omume mgbe a na-emegide ya?

16 Mmegide emeghị ka Jizọs kwụsị ilekwasị anya n’ịgbara eziokwu ahụ àmà. Ọbụna ịmara na ozi elu ala ya ga-eduga na ya ịnwụ ọnwụ ịchụàjà emeghị ka ọ daa mbà. Banyere Jizọs, Pọl kwuru, sị: “N’ihi ọṅụ ahụ e setịpụrụ n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, na-eleda ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:2) Rịba ama na Jizọs ‘ledara ihere anya.’ Ihe ndị na-emegide ya chere banyere ya enyeghị ya nsogbu n’obi. O lekwasịrị anya n’ime uche Chineke.

17. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná ntachi obi Jizọs?

17 N’ikwu banyere ihe mmụta dị ná ntachi obi Jizọs, Pọl na-agba Ndị Kraịst ume, sị: “Na-echesinụ echiche ike banyere onye ahụ diworo okwu mmegide dị otú ahụ nke ndị mmehie bụ́ ndị na-emehie megide ọdịmma nke ha, ka ike wee ghara ịgwụ unu, unu ewee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.” (Ndị Hibru 12:3) N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ ihe na-akụda mmụọ iche mmegide ma ọ bụ ịkwa emo ihu kwa ụbọchị. Ọ pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ike ịnọgide na-eguzogide ihe ndọrọ nke ụwa, ikekwe okwu nkụda mmụọ nke ndị ikwu anyị bụ́ ndị na-agba anyị ume “ịba uru.” Otú ọ dị, dị ka Jizọs, anyị na-elegara Jehova anya maka nkwado ka anyị na-ekpebisi ike ibute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị.—Matiu 6:33; Ndị Rom 15:13; 1 Ndị Kọrint 2:4.

18. Olee ezi ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe Jizọs gwara Pita?

18 Ọjụjụ Jizọs jụrụ ịbụ onye a dọpụrụ uche ya pụtara ìhè mgbe ọ malitere ịgwa ndị na-eso ụzọ ya banyere ọnwụ ya na-abịanụ. Pita gbara Jizọs ume ‘imere onwe ya ebere’ ma mesie ya obi ike na ‘ihe a agaghị eme ya ma ọlị.’ Jizọs jụrụ ịṅa ntị n’ihe ọ bụla pụrụ ime ka ọ daa mbà ná mkpebi siri ike o mere ime uche Jehova. Ọ gbanyere Pita azụ ma kwuo, sị: “Gaa n’azụ m, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.” (Matiu 16:21-23) Ka anyị kpebisiekwa ike ịnọgide na-ajụ echiche mmadụ. Kama nke ahụ, ka echiche Chineke na-eduzi anyị mgbe nile.

Iweta Abamuru Na-adịgide Adịgide

19. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye ọrụ ebube, gịnị bụ akụkụ kasị mkpa nke ozi Jizọs?

19 Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube iji gosi na ya bụ Mezaịa ahụ. Ọbụna ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. Ọrụ ndị ahụ dọtara ìgwè mmadụ, ma Jizọs abịaghị n’ụwa nanị iji rụọ ọrụ ebere. Ọ bịara ịgbara eziokwu ahụ àmà. Ọ maara na ihe anụ ahụ́ ọ bụla o nyere ndị mmadụ agaghị adịte aka. Ọbụna ndị ọ kpọlitere n’ọnwụ nwụkwara ọzọ. Ọ bụ nanị site n’ịgbara eziokwu ahụ àmà ka ọ pụrụ inyere ụfọdụ aka inweta ndụ ebighị ebi.—Luk 18:28-30.

20, 21. Echiche ziri ezi dị aṅaa ka ezi Ndị Kraịst na-enwe n’ihe banyere ọrụ ọma?

20 Taa, ụfọdụ ndị na-agbalị iṅomi ọrụ ọma ndị Jizọs rụrụ site n’iwu ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ịrụrụ ndị ogbenye ọrụ ebere ndị ọzọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ na-efu ha oké ihe, a na-ajakwa ezi ebumnobi ha mma; ma ahụ́ efe ọ bụla ha na-eweta adịghị adịte aka. Ọ bụ nanị Alaeze ahụ ga-eweta ahụ́ efe na-adịgide adịgide. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova na-elekwasị anya n’ịgba àmà banyere eziokwu nke Alaeze ahụ, dị ka Jizọs mere.

