Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkwusa Sọl Akpalite Ibu Iro

Nkwusa Sọl Akpalite Ibu Iro

Nkwusa Sọl Akpalite Ibu Iro

Ọ GBAGWOJURU ndị Juu nọ na Damaskọs anya. Olee otú onye ji ịnụ ọkụ n’obi agbachitere nkwenkwe ọdịnala pụrụ isi ghọọ onye jụrụ okwukwe? Sọl anọwo na-amaja ndị na-akpọku aha Jizọs na Jeruselem. Ọ bịara Damaskọs ịkpagbu ndị na-eso ụzọ nọ n’ebe ahụ. Ma ugbu a, ya onwe ya nọ na-ekwusa na otu onye omempụ ahụ a kpọgburu n’elu osisi n’ihi ikwulu Chineke bụ Mezaịa ahụ! Isi ò mebiela Sọl?—Ọrụ 9:1, 2, 20-22.

Ma eleghị anya, ọ dị ihe kpatara ya. Ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ ha na Sọl so si Jeruselem bịa kwuru ihe mere n’ụzọ. Ka ha na-abịaru Damaskọs nso, na mberede, oké ìhè nwuru gburugburu ha, ha nile dakwara n’ala. A nụkwara ụda olu. Ọ dịghị onye merụrụ ahụ́ ma e wezụga Sọl. O dina n’okporo ụzọ. Mgbe o mesịrị bilie, ndị njem ndị ọzọ kpọgara ya Damaskọs, n’ihi na ọ pụghị ịhụ ihe ọ bụla.—Ọrụ 9:3-8; 26:13, 14.

Onye Mmegide Aghọọ Onye Nkwado

Gịnị mere Sọl n’ụzọ Damaskọs? Ọ̀ pụrụ ịbụ na njem ahụ dị ogologo ma ọ bụ oké okpomọkụ nke anwụ etiti ehihie ahụ emewo ka ike gwụ ya? N’ikpebisi ike ịchọpụta ihe nkịtị kpatara ya, ndị na-arụ ụka nke oge a sịrị na nsogbu ya pụrụ ịbụ uche mgbasasị, ịmụ anya arọ nrọ, nsogbu uche nke obi amamikpe Sọl kpataara ya, ọrịa uche, nakwa ọrịa àkwụ́kwụ̀ e chere na ọ na-arịa.

Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs Kraịst mere ka Sọl hụ ya n’ìhè ahụ na-achachi anya, na-eme ka o kweta na Ya bụ Mezaịa ahụ. Ihe osise ụfọdụ ndị na-egosi ihe a merenụ na-egosi ebe Sọl si n’elu ịnyịnya na-ada. Ọ bụ ezie na nke ahụ pụrụ ime eme, nanị ihe Bible kwuru bụ na ‘ọ dara n’ala.’ (Ọrụ 22:6-11) Ụdị ada ọ bụla Sọl dara erutụghị ka ọdịda ọ dara site n’ọkwá ọ nọbu na ya. Ọ ghaghị ịmata ugbu a na ihe ụmụazụ Jizọs na-ekwusa bụ eziokwu. Ọ dịghị ihe ọzọ Sọl pụrụ ime ma ọ bụghị isonyere ha. Sọl si n’ịbụ onye na-emegide ozi Jizọs n’ụzọ siri ike gaa n’ịbụ otu n’ime ndị kasị akwado ya. Mgbe ọ maliteghachiri ịhụ ụzọ, e meekwa ya baptizim, “Sọl nọgidere na-enwetakwu ike, ma na-etinye ndị Juu bi na Damaskọs ná mgbagwoju anya ka ọ na-egosi n’ụzọ ezi uche dị na ya na onye a bụ Kraịst ahụ.”—Ọrụ 9:22.

