Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Nri—Ihe Karịrị Nanị Oge E Ji Eri Nri!

Oge Nri—Ihe Karịrị Nanị Oge E Ji Eri Nri!

Oge Nri—Ihe Karịrị Nanị Oge E Ji Eri Nri!

EZIGBO nri na-atọ onye ọ bụla ụtọ. Ọ bụrụ na i jikọta nri ahụ na ezi mkparịta ụka, tinyere ezi mkpakọrịta nke gị na ndị ị hụrụ n’anya, ọ ga-aghọ oge na-enye obi ụtọ, nke e ji emejụ ihe karịrị nanị agụụ. Ọtụtụ ezinụlọ na-eme ka ọ bụrụ omume ha irikọ nri ọnụ, ọ dịkarịa ala otu ugboro n’ụbọchị. Oge nri na-enye ezinụlọ ohere ikwurịta ihe ndị ha ga-eme ma ọ bụ atụmatụ ha n’ụbọchị ahụ. Ndị nne na nna bụ́ ndị na-ege ntị n’okwu ụmụ ha na-aghọtatụ echiche na mmetụta ndị ụmụ ha na-enwe. Ka oge na-aga, mkpakọrịta na-enye obi ụtọ e ji ntụsara ahụ́ enwe ka a na-eri nri na-eme ka e nwee nchebe, ntụkwasị obi na ịhụnanya nke na-eme ka ezinụlọ kwụsie ike.

Taa, n’ihi na ọtụtụ ndị òtù ezinụlọ na-eji ọrụ n’aka, ije adịrịkwa ha n’ụkwụ mgbe nile, ọ na-esiri ha ike irikọ nri ọnụ. N’ebe ụfọdụ n’ụwa, o megidere omenala ezinụlọ irikọ nri ọnụ ma ọ bụ ọbụna ikwu okwu mgbe a na-eri nri. Ezinụlọ ndị ọzọ nwere àgwà nke ịgbanye TV n’oge nri, na-anapụ nnọọ onwe ha nkwurịta okwu bara uru.

Otú ọ dị, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịdị njikere iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ewulite ezinụlọ ha. (Ilu 24:27) Ogologo oge gara aga, a gwara ndị nne na nna na otu n’ime oge ndị kasị mma iji kụziere ụmụ ha Okwu Chineke bụ ‘mgbe ha na-anọdụ n’ụlọ ha.’ (Deuterọnọmi 6:7) Ịnọkọta ọnụ mgbe nile maka nri na-enye ndị mụrụ ụmụ ohere pụrụ iche iji kụnye ịhụnanya miri emi maka Jehova na ụkpụrụ ezi omume ya n’ime ụmụ ha. Site n’ịdị na-eme ka ụmụ gị nwee obi ụtọ na ntụsara ahụ́, ị pụrụ ime ka oge nri bụrụ nke dị ụtọ ma na-ewuli elu nye ezinụlọ gị. Ee, mee ka oge nri bụrụ ihe karịrị nanị oge e ji eri nri!