‘Ịchọta Nkume Pel Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa’
‘Ịchọta Nkume Pel Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa’
“Alaeze nke eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ nke ụmụ mmadụ na-achụsosi ike, ndị sikwara ọnwụ na-achọ ya na-enweta ya.”—MATIU 11:12.
1, 2. (a) Olee àgwà dị ụkọ Jizọs kwuru banyere ya n’otu n’ime ilu ndị ọ tụrụ banyere Alaeze? (b) Gịnị ka Jizọs kwuru n’ilu nke nkume pel dị oké ọnụ ahịa?
Ọ̀ DỊ ihe i ji kpọrọ ihe nke ukwuu nke na ị ga-enye ihe nile i nwere ma ọ bụ jiri ha chụọ àjà iji nweta ya? Ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-ekwu na ha na-etinye onwe ha n’ịchụso ụfọdụ n’ime ihe mgbaru ọsọ ha—ego, ịbụ onye a ma ama, ikike, ma ọ bụ ọkwá—mmadụ ịhụ ihe masịrị ya nke ukwuu nke na ọ ga-adị njikere ịhapụ ihe nile o nwere iji nweta ya abụghị ihe a na-ahụkebe. Jizọs Kraịst zoro aka n’àgwà a a na-adịghị ahụkebe na nke dị oké ọnụ ahịa n’otu n’ime ọtụtụ ilu ya banyere Alaeze Chineke bụ́ ndị na-akpali iche echiche.
2 Ọ bụ ilu Jizọs tụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ma ọ bụ ihe atụ o nyere ha mgbe nanị ya na ha nọ, bụ́ nke a na-akpọkarị ilu nkume pel dị oké ọnụ ahịa. Jizọs kwuru, sị: “Alaeze nke eluigwe dị ka onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma. Mgbe ọ hụrụ otu nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa, ọ lara ma jiri ọsọ ọsọ ree ihe nile o nwere wee zụọ ya.” (Matiu 13:36, 45, 46) Olee ihe Jizọs chọrọ ka ndị na-ege ya ntị mụta n’ilu a? Oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe ahụ Jizọs kwuru?
Ịdị Oké Ọnụ Ahịa nke Nkume Pel
3. N’ihi gịnị ka nkume pel ọma ji dị oké ọnụ ahịa n’oge ochie?
3 Site n’oge ochie, a nọwo na-ele nkume pel anya dị ka ihe ịchọ mma dị oké ọnụ ahịa. Otu akwụkwọ na-ekwu na ọkà mmụta bụ́ onye Rom bụ́ Pliny nke Okenye kwuru na nkume pel “dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla ọzọ e ji kpọrọ ihe.” N’adịghị ka ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ ọtụtụ nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, ọ bụ ihe ndị dị ndụ na-emepụta nkume pel. Ọ bụ ihe a maara nke ọma na ụdị eju mmiri ụfọdụ pụrụ ime ka ihe ndị bara n’okpokoro ha—dị ka iberibe nkume—ghọọ nkume pel ndị na-egbukepụ egbukepụ site n’ịwụsa ha ihe ndị na-esi ha n’ahụ́ apụta a maara dị ka nacre. N’oge ochie, ebe ndị bụ́ isi e si nweta nkume pel ndị kasị mma bụ Oké Osimiri Uhie, Ọwara Oké Osimiri Peasia na Oké Osimiri India—ebe ndị dị nnọọ anya site n’ala Izrel. Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo banyere “onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma.” Ịchọta nkume pel ndị dị oké ọnụ ahịa n’ezie chọrọ nnọọ mgbalị dị ukwuu.
4. Gịnị bụ isi ihe dị n’ilu Jizọs banyere onye ahịa na-achọ nkume pel?
4 Ọ bụ ezie na ọ dịla anya nkume pel ọma dịwara oké ọnụ, ihe àmà na-egosi na ọ bụghị ịdị oké ọnụ ya bụ isi ihe dị n’ilu Jizọs. N’ilu a, ihe Jizọs mere abụghị nanị iji Alaeze Chineke tụnyere nkume pel dị oké ọnụ ahịa; ọ dọọrọ uche gaa n’ebe “onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma” nọ na ihe o mere mgbe ọ chọtara ya. N’adịghị ka onye na-ere ihe n’ụlọ ahịa, onye ahịa na-achọ nkume pel, bụ onye a pụrụ ịkpọ aka ochie n’ahịa ahụ, onye maara anya ya ma ọ bụ nwee ike ịmata ịma mma na ihe ndị zoro ezo na-eme ka nkume pel gbapụ iche. Ọ ga-ama nkume pel ọma ma ọ hụ ya, onye na-ere nkume pel adịgboroja agaghịkwa aghọgbuli ya.
