Ị̀ Na-eji Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ?
Ị̀ Na-eji Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ?
OLEE onye n’ime anyị na-ahụtụbeghị onye ka ya maa mma, onye yiri ka ọ̀ bụ onye a ma ama karịa ya, onye ka ya aghọta ihe ngwa ngwa, ma ọ bụ onye na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ karịa ya? Ndị ọzọ pụrụ inwe ahụ́ ike karịa anyị ma ọ bụ nwee ezigbo ọrụ, na-enwe ihe ịga nke ọma, ma ọ bụ nwee ndị enyi karịa anyị. Ha pụrụ inwe ihe onwunwe na ego karịa anyị, nwee ụgbọala ka nke anyị ọhụrụ, ma ọ bụ yie ka ha nwere obi ụtọ karịa anyị. Mgbe anyị hụrụ ihe ndị dị otú ahụ, ànyị na-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ? Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike izere iji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ? N’ihi gịnị ka Onye Kraịst pụrụ iji chọọ izere ya? Oleekwa otú anyị pụrụ isi nwee afọ ojuju n’ejighị onwe anyị tụnyere onye ọ bụla?
Ihe Ndị Mere Anyị Pụrụ Iji Jiri Onwe Anyị Na-atụnyere Ndị Ọzọ na Mgbe Anyị Pụrụ Ime Otú Ahụ
Otu ihe pụrụ ime ka ndị mmadụ na-eji onwe ha atụnyere ndị ọzọ bụ na nke a na-eme ka ha na-enwekwu ùgwù onwe onye. Ndị mmadụ na-enwekarị afọ ojuju mgbe ha chọpụtara na ha na-enwe ihe ịga nke ọma dị ka ndị ọgbọ ha. Echiche ọzọ bụ na iji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ bụ mgbalị iji belata ejighị ihe n’aka banyere onwe anyị, iji ghọta ihe anyị pụrụ ime na ebe ike anyị ruru. Anyị na-ahụ ihe ndị ọzọ rụzuworo. Ọ bụrụ na ha dị ka anyị n’ọtụtụ ụzọ ma rụzuo ụfọdụ ihe, anyị pụrụ iche na anyị pụrụ ịrụzu ihe ndị dị otú ahụ.
Ọ na-abụkarị ndị yiri onwe ha na-eji onwe ha atụnyere ibe ha—ndị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha, ndị bụ́ ọgbọ, ndị nọ n’otu ụdị ọkwá, na ndị maara onwe ha. O yikarịghị ka ànyị ga-eji onwe anyị atụnyere onye ọzọ ma ọ bụrụ na o ji ihe dị ukwuu kara anyị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, nwata nwanyị nkịtị dị afọ iri na ụma yiri ka ọ̀ ga-eji onwe ya atụnyere ụmụ akwụkwọ ibe ya karịa iji onwe ya atụnyere nwaada mara mma e ji eme mkpọsa ngwá ahịa, nwaada ahụ e jikwa eme mkpọsa ngwá ahịa eyikarịghị ka ọ̀ ga-eji onwe ya atụnyere nwata nwanyị ahụ.
Olee ebe ndị mmadụ na-eji onwe ha atụnyere ndị ọzọ? A pụrụ iji ihe onwunwe ma ọ bụ àgwà ọ bụla e lere anya n’ógbè dị ka ihe bara uru—ma ọ bụ ọgụgụ isi, ịma mma, akụ̀ na ụba ma ọ bụ uwe—atụnyere nke ndị ọzọ. Otú ọ dị, anyị na-ejikarị ihe ndị na-amasị anyị atụnyere nke ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, o yighị ka ànyị ga-emere enyi anyị anyaụfụ n’ihi ọtụtụ stamp ọ
chịkọtara ma ọ bụrụ na anyị enweghị mmasị n’ịchịkọta stamp.Mmadụ iji onwe ya atụnyere onye ọzọ na-akpalite mmeghachi omume dịgasị iche, site n’afọ ojuju gaa n’ịda mbà n’obi, site n’oké mmasị na ọchịchọ nke iṅomi onye ahụ gaa n’inwe ahụ́ erughị ala ma ọ bụ imegidesi onye ahụ ike. Ụfọdụ n’ime mmetụta ndị a na-emerụ ahụ́, ha ekwekọghịkwa n’àgwà Ndị Kraịst.
Iji Onwe Onye Atụnyere Ndị Ọzọ n’Ụzọ Ịsọ Mpi
Ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-agbalị “imeri” mgbe ha ji onwe ha tụnyere ndị ọzọ na-enwe mmụọ ịsọ mpi. Ha na-achọ ịka ndị ọzọ mma, afọ adịghịkwa eju ha ruo mgbe ha chere na ha akala ndị ọzọ mma. Ahụ́ adịghị eru mmadụ ala ma ya na ndị dị otú ahụ nọrọ. Ọ na-esi ike ịnọgide na-abụ enyi ha, ọ na-arakwa ahụ́ iso ha emekọrịta ihe. Ọ bụghị nanị na ndị dị otú ahụ adịghị egosi umeala n’obi kama ha adịghị etinyekarị ndụmọdụ Bible banyere ịhụ mmadụ ibe ha n’anya n’ọrụ, ebe ọ bụ na àgwà ha pụrụ ịkpali ndị ọzọ iche na ha dị ala.—Matiu 18:1-5; Jọn 13:34, 35.
Ime ka ndị ọzọ chee na ha “dara ada” na-emerụ ahụ́. Dị ka otu onye edemede si kwuo, “ọdịda anyị na-ewutekwu ewute mgbe o yiri ka ndị anyị na ha nọ n’otu ọnọdụ hà enwetawo ihe ndị anyị na-achọ.” Ya mere, mmụọ nke ịsọ mpi na-akpalite anyaụfụ, ibu iwe n’obi, na enweghị mmasị n’ebe mmadụ nọ n’ihi ihe onwunwe, ihe ịga nke ọma, ọkwá, aha ọma, ihe ndabara ọma ya, na ihe ndị ọzọ. Nke a na-edugakwu n’ịsọ mpi—otu ihe ọjọọ na-akpata ibe ya. Bible na-emegide “ịsọ mpi.”—Ndị Galeshia 5:26.
Site n’iwetu ihe ndị onye ha na-achọ ịka mma rụzuru ala, ndị anyaụfụ na-agbalị ichebe ùgwù onwe onye ha dalatara adalata. Omume dị otú ahụ pụrụ iyi obere ihe, ma, ọ bụrụ na a chọpụtaghị ma gbochie ya, ọ pụrụ iduga n’oké ihe ọjọọ. Tụlee ihe ndekọ Bible abụọ bụ́ ndị metụtara anyaụfụ.
N’oge o biri n’etiti ndị Filistia, e jiri “ìgwè ewu na atụrụ, na ihe nnweta, bụ́ ìgwè ehi, na ọtụtụ ndị ohu” gọzie Aịzik, “ndị Filistia wee na-ekwo ya ekworo.” N’ihi ya, ha kpochiri olulu mmiri nna Aịzik, bụ́ Ebreham, gwuru, eze ha gwakwara Aịzik ka ọ pụọ n’obodo ha. (Jenesis 26:1-3, 12-16) Anyaụfụ ha siri ike ma bibie ihe. O kwezighị ha nnọọ odidi ịhụ ka Aịzik nọ n’etiti ha na-enwe ọganihu.
Ọtụtụ narị afọ ka nke ahụ gasịrị, Devid kpara ike dị egwu n’ọgbọ agha. Ndị inyom Izrel toro ike ọ kpara, na-abụ, sị: “Sọl etigbuwo ndị iro ya, [otu puku ndị ikom, otu puku ndị ikom], Devid kwa ndị iro ya, [narị puku ndị ikom iri, narị puku ndị ikom iri].” Ọ bụ ezie na ha tokwara ya, Sọl lere otú ahụ e si jiri ya tụnyere Devid anya dị ka mweda n’ala, ọ malitekwara inwe anyaụfụ. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, ọ malitere iburu Devid iwe n’obi. N’oge na-adịghị anya, o mere nke mbụ n’ime mgbalị ndị o mere ugboro ugboro igbu Devid. Lee nnọọ ihe ọjọọ anyaụfụ pụrụ ịkpata!—1 Samuel 18:6-11.
Ya mere, ọ bụrụ na iji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ—ihe ndị ha rụzuru ma ọ bụ ihe ndị ha nwetara—na-akpalite mmetụta ndị yiri anyaụfụ ma ọ bụ ịsọ mpi, kpachara anya! Mmetụta ndị a ezighị ezi, ha ekwekọghịkwa n’echiche Chineke. Ma tupu anyị atụlee otú a pụrụ isi guzogide àgwà ndị dị otú ahụ, ka anyị tụlee ihe ọzọ na-akpata mmadụ iji onwe ya atụnyere onye ọzọ.
Nnyocha Onwe Onye na Afọ Ojuju
‘Ènwere m ụbụrụ na-aghọ nkọ, bụrụ onye na-adọrọ adọrọ, nwee iru eru ụfọdụ, nwee ezi ọdịdị, bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù na onye a hụrụ n’anya? Ruokwa n’ókè ha aṅaa?’ Ọ ga-ara ahụ́ anyị ịnọ n’ihu enyo na-ajụ onwe anyị ajụjụ yiri ndị a. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka otu onye edemede si kwuo, “n’ụzọ na-apụtaghị ìhè, ajụjụ ndị dị otú ahụ na-abata anyị n’obi mgbe mgbe, n’amaghịkwa ama, anyị na-aza ha onwe anyị n’ụzọ jutụrụ afọ.” Onye na-ejighị ihe ọ pụrụ ịrụzu n’aka pụrụ ịtụgharị uche n’ihe ndị a n’enweghị ọchịchọ ịsọ mpi ma ọ bụ anyaụfụ ọ bụla. Ihe ọ na-eme bụ nanị ịtụ onwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ọ dịchaghị ihe dị
njọ na nke ahụ. Otú ọ dị, ụzọ kwesịrị ekwesị isi mee nke a abụghị iji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ.Ikike anyị nile ahaghị nhata, e nwekwara ihe dị iche iche kpatara nke a. Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye na-eme nke ọma karịa anyị. N’ihi ya, kama iji anyaụfụ na-ele ha, anyị kwesịrị iji ụkpụrụ ezi omume nke Chineke, bụ́ nke na-enye ezigbo nduzi banyere ihe ziri ezi na ihe ọjọọ, na-atụ ihe anyị rụzuru n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Jehova nwere mmasị n’ụdị ndị anyị bụ n’otu n’otu. Ọ dịghị ya mkpa iji anyị atụnyere onye ọ bụla. Pọl onyeozi na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4.
Ịlụso Anyaụfụ Ọgụ
N’ihi na mmadụ nile bụ ndị na-ezughị okè, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime mgbalị siri ike ruo ogologo iji kwụsị inwe anyaụfụ. Ọ bụ otu ihe ịmara na Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu,” ma ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ime ya eme. Pọl ghọtara na ya nwere ọchịchọ nke ime mmehie. Iji lụso ya ọgụ, o ‘tipụtara ahụ́ ya ọnyá ma chịkwaa ya dị ka ohu.’ (Ndị Rom 12:10; 1 Ndị Kọrint 9:27) Nye anyị, nke ahụ pụrụ ịpụta iguzogide echiche nke ịsọ mpi ma jiri echiche ndị na-ewuli elu dochie ya. Ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere, na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ‘ịghara iche banyere onwe anyị karịa ka ọ dị mkpa iche.’—Ndị Rom 12:3.
Ọmụmụ Bible na ntụgharị uche na-enyekwa aka. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere Paradaịs nke Chineke kwere ná nkwa ya maka ọdịnihu. N’oge ahụ, mmadụ nile ga-anọ n’udo, nwee ezi ahụ́ ike, nri bara ụba, ebe obibi na-enye ntụsara ahụ́, na ọrụ na-eju afọ. (Abụ Ọma 46:8, 9; 72:7, 8, 16; Aịsaịa 65:21-23) Ọ̀ dị onye ga-enwe ọchịchọ ịsọ mpi? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ dịghị ihe mere mmadụ ga-eji nwee ọchịchọ dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na Jehova enyeghị anyị ihe ndekọ zuru ezu banyere otú ndụ ga-adị mgbe ahụ, ma, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya anyị iche na mmadụ nile ga-enwe ike ịchụso nkà na ihe ndị na-amasị ha. Otu onye pụrụ ịmụ banyere mbara igwe, onye ọzọ akpaa ákwà ndị mara mma. Olee ihe mmadụ ga-eji nwewere ibe ya anyaụfụ? Ihe ndị ibe anyị rụzuru ga na-akpali anyị ịrụpụtakwu ihe, ọ bụghị ime ka anyị na-ebu iwe n’obi. Mmetụta dị otú ahụ ga-abụ ihe mgbe ochie.
Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ụdị ndụ anyị chọrọ ibi, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbalị ịzụlite otu ụdị àgwà ahụ ugbu a? Anyị anọrọlarị na paradaịs ime mmụọ, bụ́ nke ọtụtụ nsogbu ndị dị n’ụwa gbara anyị gburugburu na-adịghị na ya. Ebe ọ bụ na mmụọ nke nsọrịta mpi agaghị adị n’ụwa ọhụrụ nke Chineke, e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-ezere ya ugbu a.
Nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ dị njọ iji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ? Ka ọ̀ dị mgbe ọ pụrụ ikwesị ekwesị?
Iji Onwe Onye Atụnyere Ndị Ọzọ n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ enwewo obi ilu ma ọ bụ daa mbà n’obi n’ihi iji onwe ha atụnyere ndị ọzọ, ma o kwesịghị ịdị otú ahụ mgbe nile. Banyere nke a, rịba ama ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.” (Ndị Hibru 6:12) Ịgbalị ịzụlite àgwà ndị dị ka nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie pụrụ ịrụpụta ihe. N’ezie, nke ahụ pụrụ ịgụnye iji onwe anyị atụnyere ha. Ma, ọ pụrụ inyere anyị aka ịhụ ihe atụ ndị anyị pụrụ iṅomi na ebe ndị ọ dị mkpa ka anyị meziwanye ihe.
Tụlee ihe banyere Jonatan. A pụrụ ikwu na o nwere ihe mere ọ ga-eji nwee anyaụfụ. Dị ka ọkpara Eze Sọl nke Izrel, ọ pụrụ ịbụ na Jonatan atụwo anya na ya ga-abụ eze, ma Jehova họọrọ onye o ji afọ 30 tọọ, bụ́ Devid na-eto eto. Kama ibu iwe n’obi, Jonatan mere ihe megidere nke ahụ site n’imete Devid enyi ma kwado ya dị ka eze Jehova họpụtara. Jonatan bụ n’ezie nwoke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. (1 Samuel 19:1-4) N’adịghị ka nna ya, bụ́ onye lere Devid anya dị ka onye na-ama ya aka, Jonatan ghọtara na aka Jehova dị n’okwu ahụ ma mee uche Ya; o jighị onwe ya tụnyere Devid, na-ajụ, sị, “Gịnị mere e ji họrọ Devid, kama ịhọrọ m?”
N’etiti Ndị Kraịst ibe anyị, ọ dịghị mgbe anyị kwesịrị iche na ọnọdụ anyị nọ n’ihe ize ndụ, ka à ga-asị na ndị ọzọ na-achọ ịka anyị ma ọ bụ iweghara ọnọdụ anyị. Ịma aka ekwesịghị ekwesị. E ji ịrụkọ ọrụ ọnụ, ịdị n’otu, na ịhụnanya mara Ndị Kraịst, ọ bụghị nsọrịta mpi. “Ịhụnanya na anyaụfụ adịghị agakọ,” ka ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Francesco Alberoni na-ekwu. “Ọ bụrụ na anyị hụrụ mmadụ n’anya, anyị na-achọ ka ihe ọma meere ya, anyị na-enwe obi ụtọ mgbe o nwere ihe ịga nke ọma na mgbe obi dị ya ụtọ.” Ya mere, mgbe e nyere onye ọzọ ihe ùgwù ụfọdụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ihe ịhụnanya dị na ya ime ga-abụ inwe afọ ojuju na nke ahụ. Nke ahụ bụ ihe Jonatan mere. Dị ka ya, a ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị na-akwado ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ebu ibu ọrụ ná nzukọ Jehova.
Ọ dịghị ihe dị njọ n’inwe mmasị n’ihe nlereanya magburu onwe ha Ndị Kraịst ibe anyị na-esetịpụ. Iji onwe anyị atụnyere ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ ịkpali anyị iṅomi okwukwe ha. (Ndị Hibru 13:7) Ma, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, iṅomi ha pụrụ ịghọ ịsọ mpi. Ọ bụrụ na anyị echee na onye anyị na-akwanyere ùgwù akala anyị, anyị ana-agbalịkwa iwetu ya ala ma ọ bụ ịkatọ ya, nṅomi pụrụ ịghọ anyaụfụ.
Ọ dịghị mmadụ na-ezughị okè pụrụ ịbụ ihe nlereanya zuru okè. Ya mere, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” Ọzọkwa, “Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.” (Ndị Efesọs 5:1, 2; 1 Pita 2:21) Àgwà Jehova na Jizọs—ịhụnanya, omume enyi, ọmịiko, na umeala n’obi ha—kwesịrị ịbụ ihe anyị ga na-agbalị iṅomi. Anyị kwesịrị iwepụta oge iji àgwà anyị, nzube anyị na ụzọ anyị si eme ihe tụnyere nke ha. Iji onwe anyị atụnyere ha n’ụzọ dị otú ahụ pụrụ ime ka anyị nwekwuo obi ụtọ ná ndụ, na-enye anyị nduzi, nkwụsi ike, na nchebe e ji n’aka, ọ pụkwara inyere anyị aka n’otu n’otu ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè. (Ndị Efesọs 4:13) Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ime ike anyị nile iji ṅomie ihe nlereanya ha zuru okè, n’ezie, anyị agaghị enwecha ọchịchọ nke iji onwe anyị atụnyere ụmụ mmadụ ibe anyị.
[Foto dị na peeji nke 29]
Eze Sọl meere Devid anyaụfụ
[Foto dị na peeji nke 31]
Ọ dịghị mgbe Jonatan lere Devid bụ́ onye ọ tọrọ atọ anya dị ka onye na-ama ya aka