Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Ebube—Ihe Ndị Mere Eme Ka Hà Bụ Akụkọ Ifo?

Ọrụ Ebube—Ihe Ndị Mere Eme Ka Hà Bụ Akụkọ Ifo?

Ọrụ Ebube—Ihe Ndị Mere Eme Ka Hà Bụ Akụkọ Ifo?

IHE a mapawara n’azụ otu obere ụgbọala na-agbafe agbafe, bụ́ “Ọrụ Ebube Dị—Jụọkwa Ndị Mmụọ Ozi,” dọọrọ uche otu nwa amadị ozugbo. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye ji okpukpe kpọrọ ihe, o jichaghị n’aka ihe nke a pụtara. Ihe ahụ a mapawara n’ụgbọala ahụ ọ̀ na-egosi na onye na-akwọ ụgbọala ahụ kweere n’ọrụ ebube? Ka ọ̀ bụ ụzọ egwuregwu isi gosi na ya ekweghị ma n’ọrụ ebube ma ná ndị mmụọ ozi?

Ihe onye edemede bụ́ onye Germany bụ́ Manfred Barthel kwuru pụrụ ịmasị gị: “Okwu ahụ bụ́ ọrụ ebube na-akpata oké nkewa n’etiti ndị mmadụ ozugbo ha gụtara ya.” Ndị kweere n’ọrụ ebube kwenyesiri ike na ọ dị adị, nakwa, ma eleghị anya, na a na-ahụ ya mgbe mgbe. * Dị ka ihe atụ, a kọrọ na na Gris, n’ime afọ ole na ole gara aga, ndị kweere n’ọrụ ebube azọrọwo na a na-ahụ ya ihe dị ka otu ugboro n’ọnwa. Nke a mere ka otu onye Bishọp nke Chọọchị Ọtọdọks nke Gris dọọ aka ná ntị, sị: “Onye kweere na ya na-eme ka Chineke, Meri na ndị senti yie ụmụ mmadụ nkịtị. Ndị kweere na ya ekwesịghị ibu ya n’isi.”

Ná mba ụfọdụ ndị ọzọ, ndị mmadụ ekwenyechaghị n’ọrụ ebube. Dị ka otu atụmatụ e mere bụ́ nke e bipụtara na Germany n’afọ 2002 si kwuo, pasent 71 nke ndị obodo ahụ na-ewere ọrụ ebube dị ka akụkọ ifo, ọ bụghị dị ka ihe ndị mere eme. Otú ọ dị, n’ime ihe na-erughị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị kweere n’ọrụ ebube, e nwere ụmụ nwanyị atọ ndị sịrị na ha nwetara ozi site n’aka Nwa Agbọghọ ahụ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri. Ọnwa ole na ole ka ha kwusịrị na ha hụrụ Meri—bụ́ onye ya na ndị mmụọ ozi na nduru so, akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Westfalenpost kọrọ, sị: “Ruo ugbu a, ihe dị ka ndị njem ala nsọ dị iri puku mmadụ ise, bụ́ ndị na-achọ ọgwụgwọ, tinyekwara ndị nwere ọchịchọ ịmata ihe, egosiwo nnukwu mmasị n’ọhụụ ahụ ụmụ nwanyị ahụ hụrụ.” A tụkwara anya na puku mmadụ iri ọzọ ga-enuga n’obodo ahụ iji hụ Meri ma ọ pụta ọzọ. E kwuru na Nwa Agbọghọ ahụ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri pụtakwara na Lourdes, France, na 1858, nakwa na Fátima, Portugal, na 1917.

Gịnị Banyere Okpukpe Ndị Na-abụghị nke Ndị Kraịst?

E nwere ndị kweere n’ọrụ ebube n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-akọwa na ndị guzobere Okpukpe Buddha, Iso Ụzọ Kraịst na okpukpe Alakụba nwere echiche dịgasị iche banyere ọrụ ebube, ma o kwuru, sị: “Akụkọ ihe mere eme nke okpukpe ndị a na-egosi n’ụzọ doro anya na ọrụ ebube na akụkọ banyere ọrụ ebube abụwo akụkụ dị mkpa nke nkwenkwe okpukpe mmadụ.” Akwụkwọ ntụaka a na-ekwu na “Buddha n’onwe ya rụrụ ọrụ ebube mgbe ụfọdụ.” Mgbe e mesịrị “wega okpukpe Buddha na China, ndị ozi ala ọzọ ya jiri ike ọrụ ebube mee ihe.”

