Kraịst—Onye Amụma Dị Iche Iche Lekwasịrị Anya
Kraịst—Onye Amụma Dị Iche Iche Lekwasịrị Anya
“Ịgba àmà banyere Jizọs bụ ihe na-akpali ibu amụma.”—MKPUGHE 19:10.
1, 2. (a) Malite n’afọ 29 O.A., olee mkpebi chere Izrel ihu? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
Ọ BỤ n’afọ 29 O.A., okwu banyere Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa bụ mkparịta ụka bụ́ isi a na-enwe n’Izrel. Ozi Jọn Onye Na-eme Baptizim emewo ka a na-atụsi anya Mezaịa ahụ ike. (Luk 3:15) Jọn ekwuo na ya abụghị Kraịst ahụ. Kama, n’izo aka n’ebe Jizọs onye Nazaret nọ, o kwuru, sị: “Agbawokwa [m] àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Jọn 1:20, 34) N’oge na-adịghị anya, ìgwè mmadụ esoro Jizọs iji gee ntị n’ozizi ya na ka ọ gwọọ ha.
2 N’ọnwa ndị sochirinụ, Jehova nyere ọtụtụ ihe àmà banyere Ọkpara ya. Ndị mụworo Akwụkwọ Nsọ na ndị hụrụ ọrụ ndị Jizọs rụrụ nwere ezi ihe mere ha ga-eji nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Otú ọ dị, n’ozuzu, ndị ahụ ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ enweghị okwukwe. Ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha kwetara na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke. (Jọn 6:60-69) Gịnị ka ị gaara eme ma a sị na ị dị ndụ n’oge ahụ? À gaara akpaliwo gị ịnabata Jizọs dị ka Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa ma ghọọ onye na-eso ụzọ ya na-ekwesị ntụkwasị obi? Tụlee ihe àmà ndị na-egosi onye ọ bụ bụ́ ndị Jizọs n’onwe ya nyere mgbe e boro ya ebubo na ọ na-emebi Ụbọchị Izu Ike, rịbakwa ama ihe àmà abụọ sochirinụ o nyere iji wusie okwukwe nke ndị na-eso ụzọ ya na-eguzosi ike n’ihe ike.
Jizọs n’Onwe Ya Enye Ihe Àmà
3. Ọnọdụ ndị dị aṅaa kpaliri Jizọs inye ihe àmà gosiri onye ọ bụ?
3 Ọ bụ n’oge Ememe Ngabiga nke 31 O.A. Jọn 5:1-9, 16-18) Okwu Jizọs ji gbachitere onwe ya nwere arụmụka atọ ga-eme ka onye Juu ọ bụla nwere obi eziokwu mata onye Jizọs bụ n’ezie.
Jizọs nọ na Jeruselem. Ọ ka gwọpụrụ otu nwoke rịaworo ọrịa ruo afọ 38. Otú ọ dị, ndị Juu kpagburu Jizọs n’ihi ime nke a n’Ụbọchị Izu Ike. Ha bokwara ya ebubo nke ikwulu Chineke ma chọọ igbu ya n’ihi na ọ na-akpọ Chineke Nna ya. (4, 5. Gịnị bụ nzube nke ozi Jọn, oleekwa otú o si mezuo ya n’ụzọ gara nke ọma?
4 Nke mbụ, Jizọs zoro aka n’àmà onye obu ụzọ ya, bụ́ Jọn Onye Na-eme Baptizim, gbara, na-asị: “Unu ezipụwo ndị mmadụ ka ha gakwuru Jọn, ọ gbawokwa àmà banyere eziokwu ahụ. Onye ahụ bụ oriọna na-enwu enwu ma na-enye ìhè, ọ bụkwa ruo nwa oge ka unu chọrọ ịṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ìhè ya.”—Jọn 5:33, 35.
