Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-achịkwa Ọdịnihu Gị?

Gịnị Na-achịkwa Ọdịnihu Gị?

Gịnị Na-achịkwa Ọdịnihu Gị?

“ỤMỤ mmadụ apụghị ịchịkwa ọdịnihu ha dị nnọọ ka ụmụ anụmanụ na-apụghị ịchịkwa nke ha,” ka onye kweere n’evolushọn bụ́ John Gray na-ede. Onye edemede bụ́ Shmuley Boteach na-ekwu ihe dị nnọọ iche n’akwụkwọ ya bụ́ An Intelligent Person’s Guide to Judaism. Ọ na-ekwu, sị: “Mmadụ abụghị anụmanụ, n’ihi ya kwa, ọdịnihu ya dị ya nnọọ n’aka.”

Ọtụtụ ndị kwenyeere Gray ma kwere na ikike ndị a na-apụghị ịchịkwa achịkwa sitere n’okike na-ekpebi ọdịnihu nke ezinụlọ mmadụ. Ndị ọzọ na-ewere mmadụ dị ka ihe okike Chineke nke e nyere ikike ịchịkwa ọdịnihu onwe ya.

Ụfọdụ na-eche na ọ bụ ụmụ mmadụ ndị dị ike na-achịkwa ọdịnihu ha. Dị ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Roy Weatherford si kwuo, “ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa—karịsịakwa ndị inyom dịworo ndụ—apụghị . . . ịchịkwa ndụ ha kpọmkwem n’ihi mmegbu na nrigbu sitere n’aka ụmụ mmadụ ibe ha.” (Akwụkwọ bụ́ The Implications of Determinism) Ọtụtụ ndị ahụwo ka ndị na-azọ ọkwá ọchịchị na ikike tisara olileanya ha maka ọdịnihu obi ụtọ.

N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ọzọ echewo na ọ dịghị ihe ha pụrụ ime n’ihi na ha chere na e nwere ikike ndị karịrị nke mmadụ na-achịkwa ọdịnihu ha. Boteach na-ekwu na “ndị Gris oge ochie kwenyesiri ike na ọ dịghị nnọọ olileanya ha nwere ebe ọ bụ na mmadụ apụghị ịgbanwe ọdịnihu ya a kara aka.” Ha chere na ọ bụ chi nwanyị ndị a na-ejighị n’aka na-ekpebi ọdịnihu mmadụ ọ bụla. Ha kweere na chi nwanyị ndị a na-ekpebi mgbe mmadụ ga-anwụ, nakwa ókè ahụhụ ọ ga-ata na ihe mgbu ọ ga-enwe ná ndụ ga-aha.

Nkwenkwe bụ́ na ikike ka nke mmadụ na-achịkwa ọdịnihu mmadụ juru ebe nile taa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mmadụ kweere na Kismet, ma ọ bụ akara aka. Ha na-ekwu na Chineke eburuwo ụzọ kpebie ihe ga-esi n’omume nile nke ụmụ mmadụ pụta na oge mmadụ ga-anwụ. E nwekwara ozizi nke ọdịnihu a kara aka, bụ́ nke na-akwalite echiche bụ́ na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile “eburuwo ụzọ kpebie ma ọ̀ ga-enye mmadụ nke ọ bụla ntaramahụhụ ka ọ̀ ga-azọpụta ya.” Ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst kweere n’ozizi a.

Gịnị ka i chere? Ike ndị karịrị gị hà ekpebiworị ọdịnihu gị? Ka ọ̀ dị eziokwu dị n’okwu onye England na-ede egwuregwu bụ́ William Shakespeare, bụ́ onye dere, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ụmụ mmadụ na-ekpebi ọdịnihu ha”? Tụlee ihe Bible na-ekwu n’okwu a.