21 N’ezie, ezi Ndị Kraịst na-arụ ọrụ ọma. Pọl dere, sị: “Ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) N’oge nsogbu ma ọ bụ mgbe mmadụ nọ ná mkpa, anyị adịghị ala azụ ‘n’imere ndị agbata obi ma ọ bụ ụmụnna anyị Ndị Kraịst ihe ọma.’ Otú o sina dị, anyị na-elekwasị anya n’ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya—ịgbara eziokwu ahụ àmà.

Mụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya Jizọs

22. Gịnị mere Ndị Kraịst ji ekwusara ndị agbata obi ha ozi ọma?

22 Pọl dere, sị: “N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na akpọsaghị m ozi ọma!” (1 Ndị Kọrint 9:16) O legharaghị ozi ọma ahụ anya n’ihi na ikwusa ya ga-apụtara ma ya ma ndị na-ege ya ntị ndụ. (1 Timoti 4:16) Anyị sikwa otú ahụ ele ozi anyị anya. Anyị chọrọ inyere ndị agbata obi anyị aka. Anyị chọrọ igosi ịhụnanya anyị nwere maka Jehova. Anyị chọrọ igosipụta na anyị hụrụ Jizọs n’anya ma nwee ekele maka ịhụnanya dị ukwuu o nwere n’ebe anyị nọ. N’ihi ya, anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ ma si otú a na-ebi ndụ “ọ bụkwaghị maka ọchịchọ mmadụ, kama maka uche Chineke.”—1 Pita 4:1, 2.

23, 24. (a) Olee ihe anyị na-amụta site n’ọrụ ebube nke azụ ahụ? (b) Ole ndị taa na-agba àmà nke ọma?

23 Dị ka Jizọs, anyị adịghị ada mbà mgbe ndị ọzọ na-akwa anyị emo ma ọ bụ jiri iwe jụ ozi anyị. Anyị na-amụta ihe site n’ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ mgbe ọ kpọrọ Pita na Andru ka ha soro ya. Anyị ghọtara na ọ bụrụ na anyị erubere Jizọs isi ma wụnye ụgbụ anyị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọbụna ná mmiri ndị yiri ka ọ dịghị ihe dị na ha, ịkụ azụ anyị pụrụ ịrụpụta ihe. Ọtụtụ ndị ọkụ azụ bụ́ Ndị Kraịst egbutewo azụ buru ibu mgbe ha jisịrị ọtụtụ afọ kụọ azụ ná mmiri ndị yiri ka azụ adịghị na ha. Ndị ọzọ akwagawo ebe a na-egbute azụ karị ma gbute ọtụtụ azụ ebe ahụ. N’agbanyeghị ihe anyị na-eme, anyị agaghị akwụsị ịwụnye ụgbụ anyị. Anyị maara na ọ dịbeghị akụkụ ụwa Jizọs kwuru na a rụzuwo ọrụ nkwusa ahụ na ya.—Matiu 24:14.

24 Ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii ji ọrụ n’aka n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. Mbipụta Ụlọ Nche nke February 1, 2005, ga-ebu akụkọ mgbaafọ nke ọrụ ha n’ụwa nile n’afọ ije ozi 2004. Ihe ndekọ ahụ ga-egosipụta ngọzi bara ụba nke Jehova n’ọrụ nkwusa ahụ. N’oge fọdụụrụ usoro ihe a, ka anyị nọgide na-etinye uche n’okwu Pọl ahụ na-akpali akpali bụ́: “Kwusaa okwu ahụ, nọgidesie ike na ya.” (2 Timoti 4:2) Ka anyị nọgide na-agba àmà nke ọma ruo mgbe Jehova ga-asị na ọrụ ahụ agwụwo.

Malite n’afọ a, Akụkọ Afọ Ije Ozi nke Ndịàmà Jehova n’Ụwa Nile agaghịzi adị na-apụta ná mbipụta Ụlọ Nche nke January 1. Kama nke ahụ, a ga na-ebipụta ya na nke February 1.

Ị̀ Pụrụ Ịza Ajụjụ Ndị A?

• Olee otú anyị pụrụ isi rite uru n’ọzụzụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

• Àgwà dị aṅaa ka Jizọs nwere n’ebe ndị o kwusaara ozi ọma nọ?

• Gịnị na-akpali anyị ịgba àmà nke ọma?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi lekwasị anya n’ime uche Chineke dị ka Jizọs mere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Anyị ga-adị irè n’ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị egosipụta otu nchegbu ahụ Jizọs nwere maka ndị mmadụ

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ihe bụ́ isi mere Jizọs ji bịa n’ụwa bụ ịgbara eziokwu ahụ àmà

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ndịàmà Jehova na-elekwasị anya n’ịgba àmà nke ọma