Mgbe o kwusịrị banyere ụdị ọrụ ebube ndị dị otú ahụ, akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ mechiri site n’ikwu, sị: “Mmadụ nwere ike ịjụ ikwere akụkọ ọrụ ebube nile a, bụ́ ndị ndị edemede okpukpe dere, ma obi abụọ adịghị ya na ihe ha bu n’obi dee ha bụ iji nye Buddha otuto, bụ́ onye nwere ikike inye ụmụazụ ya na-anụ ọkụ n’obi ike ịrụ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ.” Otu akwụkwọ ahụ na-ekwukwa banyere okpukpe Alakụba, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị Alakụba akwụsịtụbeghị ịtụ anya ọrụ ebube. Akụkọ okpukpe ha (hadīths) na-egosi na Muhammad rụrụ ọrụ ebube n’ihu ọha ọtụtụ ugboro. . . . E kweere na ọbụna mgbe ha nwụsịrị, ndị senti na-anọ n’ili ha arụrụ ndị Alakụba ọrụ ebube, a na-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi arịọ ha maka enyemaka.”

Olee Maka Ọrụ Ebube Ndị A Rụrụ n’Okpukpe Ndị Kraịst?

Ọtụtụ ndị nọ n’Iso Ụzọ Kraịst nwere echiche dịgasị iche. Ụfọdụ na-ekwere ihe ndị Bible kọrọ banyere ọrụ ebube ndị Jizọs Kraịst, ma ọ bụ ndị ohu Chineke biri ndụ tupu oge Ndị Kraịst rụrụ. Ma, ọtụtụ na-ekwenyere onye Protestant Na-eme Mgbanwe bụ́ Martin Luther. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu banyere ya, sị: “Ma Luther ma Calvin dere na oge ọrụ ebube agafeela, nakwa na e kwesịghị ịdị na-atụ anya ha.” Akwụkwọ ntụaka a na-ekwu na Chọọchị Katọlik nọgidere na-ekwenye n’ọrụ ebube “n’agbalịghị ịkọwa otú ha si mee.” Otú ọ dị, “ndị Protestant gụrụ akwụkwọ mesịrị kwere na ihe bụ́ isi n’Iso Ụzọ Kraịst bụ ime omume ọma, nakwa na ma Chineke ma ụwa ndị mmụọ adịghị nke na-enwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ ụmụ mmadụ na-adị kwa ụbọchị.”

Ndị ọzọ bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst, gụnyere ụfọdụ ndị ndú okpukpe, na-enwe obi abụọ ma ọrụ ebube ndị e kwuru okwu ha na Bible hà mere eme. Were akụkọ nke obere osisi ahụ na-ere ọkụ, bụ́ nke a kọrọ na Bible n’Ọpụpụ 3:1-5, dị ka ihe atụ. Akwụkwọ bụ́ What the Bible Really Says na-akọwa na ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe nke Germany adịghị ewere akụkọ a dị ka akụkọ ọrụ ebube nkịtị. Kama nke ahụ, ha na-akọwa ya dị ka “ihe na-egosi oké nsogbu nke akọ na uche Mozis na-enye ya.” Akwụkwọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “A pụkwara iwere ire ọkụ ahụ dị ka okooko osisi ndị anwụ nke charanụ n’ihi ọnụnọ Chineke nọ ebe ahụ mere ka ha waa.”

Ọ pụrụ ịbụ na nkọwa dị otú ahụ ejuchaghị gị afọ. Oleezi ihe i kwesịrị ikwere? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na ọrụ ebube emetụla? Gịnịkwanụ banyere ọrụ ebube ndị nke oge a? Ebe ọ bụ na anyị apụghị ịjụ ndị mmụọ ozi, ònye ka anyị pụrụ ịjụ?

Echiche Bible

Ọ dịghị onye pụrụ ịgbagha na Bible kọrọ na mgbe ụfọdụ, n’oge ndị gara aga, Chineke rụrụ ọrụ ndị mmadụ na-apụghị ịrụ. Banyere Chineke, anyị na-agụ, sị: ‘I wee jiri ihe ịrịba ama dị iche iche, jirikwa ihe [ma ọ bụ, “ọrụ”] ebube dị iche iche, jirikwa aka dị ike, jirikwa ogwe aka setịrị esetị, jirikwa egwu dị ukwuu, mee ka ndị Gị, bụ́ Izrel, si n’ala Ijipt pụta.’ (Jeremaịa 32:21) Cheedị banyere nke ahụ, e ji ihe otiti iri sitere n’aka Chineke, ndị gụnyere ọnwụ nke ụmụ na anụmanụ ha nile e buru ụzọ mụọ, weda mba kasị ike n’oge ahụ ala. Ha bụ ọrụ ebube n’ezie!—Ọpụpụ, isi 7 ruo nke 14.

Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, ndị dere Oziọma anọ ahụ kọwara ọrụ ebube iri atọ na ise Jizọs rụrụ. N’ezie, okwu ha na-enye echiche na ọ rụdịrị ọtụtụ ọrụ ebube karịa ole ha kọrọ. Akụkọ ndị a hà bụ eziokwu ka hà bụ akụkọ ifo? *Matiu 9:35; Luk 9:11.

