Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Nile

Jehova Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Nile

Jehova Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Nile

“Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ Ya nile.”—ABỤ ỌMA 145:17.

1. Olee otú ị na-esi emeghachi omume mgbe mmadụ kwubiri ihe na-ezighị ezi banyere gị, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ dị otú ahụ?

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe mmadụ kwubiri ihe na-ezighị ezi banyere gị, ikekwe na-enyo omume ma ọ bụ ebumnobi gị enyo, n’amaghị ihe nile banyere gị? Ya bụrụ otú ahụ, o yikarịrị ka iwe ò were gị—a pụkwara ịghọta ihe mere i ji wee iwe. Anyị pụrụ isi na nke a mụta otu ihe dị mkpa: Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịghara iru ná nkwubi okwu ngwa ngwa mgbe anyị na-amaghị ihe nile merenụ.

2, 3. Olee otú ụfọdụ ndị si emeghachi omume n’ihe ndekọ Bible ndị na-enweghị ihe ndekọ zuru ezu iji zaa ajụjụ ha nile, ma n’agbanyeghị nke ahụ, gịnị ka Bible na-agwa anyị banyere Jehova?

2 Anyị kwesịrị iburu ihe mmụta a n’obi mgbe a bịara n’ikwubi ihe banyere Jehova Chineke. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nwere ụfọdụ ihe ndekọ Bible ndị pụrụ iyi ka hà na-agbagwoju anyị anya mgbe mbụ anyị gụrụ ha. Ọ pụrụ ịbụ na ihe ndekọ ndị a—ikekwe ndị na-ekwu banyere ihe ndị na-efe Chineke ofufe mere ma ọ bụ banyere ikpe ndị Chineke kpere n’oge gara aga—enweghị akụkọ zuru ezu iji zaa ajụjụ anyị nile. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ na-akatọ ihe ndekọ ndị dị otú ahụ, ọbụna na-eche ma Chineke ọ̀ bụkwa onye ezi omume na onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Ma Bible na-agwa anyị na “onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ Ya nile.” (Abụ Ọma 145:17) Okwu ya na-emesikwa anyị obi ike na ọ ‘dịghị emebi iwu.’ (Job 34:12; Abụ Ọma 37:28) Chezienụ otú obi ga-adị ya mgbe ndị ọzọ kwubiri ihe ndị na-ezighị ezi banyere ya!

3 Ka anyị tụlee ihe ise mere anyị kwesịrị iji nakwere ikpe Jehova. Mgbe ahụ, n’iburu ihe ndị ahụ n’uche, anyị ga-atụle ihe ndekọ Bible abụọ ndị pụrụ isiri ụfọdụ ndị ike nghọta.

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Nakwere Ikpe Jehova?

4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji dị umeala n’obi mgbe anyị na-atụle ihe ndị Chineke mere? Nye ihe atụ.

4 Nke mbụ, ebe ọ bụ na Jehova maara ihe nile metụtara okwu ahụ ma anyị amaghị ha, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi mgbe anyị na-atụle ihe ndị Chineke mere. Iji maa atụ: Ka e were ya na otu ọkàikpe nke a maara dị ka onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebiri otu ikpe n’ụlọikpe. Gịnị ka ị ga-eche ma ọ bụrụ na onye na-amaghị ihe nile banyere ikpe ahụ, nke na-aghọtaghịkwa iwu ndị e mebiri, amalite ịkatọ mkpebi ikpe ọkàikpe ahụ? Ọ ga-abụ ihe nzuzu ma ọ bụrụ na mmadụ akatọwa otu ihe n’ebughị ụzọ mata ihe nile metụtara ya. (Ilu 18:13) Leenụ otú ọ ga-esi bụrụ nzuzu karị bụ́ ụmụ mmadụ nkịtị ịkatọ “Onyeikpe ụwa nile”!—Jenesis 18:25.

5. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ichefu mgbe anyị na-agụ ihe ndekọ Bible banyere ikpe ndị Chineke kpere mmadụ ụfọdụ?

5 Ihe nke abụọ mere anyị kwesịrị iji nakwere ikpe Chineke bụ na, n’adịghị ka mmadụ, Chineke pụrụ inyocha obi. (1 Samuel 16:7) Okwu ya na-ekwu, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, na-enyocha obi, na-anwa akụrụ, ọbụna inye onye ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị, dị ka mkpụrụ nke omume ya nile si dị.” (Jeremaịa 17:10) N’ihi ya, mgbe anyị na-agụ ihe ndekọ Bible banyere ikpe Chineke kpere mmadụ ụfọdụ, ka anyị ghara ichefu na anya ya nke na-ahụ ihe nile hụrụ echiche, ebumnobi na ọchịchọ ndị zoro ezo bụ́ ndị a na-edekọghị n’Okwu ya.—1 Ihe E Mere 28:9.

