Nhụperetụ nke Alaeze Chineke Aghọọ Ihe Dị Adị
Nhụperetụ nke Alaeze Chineke Aghọọ Ihe Dị Adị
“Unu na-emekwa nke ọma n’itinye uche [n’okwu amụma ahụ] dị ka oriọna na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị.”—2 PITA 1:19.
1. Ọdịiche dị aṅaa ka anyị na-ahụ n’ụwa taa?
ỌGBA AGHARA—nke ahụ bụ ihe e ji mara ụwa nke taa. Site ná mbibi nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha ruo n’iyi ọha egwu zuru ụwa ọnụ, nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ yiri ihe na-agaghịzi ekwe mmekwata. Ọbụna okpukpe ndị dị n’ụwa enyebeghị aka. N’ezie, ha na-eme ka ọ kawanye njọ site n’ime ka nkwesi olu ike, ịkpọasị na ịhụ mba n’anya, bụ́ ndị na-ekewasị ndị mmadụ, na-arị elu. Ee, dị ka e buru n’amụma, “oké ọchịchịrị” ekpuchiwo “ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 60:2) Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, ọtụtụ nde mmadụ na-eji obi ike elepụ anya n’ọdịnihu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha na-ege ntị n’okwu amụma Chineke “dị ka oriọna na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị.” Ha na-ekwe ka “okwu,” ma ọ bụ ozi Chineke bụ́ nke a na-achọta ugbu a na Bible na-eduzi nzọụkwụ ha.—2 Pita 1:19.
2. Dị ka amụma Daniel banyere “ọgwụgwụ ihe ndị a” si kwuo, nanị ole ndị ga-enweta nghọta ime mmụọ?
2 Banyere “ọgwụgwụ ihe ndị a,” Daniel onye amụma dere, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba. Ọtụtụ mmadụ ga-eme onwe ha ka ha dị ọcha, ha ga-eme onwe ha ka ha nwuo ọcha, a ga-anụchakwa ha; ma ndị na-emebi iwu ga-emebi iwu; ndị nile nke na-emebi iwu agaghị aghọtakwa ihe; ma ndị ahụ ndị nwere uche ga-aghọta.” (Daniel 12:4, 10) Ọ bụ nanị ndị ji ezi obi “na-ejegharị” n’Okwu Chineke, ma ọ bụ jiri ịdị uchu na-amụ ya, ndị na-erube isi n’ụkpụrụ Chineke ma na-agbalị ime uche Ya, ga-enweta nghọta ime mmụọ.—Matiu 13:11-15; 1 Jọn 5:20.
3. Eziokwu dị aṅaa dị mkpa ka ndị mmụta Bible oge mbụ ghọtara n’afọ ndị 1870?
3 Laarị azụ n’afọ ndị 1870, tupu ‘ụbọchị ikpeazụ’ ahụ amalite, Jehova Chineke malitere ime ka a ghọtakwuo “ihe nzuzo ndị dị nsọ nke alaeze eluigwe.” (2 Timoti 3:1-5; Matiu 13:11) N’oge ahụ, otu ìgwè nke ndị mmụta Bible ghọtara—n’ụzọ dị nnọọ iche n’echiche nke ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ nwere—na a gaghị ahụ nlọghachi Kraịst anya. Mgbe e chisịrị ya eze n’eluigwe, Jizọs ga-alọghachi n’echiche nke ilekwasị anya n’ụwa dị ka Eze ya. Ihe àmà a na-ahụ anya nke ọtụtụ ihe mejupụtara ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya mara na ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya amalitewo.—Matiu 24:3-14.
Mgbe Ihe ahụ A Hụpetụụrụ Ghọrọ Ihe Dị Adị
4. Olee otú Jehova siworo wusie okwukwe nke ndị ohu ya nke oge a ike?
4 Ọhụụ nnwogha ahụ bụ nhụperetụ pụtara ìhè nke Kraịst n’ebube Alaeze. (Matiu 17:1-9) Ọhụụ ahụ wusiri okwukwe Pita, Jems, na Jọn ike n’oge ahụ bụ́ mgbe ọtụtụ ndị kwụsịrị iso Jizọs n’ihi na o mezughị atụmanya ha ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ. N’otu aka ahụ, n’oge ọgwụgwụ a, Jehova ewusiwo okwukwe nke ndị ohu ya nke oge a ike site n’ime ka ha ghọtakwuo mmezu nke ọhụụ ahụ pụrụ iche na ọtụtụ amụma ndị ọzọ metụtara ya. Ka anyị tụlezie ụfọdụ n’ime ihe ime mmụọ ndị a dị adị bụ́ ndị na-ewusi okwukwe ike.
