Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú Samsin pụrụ isi metụ ozu ndị o gburu aka ma nọgide na-abụ onye Nazịraịt?

N’Izrel oge ochie, mmadụ pụrụ ịhọrọ ikwe nkwa ma ghọọ onye Nazịraịt ruo oge a kapịrị ọnụ. * Otu n’ime iwu ndị ji onye kwere nkwa a kwuru, sị: “Ụbọchị nile nke ọ na-ekewapụtara Jehova onwe ya ọ dịghị mmadụ nwụrụ anwụ ọ ga-abịaru nso. Ọ gaghị emerụ onwe ya banyere nna ya, ma ọ bụ banyere nne ya, ma ọ bụ banyere nwanne ya nwoke, ma ọ bụ banyere nwanne ya nwanyị, mgbe ha nwụrụ.” Gịnị ma mmadụ ‘nwụọ n’akụkụ ya ná ntabi anya, na mberede’? Imetụ onye nwụrụ anwụ aka n’ọnọdụ mberede dị otú ahụ ga-emerụ ịbụ onye Nazịraịt ya. N’ihi ya, e kwuru, sị: “Ụbọchị mbụ nile alawo n’iyi.” Ọ ga-eme ememe e ji eme ka mmadụ dị ọcha ma maliteghachi oge ịbụ onye Nazịraịt ya n’isi.—Ọnụ Ọgụgụ 6:6-12.

Otú ọ dị, Samsin bụ onye Nazịraịt n’echiche dị iche. Tupu a mụọ Samsin, mmụọ ozi Jehova gwara nne ya, sị: “Lee, ị gaje ịtụ ime, mụọ nwa nwoke: agụba agaghị aga n’elu isi ya: n’ihi na onye Naziraịt nke Chineke ka nwata ahụ ga-abụ site n’afọ: ya onwe ya ga-amalitekwa ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.” (Ndị Ikpe 13:5) Samsin ekweghị nkwa ịbụ onye Nazịraịt. Ọ bụ Chineke họpụtara ya ịbụ onye Nazịraịt, ọ ga-abụkwa onye Nazịraịt ná ndụ ya nile. Mmachibido iwu ahụ megide imetụ ozu aka apụghị imetụta ya. Ọ bụrụ na o metụtara ya, ya emetụkwa ozu aka na mberede, olee otú ọ pụrụ isi maliteghachi oge ịbụ onye Nazịraịt ya n’isi bụ́ nke malitere mgbe a mụrụ ya? Mgbe ahụ, ihe àmà na-egosi na ihe ndị a chọrọ n’aka ndị bụ́ ndị Nazịraịt ná ndụ ha nile dị iche n’ihe a chọrọ n’aka ndị ji aka ha họrọ ịbụ ndị Nazịraịt.

Tụlee iwu Jehova nyere mmadụ atọ a kpọrọ aha na Bible ndị bụ́ ndị Nazịraịt ná ndụ ha nile—Samsin, Samuel, na Jọn Onye Na-eme Baptizim. Dị ka e kwuru na mbụ, Samsin agaghị akpụ isi ya. Banyere nwa ọ ka ga-atụrụ ime ya—bụ́ Samuel—Hana kwere nkwa, sị: “M ga-enyekwa ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile, agụba agaghị agakwa n’elu isi ya.” (1 Samuel 1:11) Na nke Jọn Onye Na-eme Baptizim, mmụọ ozi Jehova kwuru, sị: “Ọ gaghị aṅụ mmanya na ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-egbu egbu ma ọlị.” (Luk 1:15) Ọzọkwa, “Jọn . . . yi uwe . . . e ji ajị kamel mee, yirikwa ihe okike akpụkpọ anụ n’úkwù ya; nri ya bụkwa igurube na mmanụ aṅụ ọhịa.” (Matiu 3:4) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime mmadụ atọ a e nyere iwu ịghara ịbịaru ozu nso.

Ọ bụ ezie na ọ bụ onye Nazịraịt, Samsin so ná ndị ikpe Jehova mere ka ha bilie ịzọpụta ndị Izrel n’aka ndị na-apụnara ha ihe. (Ndị Ikpe 2:16) Ka ọ na-arụkwa ọrụ a e nyere ya, o metụrụ ozu aka. N’otu oge, Samsin tigburu ndị Filistia 30 ma yipụ ha uwe ha. Ka oge na-aga, o tigburu ndị iro ahụ “ntigbu ukwu, ogwe ụkwụ n’elu apata ụkwụ.” O jikwa ọkpụkpụ agbà ọhụrụ nke ịnyịnya ibu gbuo otu puku ndị ikom. (Ndị Ikpe 14:19; 15:8, 15) Samsin nwere ihu ọma na nkwado Jehova ka ọ na-eme ihe a nile. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na ọ bụ nwoke nke nwere okwukwe kwesịrị nṅomi.—Ndị Hibru 11:32; 12:1.

Okwu bụ́ na Samsin dọwara ọdụm “dị ka ọ ga-adọwa nwa ewu” ọ̀ na-enye echiche na ịdọwa ụmụ ewu bụ ihe a na-emekarị n’oge ya?

Ọ dịghị ihe àmà na-egosi na n’oge Ndị Ikpe Izrel, ndị mmadụ na-adọwakarị ụmụ ewu. Ndị Ikpe 14:6 na-ekwu, sị: “Mmụọ nke Jehova wee dakwasị [Samsin] n’ike, o wee dọwaa ya [nwa ọdụm] dị ka ọ ga-adọwa nwa ewu, ma ọ dịghị ihe o ji n’aka ya.” O yiri ka okwu a ọ̀ bụ ihe atụ.

Okwu ahụ bụ́ “o wee dọwaa ya” pụrụ ịpụta ihe abụọ. Ma ọ́ bụghị na Samsin dọwara ọdụm ahụ agbà ya abụrụ na ọ dọkasịrị ya n’ụzọ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ bụ agbà ka ọ dọwara ya, mgbe ahụ, o doro anya na mmadụ nwere ike ịdọwa nwa ewu otú ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, myirita ahụ na-egosi na iji aka nkịtị gbuo ọdụm dịịrị Samsin mfe dị nnọọ ka ọ pụrụ ịdịrị mmadụ mfe iji aka nkịtị gbuo nwa ewu. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na Samsin gburu ọdụm ahụ site n’ịdọkasị ya adọkasị? Mgbe ahụ, okwu ahụ aghaghị ịbụ ihe atụ. Ihe ọ ga-apụta bụ na mmụọ Jehova nyere Samsin ike ịrụ ọrụ chọrọ ike ọkpụkpụ aka pụrụ iche. N’agbanyeghị nke ọ bụ, ntụnyere ahụ e mere ná Ndị Ikpe 14:6 na-egosi na site n’enyemaka Jehova, ọdụm siri ike dị Samsin ka ihe na-adịghị ike dị nnọọ ka nwa ewu ga-adị mmadụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ ihe dịịrị onye ahụ na-ekwe nkwa ikpebi ogologo oge ọ ga-abụ onye Nazịraịt. Otú ọ dị, dị ka omenala ndị Juu si dị, oge kasị ala mmadụ pụrụ ikwe nkwa ịbụ onye Nazịraịt bụ ụbọchị 30. E chere na ihe ọ bụla na-erughị ụbọchị 30 ga-eweda nkwa ahụ ala.