6, 7. (a) Olee otú Jehova sirila gosi na ya na-agbasosi ụkpụrụ ikpe ziri ezi na ezi omume ya ike ọbụna ma a sị na ọ ga-efu ya oké ihe? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na o nwere ihe anyị gụtara na Bible nke na-eme ka anyị nwee obi abụọ ma Chineke ò mere ihe n’ikpe ziri ezi ma ọ bụ n’ezi omume?

6 Rịba ama ihe nke atọ mere e kwesịrị iji nakwere ikpe Jehova: Ọ na-agbaso ụkpụrụ ezi omume ya ọbụna ma a sị na ọ ga-efu ya oké ihe. Tụlee otu ihe atụ. Site n’inye Ọkpara ya dị ka ihe mgbapụta iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ná mmehie na ọnwụ, Jehova mere ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ikpe ziri ezi na ezi omume ya. (Ndị Rom 5:18, 19) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ga-abụrịrị na o wutere Jehova nke ukwuu ịhụ ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya tara ahụhụ ma mesịa nwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ. Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere Chineke? Banyere ‘ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ,’ Bible na-ekwu, sị: “Nke a bụ iji wee gosi ezi omume nke [Chineke].” (Ndị Rom 3:24-26) Nsụgharị ọzọ nke Ndị Rom 3:25 na-agụ, sị: “Nke a gosiri na Chineke na-eme ihe ziri ezi na ihe dị mma mgbe nile.” (New Century Version) Ee, ókè Jehova dịruru njikere ime ihe iji nye ihe mgbapụta ahụ na-egosi na ọ na-eji nnọọ “ihe ziri ezi na ihe dị mma” akpọrọ ihe.

7 Ya mere, ọ bụrụ na o nwere ihe anyị gụtara na Bible nke mere ka ụfọdụ nwewe obi abụọ ma Chineke ò mere ihe n’ikpe ziri ezi ma ọ bụ n’ezi omume, anyị kwesịrị icheta nke a: N’ihi ịgbasosi ụkpụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi ya ike, Jehova azọghị Ọkpara ya ka ọ ghara ịnwụ ọnwụ ahụhụ. Ọ̀ ga-ahapụ ụkpụrụ ndị ahụ n’ihe ndị ọzọ? Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova adịtụghị emebi ụkpụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi ya. N’ihi ya, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na ọ na-eme ihe ziri ezi na ihe dị mma mgbe nile.—Job 37:23.

8. Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ ihe na-ekwekọghị ekwekọ ụmụ mmadụ iche na Jehova enwechaghị àgwà ikpe ziri ezi na ezi omume?

8 Tụlee ihe nke anọ mere anyị kwesịrị iji nakwere ikpe Jehova: Jehova mere mmadụ n’onyinyo Ya. (Jenesis 1:27) N’ihi ya, e nyere ụmụ mmadụ àgwà ndị yiri nke Chineke, gụnyere echiche nke ikpe ziri ezi na ezi omume. Ọ ga-abụ ihe na-ekwekọghị ekwekọ ma ọ bụrụ na echiche anyị nke ikpe ziri ezi na ezi omume emee ka anyị chee na Jehova enwechaghị àgwà ndị ahụ. Ọ bụrụ na otu ihe a kọrọ na Bible na-enye anyị nsogbu n’obi, anyị kwesịrị icheta na n’ihi mmehie anyị ketara eketa, echiche anyị nke ikpe ziri ezi na ezi omume ezughị okè. Jehova Chineke, bụ́ onye e mere anyị n’onyinyo ya, zuru okè n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume. (Deuterọnọmi 32:4) Ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ọbụna iche na ụmụ mmadụ pụrụ ịdị na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume karịa Chineke!—Ndị Rom 3:4, 5; 9:14.

9, 10. Gịnị mere na iwu ejighị Jehova ịkọwara ma ọ bụ igosi ụmụ mmadụ na ihe o mere ziri ezi?