5. Ònye bụ Kpakpando Ụtụtụ ahụ, oleekwa mgbe o ‘biliri’ na otú o si ‘bilie’?
5 N’izo aka ná nnwogha ahụ, Pita onyeozi dere, sị: “N’ihi ya, e mere ka okwu amụma ahụ bụrụ ihe anyị ji n’aka karị; unu na-emekwa nke ọma n’itinye uche na ya dị ka oriọna na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị n’ime obi unu, ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ ewee bilite.” (2 Pita 1:19) Kpakpando Ụtụtụ ihe atụ ahụ, ma ọ bụ “kpakpando ụtụtụ nke na-enwupụ enwupụ” bụ Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube. (Mkpughe 22:16) O ‘biliri’ na 1914 mgbe e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe, na-aka akara mmalite nke ọgbọ ọhụrụ. (Mkpughe 11:15) N’ọhụụ nnwogha ahụ, a hụrụ Mozis na Ịlaịja n’akụkụ Jizọs, ha sokwa ya na-akparịta ụka. Ole ndị ka ha sere onyinyo ha?
6, 7. Ole ndị ka Mozis na Ịlaịja nọchiri anya ha ná nnwogha ahụ, oleekwa ihe dị mkpa Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe banyere ndị ahụ ha nọchiri anya ha?
6 Ebe ọ bụ na Mozis na Ịlaịja keere òkè n’ebube Kraịst, ndị àmà abụọ a kwesịrị ntụkwasị obi aghaghị ịnọchi anya ndị ha na Jizọs ga-achị n’Alaeze ya. Nghọta ahụ bụ́ na Jizọs nwere ndị ha na ya ga-eso achị kwekọrọ n’ọhụụ e ji gositụ Daniel onye amụma Mezaịa ahụ e chiri eze. Daniel hụrụ ka “onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” na-anata “ọchịchị ebighị ebi” site n’aka “Onye ochie ahụ,” Jehova Chineke. Ma rịba ama ihe e gosiri Daniel obere oge ka nke ahụ gasịrị. Ọ na-ede, sị: “Ma alaeze ahụ, na ọchịchị ahụ, na ịdị ukwuu nke alaeze nile n’okpuru eluigwe nile, ka a ga-enye ndị ahụ, bụ́ ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu.” (Daniel 7:13, 14, 27) Ee, ihe karịrị narị afọ ise tupu nnwogha ahụ, Chineke kpughere na “ndị nsọ” ụfọdụ ga-ekere òkè n’ịdị ukwuu nke ọchịchị Kraịst.
7 Ole ndị ka ndị nsọ ahụ Daniel hụrụ n’ọhụụ bụ? N’izo aka ná ndị dị otú ahụ, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe, ma ọ bụrụhaala na anyị atakọọ ahụhụ ka e wee mee ka anyị nwekọọ ebube.” (Ndị Rom 8:16, 17) Ndị nsọ ahụ abụghị ndị ọzọ ma e wezụga ndị na-eso ụzọ Jizọs e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ná Mkpughe, Jizọs kwuru, sị: “M ga-ekwe ka onye ahụ nke na-emeri emeri soro m nọdụ ala n’ocheeze m, ọbụna dị ka m meriri wee soro Nna m nọdụ ala n’ocheeze ya.” ‘Ndị mmeri’ a a kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha dị narị puku na iri puku anọ na anọ, ga-eso Jizọs chịa ụwa dum.—Mkpughe 3:21; 5:9, 10; 14:1, 3, 4; 1 Ndị Kọrint 15:53.
8. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ siworo rụọ ọrụ yiri nke Mozis na Ịlaịja, oleekwa ihe ndị si na ya pụta?
