Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ichekwa Ihe E Ji Mara Anyị Dị Ka Ndị Kraịst

Ichekwa Ihe E Ji Mara Anyị Dị Ka Ndị Kraịst

Ichekwa Ihe E Ji Mara Anyị Dị Ka Ndị Kraịst

“Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—AỊSAỊA 43:10.

1. Olee ụdị mmadụ ndị Jehova na-adọtara onwe ya?

MGBE ị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, legharịa anya nke ọma gburugburu gị. Olee ndị ị na-ahụ n’ebe ofufe a? Ị pụrụ ịhụ ndị na-eto eto dị uchu ka ha na-ege ntị nke ọma iji nweta amamihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ. (Abụ Ọma 148:12, 13) O yiri ka ị ga-ahụkwa ndị isi ezinụlọ na-agbalị ime ihe na-amasị Chineke ka ha na-ebi n’ụwa nke na-eme ka ndụ ezinụlọ na-adakpọ adakpọ. Ikekwe, ị ga-ahụ ndị agadi anyị hụrụ n’anya bụ́ ndị ji iguzosi ike n’ihe na-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị ime agadi na-eweta. (Ilu 16:31) Ha nile hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. O nwekwara obi ụtọ iso ha enwe mmekọrịta. Ọkpara Chineke na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.”—Jọn 6:37, 44, 65.

2, 3. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji bụrụ ihe ịma aka ijigidesi ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst ike?

2 Obi ọ́ dịghị anyị ụtọ iso ná ndị nwere nnwapụta na ngọzi Jehova? Ma, ịnọgide na-ejigide ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst ‘n’oge ndị a pụrụ iche nke siri ike obibi’ bụ ihe ịma aka. (2 Timoti 3:1) Ọ dị otú ahụ karịsịa n’ebe ndị na-eto eto bụ́ ndị a na-azụlite n’ezinụlọ Ndị Kraịst nọ. Otu onye ntorobịa dị otú ahụ kwetara, sị: “Ọ bụ ezie na m na-aga nzukọ Ndị Kraịst, enweghị m ihe mgbaru ọsọ a kapịrị ọnụ n’ụzọ ime mmụọ, n’ikwukwa eziokwu, enweghị m ezi ọchịchọ ijere Jehova ozi.”

3 Ọ bụ ezie na ụfọdụ nwere ezi ọchịchọ ijere Jehova ozi, oké nrụgide ndị ọgbọ, mmetụta ụwa na ọchịchọ ime mmehie pụrụ ịdọpụ uche ha. Mgbe a rụgidere anyị n’ụzọ siri ike, ọ pụrụ ime ka ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst jiri nwayọọ nwayọọ na-efunahụ anyị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mmadụ n’ụwa taa na-ele ụkpụrụ omume Bible anya dị ka ihe oge ya gaferela ma ọ bụ ihe na-adịghịzi irè n’ụwa nke oge a. (1 Pita 4:4) Ụfọdụ na-eche na ọ dịghị oké mkpa ife Chineke otú o si chọọ. (Jọn 4:24) N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, Pọl na-ekwu na ụwa nwere “mmụọ,” ma ọ bụ àgwà na-achịkwa ya. (Ndị Efesọs 2:2) Mmụọ ahụ na-arụgide ndị mmadụ ime ihe kwekọrọ n’echiche nke ọha mmadụ nke na-amaghị Jehova.

4. Olee otú Jizọs si mesie ike mkpa ọ dị anyị ichekwa njirimara anyị pụtara ìhè dị ka Ndị Kraịst?

4 Otú ọ dị, dị ka ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, anyị maara na ọ ga-abụrụ onye ọ bụla n’ime anyị—ma nwata ma okenye—ọdachi ịtụfu ihe e ji mara ya dị ka Onye Kraịst. Nanị ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ele onwe anyị anya n’ụzọ ziri ezi dị ka Ndị Kraịst bụ ịgbaso ụkpụrụ Jehova na ime ihe ndị ọ chọrọ anyị n’aka. E kwuwerị, e mere anyị n’onyinyo ya. (Jenesis 1:26; Maịka 6:8) Bible ji njirimara anyị pụtara ìhè dị ka Ndị Kraịst tụnyere uwe elu, bụ́ nke a na-eyi ka mmadụ nile hụ ya. Jizọs dọrọ aka ná ntị banyere oge anyị, sị: “Lee! Ana m abịa dị ka onye ohi. Obi ụtọ na-adịrị onye mụ anya ma na-edebe uwe elu ya, ka o wee ghara ịgba ọtọ na-ejegharị, ndị mmadụ ewee na-elekwasị anya n’ihe ihere ya.” * (Mkpughe 16:15) Anyị achọghị iyipụ àgwà na ụkpụrụ omume Ndị Kraịst anyị ma kwe ka ụwa Setan na-akpụzi anyị. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, “uwe elu” anyị ga-efunahụ anyị. Ihe dị otú ahụ ga-abụ ihe mwute na ihe ihere.