9 Ihe nke ise mere anyị kwesịrị iji nakwere ikpe Jehova bụ na ọ bụ “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) N’ihi ya, iwu ejighị ya ịkọwara ma ọ bụ igosi ụmụ mmadụ na ihe o mere ziri ezi. Ọ bụ Ọkpụite Ukwu, anyị dịkwa ka arịa ndị o ji ụrọ kpụọ iji anyị mee ihe masịrị ya. (Ndị Rom 9:19-21) Dị ka ite ndị o ji aka ya kpụọ, olee ndị anyị bụ ịgbaghawa mkpebi ya na ihe ndị o mere? Mgbe nna ochie ahụ bụ́ Job ghọtahiere otú Chineke si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe, Jehova gbaziri ya site n’ịjụ ya, sị: “Ị̀ na-emebikwa ikpe m? Ị̀ na-ama m ikpe, ka i wee bụrụ onye ezi omume?” N’ịghọta na ya kwuru okwu n’enweghị nghọta, Job mesịrị chegharịa. (Job 40:8; 42:6) Ka anyị ghara ịkatọ Chineke mgbe ọ bụla!

10 N’ụzọ doro anya, anyị nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji kwere na Jehova na-eme ihe ziri ezi mgbe nile. Dabere n’ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịghọta ụzọ Jehova, ka anyị tụlee ihe ndekọ Bible abụọ nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike nghọta. Nke mbụ bụ ihe otu onye na-efe Chineke mere, nke ọzọkwa bụ ikpe Chineke kpere n’onwe ya.

Gịnị Mere Lọt Ji Kwuo Ka Ya Kpọnye Ìgwè Iwe Ji Ụmụ Ya Nwanyị?

11, 12. (a) Kọọ ihe merenụ mgbe Chineke zigara mmụọ ozi abụọ nwoghara enwogha na Sọdọm. (b) Olee ajụjụ ndị ihe ndekọ a kpaliterela n’obi ụfọdụ ndị?

11 Na Jenesis isi 19, anyị na-ahụ ihe ndekọ nke ihe merenụ mgbe Chineke zigara ndị mmụọ ozi abụọ nwoghara enwogha na Sọdọm. Lọt siri ọnwụ na ndị ọbịa ahụ ga-ehi n’ụlọ ya. Otú ọ dị, n’abalị ahụ, otu ìgwè ndị ikom obodo ahụ gbara ụlọ ahụ gburugburu ma kwuo ka a kpọpụtara ha ndị ọbịa ahụ n’èzí ka ha mesoo ha omume rụrụ arụ. Lọt gbalịrị iso ìgwè ahụ tụgharịa uche ma ha ekweghị. N’ịchọ ichebe ndị ọbịa ya, Lọt kwuru, sị: “Biko, ụmụnne m, unu emela ihe ọjọọ. Biko, lee, enwere m ụmụ ndị inyom abụọ ndị aka-amaghị ahụ́ nwoke: biko, ka m kupụtara unu ha, meekwanụ ha dị ka ọ dị mma n’anya unu: nanị unu emela ndị ikom ahụ ihe; n’ihi na ọ bụ n’ihi nke a ka ha bịara n’okpuru ndò nke ụlọ m.” Ìgwè ahụ egeghị ya ntị, ọ fọkwara ntakịrị ka ha kụwaa ibo ụzọ ya. N’ikpeazụ, ndị ọbịa ahụ bụ́ ndị mmụọ ozi kụrụ ìgwè ahụ ara na-agba ìsì.—Jenesis 19:1-11.

12 N’ụzọ kwere nghọta, ihe ndekọ a akpalitela ọtụtụ ajụjụ n’obi ụfọdụ ndị. Ha na-eche, sị: ‘Olee otú Lọt ga-esi chọọ ichebe ndị ọbịa ya site n’ịgwa ìgwè ara agụụ mmekọahụ na-agba ka ha kpọrọ ụmụ ya nwanyị? Ọ́ bụghị ihe na-ekwesịghị ekwesị ka o mere, ọbụna nke na-egosi na ọ bụ onye ụjọ?’ N’ihi ihe ndekọ a, gịnị mere Chineke ji nye Pita mmụọ ya ịkpọ Lọt “onye ezi omume”? Lọt ò mere ihe Chineke chọrọ? (2 Pita 2:7, 8) Ka anyị tụlee okwu a ka anyị wee ghara iru ná nkwubi okwu na-ezighị ezi.

13, 14. (a) Gịnị ka e kwesịrị ịrịba ama n’ihe ndekọ Bible banyere ihe ndị Lọt mere? (b) Olee ihe na-egosi na Lọt emeghị ihe n’ụjọ?

