Eziokwu ahụ Ọ̀ Na-amịpụta Mkpụrụ n’Ime Ndị Ị Na-ezi Ihe?
Eziokwu ahụ Ọ̀ Na-amịpụta Mkpụrụ n’Ime Ndị Ị Na-ezi Ihe?
MGBE Eric na-eto eto kwuru na ya achọghịzi ka a mara ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ndị mụrụ ya nwere mwute dị ukwuu. Ha ahụghị mgbe nke a malitere. Dị ka nwatakịrị, Eric na-esonye n’ọmụmụ Bible ezinụlọ ha, na-aga nzukọ Ndị Kraịst ma na-eso ọgbakọ arụ ọrụ nkwusa. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, o yiri ka ọ̀ nọ n’eziokwu. Ma ugbu a ọ hapụrụ ụlọ, ndị mụrụ ya ghọtara na eziokwu Bible agbanyeghị mkpọrọgwụ n’ime ya. Ịmata nke a wụrụ ha akpata oyi ma wetara ha nkụda mmụọ.
Ndị ọzọ enwewo mmetụta dị otú ahụ nke ịbụ ndị ihe funahụrụ mgbe onye ha na-amụrụ Bible kwụsịrị ịmụ ihe mgbe ha na-atụghị anya ya. N’oge ndị dị otú ahụ, ndị mmadụ na-ajụkarị onwe ha, sị, ‘Gịnị mere na achọpụtaghị m mgbe nke a chọrọ ime?’ Ò kwere omume ịchọpụta ma eziokwu ahụ ọ̀ na-amịpụta mkpụrụ n’ime ndị anyị na-ezi ihe tupu ha enwee ọdachi n’ụzọ ime mmụọ? N’ezie, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na eziokwu ahụ na-arụ ọrụ n’ime anyị nakwa n’ime ndị anyị na-ezi ihe? N’ilu ya a maara nke ọma banyere ọgha mkpụrụ, Jizọs tụpenyetụrụ anyị azụ n’ihe banyere azịza nke ajụjụ ndị a.
Eziokwu ahụ Aghaghị Iru n’Obi
“Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke,” ka Jizọs kwuru. “Ma ndị ahụ [a kụrụ] n’ezi ala, ndị a bụ ndị, mgbe ha jisịworo ezi obi nke dị mma nụrụ okwu ahụ, na-ejigide ya, na-ejikwa ntachi obi amị mkpụrụ.” (Luk 8:11, 15) Ya mere, tupu eziokwu Alaeze ahụ enwee ike ịrụpụta ihe n’ime ndị anyị na-amụrụ ihe, ọ ghaghị ịgbanye mkpọrọgwụ n’ime obi ihe atụ ha. Jizọs mesiri anyị obi ike na dị ka ezi mkpụrụ dara n’ezi ala, ozugbo eziokwu Chineke ruru n’ezi obi, ọ na-amalite ozugbo ịrụ ọrụ na ịmị mkpụrụ. Gịnị ka anyị kwesịrị ịchọ ịhụ?
Anyị aghaghị ịmata ọnọdụ obi, ọ bụghị nanị ihe mmadụ bụ n’elu ahụ́. Nanị ịgbasochi ihe ndị metụtara okpukpe anya adịghị ekpughe mgbe nile ihe dị n’obi mmadụ. (Jeremaịa 17:9, 10; Matiu 15:7-9) Ọ dị anyị mkpa ilebakwu anya n’ime. E kwesịrị inwe mgbanwe pụtara ìhè n’ọchịchọ, ebumnobi na n’ihe ndị onye ahụ na-ebute ụzọ ná ndụ. Onye ahụ kwesịrị ịdị na-azụlite ụdị mmadụ ọhụrụ, bụ́ nke dị ka uche Chineke si chọọ. (Ndị Efesọs 4:20-24) Iji maa atụ: Mgbe ndị Tesalonaịka nụrụ ozi ọma ahụ, Pọl kwuru na ha ji ọchịchọ obi nara ya dị ka okwu Chineke. Ma, ọ bụ ntachi obi, ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya ha ji sochie ya mere ka o kweta na eziokwu ahụ “na-arụkwa ọrụ n’ime [ha].”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13, 14; 3:6.