5, 6. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịkwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ?

5 Ijigidesi ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst ike ga-enwe mmetụta dị ukwuu n’otú mmadụ ga-esi bie ndụ ya. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na ihe e ji mara onye na-efe Jehova efunahụ ya, ọ pụrụ ịbụ onye a dọpụrụ uche ya, nke na-enweghị ebe o lekwasịrị anya ma ọ bụ onye na-enweghị ihe mgbaru ọsọ ndị a kapịrị ọnụ. Bible dọrọ aka ná ntị ugboro ugboro banyere ọnọdụ nke inwe uche abụọ dị otú ahụ. Jems onye na-eso ụzọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri nke oké osimiri nke ifufe na-akwagharị ma na-enugharị. N’eziokwu, ka onye ahụ ghara iche na ya ga-anata ihe ọ bụla site n’aka Jehova; ọ bụ onye nwere uche abụọ, onye na-adịghị akwụsi ike n’ụzọ ya nile.”—Jems 1:6-8; Ndị Efesọs 4:14; Ndị Hibru 13:9.

6 Olee otú anyị pụrụ isi chekwaa ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst? Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịghọtakwu ihe ùgwù dị ukwuu anyị nwere ịbụ ndị na-efe Onye Kasị Ihe Nile Elu ofufe? Biko tụlee ụzọ ndị na-esonụ anyị pụrụ isi mee nke a.

Mee Ka A Mara Gị nke Ọma Dị Ka Onye Kraịst

7. Gịnị mere o ji bụrụ ihe bara uru ịrịọ ka Jehova nyochaa anyị?

7 Nọgide na-ewusi mmekọrịta gị na Jehova ike. Ihe onwunwe kasị oké ọnụ ahịa Onye Kraịst nwere bụ mmekọrịta ya na Chineke. (Abụ Ọma 25:14; Ilu 3:32) Ọ bụrụ na anyị amalite inwe obi abụọ banyere ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst, anyị kwesịrị inyocha ọdịdị na ichi anya nke mmekọrịta a nke ọma. Ọbụ abụ ahụ rịọrọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Nwaa m, Jehova, nwapụtakwa m; nụchaa akụrụ m abụọ na obi m.” (Abụ Ọma 26:2) Gịnị mere nnyocha dị otú ahụ ji dị oké mkpa? Ọ bụ n’ihi na anyị onwe anyị apụghị ịghọta ebumnobi na ọchịchọ anyị ndị kasị mie emie nke ọma. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịghọta mmadụ ime anyị—ebumnobi, echiche na mmetụta anyị.—Jeremaịa 17:9, 10.

8. (a) Olee otú Jehova ile anyị ule pụrụ isi baara anyị uru? (b) Olee otú e siworo nyere gị aka inwe ọganihu dị ka Onye Kraịst?

8 Site n’ịgwa Jehova ka o nyochaa anyị, anyị na-agwa ya ka o lee anyị ule. Ọ pụrụ ikwe ka ọnọdụ ga-ekpughe ihe bụ́ nnọọ ebumnobi na ọnọdụ obi anyị bilite. (Ndị Hibru 4:12, 13; Jems 1:22-25) Anyị kwesịrị ịnabata ule ndị dị otú ahụ n’ihi na ha na-enye anyị ohere igosipụta otú anyị na-eguzosiru ike n’ihe nye Jehova. Ha pụrụ igosi ma ànyị ‘zuru ezu ma gbasie ike n’ụzọ nile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ anyị.’ (Jems 1:2-4) Anyị pụkwara ito n’ụzọ ime mmụọ ka a na-ele anyị ule.—Ndị Efesọs 4:22-24.

9. Ịnwapụtara onwe anyị eziokwu Bible ọ̀ bụ ihe anyị ga-eme ma anyị chọọ? Kọwaa.

9 Nwapụtara onwe gị eziokwu Bible. Ihe e ji mara anyị dị ka ndị ohu Jehova pụrụ iji nwayọọ nwayọọ na-efunahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ejighị ihe ọmụma sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ka ọ pụtawanye ìhè. (Ndị Filipaị 1:9, 10) Ọ dị Onye Kraịst ọ bụla—ma nwata ma okenye—mkpa ịnwapụtara onwe ya n’ụzọ na-eju afọ na ihe o kweere bụ n’ezie eziokwu sitere na Bible. Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Na-anwapụtanụ ihe nile; na-ejisikwanụ aka ike n’ihe dị mma.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ndị Kraịst na-eto eto bụ́ ndị nọ n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke aghaghị ịghọta na ha apụghị ịdabere n’okwukwe nke ndị mụrụ ha. Nna Solomọn, bụ́ Devid, gbara ya ume ka ọ ‘mara Chineke nke nna ya, were obi zuru okè, fee Ya ofufe.’ (1 Ihe E Mere 28:9) Ọ gaghị ezu nnọọ ezu Solomọn na-eto eto ikiri otú nna ya si na-ewulite okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ọ ghaghị ịmara Jehova n’onwe ya, o mekwara nke ahụ. Ọ rịọrọ Chineke, sị: “Ugbu a nye m amamihe na ihe ọmụma, ka m wee na-apụ apụ na-abatakwa abata n’ihu ndị nke a.”—2 Ihe E Mere 1:10.