8 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka e ji jiri Mozis na Ịlaịja mee ndị nnọchianya nke Ndị Kraịst e tere mmanụ? Ọ bụ n’ihi na Ndị Kraịst dị otú ahụ Aịsaịa 43:10; Ọrụ 8:1-8; Mkpughe 11:2-12) Dị ka Mozis na Ịlaịja, ha na-eji obi ike agba okpukpe ụgha n’anwụ ma na-agba ndị nwere obi eziokwu ume ife Chineke ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Ọpụpụ 32:19, 20; Deuterọnọmi 4:22-24; 1 Ndị Eze 18:18-40) Ọrụ ha ọ̀ rụpụtawo ihe? Eenụ! E wezụga inye aka n’ịchịkọta ndị ga-emezu ndị ahụ e tere mmanụ, ha enyeworo ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” aka iji ọchịchọ obi na-edo onwe ha n’okpuru Jizọs Kraịst.—Jọn 10:16; Mkpughe 7:4.
na-arụ ọrụ yiri nke Mozis na Ịlaịja mgbe ha ka dị ndụ n’anụ ahụ́. Dị ka ihe atụ, ha na-eje ozi dị ka Ndịàmà Jehova, ọbụna n’okpuru mkpagbu. (Kraịst Enwezuo Mmeri Ya
9. Olee otú Mkpughe 6:2 si egosi otú Jizọs dị taa?
9 Jizọs abụghịzi mmadụ nkịtị nọ n’elu nwa ịnyịnya ibu, ọ bụ Eze dị ike ugbu a. A na-egosi ya dị ka onye na-agba ịnyịnya—ihe Bible ji eme ihe atụ nke ibu agha. (Ilu 21:31) “Lee! ịnyịnya ọcha,” ka Mkpughe 6:2 na-ekwu, “onye na-anọkwasị na ya jikwa ụta; e nyekwara ya okpueze, o wee pụọ na-enwe mmeri na ka o wee nwezuo mmeri ya.” Ọzọkwa, banyere Jizọs, ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaịọn zipụta: Gị nwee ike n’ahụ́ mmadụ n’etiti ndị iro gị.”—Abụ Ọma 110:2.
10. (a) Olee otú ọgbụgba ịnyịnya mmeri Jizọs si malite n’ụzọ dị ebube? (b) Olee otú mmeri mbụ Kraịst si metụta ụwa n’ozuzu?
10 Mmeri mbụ Jizọs nwere bụ nke o meriri ndị iro ya kasị ike—Setan na ndị mmụọ ọjọọ. O si n’eluigwe chụpụ ha ma chụda ha n’ụwa. N’ihi na ha maara na oge ha dị mkpụmkpụ, ndị ajọ mmụọ a ewesawo ihe a kpọrọ mmadụ oké iwe ma kpata ahụhụ dị ukwuu. Ná Mkpughe, e ji ọgbụgba ịnyịnya nke ndị ọgba ịnyịnya atọ ọzọ see onyinyo ahụhụ a. (Mkpughe 6:3-8; 12:7-12) N’ikwekọ n’amụma Jizọs banyere “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ya] nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a,” ọgbụgba nke ịnyịnya ndị ahụ arụpụtawo agha, ụnwụ nri, na ihe otiti ndị na-egbu egbu. (Matiu 24:3, 7; Luk 21:7-11) Obi abụọ adịghị ya na dị ka ihe ụfụ nkịtị nke ịmụ nwa, “ihe ụfụ nke nhụjuanya” ndị a ga-anọgide na-amụba ruo mgbe Kraịst ‘ga-enwezu mmeri ya’ site n’ibibi akụkụ nile a na-ahụ anya nke nzukọ Setan. *—Matiu 24:8.
11. Olee otú akụkọ ihe mere eme nke ọgbakọ Ndị Kraịst si agba akaebe na e nyewo Kraịst ikike ọchịchị?
11 Nchebe Jizọs nyeworo ọgbakọ ya ka o Mkpughe 17:5, 6) Lee ihe akaebe dị ike ọ bụ nye ọbụbụeze Kraịst!—Abụ Ọma 110:3.
wee nwee ike ịrụzu ọrụ ya nke ikwusa ozi Alaeze ahụ n’ụwa nile na-egosikwa na Kraịst enwetawo ikike dị ka eze. N’agbanyeghị na Babilọn Ukwu ahụ—alaeze ụwa nke okpukpe ụgha—na ọchịchị ndị dị obi ọjọọ emegidewo ọrụ nkwusa ahụ n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, ọ bụghị nanị na ọ nọgidewo na-aga n’ihu, kamakwa a rụwo ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-arụtụbeghị ya mbụ n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa. (12. N’ihi gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ejighị aghọta ọnụnọ Kraịst a na-adịghị ahụ anya?