N’ezie, ihe ọ bụla dị n’obi onye a na-amụrụ ihe ga-emesịrịrị pụta ìhè n’àgwà ya, dị ka ihe atụ Eric na-egosi. (Mak 7:21, 22; Jems 1:14, 15) N’ụzọ dị mwute, mgbe àgwà ọjọọ ụfọdụ pụtara ìhè nke ọma n’omume mmadụ, oge pụrụ ịgafela ịgbazi ya. Mgbe ahụ, ihe ịma aka na-eche anyị ihu bụ ịgbalị ịchọpụta adịghị ike ndị ahụ tupu ha aghọọ ihe mkpọbi ụkwụ ime mmụọ. Anyị ga-achọ ụzọ isi na-eleba anya n’obi ihe atụ. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?
Mụta Ihe n’Aka Jizọs
N’ezie, Jizọs nwere ikike ịma ihe dị n’obi mmadụ n’ehieghị ụzọ. (Matiu 12:25) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ime nke ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, o gosiri anyị na anyị onwe anyị kwa pụrụ ịmata ihe bụ́ ọchịchọ, ebumnobi na ihe ndị mmadụ na-ebute ụzọ ná ndụ. Dị nnọọ ka onye dọkịta maara ọrụ ya na-eji ụzọ dị iche iche achọpụta ihe bụ nsogbu nke obi onye ọrịa, Jizọs ji Okwu Chineke mee ihe iji ‘dọpụta’ ma gbaa “echiche na ebumnuche nke obi” n’anwụ, ọbụna mgbe ha na-apụtabeghị ìhè.—Ilu 20:5; Ndị Hibru 4:12.
Dị ka ihe atụ, n’otu oge, Jizọs nyeere Pita aka ịmata otu adịghị ike nke mesịrị ghọọ ihe mkpọbi ụkwụ. Jizọs maara na Pita hụrụ ya n’anya. N’ezie, Jizọs ka nyefesịrị Pita “mkpịsị ugodi nke alaeze.” (Matiu 16:13-19) Otú ọ dị, Jizọs makwaara na anya Setan dị n’ahụ́ ndịozi ya. N’ọdịnihu, ha ga-enweta nrụgide siri ike pụrụ ime ka ha gbahapụ okwukwe ha. O doro anya na Jizọs ghọtara na okwukwe nke ndị na-eso ụzọ ya esighị ike. Ya mere, ọ laghị azụ n’ịgwa ha ebe ọ dị mkpa ka ha rụkwuo ọrụ. Tụlee otú o si welite isiokwu ahụ.
Matiu 16:21 na-ekwu, sị: ‘Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, Jizọs Kraịst bidoro igosi ndị na-eso ụzọ ya na ya aghaghị ịta ọtụtụ ahụhụ, e gbuokwa ya.’ Rịba ama na Jizọs gosiri ha, ọ bụghị nanị ịgwa ha, ihe ga-eme ya. O yikarịrị ka o ji amaokwu Bible ndị dị ka Abụ Ọma 22:14-18 ma ọ bụ Aịsaịa 53:10-12 mee ihe, bụ́ ndị na-egosi na Mezaịa ahụ aghaghị ịta ahụhụ ma nwụọ. N’agbanyeghị nke ọ bụla ọ bụ, site n’ịgụ ma ọ bụ ihota ihe kpọmkwem site n’Akwụkwọ Nsọ, Jizọs nyere Pita na ndị ọzọ ohere ịzaghachi site n’obi ha. Olee otú ha ga-esi meghachi omume n’echiche bụ́ na a ga-akpagbu ya?