5 Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ “oriọna na-enwu enwu ma na-enye ìhè” n’echiche bụ́ na tupu Herọd atụọ ya mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ rụzuwo ọrụ Chineke nyere ya bụ́ ịkwadebe ụzọ maka Mezaịa ahụ. Jọn kwuru, sị: “Ihe mere m ji bịa na-eme baptizim n’ime mmiri bụ ka e wee mee ka [Mezaịa ahụ] pụta ìhè nye Izrel. . . . Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efedata dị ka nduru, ọ dịgidekwara n’isi ya. Amaghịdị m ya, ma Onye ahụ nke zitere m ime baptizim n’ime mmiri sịrị m, ‘Onye ọ bụla nke ị hụrụ ka mmụọ nsọ na-abịakwasị ma na-adịgide n’isi ya, onye a bụ onye ahụ nke ji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’ Ahụwokwa m ya, agbawokwa [m] àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.” * (Jọn 1:26-37) Jọn matara kpọmkwem na Jizọs bụ Ọkpara Chineke—Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. Àmà Jọn doro nnọọ anya nke na ihe dị ka ọnwa asatọ ka ọ nwụsịrị, ọtụtụ ndị Juu nwere obi eziokwu kwupụtara, sị: “Ihe nile Jọn kwuru banyere nwoke a bụcha eziokwu.”—Jọn 10:41, 42.
6. N’ihi gịnị ka ọrụ Jizọs ji kwesịworị ime ka ndị mmadụ kweta na Chineke kwadoro ya?
6 Ọzọ, Jizọs ji arụmụka ọzọ gosi na ọ bụ ya bụ Mezaịa ahụ. O zoro aka n’ọrụ ọma ndị ọ rụrụ dị ka ihe àmà na-egosi na Chineke kwadoro ya. “M nwere àmà ka nke Jọn ukwuu,” ka ọ na-ekwu, “n’ihi na ọrụ ndị ahụ Nna m kenyere m ịrụzu, bụ́ ọrụ ndị ahụ m na-arụ, na-agba àmà banyere m na Nna m zitere m.” (Jọn 5:36) Ọbụna ndị iro Jizọs apụghị ịgọnahụ ihe àmà a, bụ́ nke gụnyere ọtụtụ ọrụ ebube. “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama?” ka ụfọdụ ndị mesịrị jụọ. (Jọn 11:47) Otú ọ dị, ụfọdụ meghachiri omume n’ụzọ dị mma ma na-ekwu, sị: “Mgbe Kraịst ahụ bịarutere, ọ gaghị eme ihe ịrịba ama karịa ka nwoke a meworo, ka ọ̀ ga-eme?” (Jọn 7:31) Ndị na-ege Jizọs ntị nọ n’ọnọdụ dị mma ịghọta àgwà Nna ahụ site n’Ọkpara ya.—Jọn 14:9.
7. Olee otú Akwụkwọ Nsọ Hibru si agba àmà banyere Jizọs?
7 N’ikpeazụ, Jizọs dọọrọ uche gaa n’àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha. “Akwụkwọ Nsọ . . . na-agba àmà banyere m,” ka ọ na-ekwu, na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na unu kweere Mozis, unu ga-ekwere m, n’ihi onye ahụ dere banyere m.” (Jọn 5:39, 46) N’ezie, Mozis bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ndị àmà dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst bụ́ ndị dere banyere Kraịst ahụ. Ihe odide ha gụnyere ọtụtụ narị amụma na osuso ọmụmụ, ha nile na-ezocha aka na Mezaịa ahụ. (Luk 3:23-38; 24:44-46; Ọrụ 10:43) Gịnịkwa banyere Iwu Mozis? “Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduga na Kraịst,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Galeshia 3:24) Ee, “ịgba àmà banyere Jizọs bụ ihe na-akpali [ma ọ bụ, nzube nke] ibu amụma.”—Mkpughe 19:10.
8. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị Juu na-ejighị nwee okwukwe na Mezaịa ahụ?