12 Otú ọ dị, ọ bụ ihe dị mwute na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, gụnyere ọtụtụ nde ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst, adịghị aghọta ihe ndị dị adị a na-adịghị ahụ anya nọ n’azụ oké ihe omume ndị na-eme n’ụwa. Ha na-akwadị ndị na-akpọsa Alaeze Chineke emo. (2 Pita 3:3, 4) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Setan emewo ka uche ha kpuo ìsì. (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) N’ezie, ọ malitere iji ọchịchịrị ime mmụọ ekpuchi ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst ọtụtụ narị afọ gara aga, ọbụna na-eme ka ha gbahapụ olileanya dị oké ọnụ ahịa nke Alaeze ahụ
A Gbahapụ Olileanya Alaeze Ahụ
13. Na gịnị ka ọchịchịrị ime mmụọ dugara?
13 Jizọs buru amụma na ndị si n’ezi ofufe dapụ, dị ka ata a kụrụ n’etiti ọka, ga-egbebata n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma duhie ọtụtụ mmadụ. (Matiu 13:24-30, 36-43; Ọrụ 20:29-31; Jud 4) Ka oge na-aga, ndị a kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst malitere ime ememe, omume, na izi ozizi ndị ọgọ mmụọ, ọbụna na-akpọ ha nke “Ndị Kraịst.” Dị ka ihe atụ, ememe Krismas sitere n’ememe ndị gụnyere ife chi ndị ọgọ mmụọ bụ́ Mithra na Saturn. Ma gịnị dugara ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst ime ememe ndị a na-abụghị nke Ndị Kraịst? The New Encyclopædia Britannica (1974) na-ekwu, sị: “A malitere ime Krismas, ememe ọmụmụ Jizọs Kraịst, n’ihi atụmanya na-ebelata ebelata nke ọbịbịa Kraịst ga-abịa n’isi nso.”
14. Olee otú ozizi Origen na nke Augustine si gwagbuo eziokwu Alaeze ahụ?
14 Tụleekwa ngwagbu a gwagburu ihe okwu ahụ bụ́ “alaeze” pụtara. Akwụkwọ bụ́ The Kingdom of God in 20th-Century Interpretation na-ekwu, sị: “Origen [ọkà mmụta okpukpe nke narị afọ nke atọ] gbanwere Mkpughe 17:5, 18.
otú Ndị Kraịst sibu eji okwu ahụ bụ́ ‘alaeze’ eme ihe gaa n’ịbụ ọchịchị Chineke nke dị n’ime obi.” Na gịnị ka ozizi Origen dabeere? Ọ bụghị n’Akwụkwọ Nsọ, kama ‘na nkà ihe ọmụma na echiche ụwa bụ́ nke dị nnọọ iche n’echiche Jizọs na nke chọọchị mbụ ahụ.’ N’akwụkwọ ya bụ́ De Civitate Dei (Obodo nke Chineke), Augustine nke Hippo (354-430 O.A.) kwuru na chọọchị n’onwe ya bụ Alaeze Chineke. Echiche dị otú ahụ na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ mere ka chọọchị Krisendọm malite ịdị na-anakwere ike ọchịchị. Ha jikwa ike dị otú ahụ mee ihe ruo ọtụtụ narị afọ, mgbe mgbe, n’ụzọ obi ịta mmiri.—15. Olee otú Ndị Galeshia 6:7 siworo mezuo n’ihe banyere ọtụtụ n’ime chọọchị Krisendọm?
15 Otú ọ dị, taa, chọọchị dị iche iche na-aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ. (Ndị Galeshia 6:7) O yiri ka ikike ọtụtụ n’ime ha nwere ọ̀ na-ebelata ebelata, ndị na-aga ha na-ebelatakwa. A na-ahụ nke a nke ọma na Europe. Dị ka akwụkwọ bụ́ Christianity Today si kwuo, “ugbu a a naghịzi eji katidral ndị dị na Europe eme ihe dị ka ụlọ ofufe kama a na-ejizi ha eme ihe dị ka ebe ndebe ihe ochie, bụ́ ndị nanị ndị njem nleta na-aga na ha.” A pụkwara ịhụ otu ihe ahụ n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Gịnị ka nke a ga-apụtara okpukpe ụgha? Enweghị nkwado ọ̀ ga-eme ka ọ pụọ n’anya? Oleekwa otú ọ ga-esi metụta ezi ofufe?