5, 6. (a) Olee ihe e kwesịrị nnọọ ịrịba ama banyere onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs? (b) Gịnị ka ilu nke akụ̀ zoro ezo na-ekpughe banyere onye ahịa ahụ?
5 Ọ dị ihe ọzọ kwesịrị ịrịba ama banyere onye ahịa a. Onye ahịa nkịtị pụrụ ibu ụzọ chọpụta ego ole a na-ere nkume pel n’ahịa iji kpebie ego ole ọ ga-azụ ya ka o wee nweta uru na ya. Ọ pụkwara ịtụle ma ndị mmadụ hà chọrọ nkume pel dị otú ahụ ka o wee nwee ike irepụ ya ngwa ngwa. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ ga-enwe mmasị n’inweta uru ngwa ngwa site ná ngwá ahịa ya, ọ bụghị n’inwe nkume pel. Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs. Mkpa ya abụghị inweta uru ego ma ọ bụ ihe a na-ahụ anya. N’ezie, ọ dị njikere iji “ihe nile o nwere”—ikekwe ngwongwo ya nile—chụọ àjà iji nweta ihe ọ nọ na-achọ kemgbe.
6 N’anya ihe ka ọtụtụ ná ndị ahịa, ihe nwoke ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs mere bụ, ma eleghị anya, ihe amamihe na-adịghị na ya. Ọchụ nta ego maara ahịa agaghị eche echiche itinye aka n’ụdị achụmnta ego ahụ a na-ejighị n’aka. Ma ihe onye ahịa ahụ e kwuru banyere ya n’ilu Jizọs ji akpọrọ ihe dị iche. Ihe ọ ga-enweta abụghị uru ego kama ọ bụ ọṅụ na afọ ojuju nke inwe ihe ka nnọọ ego baa uru. E mere ka isi ihe a pụta ìhè n’ilu yiri nke a Jizọs tụrụ. O kwuru, sị: “Alaeze nke eluigwe dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke e zoro n’ala, bụ́ nke otu nwoke hụrụ wee zobe; n’ihi ọṅụ o nwekwara ọ gara ree ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ.” (Matiu 13:44) Ee, ọṅụ nke ịchọta na inweta akụ̀ ahụ dị oké ọnụ ahịa zuru ịkpali nwoke ahụ ịhapụ ihe nile o nwere. È nwere ndị dị otú ahụ taa? Ọ̀ dị akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e kwesịrị ịchụrụ àjà dị otú ahụ?
Ndị Lere Ya Anya Dị Ka Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa
7. Olee otú Jizọs si gosi na ya lere nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa?
7 Ihe Jizọs na-ekwu banyere ya n’ilu ya bụ “alaeze nke eluigwe.” O lere nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-egosi nnọọ nke a. Mgbe e mesịrị ya baptizim na 29 O.A., Jizọs “bidoro ime nkwusa na-asị: ‘Chegharịanụ, n’ihi na alaeze nke eluigwe eruwo.’” O ji afọ atọ na ọkara kụziere ọtụtụ ìgwè mmadụ banyere Alaeze ahụ. Ọ gazuru ala ahụ nile, “site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, nakwa site n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-akpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke.”—Matiu 4:17; Luk 8:1.
8. Gịnị ka Jizọs mere iji gosi ihe Alaeze ahụ ga-arụzu?
8 Site n’ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube—ndị gụnyere ịgwọ ọrịa, inye ndị agụụ na-agụ nri, ịchịkwa ikike ndị sitere n’okike, ọbụna ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ—n’ala ahụ nile, Jizọs gosikwara ihe Alaeze Chineke ga-arụzu. (Matiu 14:14-21; Mak 4:37-39; Luk 7:11-17) N’ikpeazụ, o gosipụtara iguzosi ike n’ihe ya nye Chineke na Alaeze ahụ site n’inye ndụ ya, nwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ dị ka onye na-agba àmà banyere eziokwu ahụ. Dị nnọọ ka onye ahịa ahụ ji obi ya nile hapụ ihe nile o nwere iji nweta ‘nkume pel ahụ dị nnọọ oké ọnụ ahịa,’ Jizọs dịrị ndụ ma nwụọ n’ihi Alaeze ahụ.—Jọn 18:37.