8 Ọ̀ bụ na ihe àmà a nile—àmà doro anya Jọn gbara, ọrụ ndị dị ike Jizọs n’onwe ya rụrụ Jọn 5:42) Kama ‘ịchọ otuto nke sitere n’aka onye nanị ya bụ Chineke,’ ha ‘na-anara otuto n’aka ibe ha.’ Ka a sịkwa ihe mere na ha ekwenyeghịrị Jizọs bụ́ onye, dị ka Nna ya, kpọrọ echiche dị otú ahụ asị!—Jọn 5:43, 44; Ọrụ 12:21-23.
na àgwà Chineke ndị o nwere, na ụbara akaebe ndị Akwụkwọ Nsọ gbara—agaghị eme ka i kweta na Jizọs bụ Mezaịa ahụ? Onye ọ bụla nke nwere ịhụnanya miri emi maka Chineke nakwa maka Okwu ya ga-ahụ nnọọ nke a ma nwee okwukwe na Jizọs dị ka Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. Otú ọ dị, ịhụnanya dị otú ahụ adịghị nnọọ n’Izrel. Jizọs gwara ndị na-emegide ya, sị: “Amaara m nke ọma na unu enweghị ịhụnanya Chineke n’ime unu.” (Ndị Ọhụụ Amụma Wusiri Ike
9, 10. (a) N’ihi gịnị ka oge e nyere ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe àmà ji kwesịrị ekwesị? (b) Nkwa dị aṅaa dị ịrịba ama ka Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya?
9 Ọ karịala otu afọ kemgbe Jizọs nyere ihe àmà ndị ahụ e kwuru n’elu iji gosi na ọ bụ ya bụ Mezaịa ahụ. Ememe Ngabiga nke afọ 32 O.A. abịawo ma gafee. Ọtụtụ ndị kweburu na ya akwụsiwo iso ya, ikekwe n’ihi mkpagbu, ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ nchegbu nke ndụ. Ndị ọzọ pụrụ inwewo ihe mgbagwoju anya ma ọ bụ nkụda mmụọ n’ihi na Jizọs jụrụ mgbalị ndị mmadụ mere ichi ya eze. Mgbe ndị ndú okpukpe ndị Juu mara ya aka, ọ jụrụ inye ihe àmà sitere n’eluigwe nke ga-ewetara ya otuto. (Matiu 12:38, 39) Ọjụjụ a ọ jụrụ pụrụ ijuwo ụfọdụ anya. Ọzọkwa, Jizọs amalitewo ikpughere ndị na-eso ụzọ ya ihe siiri ha ike nghọta—‘ọ ghaghị ịga Jeruselem wee taa ọtụtụ ahụhụ n’aka ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, a ga-egbukwa ya.’—Matiu 16:21-23.
10 N’ihe dị ka ọnwa itoolu ma ọ bụ iri, Jizọs ‘ga-apụ n’ụwa lakwuru Nna ya.’ (Jọn 13:1) N’ihi nchegbu miri emi o nwere maka ndị na-eso ụzọ ya na-eguzosi ike n’ihe, Jizọs kwere ụfọdụ n’ime ha nkwa inye ha ihe ahụ ọ jụrụ inye ndị Juu na-enweghị okwukwe—ihe àmà sitere n’eluigwe. “N’ezie asị m unu,” ka Jizọs na-ekwu, “na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.” (Matiu 16:28) O doro anya na Jizọs adịghị ekwu na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ga-adị ndụ ruo mgbe a ga-eguzobe Alaeze Mezaịa ahụ na 1914. Jizọs bu n’uche ime ka atọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ya na ha na-akpachi anya hụperetụ ebube ya n’ike Alaeze. A na-akpọ nhụperetụ a nnwogha.
