Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nká Na-aghọ “Okpueze nke Mara Mma”

Mgbe Nká Na-aghọ “Okpueze nke Mara Mma”

“Inyeaka M Na-esi N’aka Jehova Bịa”

Mgbe Nká Na-aghọ “Okpueze nke Mara Mma”

“NDỤ kasị mma mmadụ pụrụ ibi,” ka Muriel bụ́ onye dị otu narị afọ na otu kwuru. Theodoros dị afọ 70 si otú a kwuo ya, “Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù!” “Ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mma m gaara esi bie ndụ m,” ka Maria kwuru mgbe ọ gbara afọ 73. Ha nile ji ndụ ha jeere Jehova Chineke ozi.

E nwere ọtụtụ ndị agadi dị otú ahụ na-efe Jehova gburugburu ụwa. N’agbanyeghị nká, nsogbu ahụ́ ike na ọnọdụ ndị ọzọ siri ike, ha ka ji mkpụrụ obi ha dum na-ejere Chineke ozi. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, a na-akwanyere ndị agadi dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ùgwù dị ka ndị na-esetịpụ ihe nlereanya n’ịsọpụrụ Chineke. Jehova na-eji ozi ndị agadi akpọrọ ihe nke ukwuu, ọ bụ ezie na ọnọdụ ha pụrụ ịkpara ihe ha pụrụ ime ókè. *2 Ndị Kọrint 8:12.

Akwụkwọ Abụ Ọma kwuru ihe dabara adaba banyere ụdị ndụ ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ịtụ anya ibi. Ha pụrụ ịdị ka nnukwu osisi ochie nke nọgidere na-amị mkpụrụ. Banyere ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ha ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ; osisi nke mmiri dị ha n’ahụ́ hie nne, nke nwezukwara akwụkwọ ndụ, ka ha ga-abụ.”—Abụ Ọma 92:14.

Ụfọdụ pụrụ ịtụ ụjọ na a ga-agbahapụ ha ma leghara ha anya mgbe nká mere ka ike gwụ ha. Devid rịọrọ Chineke, sị: “Atụfula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị ahapụla m.” (Abụ Ọma 71:9) Gịnị ga-ekpebi ma mmadụ ọ̀ ga-abụ onye ike na-agwụ ka ọ̀ bụ onye na-amị mkpụrụ n’oge nká? Ọ bụ àgwà nsọpụrụ Chineke bụ́ ezi omume. “Onye ezi omume ga-awa igu dị ka nkwụ,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ.—Abụ Ọma 92:12.

Ndị jiri ndụ ha jeere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi na-anọgidekarị na-amị mkpụrụ mgbe ha kara nká. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọtụtụ n’ime mkpụrụ ndị ha kụrụ ná ndụ ha nakwa ná ndụ ndị ọzọ na-epulite ma mịpụta ịdị mma. (Ndị Galeshia 6:7-10; Ndị Kọlọsi 1:10) N’ezie, ndị mikpuru onwe ha ná nchụso onwe onye ma leghara ụzọ Chineke anya adịghị enwe ezi ihe ha rụpụtarala ka ha na-eme agadi.

Akwụkwọ Bible bụ́ Ilu mesikwara ya ike na ezi omume bụ ihe ịchọ mma nye ndị agadi. N’ebe ahụ, anyị na-agụ, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31) Ee, ezi omume bụ ngosipụta nke ịma mma nke dị n’ime. Mmadụ ịgbaso ụzọ ezi omume ná ndụ ya nile na-eweta nsọpụrụ. (Levitikọs 19:32) Isi awọ na-eweta nsọpụrụ mgbe e jikọtara ya na amamihe na omume ọma.—Job 12:12.

Nye Jehova, ndụ ezi omume e ji jeere ya ozi bụ nnọọ ihe mara mma. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Ruo agadi Mụ onwe m [Jehova] bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka: Mụ onwe m emewo, Mụ onwe m ga-ebukwa; ee, Mụ onwe m ga-eku n’aka meekwa ka unu wepụga onwe unu.” (Aịsaịa 46:4) Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-ekwe nkwa ịkwagide na ịkwado ndị ya na-eguzosi ike n’ihe n’oge agadi ha!—Abụ Ọma 48:14.

Ebe ọ bụ na ndụ e ji jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi mara nnọọ mma n’anya ya, ó kwesịghị ka ndị ọzọ kwanyere ya ùgwù? N’inwe echiche yiri nke Chineke, anyị na-eji ndị kwere ekwe ibe anyị meworo agadi akpọrọ ihe. (1 Timoti 5:1, 2) N’ihi ya, ka anyị na-achọ ụzọ ndị dị irè isi gosi ha ịhụnanya Ndị Kraịst site n’ịdị na-egbo mkpa ha.

Ịbanye n’Ụzọ nke Ezi Omume ná Nká

“N’ụzọ ezi omume ka ndụ dị,” ka Solomọn na-agba anyị ume. (Ilu 12:28) Ime agadi adịghị egbochi mmadụ ịbanye n’ụzọ a. Dị ka ihe atụ, na Moldova, otu nwoke dị afọ 99 ji oge okorobịa ya kwado ọchịchị Kọmunist. Obi dị ya ụtọ na ya na ndị ndú Kọmunist a ma ama, dị ka V. I. Lenin, ekwurịtala okwu ihu na ihu. Otú ọ dị, mgbe ọchịchị Kọmunist dara, ndụ agadi nwoke a enweghịzi nzube. Ma mgbe Ndịàmà Jehova gosiri ya na Alaeze Chineke bụ nanị ezi ihe ngwọta dịịrị nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ nabatara eziokwu Bible ma ghọọ onye mmụta dị uchu nke Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ nanị ọnwụ gbochiri ya ịghọ ohu Jehova e mere baptizim.

Mgbe ọ na-amụ banyere omume ndị Chineke chọrọ, otu nwanyị dị afọ 81 na Hungary ghọtara na ọ dị ya mkpa ịlụ nwoke ya na ya biworo ruo ọtụtụ afọ. Nwanyị ahụ ji obi ike kọwaara onye ya na ya bi echiche ya dabeere na Bible. N’ụzọ tụrụ ya nnọọ n’anya ma nye ya oké ọṅụ, nwoke ahụ kwetara ịlụ ya. Mgbe ha debanyesịrị alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ n’ụzọ iwu, o nwere ọganihu ime mmụọ dị ngwa. N’ime ọnwa asatọ ka ọ malitesịrị ịmụ Bible, ọ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, n’oge na-adịghịkwa anya ka e mesịrị, e mere ya baptizim. Lee ka o si bụrụ eziokwu na ezi omume pụrụ ikpuwe ndị agadi ịma mma dị ka okpueze!

Ee, Ndị Kraịst meworo agadi bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ijide n’aka na Chineke nwere mmasị n’ebe ha nọ. Jehova agaghị ahapụ ndị na-anọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ya. Kama nke ahụ, ọ na-ekwe nkwa iduzi, ịkwado na ịkwagide ha ọbụna ruo n’agadi. Ha pụkwara ịgba akaebe nye ịbụ eziokwu nke okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.”—Abụ Ọma 121:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee 2005 Calendar of Jehovah’s Witnesses, January/February.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.”—ILU 16:31.

[Igbe dị na peeji nke 8]

JEHOVA NA-ELEKỌTA NDỊ OHU YA MERE AGADI

“Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.”—Levitikọs 19:32.

“Ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka.”—Aịsaịa 46:4.