9. Olee otu àgwà a na-adịghị ahụkebe a hụrụ n’etiti ndị na-eso ụzọ Jizọs nke oge mbụ?
9 Ọ bụghị nanị na Jizọs mere ka ndụ ya hiwe isi n’Alaeze ahụ kama ọ kpọkọtakwara otu obere ìgwè ịbụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha onwe ha kwa lere Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa. Andru, bụ́ onye na-esobu ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ otu n’ime ha. Mgbe ha nụrụ akaebe Jọn gbara na Jizọs bụ “Nwa Atụrụ Chineke,” Andru na onye ọzọ na-eso ụzọ Jọn, onye o yikarịrị ka ọ̀ bụ otu n’ime ụmụ Zebedi nke aha ya bụkwa Jọn, bịara nwee mmasị n’ebe Jizọs nọ ma ghọọ ndị kwere ekwe. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Ozugbo, Andru gakwuuru nwanne ya nwoke bụ́ Saịmọn ma gwa ya, sị: “Anyị ahụwo Mezaịa ahụ.” N’egbughị oge ọ bụla, Saịmọn (onye ghọrọ Sifas, ma ọ bụ Pita), tinyere Filip na enyi ya bụ́ Nataniel bịakwara ghọta Jizọs dị ka Mezaịa ahụ. N’ezie, a kpaliri Nataniel ịgwa Jizọs, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke, ị bụ Eze Izrel.”—Jọn 1:35-49.
Ndị A Kpaliri Ime Ihe
10. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mere mgbe ọ kpọrọ ha obere oge ka ya na ha zutesịrị nke mbụ?
10 A pụrụ iji obi ụtọ dị ukwuu nke Andru, Pita, Jọn na ndị ọzọ nwere mgbe ha chọtara Mezaịa ahụ tụnyere nke onye ahịa ahụ nwere mgbe ọ chọtara nkume pel ahụ dị oké ọnụ ahịa. Gịnịzi ka ha ga-eme? Oziọma anọ ahụ agwachaghị anyị ihe ha mere ozugbo ha zutesịrị Jizọs nke mbụ ya. Ihe àmà na-egosi na ihe ka ọtụtụ n’ime ha laghachiri n’otú ha sibu ebi ndụ. Otú ọ dị, n’agbata ihe dị ka ọnwa isii na otu afọ ka e mesịrị, Jizọs zutere Andru, Pita, Jọn na nwanne Jọn bụ́ Jems ọzọ n’ebe ha na-egbu azụ n’ụsọ Oké Osimiri Galili. * Mgbe Jizọs hụrụ ha, ọ gwara ha, sị: “Soronụ m, m ga-emekwa unu ndị na-akụta mmadụ.” Gịnị ka ha mere? Banyere Pita na Andru, ihe ndekọ Matiu na-ekwu, sị: “Ozugbo ahụ, ka ha gbahapụrụ ụgbụ ha, ha sooro ya.” Banyekwara Jems na Jọn, anyị na-agụ, sị: “Ozugbo ahụ, ka ha hapụrụ ụgbọ ahụ na nna ha, ha sooro ya.” Ihe ndekọ Luk na-agbakwụnye na ha ‘gbahapụrụ ihe nile ma soro ya.’—Matiu 4:18-22; Luk 5:1-11.
11. Olee ihe o yikarịrị ka ọ̀ bụ ya mere ndị ahụ na-eso ụzọ ji za òkù Jizọs n’egbughị oge?
11 Otú ndị ahụ na-eso ụzọ si za òkù Jizọs n’egbughị oge, ọ̀ na-egosi na ha mere mkpebi n’echeghị ya eche? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ ezie na ha laghachiri n’ọrụ ezinụlọ ha nke igbu azụ mgbe ha na Jizọs zutesịrị nke mbụ, obi abụọ adịghị ya na ihe ha hụworo ma nụ n’oge ahụ nwere mmetụta miri emi n’obi na n’uche ha. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ gaferenụ nyere ha oge buru ibu ịtụgharị uche n’okwu ndị ahụ. Ugbu a, oge ime mkpebi eruola. Hà ga-adị ka onye ahịa ahụ nkume pel dị oké ọnụ ahịa ọ chọtara kpaliri obi ya nke na, dị ka Jizọs si kọwaa, “ọ lara ma jiri ọsọ ọsọ” mee ihe ọ na-aghaghị ime iji zụta nkume pel ahụ? Ee. Ihe ha hụrụ ma nụ akpaliela obi ha. Ha ghọtara na oge eruola ka ha mee ihe. N’ihi ya, dị ka ihe ndekọ ndị ahụ si gwa anyị, n’egbughị oge ọ bụla, ha hapụrụ ihe nile ma ghọọ ụmụazụ Jizọs.
