Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ndụ Gị Dịruru Oké Ọnụ Ahịa?

Olee Otú Ndụ Gị Dịruru Oké Ọnụ Ahịa?

Olee Otú Ndụ Gị Dịruru Oké Ọnụ Ahịa?

KA A na-ala ndụ ọtụtụ mmadụ n’iyi na Europe n’oge Agha Ụwa Mbụ, a nọ na-eme mgbalị dị egwu iji zọpụta ndụ ndị mmadụ n’Antarctica. Ọdachi dakwasịrị onye Britain na-eme nchọpụta bụ́ Ernest Shackleton na ndị òtù ya mgbe ice kpụkọrọ akpụkọ tiwara ụgbọ ha, bụ́ Endurance, ma mee ka o mie. Shackleton jisiri ike kpọga ndị òtù ya n’ebe dị nchebe—ruo n’ókè ụfọdụ—n’Elephant Island nke dị n’Ebe Ndịda Oké Osimiri Atlantic. Ma ha ka nọ n’oké ihe ize ndụ.

Shackleton ghọtara na nanị olileanya ha nwere ịdị ndụ dabeere na ha iziga ozi ka ndị na-arụ ọrụ n’ebe a na-egbu azụ whale dị n’agwaetiti South Georgia gbatara ha ọsọ enyemaka. Ebe ahụ dị 1,100 kilomita site n’ebe ha nọ, ihe Shackleton nwekwara bụ nanị otu obere ụgbọ e ji azọpụta ndụ nke ji obere ihe karịa mita isii na ọkara n’ogologo bụ́ nke o wetara n’ụgbọ ahụ bụ́ Endurance. Ha nọ ná nsogbu.

Otú ọ dị, na May 10, 1916, ka ụbọchị 17 tara akpụ gasịrị, Shackleton na mmadụ ole na ole ná ndị òtù ya bịarutere South Georgia, ma ọnọdụ ọjọọ e nwere n’oké osimiri ahụ manyere ha ịkwụsị n’akụkụ nke ọzọ nke agwaetiti ahụ. Iji ruo ebe ha na-aga, ha aghaghị iji ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita 30 gafere ugwu ndị ha na-amabughị bụ́ ndị snow kpuchiri elu ha. N’agbanyeghị ihe isi ike nile—oké oyi na enweghị ezigbo ngwá e ji arị ugwu—Shackleton na ndị òtù ya ruru ebe ha na-aga, o mesịkwara zọpụta ndị ikom ya nile tọrọ atọ. Gịnị mere Shackleton ji tinye mgbalị siri ike dị otú ahụ? Onye na-ede akụkọ ndụ bụ́ Roland Huntford na-ede, sị: “Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ndị ikom ya nile ná ndụ.”

“Ọ Dịghị Ihe Fọdụrụ nke A Na-agụghị”

Olee ihe mere ndị ikom Shackleton na-ejighị nwee obi nkoropụ ka ha kwụkọtara ọnụ na-echere n’ebe bụ́ nnọọ “ebe na-enweghị ụzọ e si aga ya nke jupụtara n’okwute na ice nke dị kilomita iri atọ site n’otu isi ya ruo na nke ọzọ”? Ọ bụ obi ike ha nwere na onye ndú ha ga-emezu nkwa ya nke ịzọpụta ha.

Ihe a kpọrọ mmadụ taa nọ n’ọnọdụ yiri nnọọ nke ndị ikom ahụ tọrọ atọ n’Elephant Island. Ọtụtụ ndị nọ nnọọ n’ọnọdụ ọjọọ ma na-adọga nanị iji dịgide ndụ. Ma ha pụrụ inwe obi ike zuru ezu na Chineke ‘ga-adọpụta onye e wedara n’ala’ ná mmegbu na nhụjuanya. (Job 36:15) Jide n’aka na Chineke na-ele ndụ mmadụ nile anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike, na-ekwu, sị: “Kpọkuokwa m n’ụbọchị mkpagbu; M ga-adọpụta gị.”—Abụ Ọma 50:15.

Ọ̀ na-esiri gị ike ikweta na Onye Okike na-ele gị—nanị otu onye n’ime ọtụtụ ijeri mmadụ bi n’ụwa—anya dị ka onye dị oké ọnụ ahịa? Mgbe ahụ, rịba ama ihe Aịzaịa onye amụma dere banyere ọtụtụ ijeri kpakpando dị n’ime ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ndị dị na mbara igwe. Anyị na-agụ, sị: ‘Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.’—Aịsaịa 40:26.