10. Gịnị mere ọ na-ejighị dị njọ iji ezi ebumnobi ajụ ajụjụ?

10 Okwukwe siri ike na-adabere n’ihe ọmụma. “Okwukwe na-esochi ihe a na-anụ,” ka Pọl kwuru. (Ndị Rom 10:17) Gịnị ka o bu n’uche kwuo nke ahụ? Ihe o bu n’uche bụ na site n’ịgụ Okwu Chineke, anyị na-ewusi okwukwe na obi ike anyị nwere na Jehova, nkwa ya na nzukọ ya, ike. Ịjụ ajụjụ ndị sitere n’ezi obi banyere Bible pụrụ ime ka e nweta azịza ndị na-eju afọ. Ọzọkwa, ná Ndị Rom 12:2, anyị na-achọta ndụmọdụ Pọl bụ́: “Na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” Oleezi otú anyị pụrụ isi mee nke a? Ọ bụ site n’inweta “ezi ihe ọmụma banyere eziokwu ahụ.” (Taịtọs 1:1) Mmụọ Jehova pụrụ inyere anyị aka ịghọta ọbụna ihe ndị siri ike nghọta. (1 Ndị Kọrint 2:11, 12) Anyị kwesịrị ikpe ekpere maka enyemaka Chineke mgbe anyị na-aghọtaghị ihe ụfọdụ. (Abụ Ọma 119:10, 11, 27) Jehova chọrọ ka anyị ghọta Okwu ya, kwere na ya ma rubere ya isi. Ọ na-aza ajụjụ ndị e ji ezi ebumnobi jụọ.

Kpebisie Ike Ime Ihe Ga-amasị Chineke

11. (a) Olee ọchịchọ ebumpụta ụwa nke pụrụ ịmata anyị n’ọnyà? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nweta obi ike iji guzogide nrụgide ndị ọgbọ?

11 Na-agbalị ime ihe ga-amasị Chineke, ọ bụghị mmadụ. Ọ bụ nnọọ ihe e bu pụta ụwa ime ka a mata anyị ruo n’ókè ụfọdụ site n’isonye n’òtù. Enyi dị onye ọ bụla mkpa, mmadụ ịbụ onye a nakweere na-eme ka obi dị ya mma. Nrụgide ndị ọgbọ na-esi ike n’oge uto—tinyekwara mgbe mmadụ torola—na-eme ka mmadụ na-enwe ọchịchọ siri ike nke iṅomi ndị ọzọ ma ọ bụ ime ihe ga-amasị ha. Ma ndị enyi na ndị ọgbọ adịghị ebu ọdịmma anyị kasị mma n’obi mgbe nile. Mgbe ụfọdụ, nanị ihe ha na-achọ bụ onye ga-eso ha mee ihe ọjọọ. (Ilu 1:11-19) Mgbe nrụgide na-adịghị mma nke ndị ọgbọ nwetara Onye Kraịst, onye ahụ na-agbalịkarị izochi onye ọ bụ. (Abụ Ọma 26:4) Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu agbasola akparamàgwà nke ụwa gbara unu gburugburu.” (Ndị Rom 12:2, The Jerusalem Bible) Jehova na-enye anyị ume ime mmụọ dị anyị mkpa iji guzogide mmetụta ọ bụla sitere n’aka ndị ọzọ iji mee ka anyị gbasoo ụkpụrụ ụwa.—Ndị Hibru 13:6.

12. Olee ụkpụrụ na ihe atụ pụrụ ime ka anyị kwụsie ike mgbe a nwara anyị ọnwụnwa ịghara ịtụkwasị Chineke obi?

12 Mgbe ndị ọzọ nwara ịrụgide anyị ichefu na anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị icheta na anyị iguzosi ike n’ihe nye Chineke dị nnọọ mkpa karịa echiche nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ma ọ bụ ihe na-ewuru ha. Ihe e kwuru n’Ọpụpụ 23:2 bụ ụkpụrụ bara uru ịgbaso: “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche.” Mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị Izrel ibe ya nwere obi abụọ n’ike Jehova nwere imezu nkwa Ya, Keleb jụrụ nnọọ ịgbaso ihe ka ọtụtụ. O ji nnọọ n’aka na a pụrụ ịtụkwasị nkwa Chineke obi, a gọzikwara ya n’ụba maka nguzo ya. (Ọnụ Ọgụgụ 13:30; Joshua 14:6-11) Ị̀ dịkwa njikere iguzogide nrụgide nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ iji nwee ike ichekwa mmekọrịta gị na Chineke?