Dị Njikere Maka Oké Ụbọchị Chineke
16. N’ihi gịnị ka iro a na-ebuso Babilọn Ukwu ahụ ji dị ịrịba ama?
16 Dị nnọọ ka anwụrụ ọkụ na ntụ si n’ugwu na-agbọpụ ọkụ bụ́ nke na-adịghị akpa ike apụta na-egosi na ugwu ahụ na-achọ ịgbawa, mmụba nke iro a na-ebuso ọtụtụ okpukpe n’akụkụ nile nke ụwa na-egosi na a gụwo ụbọchị okpukpe ụgha ọnụ. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-akpali ndị ọchịchị nke ụwa ijikọta aka ikpughe na ibibi Babilọn Ukwu ahụ nke na-akwa iko n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 17:15-17; 18:21) Ezi Ndị Kraịst hà kwesịrị ịtụ ihe omume ahụ na akụkụ ndị ọzọ nke “oké mkpagbu” ga-esochi ya egwu? (Matiu 24:21) Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie, ha ga-enwe ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ mgbe Chineke ga-eme ihe megide ndị ajọ omume. (Mkpughe 18:20; 19:1, 2) Tụlee ihe atụ nke Jeruselem narị afọ mbụ na Ndị Kraịst bi n’ebe ahụ.
17. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ iji jiri obi ike chee ọgwụgwụ nke usoro ihe a ihu?
17 Mgbe ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu na 66 O.A., ọ tụghị Ndị Kraịst mụ anya n’anya, ha atụghịkwa egwu. N’ihi na ha bụ ndị ji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, ha maara na “ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso.” (Luk 21:20) Ha makwaara na Chineke ga-emeghere ha ụzọ mgbapụ. Mgbe nke ahụ mere, Ndị Kraịst gbapụrụ. (Daniel 9:26; Matiu 24:15-19; Luk 21:21) N’ụzọ yiri nke ahụ taa, ndị maara Chineke ma na-erubere Ọkpara ya isi pụrụ iji obi ike chee ọgwụgwụ nke usoro ihe a ihu. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) N’ezie, mgbe oké mkpagbu ahụ tiwapụrụ, ha ga-eji ọṅụ ‘guzo kwem ma welie isi ha elu, n’ihi na mgbapụta ha na-eru nso.’—Luk 21:28.
18. Gịnị ga-esi ná mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ Gọg ga-awakpo ndị ohu Jehova pụta?
18 Mgbe e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ, n’ịrụ ọrụ dị ka Gọg nke Megọg, Setan ga-awakpo Ndịàmà Jehova nọ n’udo n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. N’ịdị “ka igwe ojii ikpuchi ala,” ìgwè ndị agha Gọg ga-atụ anya imeri ndị Chineke n’ụzọ dị mfe. Lee ihe ijuanya na-echere ha! (Ezikiel 38:14-16, 18-23) Jọn onyeozi na-ede, sị: “M wee hụ ka e meghere eluigwe, ma, lee! otu ịnyịnya ọcha. A na-akpọkwa onye na-anọkwasị na ya Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Onye Eziokwu, . . . Otu ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya na-apụta, ka o wee jiri ya tigbuo mba nile.” “Eze nke ndị eze” a a na-apụghị imeri emeri ga-anapụta ndị ji ikwesị ntụkwasị obi efe Jehova ofufe ma kpochapụ ndị iro ha nile. (Mkpughe 19:11-21) Lee ka nke ahụ ga-esi bụrụ ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke mmezu nke ọhụụ nnwogha ahụ!
19. Olee otú mmeri zuru ezu Kraịst ga-enwe ga-esi metụta ndị na-eso ụzọ ya na-eguzosi ike n’ihe, gịnịkwa ka ha kwesịrị ịgbalịsi ike ime ugbu a?
2 Ndị Tesalonaịka 1:10) Ị̀ ga-achọ iso ná ndị ga-eji egwu nsọpụrụ guzo n’ihu Ọkpara Chineke na-enwe mmeri? Ya bụrụ otú ahụ, nọgide na-ewusi okwukwe gị ike ma ‘na-egosipụta na ị bụ onye dị njikere, n’ihi na n’awa ị na-echeghị na ọ gaje ịbụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.’—Matiu 24:43, 44.