N’ụzọ na-atụ n’anya, n’agbanyeghị otú Pita siworo gosi na obi kara ya nakwa na ya na-anụ ọkụ n’obi, nzaghachi ya n’oge a gosipụtara na echiche ya hiere ụzọ. “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị,” ka o kwuru, “ihe a agaghị eme gị ma ọlị.” Echiche Pita hiere nnọọ ụzọ n’ihi na, dị ka Jizọs mere ka ọ pụta ìhè, ihe ọ nọ na-eche “abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ”—nnukwu adịghị ike nke pụrụ ịrụpụta ihe dị njọ. Gịnị ka Jizọs meziri? Mgbe ọ basịịrị Pita mba, Jizọs gwara ya na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” N’ikwu ihe dabeere n’Abụ Ọma 49:8 na 62:12, o ji obiọma chetara ha na atụmanya ebighị ebi ha na-adabere ọ bụghị ná mmadụ, bụ́ ndị na-agaghị eweta nzọpụta, kama na Chineke.—Matiu 16:22-28.
Ọ bụ ezie na Pita mesịrị tụọ ụjọ nwa oge ma gọnahụ Jizọs ugboro atọ, obi abụọ adịghị ya na mkparịta ụka a na ndị ọzọ nyeere ya aka ịgbake ngwa ngwa n’ụzọ ime mmụọ. (Jọn 21:15-19) Nanị ụbọchị 50 ka e mesịrị, Pita ji obi ike guzoro n’ihu ìgwè mmadụ nọ na Jeruselem iji gbaa akaebe nye mbilite n’ọnwụ Jizọs. N’ime izu, ọnwa, na afọ ndị sochirinụ, o jiri obi ike chee nnwụchi, iti ihe, na ịtụ mkpọrọ ihu ugboro ugboro, si otú ahụ na-esetịpụ ihe nlereanya nke iguzosi ike n’ezi ihe n’atụghị egwu.—Ọrụ 2:14-36; 4:18-21; 5:29-32, 40-42; 12:3-5.
Gịnị ka anyị na-amụta na nke a? Ị̀ pụrụ ịhụ ihe Jizọs mere iji dọpụta ma gbaa ihe dị n’obi Pita n’anwụ? Nke mbụ, ọ họọrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị ekwesị iji mee ka Pita lekwasị anya n’ebe ndị chọrọ nnọọ nlebara anya. Ọzọkwa, o nyere Pita ohere ịzaghachi site n’obi ya. N’ikpeazụ, o nyekwuru ndụmọdụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ iji nyere Pita aka ịgbazi
echiche na mmetụta ya. Ị pụrụ iche na nkà izi ihe a karịrị gị, ma ka anyị tụlee ahụmahụ abụọ bụ́ ndị na-egosi otú nkwadebe na ndabere n’ebe Jehova nọ pụrụ isi nyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịgbaso ihe nlereanya Jizọs.Ịdọpụta Ihe Dị n’Obi
Mgbe otu nna bụ́ Onye Kraịst matara na ụmụ ya nwoke abụọ bụ́ ndị nọ na klas nke mbụ na nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị weere swiiti n’elu tebụl onye nkụzi, ọ nọwara ha ọdụ ma soro ha tụgharịa uche. Kama ileghara nke a anya dị ka ihe na-enweghị ihe o mere na iberibe ụmụaka, nna ha na-akọ, sị, “Agbalịrị m ịdọpụta n’obi ụmụaka ahụ ihe kpaliri ha ịkpa àgwà ọjọọ a.”
Nna ha gwara ụmụaka ahụ ka ha cheta ihe mere Ekan, dị ka e dekọrọ na Joshua isi 7. Ụmụaka ahụ ghọtara nke ahụ ozugbo ma kweta ihe ọjọọ ahụ ha mere. Akọ na uche ha anọworị na-enye ha nsogbu. Ya mere, nna ha gwara ha ka ha gụọ Ndị Efesọs 4:28, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike . . . ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.” Ime ka ụmụaka ahụ kwụọ ụgwọ swiiti ahụ site n’ịzụta swiiti ọzọ na iwegara ya onye nkụzi ahụ mesikwuru ndụmọdụ ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ o nyere ha ike.
