Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ Ịchịkwa Ọdịnihu Gị?

Ị̀ Pụrụ Ịchịkwa Ọdịnihu Gị?

Ị̀ Pụrụ Ịchịkwa Ọdịnihu Gị?

À KAWO ọdịnihu anyị aka? Ọ̀ bụ na nhọrọ ndị anyị na-eme ná ndụ adịghị emetụta ọdịnihu anyị n’ụzọ ọ bụla?

Ka e were ya na ọ bụ mmadụ ga-ekpebi ọdịnihu ya. N’ọnọdụ a, à pụrụ ịhọpụta mmadụ ịrụ otu ọrụ ma ọ bụ ịnọ n’otu ọkwá a kapịrị ọnụ tupu oge eruo? Oleekwa otú Chineke ga-esi mezuo uche ya maka ụwa ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ nweere onwe ha ikpebi ọdịnihu ha? Bible na-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ na-eju afọ.

Akara Aka na Nnwere Onwe Ime Nhọrọ—Hà Kwekọrọ?

Tụlee otú Jehova Chineke si mee anyị. “N’onyinyo Chineke ka O kere [mmadụ]: nwoke na nwanyị ka O kere ha,” ka Bible na-ekwu. (Jenesis 1:27) N’ịbụ ndị e mere n’onyinyo Chineke, anyị nwere ikike nke igosipụta àgwà ya ndị dị ka ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe na ike. Chineke enyewokwa anyị onyinye nke nnwere onwe ime nhọrọ. Nke a na-eme ka anyị dị iche n’etiti ihe ndị o kere n’ụwa. Anyị pụrụ ịhọrọ ma ànyị ga-agbaso nduzi Chineke n’ihe metụtara omume ma ọ bụ na anyị agaghị agbaso ya. Ọ bụ ya mere Mozis onye amụma pụrụ iji kwuo, sị: “Emewo m ka eluigwe na ala gbaa àmà megide unu taa, na ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ́ Ya.”—Deuterọnọmi 30:19, 20.

Ma ikwu na e nyere anyị onyinye nke nnwere onwe ime nhọrọ apụtaghị na anyị nwere nnwere onwe a na-akparaghị ókè. Ọ dịghị eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’iwu ndị na-achịkwa ihe e kere eke na iwu ndị metụtara omume bụ́ ndị Chineke mere maka nkwụsi ike na udo nke eluigwe na ala. E mere iwu ndị a maka ọdịmma anyị, ịda nke ọ bụla n’ime ha pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị oké njọ. Chetụgodị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ileghara iwu ndọda anya ma si n’elu ụlọ elu wụpụ!—Ndị Galeshia 6:7.

Nnwere onwe ime nhọrọ na-emekwa ka anyị nwee ihe mgbochi nke ihe ndị e kere eke na-enweghị nnwere onwe dị otú ahụ na-enweghị. Onye edemede bụ́ Corliss Lamont na-ajụ, sị: “Olee otú anyị ga-esi nye ụmụ mmadụ ibu ọrụ nke imere onwe ha mkpebi, taakwa ha ahụhụ maka imejọ ihe, ma ọ bụrụ na anyị kweere . . . na e buruwo ụzọ kaa nhọrọ na omume ha aka?” N’ezie, anyị apụghị ime otú ahụ. A dịghị ata ụmụ anụmanụ na-enweghị ọgụgụ isi ahụhụ maka ihe ndị ha mere, a dịghịkwa ata kọmputa ụta maka ịrụ ọrụ e mere ya ịrụ. Mgbe ahụ, nnwere onwe ime nhọrọ na-eme ka anyị nwee ibu ọrụ dị ukwuu ma bụrụ ndị ga-aza ajụjụ maka ihe ndị anyị mere.

Lee otú Jehova Chineke ga-esi bụrụ onye na-adịghị ahụ n’anya na onye na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi ma ọ bụrụ na o buruwo ụzọ kpebie ihe anyị ga-eme tupu a mụọ anyị, ma taa anyị ahụhụ n’ihi ihe ndị anyị mere! Ọ dịghị eme otú a, n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya,” “ụzọ Ya nile [bụkwa] ikpe ziri ezi.” (1 Jọn 4:8; Deuterọnọmi 32:4) O nyeghị anyị nnwere onwe ime nhọrọ, ma n’otu mgbe ahụ, ‘buru ụzọ kpebie onye ọ ga-azọpụta na onye ọ ga-enye ntaramahụhụ,’ dị ka ndị kweere n’akara aka na-ekwu. Nnwere onwe ime nhọrọ na-akagbu ozizi akara aka.

Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na nhọrọ ndị anyị na-eme ga-agbanwe ọdịnihu anyị. Dị ka ihe atụ, Chineke na-arịọ ndị na-eme ihe ọjọọ, sị: “Biko, lọtanụ, onye ọ bụla ya si n’ụzọ ọjọọ ya na n’ihe ọjọọ nke omume nile unu lọta . . . M gaghị emekwa unu ihe ọjọọ.” (Jeremaịa 25:5, 6) Arịrịọ a agaghị enwe isi ma ọ bụrụ na Chineke ebuworị ụzọ kpebie ihe ga-abụ ọdịnihu onye ọ bụla. Ọzọkwa, Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ya mere, chegharịanụ, chigharịakwanụ ka e wee hichapụ mmehie unu, ka oge a kara aka maka inwe ume ọhụrụ wee bịa site n’ebe onye ahụ bụ́ Jehova nọ.” (Ọrụ 3:19) Gịnị mere Jehova ga-eji gwa ndị mmadụ ka ha chegharịa ma chigharịa ma ọ bụrụ na ọ maara na ọ dịtụghị ihe ha ga-eme iji gbanwee ọdịnihu ha?

Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ụfọdụ ndị Chineke kpọrọ iso Jizọs Kraịst chịa dị ka ndị eze n’eluigwe. (Matiu 22:14; Luk 12:32) Otú ọ dị, Bible na-ekwu na ihe ùgwù ahụ ga-efunahụ ha ma ọ bụrụ na ha atachighị obi ruo ọgwụgwụ. (Mkpughe 2:10) Gịnị mere Chineke ga-eji kpọwa ha akpọwa ma ọ bụrụ na o buworị ụzọ kpebie na a gaghị ahọrọ ha? Tụleekwa ihe Pọl onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya. O dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya nọgide na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịworo ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ maka mmehie.” (Ndị Hibru 10:26) Ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ agaghị aba uru ma ọ bụrụ na Chineke eburuwo ụzọ kpebie ọdịnihu ha. Ma, Chineke ọ́ họpụtaghị tupu oge eruo, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, mmadụ ụfọdụ iso Jizọs Kraịst chịa?

Ihe A Họpụtara Tupu Oge Eruo—Ọ̀ Bụ Ndị Mmadụ n’Otu n’Otu Ka Ọ̀ Bụ Ìgwè?

“[Chineke ejiriwo] ngọzi ime mmụọ nile gọzie anyị n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst,” ka Pọl onyeozi dere, “dị nnọọ ka ọ họọrọ anyị n’ịdị n’otu nke anyị na ya tupu a tọọ ntọala ụwa . . . N’ihi na ọ họpụtara anyị tupu oge eruo ido anyị dị ka ụmụ nye onwe ya site n’aka Jizọs Kraịst.” (Ndị Efesọs 1:3-5) Gịnị ka Chineke họpụtara tupu oge eruo, gịnịkwa ka ịbụ ndị a họpụtara “tupu a tọọ ntọala ụwa” pụtara?

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ekwu na Chineke ahọrọwo ụfọdụ n’ime ụmụ nke mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam, iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Ndị Rom 8:14-17, 28-30; Mkpughe 5:9, 10) Otú ọ dị, iwere ya na Jehova Chineke họpụtara ụfọdụ mmadụ inweta ihe ùgwù a ọtụtụ puku afọ tupu a mụọ ha na-emegide eziokwu ahụ bụ́ na e nyere ụmụ mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ. Ihe Chineke họpụtara tupu oge eruo bụ otu ìgwè, ma ọ bụ òtù, ọ bụghị ndị mmadụ n’otu n’otu.

Iji maa atụ: Ka e were ya na gọọmenti kpebiri iguzobe otu ụlọ ọrụ. Ya ekpebie ihe ga-abụ ọrụ ụlọ ọrụ ahụ, ikike ọ ga-enwe na mmadụ ole ga-arụ ọrụ na ya. Ụlọ ọrụ ahụ emesịa malite ọrụ nwa oge ka e guzobesịrị ya, ndị na-arụ ọrụ na ya ekwuokwa, sị: “Afọ ole na ole gara aga, gọọmenti kpebiri ihe ga-abụ ọrụ anyị. Ugbu a, anyị na-amalite ịrụ ọrụ e nyere anyị.” Ị̀ ga-ekwubi na ọ ghaghị ịbụ na gọọmenti ekpebiwo afọ ole na ole tupu mgbe ahụ ndị ga-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. N’otu aka ahụ, Jehova buru ụzọ kpebie na ya ga-eguzobe otu ụlọ ọrụ pụrụ iche iji gwọta nsogbu ndị mmehie Adam kpatara. Ọ họpụtara ìgwè ga-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ tupu oge eruo—ma o kpebighị ndị ọ ga-abụ. A ga-ahọrọ ha ma e mesịa, nhọrọ ndị ha ga-eme ná ndụ ga-ekpebikwa ma à ga-emesịa were ha ma à ga-ajụ ha.