11. Kọwaa ọhụụ nnwogha ahụ.
11 Ụbọchị isii ka e mesịrị, Jizọs kpọọrọ Pita, Jems, na Jọn gaa n’ugwu dị oké elu—eleghị anya n’usoro Ugwu Hemọn. N’ebe ahụ, ‘e nwoghara Jizọs n’ihu anya ha, ihu ya wee na-achakwa ka anyanwụ, uwe elu ya na-enwupụkwa enwupụ dị ka ìhè.’ Ndị amụma bụ́ Mozis na Ịlaịja pụtakwara, soro Jizọs na-akparịta ụka. Ọ pụrụ ịbụ na ihe omume a na-awụ ibobo n’ahụ́ weere ọnọdụ n’abalị, na-eme ka a hụ ya nke ọma karị. N’ezie, ihe a mere nnọọ eme nke na Pita kwuru ka ya wuo ụlọikwuu atọ—otu maka Jizọs, otu maka Mozis Matiu 17:1-6.
na otu maka Ịlaịja. Ka Pita ka na-ekwu okwu, igwe ojii na-enwupụ enwupụ kpuchiri ha, otu olu sikwa n’igwe ojii ahụ kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; geenụ ya ntị.”—12, 13. Mmetụta dị aṅaa ka ọhụụ nnwogha ahụ nwere n’ahụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs, n’ihi gịnịkwa?
12 N’eziokwu, Pita ka kwupụrụ na Jizọs bụ “Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.” (Matiu 16:16) Ma cheedị ịnụ ka Chineke n’onwe ya gbara akaebe, na-eme ka a mata onye Ọkpara ya e tere mmanụ bụ, nakwa ọrụ ọ ga-arụ! Lee ahụmahụ na-ewusi okwukwe ike nnwogha ahụ bụụrụ Pita, Jems na Jọn! N’ịbụ ndị e si otú a wusie okwukwe ha ike, ha bụ ndị a kwadebere nke ọma ugbu a iche ihe ndị ga-abịa n’ọdịnihu ihu nakwa maka ọrụ dị mkpa ha ga-arụ n’ọgbakọ a ga-enwe n’ọdịnihu.
13 Nnwogha ahụ nwere mmetụta miri emi n’ahụ́ ndị ahụ na-eso ụzọ. Ihe karịrị afọ 30 ka e mesịrị, Pita dere, sị: “[Jizọs] si n’aka Chineke bụ́ Nna nata nsọpụrụ na ebube, mgbe e sitere n’oké ebube ahụ gwa ya okwu ndị dị otú a: ‘Nke a bụ ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye mụ onwe m nwapụtaworo.’ Ee, okwu ndị a ka anyị nụrụ ka e sitere n’eluigwe kwuo ka anyị na ya nọ n’ugwu nsọ ahụ.” (2 Pita 1:17, 18) Ihe omume ahụ nwekwara mmetụta n’ahụ́ Jọn. Ihe karịrị afọ 60 ka ihe ahụ mesịrị, o yiri ka ọ̀ bụ na ya ka ọ na-ezo aka mgbe o kwuru, sị: “Anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube nke ọkpara a mụrụ nanị ya nwetara n’aka nna ya.” (Jọn 1:14) Ma, nnwogha ahụ abụghị ọhụụ ikpeazụ e gosiri ụmụazụ Jizọs.
Ndị Chineke Na-eguzosi Ike n’Ihe Enwekwuo Nghọta
14, 15. N’echiche dị aṅaa ka Jọn onyeozi ga-anọgide ruo mgbe Jizọs ga-abịa?
14 Mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya n’ụsọ Oké Osimiri Galili. N’ebe ahụ, ọ gwara Pita, sị: “Ọ bụrụ uche m ka [Jọn] nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ gbasara gị?” (Jọn 21:1, 20-22, 24) Ihe ahụ o kwuru ọ̀ na-egosi na Jọn onyeozi ga-adị ndụ karịa ndịozi ndị ọzọ? O yiri otú ahụ, n’ihi na o ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 70 ọzọ. Otú ọ dị, okwu Jizọs nwere ihe ka ukwuu ọ pụtara.