13 Iji malite, anyị kwesịrị ịrịba ama na kama ịkwado ma ọ bụ ịkatọ ihe Lọt mere, ihe Bible mere bụ nanị ịkọ ihe merenụ. Bible agwaghịkwa anyị ihe Lọt bu n’uche ma ọ bụ ihe kpaliri ya ime ihe o mere. Mgbe ọ bịara ná “mbilite n’ọnwụ nke . . . ndị ezi omume,” eleghị anya, ọ ga-akọwa nke ahụ n’ụzọ zuru ezu.—Ọrụ 24:15.

14 Lọt abụtụghị onye ụjọ. Ọnọdụ ọ nọ na ya tara akpụ. Site n’ikwu na ndị ọbịa ahụ “bịara n’okpuru ndò” nke ụlọ ya, Lọt gosiri na ya chere na iwu ji ya ichebe ha. Ma nke a adịghị mfe. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-akọ na ndị Sọdọm “adịghị ekpe mmadụ ikpe ziri ezi, ha adịghịkwa asọpụrụ Chineke . . . Ha kpọrọ ndị ọbịa asị, na-ejikwa idina ụdị onwe emetọ onwe ha.” N’agbanyeghị nke ahụ, Lọt atụghị ìgwè ọjọọ ahụ ụjọ. Kama nke ahụ, ọ pụkwuuru ha ma soro ndị ikom ahụ iwe ji tụgharịa uche. O ‘mechidịrị ụzọ n’azụ ya.’—Jenesis 19:6.

15. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Lọt ji okwukwe mee ihe?

15 Ụfọdụ pụrụ ịjụ sị, ‘N’agbanyeghị nke ahụ, n’ihi gịnị ka Lọt ga-eji kwuo ka ya nye ìgwè ahụ ụmụ ya nwanyị?’ Kama iche na o bu ihe ọjọọ n’obi, gịnị ma ị tụlee ihe ụfọdụ ọ pụrụ ịbụ ha kpatara nke a? Nke mbụ, ọ pụrụ nnọọ ịbụ na Lọt ji okwukwe mee ihe. N’ụzọ dị aṅaa? Obi abụọ adịghị ya na Lọt maara otú Jehova sirila chebe Sera, nwunye Ebreham, nwanne nna Lọt. Cheta na n’ihi na Sera mara mma nke ukwuu, Ebreham gwara ya ka o kwuo na ya bụ nwanne ya nwoke, ka ndị ọzọ ghara igbu ya iji lụrụ nwunye ya. * N’ihi nke a, e kubara Sera n’ụlọ Fero. Otú ọ dị, Jehova mere ihe ma gbochie Fero imerụ Sera. (Jenesis 12:11-20) Ọ pụrụ ịbụ na Lọt nwere okwukwe na a pụrụ ichebe ụmụ ya nwanyị n’ụzọ yiri nke ahụ. N’ụzọ dị ịrịba ama, site n’aka ndị mmụọ ozi ya, Jehova mere ihe, e chebekwara ụmụ agbọghọ ahụ.

16, 17. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Lọt pụrụ isiwo nwaa ime ka akpata oyi wụọ ndị ikom Sọdọm n’ahụ́ ma ọ bụ megharịa ha anya? (b) N’agbanyeghị ihe bụ́ echiche Lọt, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?

16 Tụlee ihe ọzọ ọ pụrụ ịbụ ya mere Lọt ji mee ihe o mere. Ọ pụkwara ịbụ na Lọt na-achọ ime ka akpata oyi wụọ ndị ikom ahụ n’ahụ́ ma ọ bụ megharịa ha anya. Ọ pụrụ ịbụ na o kweere na ụmụ ya nwanyị agaghị amasị ìgwè ahụ n’ihi na ihe na-agụ ndị Sọdọm ahụ bụ agụụ idina nwoke ibe ha. (Jud 7) Ọzọkwa, ndị ikom obodo ahụ ekweela ụmụ agbọghọ ahụ nkwa ọlụlụ, n’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na ndị ikwu na ibe ndị ahụ na-aga ịghọ ndị ọgọ ya ma ọ bụ ndị ha na ha na-azụkọ ahịa so n’ìgwè ahụ. (Jenesis 19:14) Ọ pụrụ ịbụ na Lọt nwere olileanya na n’ihi njikọ ndị dị otú ahụ, ụfọdụ ndị ikom so n’ìgwè ahụ ga-agbachitere ụmụ ya nwanyị. Ìgwè nke kewara ekewa otú ahụ agatụghị edina ha. *