“Anyị na-agbalị iwepụ ebumnobi ọjọọ ọ bụla ozugbo anyị chọpụtara ha,” ka nna ha na-ekwu, “ma jiri ezi ebumnobi dochie ha site n’isoro ụmụ anyị tụgharịa uche.” Site n’iṅomi Jizọs mgbe ha na-ezi ụmụ ha ihe, ndị nne na nna a rụpụtara ezi ihe n’ezie. E mesịrị kpọọ ụmụaka abụọ ahụ ịrụ ọrụ na Betel n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, bụ́ ebe otu n’ime ha ka na-eje ozi afọ 25 ka ihe ahụ mesịrị.
Tụlee otú Onye Kraịst ọzọ si nyere onye ọ na-amụrụ Bible aka. Onye ahụ ọ na-amụrụ ihe na-abịa nzukọ ma na-ekere òkè n’ozi, o kwupụtakwala ọchịchọ ya ka e mee ya baptizim. Otú ọ dị, o yiri ka ọ̀ na-adabere nnọọ n’onwe ya kama ịdabere na Jehova. “Dị ka nwanyị na-alụbeghị di, ọ na-adaberezi nnọọ n’onwe ya karịa ka o chere,” ka Onyeàmà ahụ na-echeta. “Enwere m nchegbu na ọ na-aga inwe ọrịa mkpaghasị uche ma ọ bụ ọdachi ime mmụọ.”
Ya mere, Onyeàmà ahụ butere ụzọ n’iso onye ahụ ọ na-amụrụ ihe tụgharịa uche na Matiu 6:33, na-agba ya ume ịgbanwe ihe ndị ọ na-ebute ụzọ ná ndụ, itinye Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ, na inwe ntụkwasị obi na Jehova ga-eme ihe ga-akasị baara ya uru. Ọ jụrụ ya n’ezoghị ọnụ, sị: “Ibi nanị gị ọ̀ na-eme mgbe ụfọdụ ka o siere gị ike ịdabere n’ebe ndị ọzọ nọ, gụnyere Jehova?” Onye ahụ ọ na-amụrụ ihe kwetara na ọ fọrọ nke nta ka ya kwụsị ikpe ekpere. Onye nkwusa ahụ gbaziri ya ume ịgbaso ndụmọdụ dị n’Abụ Ọma 55:22 ma tụkwasị Jehova ibu ya n’ihi na dị ka 1 Pita 5:7 na-emesi anyị obi ike, ‘ọ na-eche banyere anyị.’ Okwu ndị a metụrụ ya n’obi. Onyeàmà ahụ na-ekwu, sị, “Nke ahụ bụ otu n’ime ugboro ole na ole m hụrụ ka o bere ákwá.”
Mee Ka Eziokwu ahụ Nọgide Na-arụ Ọrụ n’Ime Gị
Ịhụ ka ndị anyị na-ezi ihe na-eme ihe ndị kwekọrọ n’eziokwu Bible na-ewetara anyị ọṅụ dị ukwuu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na mgbalị anyị inyere ndị ọzọ aka ga-enwe ihe ịga nke ọma, anyị ga-esetịpụ ezigbo ihe nlereanya n’onwe anyị. (Jud 22, 23) Ọ dị anyị nile mkpa ‘ịnọgide jiri egwu na ịma jijiji na-arụpụta nzọpụta nke onwe anyị.’ (Ndị Filipaị 2:12) Nke ahụ na-agụnye ikwe ka ìhè nke Akwụkwọ Nsọ na-enwu n’ime obi anyị mgbe nile, na-achọ àgwà, ọchịchọ, na mmetụta ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka a rụkwuo ọrụ na ha.—2 Pita 1:19.