Ị̀ ghọtara ihe nke ahụ pụtara? Ụyọkọ kpakpando Milky Way anyị—bụ́ nke usoro mbara igwe anyị bụ nanị otu akụkụ ya—nwere ọ dịkarịa ala 100 ijeri kpakpando. Ụyọkọ kpakpando olekwanụ ka e nwere? Ọ dịghị onye maara ole ha dị n’ezie, ma ụfọdụ atụmatụ e mere na-ekwu na ha dị otu narị ijeri na iri ijeri abụọ na ise. Lee nnọọ ọnụ ọgụgụ na-ebu isi nke kpakpando e nwere! Ma Bible na-agwa anyị na Onye Okike nke eluigwe na ala maara aha nke ọ bụla n’ime kpakpando ndị ahụ.

“A Gụwo Ntutu Nile nke Isi Unu Ọnụ”

Mmadụ pụrụ ikwu, sị, ‘Ma nanị ịma aha ọtụtụ ijeri kpakpando—ma ọ bụ ọtụtụ ijeri mmadụ—dị iche n’iche banyere ha n’otu n’otu.’ Aha ọtụtụ ijeri mmadụ pụrụ ịdị na kọmputa nwere ohere zuru ezu maka ichekwa ihe ọmụma. Ma ọ dịghị onye ga-ekwu na kọmputa ahụ na-eche banyere onye ọ bụla n’ime ha. Otú ọ dị, Bible na-egosi na ọ bụghị nanị na Jehova Chineke maara aha ọtụtụ ijeri mmadụ kamakwa ọ na-eche banyere ha nile n’otu n’otu. Pita onyeozi dere, sị: “Na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.”—1 Pita 5:7.

Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ. Ya mere unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Matiu 10:29-31) Rịba ama na Jizọs ekwughị na nanị ihe Chineke ga-eme bụ ịmara ihe mere nza nakwa mmadụ. O kwuru, sị: “Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” Gịnị mere i ji dị oké ọnụ ahịa karịa ha? Ọ bụ n’ihi na e mere gị “n’onyinyo Chineke”—i nwekwara ikike nke ịzụlite na igosipụta omume ọma na àgwà ime mmụọ bụ́ ndị na-egosipụta àgwà Chineke ndị dị elu.—Jenesis 1:26, 27.

“Ihe Sitere n’Ọrụ E Ji Ọgụgụ Isi Rụọ”

Ekwela ka okwu nke ndị na-azọrọ na e nweghị Onye Okike duhie gị. Dị ka ha si kwuo, ọ bụ ikike na-abụghị onye, nke a na-apụghị ịghọta aghọta mere gị. Ha na-azọrọ na kama ịbụ onye e mere “n’onyinyo Chineke,” na gị na ụmụ anụmanụ nile e nwere na mbara ala a—gụnyere nza—bụ otu ihe.

Ì chere n’ezie na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ndụ pụtara nnọọ ná ndabara, ma ọ bụ site n’ikike a na-apụghị ịghọta aghọta? Dị ka ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Michael J. Behe si kwuo, “usoro ndị dị nnọọ mgbagwoju anya nke mmiri ọgwụ na-adị n’ahụ́” bụ́ ndị na-achịkwa ndụ na-eme ka echiche ahụ bụrụ ihe ezi uche na-adịtụghị na ya. Ọ na-ekwu na ihe àmà e nwetara site n’ịmụ banyere mmiri ọgwụ ndị dị n’ahụ́ na-eme nnọọ ka e kwubie na “ọbụna ihe ndị kasị nta dị ndụ . . . bụ ihe sitere n’ọrụ e ji ọgụgụ isi rụọ.”—Darwin’s Black Box—The Biochemical Challenge to Evolution.

Bible na-agwa anyị na ndụ nile dị n’ụwa sitere n’ọrụ e ji ọgụgụ isi rụọ. Ọ na-agwakwa anyị na Onye rụrụ ọrụ nile a e ji ọgụgụ isi rụọ bụ Jehova Chineke, Onye Okike nke eluigwe na ala.—Abụ Ọma 36:9; Mkpughe 4:11.