17 N’agbanyeghị ihe bụ́ echiche na ebumnobi Lọt, anyị pụrụ ijide otu ihe n’aka: Ebe ọ bụ na Jehova na-eme ihe ziri ezi mgbe nile, ọ ga-enwerịrị ezi ihe mere o ji lee Lọt anya dị ka “onye ezi omume.” N’ihi omume nke ìgwè ndị Sọdọm ahụ ara na-agba, ọ̀ dị ihe mere anyị ga-eji nwee obi abụọ ma Jehova ò mere ihe ziri ezi site n’ibibi ndị bi n’ajọ obodo ahụ?—Jenesis 19:23-25.

Gịnị Mere Jehova Ji Tigbuo Ụza?

18. (a) Olee ihe merenụ mgbe Devid nwara ibute Igbe ahụ na Jeruselem? (b) Olee ajụjụ ihe ndekọ a na-ewelite?

18 Ihe ndekọ ọzọ pụrụ isiri ụfọdụ ndị ike nghọta metụtara mgbalị Devid mere ibute igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jeruselem. A dọnyere Igbe ahụ n’ụgbọala, bụ́ nke Ụza na nwanne ya nwoke na-edu. Bible na-ekwu, sị: “Ha wee bịaruo ebe nzọcha ọka Nakọn, Ụza wee setịa aka ya ruo ebe igbe Chineke dị, jide ya; n’ihi na ehi na-agba ụkwụ. Iwe Jehova wee dị ọkụ megide Ụza; Chineke wee tigbuo ya n’ebe ahụ n’ihi mmehie ya; o wee nwụọ n’ebe ahụ n’akụkụ igbe Chineke.” Ọnwa ole na ole ka nke ahụ gasịrị, mgbalị ọzọ e mere gara nke ọma bụ́ mgbe e buru Igbe ahụ n’ụzọ Chineke tụziri site ná ndị Kohat ibu ya n’ubu ha. (2 Samuel 6:6, 7; Ọnụ Ọgụgụ 4:15; 7:9; 1 Ihe E Mere 15:1-14) Ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị: ‘Gịnị mere Jehova ji meghachi omume n’ụzọ siri ike otú ahụ? Nanị ihe Ụza mere bụ ijide Igbe ahụ ka ọ ghara ịda.’ Ka anyị wee ghara iru ná nkwubi okwu na-ezighị ezi, anyị kwesịrị ịtụle ihe ụfọdụ pụrụ inyere anyị aka.

19. Gịnị mere na Jehova agaghị ekpeli ikpe na-ezighị ezi?

19 Ọ dị anyị mkpa icheta na Jehova agaghị ekpeli ikpe na-ezighị ezi. (Job 34:10) Ya ime otú ahụ ga-abụ ihe ịhụnanya na-adịghị na ya, anyị makwaara site n’ọmụmụ Bible anyị nile na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Tụkwasị na nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na “ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ọnọdụ guzosiri ike nke ocheeze [Chineke].” (Abụ Ọma 89:14) Oleezi otú Jehova ga-esi kpee ikpe na-ezighị ezi? Ya bụrụ na o mee otú ahụ, ọ ga na-eleda ntọala nke ọbụbụeze ya anya.

20. Olee ihe ndị mere Ụza kwesịrị ijiwo mara iwu ndị metụtara Igbe ahụ?

20 Cheta na Ụza kwesịrị ịmawo Iwu ahụ nke ọma. Igbe ahụ nọchiri anya ọnụnọ Jehova. Iwu ahụ kwuru hoo haa na ndị a na-enyeghị ikike ime otú ahụ agaghị emetụ ya aka, na-adọ aka ná ntị n’ụzọ doro anya na a ga-egbu ndị dara iwu ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 4:18-20; 7:89) N’ihi ya, ibugharị igbe nsọ ahụ abụghị ọrụ a ga-eji gwurie egwu. Ihe àmà na-egosi na Ụza bụ onye Livaị (ọ bụ ezie na ọ bụghị onye nchụàjà), n’ihi ya, o kwesịrị ịmawo Iwu ahụ nke ọma. E wezụga nke ahụ, ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, e bugara Igbe ahụ n’ụlọ nna ya maka nchebe. (1 Samuel 6:20–7:1) Ọ nọrọ ebe ahụ ruo afọ 70 tupu Devid ekpebie ibupụ ya. Ya mere, site na nwata, o yiri ka Ụza ọ̀ maara iwu ndị metụtara Igbe ahụ.