Ọ bụrụ na Bible bụ ihe ọ na-azọrọ na ya bụ—Okwu eziokwu nke Chineke—mgbe ahụ, i nwere ezi ihe mere ị ga-eji kwere n’ọrụ ebube ndị o kwuru banyere ha. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na a rụrụ ọrụ ebube n’oge ndị gara aga—ọgwụgwọ ọrụ ebube, mbilite n’ọnwụ n’ụzọ ọrụ ebube, na ihe ndị yiri ha—n’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-akọwakwa n’ụzọ doro anya na a naghịzi arụ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ. (Lee igbe bụ́ “Ihe Mere A Na-ejighịzi Ahụ Ọrụ Ebube Otú E Si Hụ Ha n’Oge Ochie,” na peeji nke 4.) Nke a ọ̀ pụtaziri na ọbụna ndị kweere na Bible ekwenyeghị n’ọrụ ebube ndị a na-arụ taa? Ka isiokwu na-esonụ zaa ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 “Ọrụ ebube” a na-ekwu banyere ya n’isiokwu a, bụ dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu Bible si kwuo: “Ihe ndị na-eme n’ụwa a na-ahụ anya, bụ́ ndị karịrị ike nile a ma ama nke ụmụ mmadụ ma ọ bụ ihe ndị e kere eke, n’ihi ya kwa, e were ya na ha sitere n’ike karịrị nke mmadụ.”

^ par. 14 Ị pụrụ ịtụle ihe àmà na-egosi na e kwesịrị ikwere na Bible. E depụtara ihe àmà dị otú ahụ n’akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 4]

IHE MERE A NA-EJIGHỊZI AHỤ ỌRỤ EBUBE OTÚ E SI HỤ HA N’OGE OCHIE

A kpọtụrụ ụdị ọrụ ebube dị iche iche aha n’ime Bible. (Ọpụpụ 7:19-21; 1 Ndị Eze 17:1-7; 18:22-38; 2 Ndị Eze 5:1-14; Matiu 8:24-27; Luk 17:11-19; Jọn 2:1-11; 9:1-7) Ọtụtụ n’ime ọrụ ebube ndị a gosiri na Jizọs bụ Mezaịa ahụ, ha gosikwara na Chineke kwadoro ya. Ụmụazụ mbụ Jizọs rụrụ ọrụ ebube, ndị dị ka ịsụ asụsụ dị iche iche na ịghọta okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ nsọ. (Ọrụ 2:5-12; 1 Ndị Kọrint 12:28-31) Onyinye ọrụ ebube ndị dị otú ahụ baara ọgbakọ Ndị Kraịst uru mgbe ọ ka na-amalite amalite. N’ụzọ dị aṅaa?

Otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na e nwere Akwụkwọ Nsọ ole na ole. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ nanị ndị bara ọgaranya nwere akwụkwọ mpịakọta ma ọ bụ ụdị akwụkwọ ọ bụla ọzọ. N’ala ndị na-ekpere arụsị, ọ dịghị onye maara banyere Bible ma ọ bụ onye chepụtara ya, bụ́ Jehova. Ọ bụ okwu ọnụ ka a ga-eji kụzie ozizi Ndị Kraịst. Onyinye ọrụ ebube ndị ahụ bara uru n’igosi na Chineke ji ọgbakọ Ndị Kraịst na-eme ihe.

Ma Pọl kọwara na onyinye ndị a ga-akwụsị ozugbo ha na-adịghịzi mkpa. “Ọ bụrụ na e nwere onyinye ibu amụma, a ga-ewepụ ha; ọ bụrụ na e nwere ịsụ asụsụ dị iche iche, ha ga-akwụsị; ọ bụrụ na e nwere ihe ọmụma, a ga-ewepụ ya. N’ihi na anyị nwere ihe ọmụma na-ezughị ezu, anyị na-ebukwa amụma n’ụzọ na-ezughị ezu; ma mgbe ihe ahụ nke zuru ezu bịarutere, a ga-ewepụ ihe ahụ nke na-ezughị ezu.”—1 Ndị Kọrint 13:8-10.

Taa, ndị mmadụ pụrụ ịgụ Bible, akwụkwọ ndepụta okwu dị iche iche na akwụkwọ nkà ihe ọmụma. Ihe karịrị nde Ndị Kraịst isii a zụrụ azụ nọ na-enyere ndị ọzọ aka inweta ihe ọmụma Chineke nke dabeere na Bible. N’ihi ya, ọrụ ebube adịghịzi mkpa iji nwapụta na Jizọs Kraịst bụ Onye Nnapụta nke Chineke họpụtara ma ọ bụ iji gosi na Jehova na-akwado ndị ohu ya.