12, 13. (a) Olee otú ọtụtụ n’ime ndị nụrụ ihe Jizọs kwuru si meghachi omume? (b) Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, gịnịkwa ka okwu ya gosiri?
12 Lee ka ndị a kwesịrị ntụkwasị obi si dị iche n’ebe ụfọdụ ndị ọzọ nọ, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha ka e mesịrị n’Oziọma anọ ndị ahụ! Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Jizọs gwọrọ ọrịa ma ọ bụ nye nri, ma ha nọgidere n’ọrụ nke aka ha. (Luk 17:17, 18; Jọn 6:26) Ụfọdụ rịọrọ ọbụna ka a hapụ ha mgbe Jizọs kpọrọ ha ịghọ ụmụazụ ya. (Luk 9:59-62) N’ụzọ dị nnọọ iche, Jizọs mesịrị kwuo banyere ndị nke kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Malite n’ụbọchị Jọn Onye Na-eme Baptizim ruo ugbu a, alaeze nke eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ nke ụmụ mmadụ na-achụsosi ike, ndị sikwara ọnwụ na-achọ ya na-enweta ya.”—Matiu 11:12.
13 Ihe a “na-achụsosi ike” na ihe a ‘na-esiri ọnwụ’—gịnị ka okwu ndị a na-egosi? Banyere ngwaa Grik nke e si na ya nweta okwu ndị a, Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words na-ekwu, sị: “Ngwaa ahụ na-enye echiche nke itinye mgbalị siri ike.” Banyekwara amaokwu a, ọkà mmụta Bible bụ́ Heinrich Meyer na-ekwu, sị: “Ọ bụ otú a ka e si kọwaa mgbalị na ndọga siri ike a na-eme maka alaeze Mezaịa ahụ na-eru nso . . . A na-enwe oké mmasị na ịnụ ọkụ n’obi n’ihe ndị metụtara alaeze ahụ (ọ bụghịzi iji nwayọọ na-atụ anya ya).” Dị ka onye ahịa ahụ, mmadụ ole na ole a ghọtara ihe dị oké ọnụ ahịa n’ezie ozugbo, ha jikwa obi ha nile hapụ ihe nile ha nwere n’ihi Alaeze ahụ.—Matiu 19:27, 28; Ndị Filipaị 3:8.
Ndị Ọzọ Sonyere n’Ịchọ Ya
14. Olee otú Jizọs si kwadebe ndịozi ya maka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, gịnịkwa si na ya pụta?
14 Ka Jizọs nọgidere na-eje ozi ya, ọ zụrụ ma nyere ndị ọzọ aka iru eru maka Alaeze ahụ. O bu ụzọ họpụta mmadụ 12 n’etiti ndị na-eso ụzọ ya ma kpọọ ha ndịozi, ma ọ bụ ndị o zipụrụ. Jizọs nyere ndị a ntụziaka zuru ezu banyere otú ha ga-esi jee ozi ha, dọọkwa ha aka ná ntị banyere ihe ịma aka na ihe isi ike ndị ha ga-ezute. (Matiu 10:1-42; Luk 6:12-16) Ruo ihe dị ka afọ abụọ, ha sonyeere Jizọs na njem nkwusa ya n’ala ahụ nile, soro ya kpachie anya. Ha nụrụ ihe ndị o kwuru, hụ ọrụ ndị dị ike ọ rụrụ, hụkwa ihe nlereanya ya. (Matiu 13:16, 17) Obi abụọ adịghị ya na ihe a nile metụrụ ha n’ahụ́ nke ukwuu nke na, dị ka onye ahịa ahụ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi na obi ha nile chụsoo Alaeze ahụ.
15. Gịnị ka Jizọs kwuru bụ́ isi ihe mere ụmụazụ ya ga-eji ṅụrịa ọṅụ?
15 Tụkwasị ná ndịozi 12 ahụ, Jizọs Luk 10:1-12) Mgbe mmadụ 70 ahụ laghachiri, ha ji oké ọṅụ kọọrọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a na-edo ọbụna ndị mmụọ ọjọọ n’okpuru anyị site n’iji aha gị eme ihe.” Ma, ikekwe n’ụzọ tụrụ ha n’anya, Jizọs kpugheere ha na ọbụna ọṅụ ka ukwuu na-echere ha n’ihi ịnụ ọkụ n’obi ha nwere maka Alaeze ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Unu aṅụrịla ọṅụ n’ihi nke a, na a na-eme ka mmụọ dị iche iche nọrọ n’okpuru unu, kama ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha unu n’eluigwe.”—Luk 10:17, 20.