21. N’ihe metụtara Ụza, gịnị mere o ji dị mkpa icheta na Jehova na-ahụ ọchịchọ nke obi?

21 Dị ka e kwuru ná mmalite, Jehova pụrụ inyocha obi. Ebe ọ bụ na Okwu ya kpọrọ ihe Ụza mere “mmehie,” ọ pụrụ ịbụ na Jehova hụrụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ihe ndekọ ahụ na-ekpughechaghị. Ọ̀ pụrụ ịbụ, ma eleghị anya, na Ụza bụ onye mpako, nke na-emebigakarị ihe ókè? (Ilu 11:2) Ọ̀ ga-abụ na idu Igbe ahụ, nke ezinụlọ ya chekwaworo n’ụlọ ha, n’ihu ọha buru ya isi? (Ilu 8:13) Ọ̀ ga-abụ na Ụza enweghị nnọọ okwukwe nke na o chere na aka Jehova dị mkpụmkpụ nke na ọ gaghị emeli ka Igbe nsọ ahụ, nke na-anọchi anya ọnụnọ Ya, ghara ịda? Ihe ọ bụla ọ bụ, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova mere ihe ziri ezi. O yiri ka ò nwere ihe ọ hụrụ n’obi Ụza mere O ji gbuo ya ozugbo.—Ilu 21:2.

Ezi Ihe Mere A Ga-eji Nwee Obi Ike

22. Olee otú Okwu Jehova ịhapụ ịkọwa ihe nile mgbe ụfọdụ si egosipụta amamihe Ya?

22 Okwu Jehova ịhapụ ịkọwa ihe nile mgbe ụfọdụ na-egosipụta amamihe Ya na-enweghị atụ. N’ụzọ dị otú ahụ, Jehova na-enye anyị ohere igosi na anyị tụkwasịrị ya obi. Site n’ihe anyị tụlerela, ó dobeghị anya na anyị nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji nakwere ikpe Jehova? Ee, mgbe anyị ji ezi obi na obi ghere oghe na-amụ Okwu Chineke, anyị na-amụta nnọọ ọtụtụ ihe banyere Jehova, bụ́ ndị na-eme ka anyị jide n’aka na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume mgbe nile. N’ihi ya, ọ bụrụ na ihe ndekọ Bible ụfọdụ akpalite ajụjụ ndị anyị na-apụghị ịchọta azịza ha doro anya ozugbo, ka anyị nwee obi ike zuru ezu na Jehova mere ihe ziri ezi.

23. Obi ike dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere ihe ndị Jehova ga-eme n’ọdịnihu?

23 Anyị pụrụ inwe obi ike yiri nke ahụ banyere ihe ndị Jehova ga-eme n’ọdịnihu. N’ihi ya, anyị pụrụ jide n’aka na mgbe ọ ga-abịa imezu ihe o kpere n’ikpe n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ, ọ gaghị ‘ekpochapụ ndị ezi omume tinyere ndị na-emebi iwu.’ (Jenesis 18:23) Ịhụnanya o nwere maka ezi omume na ikpe ziri ezi agaghị ekwe ka o mee otú ahụ. Anyị pụkwara inwe obi ike zuru ezu na n’ime ụwa ọhụrụ na-abịanụ, ọ ga-ewere ihe nile na-akpa anyị mee ka afọ ju anyị n’ụzọ kasị mma ga-ekwe omume.—Abụ Ọma 145:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ụjọ Ebreham tụrụ nwere ezi ihe kpatara ya n’ihi na otu ihe odide papaịrọs oge ochie na-akọ banyere otu Fero nke gwara ndị agha ka ha dọkpụta otu nwanyị mara mma ma gbuo di ya.

^ par. 16 Maka ihe ọmụma ndị ọzọ, lee Ụlọ Nche nke June 1, 1980, peeji nke 31.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee ihe ndị mere anyị kwesịrị iji nakwere ikpe Jehova?

• Gịnị pụrụ inyere anyị aka izere iru ná nkwubi okwu na-ezighị ezi banyere Lọt ikwu ka ya nye ìgwè ahụ iwe ji ụmụ ya nwanyị?

• Olee ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe mere Jehova ji tigbuo Ụza?

• Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe banyere ihe ndị Jehova ga-eme n’ọdịnihu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]