Dị ka ihe atụ, ịnụ ọkụ n’obi gị maka ihe omume Ndị Kraịst ò belatala n’oge na-adịbeghị anya? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị kpatara ya? Otu ihe pụrụ ịkpata ya bụ na ị na-adabere n’onwe gị n’ụzọ gabigara ókè. Olee otú ị pụrụ isi chọpụta ma ọ̀ dị otú ahụ? Gụọ Hagaị 1:2-11 ma jiri ezi obi tụgharịa uche n’otú Jehova si soro ndị Juu si mba ọzọ lọta tụgharịa uche. Jụzie onwe gị, sị: ‘Àna m echegbubiga onwe m ókè banyere ịkpakọba akụ̀ na ụba na ihe onwunwe? M̀ tụkwasịrị Jehova obi n’ezie na ọ ga-elekọta ezinụlọ m ma ọ bụrụ na m ebute ihe ime mmụọ ụzọ? Ka m̀ na-eche na m ga-ebugodị ụzọ lekọta onwe m?’ Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i meziwanye ụzọ isi eche echiche na mmetụta ndị ị na-enwe, alala azụ ime ha. Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, ndị dị ka ndị dị na Matiu 6:25-33, Luk 12:13-21 na 1 Timoti 6:6-12, na-eme ka anyị nwee echiche ziri ezi banyere mkpa anụ ahụ́ na nke ihe onwunwe, bụ́ nke na-eme ka anyị nọgide na-enweta ngọzi Jehova.—Malakaị 3:10.
Mmadụ isi otú a jiri ezi obi nyochaa onwe ya pụrụ ịkpali ya iche echiche. Ịnakwere adịghị ike ụfọdụ mgbe e mere ka anyị mara ha pụrụ isiri anyị nnọọ ike, mgbe i butere ụzọ n’inyere nwa gị, onye ị na-amụrụ Bible, ma ọ bụ ọbụna onwe gị aka n’ụzọ ịhụnanya—n’agbanyeghị otú o si bụrụ n’okwu dịịrị onwe onye ma ọ bụ nke chọrọ nlezianya—ọ pụrụ ịbụ na ị na-ebute ụzọ n’ịzọpụta ndụ ya ma ọ bụ nke gị.—Ndị Galeshia 6:1.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mgbalị gị arụpụtaghị ezi ihe? Adala mbà ngwa ngwa. Ịgbazi obi mmadụ na-ezughị okè pụrụ ịchọ nlezianya, na-ewe oge, ma na-agbakasị ahụ́ mgbe ụfọdụ. Ma, ọ pụkwara ịbụ ihe na-akwụghachi ụgwọ.
Eric na-eto eto, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, mesịrị mata onwe ya ma maliteghachi ‘ijegharị n’eziokwu ahụ.’ (2 Jọn 4) “Ọ bụ nnọọ mgbe m ghọtara ihe funahụrụ m ka m laghachikwuuru Jehova,” ka ọ na-ekwu. Site n’enyemaka nke nne na nna ya, Eric ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi ugbu a. Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ọ na-anabataghị mgbalị ndị mụrụ ya mere ugboro ugboro iji nyere ya aka inyocha obi ya, ugbu a o nwere ekele dị ukwuu maka ihe ha mere. “Ndị mụrụ m enweghị atụ,” ka ọ na-ekwu. “Ọ dịtụghị mgbe ha kwụsịrị ịhụ m n’anya.”
Ime ka ìhè nke Okwu Chineke na-enwu n’obi ndị anyị na-ezi ihe bụ ihe na-egosipụta obi ebere. (Abụ Ọma 141:5) Nọgide na-enyocha obi ụmụ gị na nke ndị ị na-amụrụ Bible iji hụ na àgwà ọhụrụ nke Ndị Kraịst na-agbanye mkpọrọgwụ n’ezie n’ime ha. Na-eme ka eziokwu ahụ na-arụ ọrụ n’ime ndị ọzọ nakwa n’ime gị onwe gị site ‘n’ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’—2 Timoti 2:15.
[Foto dị na peeji nke 29]
Okwu Jizọs kpughere adịghị ike Pita
[Foto dị na peeji nke 31]
Na-eji Bible eme ihe iji dọpụta ihe dị n’ime obi