“họpụtara mmadụ iri asaa ọzọ ma zipụ ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo na n’ebe ọ bụla nke ya onwe ya gaje ịbịa.” Ọ gwakwara ha banyere ule na ihe isi ike ndị ha ga-ezute ma nye ha ntụziaka ka ha na-agwa ndị mmadụ, sị: “Alaeze Chineke abịaruwo unu nso.” (16, 17. (a) Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi n’abalị ikpeazụ ya na ha nọrọ? (b) Olee ọṅụ na mmesi obi ike okwu Jizọs wetaara ndịozi ahụ?
16 Ka e mesịrị, n’abalị ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ, na Naịsan 14, 33 O.A., o guzobere ihe e mesịrị mara dị ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma nye ha iwu ịdị na-echeta ihe omume ahụ. N’abalị ahụ, Jizọs gwara ndịozi 11 fọdụrụnụ, sị: “Unu bụ ndị rapawooro m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbaworo ndụ, maka alaeze, ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’alaeze m, nọdụkwa n’ocheeze ikpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.”—Luk 22:19, 20, 28-30.
17 Lee ọṅụ na afọ ojuju ndịozi ahụ na-aghaghị inwewo mgbe ha nụrụ okwu Jizọs ndị ahụ! E nyere ha ihe ùgwù kasịnụ mmadụ pụrụ inwe. (Matiu 7:13, 14; 1 Pita 2:9) Dị ka onye ahịa ahụ, ha ahapụla ọtụtụ ihe iji soro Jizọs n’ịchụso Alaeze ahụ. Ugbu a, e mesiri ha obi ike na àjà ndị ha chụrụla alaghị n’iyi.
18. E wezụga ndịozi 11 ahụ, ole ndị ga-emesịkwa soro rite uru n’Alaeze ahụ?
18 Ọ bụghị nanị ndịozi ahụ ha na Jizọs nọ n’abalị ahụ ga-erite uru n’Alaeze ahụ. Ọ bụ uche Jehova na a ga-eme ka ngụkọta nke otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ baa n’ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ dị ka ndị ha na Jizọs Kraịst ga-eso chịa n’ebube Alaeze eluigwe. Ọzọkwa, Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, . . . na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, . . . na-asị: ‘Nzọpụta anyị sitere n’aka Chineke anyị, bụ́ onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, sitekwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.’” Ndị a bụ *—Mkpughe 7:9, 10; 14:1, 4.
ndị Alaeze ahụ ga-achị n’ụwa.19, 20. (a) Ohere dị aṅaa ka ndị nke mba nile nwere? (b) Olee ajụjụ a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Obere oge tupu Jizọs arịgoro eluigwe, o nyere ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi iwu, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:19, 20) N’ihi ya, ndị si ná mba nile ga-aghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Dị nnọọ ka onye ahịa ahụ tụkwasịrị obi na nkume pel ọma ahụ, ndị a kwa—ma hà ga-enweta ụgwọ ọrụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa—ga-atụkwasị obi n’Alaeze ahụ.
20 Okwu Jizọs gosiri na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ga-adịgide ruo ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’ Ya mere n’oge anyị, à ka nwere ndị dị ka onye ahịa ahụ, bụ́ ndị dị njikere ịhapụ ihe nile ha nwere iji chụsoo Alaeze Chineke? A ga-atụle ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Ọ pụrụ ịbụ na Jọn nwa Zebedi sooro Jizọs ma hụ ụfọdụ n’ime ihe ndị o mere mgbe ha na ya zutesịrị nke mbụ, bụ́ nke nyeere ya aka idekọ ha n’ụzọ doro nnọọ anya n’ihe ndekọ Oziọma ya. (Jọn, isi nke 2-5) Otú ọ dị, ọ laghachiri n’ọrụ ezinụlọ ya nke igbu azụ ruo oge ụfọdụ tupu Jizọs akpọọ ya.
^ par. 18 Iji nwetakwuo nkọwa zuru ezu, lee isi nke 10 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Gịnị bụ isi ihe dị n’ilu Jizọs banyere onye ahịa na-achọ nkume pel?
• Olee otú Jizọs si gosi na ya lere nnọọ Alaeze ahụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa?
• Gịnị mere Andru, Pita, Jọn na ndị ọzọ ji za òkù Jizọs ozugbo?
• Olee ohere magburu onwe ya na-echere ndị nke mba nile?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 10]
‘Ha gbahapụrụ ihe nile ma soro Jizọs’
[Foto dị na peeji nke 12]
Tupu Jizọs arịgoro eluigwe, o nyere ụmụazụ ya iwu ime ndị na-eso ụzọ