Olee ụwa Pọl onyeozi bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “[Chineke] họọrọ anyị n’ịdị n’otu nke anyị na ya tupu a tọọ ntọala ụwa”? Ụwa Pọl na-ekwu banyere ya ebe a abụghị ụwa Chineke mere ka ọ malite ịdị mgbe o kere Adam na Iv. Ụwa nke ahụ “dị mma nke ukwuu”—o nwetụghị mmehie na ire ure. (Jenesis 1:31) ‘Ntọhapụ’ site ná mmehie adịghị ya mkpa.—Ndị Efesọs 1:7.

Ụwa nke Pọl na-ekwu banyere ya kpọmkwem bụ nke malitere ịdị mgbe Adam na Iv nupụsịworo isi n’Iden—ụwa nke dị nnọọ iche na nke Chineke zubere ná mmalite. Ọ bụ ụwa nke ji ụmụ Adam na Iv malite. Ndị nọ n’ụwa ahụ bụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, ndị bụ́kwa ohu nke mmehie na ire ure. Ọ bụ ụwa nke ndị a pụrụ ịgbapụta agbapụta, n’adịghị ka Adam na Iv bụ́ ndị ma ụma mee mmehie.—Ndị Rom 5:12; 8:18-21.

Jehova Chineke mere ihe ozugbo banyere ọnọdụ nnupụisi ahụ e nwere n’Iden kpatara. Ozugbo e nwere mkpa maka ya, ọ họpụtara tupu oge eruo ụlọ ọrụ pụrụ iche—Alaeze Mezaịa nke dị n’aka Jizọs Kraịst—nke ọ ga-eji mee ihe n’ihe metụtara mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ site ná mmehie Adam. (Matiu 6:10) Chineke mere nke a “tupu a tọọ ntọala ụwa” nke ụmụ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta, ya bụ, tupu ndị mmehie ahụ bụ́ Adam na Iv amụọ ụmụ.

Ime atụmatụ na-adịkarị ụmụ mmadụ mkpa iji rụzuo ihe ha chọrọ ịrụzu. Akara aka na echiche bụ́ na Chineke aghaghị inwe atụmatụ zuru ezu nke a kapịrị ihe nile ọnụ na ya maka eluigwe na ụwa nwere njikọ. “Nye ọtụtụ ndị ọkà ihe ọmụma,” ka Roy Weatherford na-ede, “ebe ọ bụ na Chineke nwere Ike Kasị Elu, ọ ghaghị ibu ụzọ kpebie obere ihe ọ bụla ga-eme n’ọdịnihu.” Ọ̀ dị Chineke mkpa n’ezie ibu ụzọ kpebie ihe ọ bụla ga-emenụ?

N’ịbụ onye nwere ike na-adịghị agwụ agwụ na amamihe na-enweghị atụ, Jehova pụrụ ime ihe banyere ọnọdụ mberede pụrụ ịdapụta ka ihe ndị o kere eke na-eji nnwere onwe ime nhọrọ ha eme ihe. (Aịsaịa 40:25, 26; Ndị Rom 11:33) Ọ pụrụ ime nke a ozugbo n’ebughị ụzọ chee ya echee. N’adịghị ka ụmụ mmadụ ndị na-ezughị okè ndị nwere ikike a kpaara ókè, ọ dịghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile mkpa inwe atụmatụ a kapịrị ọnụ na nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nke ga-ekpebi ọdịnihu mmadụ nile bi n’ụwa. (Ilu 19:21) N’ọtụtụ nsụgharị Bible, Ndị Efesọs 3:11 na-ekwu na Chineke nwere “nzube ebighị ebi” kama ikwu na o nwere atụmatụ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe.

Otú Ị Pụrụ Isi Chịkwaa Ọdịnihu Gị

Chineke nwere nzube maka ụwa, o buwokwa ụzọ kpebie nzube ahụ. Mkpughe 21:3, 4 na-ekwu, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” Ee, ụwa a ga-aghọ Paradaịs, dị nnọọ ka Jehova zubere na mbụ. (Jenesis 1:27, 28) Ajụjụ bụ, Ị̀ ga-ebi na ya? Nke ahụ na-adabere ná nhọrọ ndị ị na-eme ugbu a. Jehova ekpebibeghị akara aka gị.

Àjà mgbapụta nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, na-eme ka o kwe onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na Jizọs omume inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16, 17; Ọrụ 10:34, 35) “Onye na-egosipụta okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi,” ka Bible na-ekwu. “Onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ.” (Jọn 3:36) Ị pụrụ ịhọrọ ndụ site n’ịmụ banyere Chineke, Ọkpara ya na uche Ya n’ime Bible na site n’itinye ihe ị na-amụta n’ọrụ. Onye na-eme ihe kwekọrọ n’amamihe e dekọrọ n’Okwu Chineke pụrụ ijide n’aka na ‘ọ ga-anọ jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.’—Ilu 1:20, 33.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

N’adịghị ka ụmụ anụmanụ, ụmụ mmadụ ga-aza ajụjụ maka ihe ndị ha mere

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ugo: Foto: Cortesía de GREFA