Ekwela ka eziokwu bụ́ na anyị aghaghị ibi n’ụwa nke jupụtara n’ihe mgbu na ahụhụ mee ka ị ghara ikwere na e nwere Onye kere ma hazie ụwa na ụdị ndụ nile dị na ya. Buru eziokwu abụọ bụ́ isi n’uche. Nke mbụ bụ na ọ bụghị Chineke kpatara ezughị okè anyị nọ na ya. Nke ọzọ bụ na Onye Okike anyị nwere ezi ihe mere o ji kwere ka ọ dịruo nwa oge. Dị ka magazin a tụlerela ọtụtụ ugboro, Jehova Chineke ekwewo ka ihe ọjọọ dịruo nanị oge a kapịrị ọnụ iji dozie kpamkpam ihe iseokwu ndị bilitere mgbe ụmụ mmadụ mbụ jụrụ ọbụbụeze ya. *Jenesis 3:1-7; Deuterọnọmi 32:4, 5; Eklisiastis 7:29; 2 Pita 3:8, 9.

“Ọ Ga-anapụta Ogbenye Mgbe Ọ Na-etiku Ya”

N’ezie, n’agbanyeghị ọnọdụ jọgburu onwe ya ọtụtụ ndị nọ na ya taa, ndụ ka bụ onyinye magburu onwe ya. Anyị na-emekwa ike anyị nile iji chebe ya. Ndụ Chineke kwere nkwa ya maka ọdịnihu karịrị ndọga iji dịgide ndụ n’ọnọdụ ihe isi ike na ihe mgbu—dị ka ndị ikom Shackleton mere n’Elephant Island. Nzube Chineke bụ ịnapụta anyị ná ndụ ihe mgbu na ihe efu anyị na-ebi ugbu a iji mee ka anyị “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” bụ́ nke Chineke zubere na mbụ ka ụmụ mmadụ o kere eke bie.—1 Timoti 6:19.

Chineke ga-eme ihe a nile n’ihi na onye ọ bụla n’ime anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. O mere ndokwa ka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, chụọ àjà mgbapụta ahụ dị mkpa iji napụta anyị site ná mmehie, ezughị okè, na ọnwụ nke anyị ketara site n’aka nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. (Matiu 20:28) Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka . . . onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya . . . nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Gịnị ka Chineke ga-emere ndị ihe mgbu na mmegbu na-emekpa ahụ́ taa? Banyere Ọkpara ya, Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee na-agwa anyị, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.” N’ihi gịnị ka ọ ga-eji mee nke a? Ọ bụ n’ihi na ‘ọbara [ma ọ bụ, ndụ] ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.’Abụ Ọma 72:12-14.

Ruo ọtụtụ narị afọ, ụmụ mmadụ ataala ahụhụ n’ihi mmehie na ezughị okè, dị ka à ga-asị na ha ‘na-asụ ude’ n’ihi oké ihe mgbu na ahụhụ. Chineke kwere ka nke a dịrị n’ihi na ọ maara na ya pụrụ imezi ihe ọ bụla ya ikwe ka ọnọdụ ahụ dịrị pụrụ imebi. (Ndị Rom 8:18-22) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eji ọchịchị Alaeze ya nke dị n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ‘weghachi ihe nile.’—Ọrụ 3:21; Matiu 6:9, 10.

Nke ahụ na-agụnye ịkpọlite ndị tara ahụhụ ma nwụọ n’oge gara aga n’ọnwụ. Chineke na-echeta ha. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) N’oge na-adịghị anya, ha ga-enweta ndụ “n’ụba”—ndụ ebighị ebi n’izu okè na paradaịs elu ala nke ihe mgbu na ahụhụ na-agaghịzi adị na ya. (Jọn 10:10; Mkpughe 21:3-5) Onye ọ bụla dị ndụ ga-anụ ụtọ ndụ n’ụzọ zuru ezu ma zụlite àgwà na ikike ndị magburu onwe ha bụ́ ndị e ji mara ndị e mere “n’onyinyo Chineke.”

Ị̀ ga-anọ ya iji nụ ụtọ ndụ ahụ nke Jehova kwere ná nkwa? Nke ahụ dị gị n’aka. Anyị na-agba gị ume irite uru ná ndokwa ndị Chineke mere iji weta ngọzi ndị a nile. Ndị na-ebipụta magazin a ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ime otú ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Maka ntụle zuru ezu nke okwu a, lee isi nke 8, “N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?” n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Ndị ikom a tọrọ atọ nwere obi ike na Shackleton ga-emezu nkwa o kwere ịnapụta ha

[Credit Line]

© CORBIS

[Foto dị na peeji nke 6]

“Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza”