Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ga-enye Ụwa Nri?

Ònye Ga-enye Ụwa Nri?

Ònye Ga-enye Ụwa Nri?

DỊ KA atụmatụ nke Òtù Na-ahụ Maka Ihe Oriri Ụwa, bụ́ òtù nke Mba Ndị Dị n’Otu hiwere iji lụso agụụ ọgụ, mere si kwuo, agụụ na-akụrụ narị nde mmadụ asatọ—ndị ọtụtụ n’ime ha bụ́ ụmụaka—aka n’ụzọ. N’oge na-adịbeghị anya, òtù ahụ kwuru na nsogbu ndị ọzọ, dị ka iyi ọha egwu, wekọọrọ ego ọtụtụ mba ndị mepere emepe gaara eji dozie nsogbu a ma mee ka ha ghara ilebara ya anya. Mmụba nke ọrịa na-efe efe emeela ka nsogbu ahụ ka njọ. Akwụkwọ bụ́ Global School Feeding Report nke òtù ahụ dere kwuru banyere mba ndị dị n’Africa bụ́ ebe ndị ọrịa AIDS jupụtara, sị: “Otu ọgbọ dum nke ndị nne na nna na-apụ n’anya. Ụmụ ndị ha na-anwụnahụ aghaghị iji aka ha lekọtawa onwe ha, ihe ka ọtụtụ n’ime ha amaghị ka e si arụ ọrụ ugbo, ha enweghịkwa nkà ndị e ji ebi ndụ bụ́ ndị na-esi n’otu ọgbọ agafere n’ọzọ.”

Òtù Na-ahụ Maka Ihe Oriri Ụwa na-eme atụmatụ inye ụmụ akwụkwọ ọ dịkarịa ala otu ugboro nri kwa ụbọchị. Ebumnobi ya abụghị nanị ịkwụsịlata agụụ, kamakwa iji agụmakwụkwọ nkịtị welite atụmatụ ndị ọzọ e mere iji gbochie nje HIV na ọrịa AIDS n’etiti ndị na-eto eto.

N’ebe ndị a maliteworo itinye atụmatụ a n’ọrụ, ụmụaka enwetawo nri na-edozi ahụ́, ọzụzụ n’idebe onwe onye ọcha, na enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ. A hụwokwa na nje HIV na ọrịa AIDS na-ebelata n’ebe ndị mmadụ gbanwere omume ha.

N’ụzọ dị mwute, mgbe mgbe, ihe ndị na-esi ná mgbalị ụmụ mmadụ apụta adịghị egbocha mkpa ahụ kpamkpam. Ma Bible na-ekwe nkwa na-akasi obi banyere ngwọta na-adịgide adịgide nke nsogbu agụụ. “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala,” ka Abụ Ọma 72:16 na-ekwu. N’okpuru Alaeze Chineke, ndị mmadụ ga-enwe ike ikwu banyere Jehova Chineke, sị: “I letawo ala, wee mee ka o jupụta n’ihe, Ị na-eme ka o nwee akụ̀ hie nne; . . . Ị na-edozi ọka ha, mgbe i si otú a dozie ala onwe ya.”—Abụ Ọma 65:9.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 32]

WFP/Y. Yuge