15 Okwu ahụ bụ́ “ruo mgbe m ga-abịa” na-echetara anyị aka Jizọs zoro na “Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.” (Matiu 16:28) Jọn nọgidere ruo mgbe Jizọs bịara n’echiche bụ́ na e mesịrị mee ka Jọn hụ ọhụụ amụma nke ọbịbịa Jizọs n’ike Alaeze. Ka ọnwụ Jọn na-eru nso, ka ọ nọ n’ebe a chụgara ya n’agwaetiti Patmọs, ọ natara Mkpughe tinyere ihe àmà amụma ya nile dị ịtụnanya nke ihe ndị ga-eme “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” Ọhụụ ndị a dị ebube kpaliri Jọn nke ukwuu nke na mgbe Jizọs sịrị: “Ee; ana m abịa ọsọ ọsọ,” Jọn tiri mkpu, sị: “Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.”—Mkpughe 1:1, 10; 22:20.
16. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa anyị ịnọgide na-ewusi okwukwe anyị ike?
16 Ndị nwere obi eziokwu na narị afọ mbụ nabatara Jizọs dị ka Mezaịa ahụ ma nwee okwukwe na ya. N’ihi enweghị okwukwe gbara ha gburugburu, ọrụ ha ga-arụ, na ule ndị ha ga-ezute, ọ dị mkpa ka e wusie ndị ghọrọ ndị kwere ekwe ike. Jizọs enyewo ihe àmà zuru ezu iji gosi na ọ bụ ya bụ Mezaịa
ahụ, o nyewokwa ọhụụ amụma ndị na-enye ihe ọmụma iji gbaa ụmụazụ ya na-eguzosi ike n’ihe ume. Taa, anyị nọ n’ime ime ‘ụbọchị Onyenwe anyị.’ N’oge na-adịghị anya, Kraịst ga-ebibi usoro ajọ ihe dum nke Setan ma napụta ndị Chineke. Anyị onwe anyị aghaghịkwa iwusi okwukwe anyị ike site n’iji ihe nile Jehova nyeworo anyị maka ọdịmma ime mmụọ anyị eme ihe nke ọma.Ndị E Chebere Gafere Ọchịchịrị na Ule
17, 18. Olee ọdịiche pụtara ìhè dị na narị afọ mbụ n’etiti ụmụazụ Jizọs na ndị na-emegide nzube Chineke, oleekwa otú ihe si gaara òtù nke ọ bụla?
17 Mgbe ọnwụ Jizọs gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya ji obi ike rube isi n’iwu ya nke ịgba àmà banyere ya “ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria dum nakwa ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) N’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ e hiwere ọhụrụ nwetara, Jehova ji nghọta ime mmụọ na ọtụtụ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ gọzie ya.—Ọrụ 2:47; 4:1-31; 8:1-8.
18 N’aka nke ọzọ, atụmanya nke ndị na-emegide ozi ọma ahụ nọgidere na-agbawanye ọchịchịrị. “Ụzọ ndị na-emebi iwu dị ka ọchịchịrị,” ka Ilu 4:19 na-ekwu. “Ha amaghị ihe ọ bụ ha ji asụ ngọngọ.” “Ọchịchịrị” ahụ gbachiwanyere na 66 O.A. mgbe ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu. Mgbe ha hapụsịrị obodo ahụ ruo nwa oge n’enweghị ihe doro anya kpatara ya, ndị Rom laghachiri na 70 O.A., na nke ugbu a, ha bibiri obodo ahụ kpamkpam. Dị ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, ihe karịrị otu nde ndị Juu nwụrụ. Otú ọ dị, Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi lanarịrị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mgbe mbụ ahụ ndị agha Rom lara, Ndị Kraịst rubere isi n’iwu Jizọs nyere ka ha gbalaga.—Luk 21:20-22.
19, 20. (a) Olee ihe mere na ndị Chineke enweghị ihe ha ga-atụrụ egwu ka usoro ihe dị ugbu a na-abịa ná njedebe ya? (b) Nghọta dị ịrịba ama dị aṅaa ka Jehova nyere ndị ya n’iri afọ ndị bu 1914 ụzọ?