19 Jizọs ga-abụ onye “e weere n’ụzọ ịtụnanya n’ụbọchị ahụ n’ihe metụtara ndị nile gosipụtara okwukwe.” (Nọgide Na-enwe Uche Ziri Ezi
20. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele anyị nwere na Chineke nyere anyị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche”? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
20 “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-agba ndị Chineke ume mgbe nile ịnọgide na-amụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma na-enwe uche ziri ezi. (Matiu 24:45, 46; 1 Ndị Tesalonaịka 5:6) Ì nwere ekele maka ihe ncheta ndị a na-abịa n’oge kwesịrị ekwesị? Ị̀ na-eji ha eme ihe mgbe ị na-ekpebi ihe ndị ị ga-ebute ụzọ ná ndụ? Gịnị ma ị jụọ onwe gị, sị: ‘Àna m ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ bụ́ nke ga-enyere m aka ịhụ Ọkpara Chineke ka ọ na-achị achị n’eluigwe? M̀ na-ahụ ya dị ka onye dị njikere imezu ikpe Chineke megide Babilọn Ukwu ahụ na akụkụ ndị ọzọ nke usoro ihe Setan?’
21. Gịnị pụrụ imewo ka ụfọdụ ndị kwụsị ịhụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ, gịnịkwa ka ọ dị ngwa ka ha mee?
21 Ụfọdụ ndị ha na ndị Jehova na-akpakọrịta ugbu a ekwewo ka anya ha gharazie ịdị na-ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ha enweghị ndidi ma ọ bụ ntachi obi, dị ka ụfọdụ ndị soro ụzọ Jizọs n’oge mbụ na-enweghị? Nchegbu nke ndụ, ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ mkpagbu ò metụtawo ha? (Matiu 13:3-8, 18-23; Luk 21:34-36) Ikekwe, o siiri ụfọdụ n’ime ha ike ịghọta ihe ọmụma ụfọdụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” bipụtara. Ọ bụrụ na otu n’ime ihe ndị a emewo gị, anyị na-agba gị ume ijirighachi ịnụ ọkụ n’obi mụọ Okwu Chineke ma kpegara Jehova ekpere ka i wee soroghachi ya nwee mmekọrịta siri ike na nke chiri anya.—2 Pita 3:11-15.
22. Olee mmetụta ịtụle ọhụụ nnwogha ahụ na amụma ndị metụtara ya nweworo n’ahụ́ gị?
22 E gosiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ọhụụ nnwogha ahụ mgbe agbamume dị ha mkpa. Taa, anyị nwere ihe ka nke ahụ ukwuu ga-ewusi anyị ike—mmezu nke nhụperetụ ahụ na ọtụtụ amụma ndị metụtara ya. Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị a dị ebube dị adị na ihe ha ga-eweta n’ọdịnihu, ka anyị onwe anyị jirikwa obi anyị nile kwuo ihe ahụ Jọn onyeozi kwuru mgbe ọ sịrị: “Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.”—Mkpughe 22:20.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Na Grik mbụ, okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “ihe ụfụ nke nhụjuanya” pụtara n’ụzọ nkịtị “ihe ụfụ nke ịmụ nwa.” (Matiu 24:8, Kingdom Interlinear) Nke a na-enye echiche na dị ka ihe ụfụ nke ịmụ nwa, nsogbu ụwa ga na-amụba n’ugboro ole ọ na-eme, n’isi ike ya na n’ogologo oge ọ na-adịru, ma bịa ná njedebe ya n’oké mkpagbu ahụ.
Ị̀ Na-echeta?
• N’afọ ndị 1870, gịnị ka otu obere ìgwè nke ndị mmụta Bible ghọtara banyere nlọghachi Kraịst?
• Olee otú e siworo mezuo ọhụụ nnwogha ahụ?
• Olee otú ọgbụgba ịnyịnya mmeri Jizọs si emetụta ụwa na ọgbakọ Ndị Kraịst?
• Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji soro ná ndị ga-alanarị mgbe Jizọs ga-enwezu mmeri ya?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
Nhụperetụ ahụ aghọọ ihe dị adị
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ị̀ maara ihe mere mgbe Kraịst malitere mmeri ya?