Nkata A Kpara Igbu Ya Akụọ Afọ n’Ala

Olee ebe Sọl, bụ́ onye e mesịrị kpọọ Pọl, gara mgbe a tọghatasịrị ya? Mgbe ọ na-edegara ndị Galeshia akwụkwọ ozi, o kwuru, sị: “Agawara m Arebia, alaghachikwara m ọzọ na Damaskọs.” (Ndị Galeshia 1:17) Okwu ahụ bụ́ “Arebia” na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na ọ gara n’akụkụ ọ bụla nke Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Arebia. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-atụ aro na ọ pụrụ ịbụ na Pọl gara n’Ọzara Siria ma ọ bụ n’ebe ọzọ n’alaeze Nabataea, nke Aritas nke Anọ na-achị. O yikarịrị ka Sọl ọ̀ gara ebe dị jụụ iji tụgharịa uche mgbe e mesịrị ya baptizim, ọbụna dị ka Jizọs gara n’ịkpa mgbe e mikpusịrị ya ná mmiri.—Luk 4:1.

Mgbe Sọl laghachiri Damaskọs, “ndị Juu gbarịtara izu igbufu ya.” (Ọrụ 9:23) Onye ọchịchị nke na-anọchite anya Eze Aritas na Damaskọs nọ na-eche obodo ahụ nche iji jichie Sọl. (2 Ndị Kọrint 11:32) Ma ka ndị iro na-akpa nkata igbu Sọl, ndị na-eso ụzọ Jizọs meere ya ụzọ mgbapụ.

Ananaịas na ndị na-eso ụzọ ha na Sọl nọrọ ozugbo a tọghatasịrị ya so ná ndị nyeere onyeozi ahụ aka ịgbalaga. * (Ọrụ 9:17-19) Ọ pụkwara ịbụ na ụfọdụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe n’ihi nkwusa Sọl mere na Damaskọs nyekwara aka, n’ihi na Ọrụ 9:25 na-ekwu, sị: “Ndị na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya ma si n’oghere dị ná mgbidi buda ya n’abalị, jiri nkata butuo ya.” Okwu ahụ bụ́ “ndị na-eso ụzọ ya” pụrụ ịpụta ndị Sọl ziri ihe. Otú o sina dị, o yiri ka ọ̀ bụ ihe ịga nke ọma ozi ya nwere mere ka iro a nọworo na-ebuso ya rịa elu.

Ihe A Ga-amụta

Mgbe anyị tụlere ụfọdụ ihe ndị gbara ntọghata Sọl na baptizim ya gburugburu, anyị na-ahụ nke ọma na o chegbubigaghị onwe ya ókè banyere otú ndị ọzọ si lee ya anya; mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ emeghịkwa ka ọ kwụsị. Ihe kasị dị Sọl mkpa bụ ọrụ nkwusa o nwetara.—Ọrụ 22:14, 15.

Ò doola gị anya na nso nso a na ọ dị mkpa ikwusa ozi ọma? Ya bụrụ otú ahụ, ị maara na ezi Ndị Kraịst nile aghaghị ịbụ ndị nkwusa Alaeze. O kwesịghị iju gị anya ma ọ bụrụ na ozi gị akpasuo ndị mmadụ iwe mgbe ụfọdụ. (Matiu 24:9; Luk 21:12; 1 Pita 2:20) Otú Sọl si meghachi omume ná mmegide kwesịrị nṅomi. Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ule n’adaghị mbà ga-enweta ihu ọma Chineke. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” Ma o mesiri ha obi ike, sị: “Site ná ntachi obi unu, unu ga-enweta mkpụrụ obi unu.”—Luk 21:17-19.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọ pụrụ ịbụ na Iso Ụzọ Kraịst rutere Damaskọs mgbe Jizọs kwusasịrị ozi ọma na Galili ma ọ bụ mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị.—Matiu 4:24; Ọrụ 2:5.

[Foto dị na peeji nke 28]

Sọl ‘dara n’ala’ mgbe Jizọs gosiri ya onwe ya

[Foto dị na peeji nke 29]

Sọl lanahụrụ nkata a kpara igbu ya na Damaskọs