19 Ọnọdụ anyị yiri nke ahụ. Oké mkpagbu ahụ na-abịanụ ga-aka ọgwụgwụ nke usoro ajọ ihe Setan akara. Ma ọ dịghị ndị Chineke mkpa ịtụ egwu, n’ihi na Jizọs kwere nkwa, sị: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:20) Iji wulite okwukwe ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ na iji kwadebe ha maka ihe na-eche ha n’ihu, Jizọs mere ka ha hụperetụ ya n’ebube eluigwe ya dị ka Eze Mezaịa. Gịnị banyere taa? Na 1914, ihe ahụ a hụpetụụrụ ghọrọ ihe dị adị. Leekwa ka o siworo wusie okwukwe nke ndị Chineke ike! Ọchịchị Mezaịa ahụ ga-eweta ọdịnihu dị ebube, a nọgidewokwa na-eme ka ndị ohu Jehova na-aghọtawanye ya. N’ụwa nke taa na-agbawanye ọchịchịrị, “okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.”—Ilu 4:18.
20 Ọbụna tupu 1914, otu ìgwè nta nke Ndị Kraịst e tere mmanụ malitere ịghọta eziokwu ndị dị mkpa banyere nlọghachi nke Onyenwe anyị. Dị ka ihe atụ, ha ghọtara na a gaghị ahụ ya anya, dị ka ihe ndị mmụọ ozi abụọ ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ na 33 O.A. mgbe Jizọs na-arịgo n’eluigwe kwuru na-egosi. Mgbe igwe ojii kpuchisịrị Jizọs pụọ n’anya ndị na-eso ụzọ ya, ndị mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Jizọs a bụ́ onye e si n’ebe unu nọ nara gaa Ọrụ 1:9-11.
n’ígwé ga-esi otú a bịa n’otu ụzọ ahụ unu hụworo ka ọ na-aga n’ígwé.”—21. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 Ọ bụ nanị ụmụazụ Jizọs na-eguzosi ike n’ihe hụrụ mgbe ọ rịgoro n’eluigwe. Dị ka ọ dị ná nnwogha ahụ, o meghị n’ihu ọha; ụwa n’ozuzu amaghịdị ihe merenụ. Otú ahụ ka ọ ga-adị mgbe Kraịst ga-alọghachi n’ike Alaeze. (Jọn 14:19) Ọ bụ nanị ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ ga-aghọta ọnụnọ ya dị ka eze. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ otú nghọta ahụ ga-esi nwee mmetụta siri ike n’ahụ́ ha, na-eduga ná nchịkọta nke ọtụtụ nde ndị ga-aghọ ndị Jizọs ga-achị n’ụwa.—Mkpughe 7:9, 14.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ nanị Jọn nụrụ olu Chineke mgbe e mere Jizọs baptizim. Ndị Juu ahụ bụ́ ndị Jizọs na-agwa okwu “anụbeghị olu [Chineke] mgbe ọ bụla ma ọ bụkwanụ hụ ọdịdị ya.”—Jọn 5:37.
Ị̀ Na-echeta?
• Mgbe e boro Jizọs ebubo na ọ na-emebi iwu Ụbọchị Izu Ike nakwa na o kwuluru Chineke, olee ihe àmà o nyere iji gosi na ọ bụ ya bụ Mezaịa ahụ?
• Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs nke oge mbụ si rite uru ná nnwogha ahụ?
• Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru na Jọn ga-anọgide ruo mgbe ya ga-abịa?
• Na 1914, olee ihe a hụpetụụrụ nke ghọworo ihe dị adị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Jizọs zoro aka n’ihe ndị na-egosi na ọ bụ ya bụ Mezaịa ahụ
[Foto dị na peeji nke 12]
Ọhụụ nnwogha ahụ bụ ihe na-ewusi okwukwe ike
[Foto dị na peeji nke 13]
Jọn ga-anọgide ruo mgbe Jizọs ‘ga-abịa’