13. Gịnị mere o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya anyị ime ka a mara anyị dị ka Ndị Kraịst?

13 Mee ka a mara na ị bụ Onye Kraịst. Ọ bụrụ na anyị ebute ụzọ n’ime ka ndị ọzọ mara anyị dị ka Ndị Kraịst, ọ ga-abụrụ anyị ihe nchebe. Mgbe e guzogidere mgbalị ha ime uche Jehova n’ụbọchị Ezra, ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi kwuru, sị: “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu nke Chineke nke eluigwe na nke ụwa.” (Ezra 5:11) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka omume na nkatọ nke ndị na-enweghị omume enyi metụta anyị, ụjọ pụrụ ijichi anyị. Ịchọ ime ihe ga-amasị mmadụ nile ga-eme ka anyị ghara ịdị irè. Ya mere, ekwela ka e menye gị egwu. Ọ na-adị mma mgbe nile ime ka ndị ọzọ mara nke ọma na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ị pụrụ iji nkwanye ùgwù na nkwenye siri ike kọwaara ndị ọzọ ụkpụrụ gị, nkwenkwe gị, na ọnọdụ gị dị ka Onye Kraịst. Mee ka ndị ọzọ mara na i kpebisiwo ike ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu nke Jehova. Mee ka ọ pụta ìhè na ị ghaghị iguzosi ike n’ezi ihe dị ka Onye Kraịst. Gosi na i ji ụkpụrụ omume ọma gị anya isi. (Abụ Ọma 64:10) Iguzopụ iche dị ka Onye Kraịst na-eguzosi ike n’ihe pụrụ iwusi gị ike, ichebe gị, ọbụna ịkpali ndị ọzọ ịjụ ajụjụ banyere Jehova na ndị ya.

14. Ịkwa emo ma ọ bụ mmegide hà kwesịrị ime ka anyị daa mbà? Kọwaa.

14 Ee, ụfọdụ pụrụ ịkwa gị emo ma ọ bụ megide gị. (Jud 18) Ọ bụrụ na ndị ọzọ anabataghị mgbalị gị ịkọwara ha ụkpụrụ gị, adala mbà. (Ezikiel 3:7, 8) N’agbanyeghị otú mkpebi gị siruru n’ike, ị pụghị ime ka ndị na-achọghị ikwere ihe ị na-agwa ha kweta. Cheta Fero. Ọ dịghị ihe otiti ma ọ bụ ọrụ ebube—ọbụna ọnwụ nke ọkpara ya—mere ka Fero kweta na Mozis na-ekwuchitere Jehova. Ya mere, ekwela ka ụjọ mmadụ jichie gị. Obi ike na okwukwe na Chineke pụrụ inyere anyị aka imeri ụjọ.—Ilu 3:5, 6; 29:25.

Leghachi Anya Azụ, Tọọ Ntọala Maka Ọdịnihu

15, 16. (a) Gịnị bụ ihe nketa ime mmụọ anyị? (b) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’iji Okwu Chineke na-atụgharị uche n’ihe nketa ime mmụọ anyị?

15 Jiri ihe nketa ime mmụọ gị kpọrọ ihe. Site n’iji Okwu Chineke eme ihe, Ndị Kraịst ga-erite uru n’ịtụgharị uche n’ihe nketa ime mmụọ ha bara ụba. Ihe nketa a na-agụnye eziokwu nke Okwu Jehova, olileanya nke ndụ ebighị ebi, na ihe ùgwù nke ịnọchi anya Chineke dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. Ị̀ pụrụ ịhụ òkè ị na-ekere n’etiti Ndịàmà ya, n’etiti ìgwè nwere ihe ùgwù bụ́ ndị e nyere ọrụ nkwusa Alaeze na-azọpụta ndụ? Cheta na ọ bụ Jehova n’onwe ya kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m.”—Aịsaịa 43:10.

16 Ị pụrụ ịjụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee otú ihe nketa ime mmụọ a dịruru oké ọnụ ahịa nye m? Èji m ya akpọrọ ihe ruo n’ókè nke na m ga-eme ka ime uche Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ m? Ekele m nwere maka ya ò siri ike nke na ọ ga-eme ka m nwee ike iguzogide ọnwụnwa ọ bụla nke pụrụ ime ka o funahụ m?’ Ihe nketa ime mmụọ anyị pụkwara ime ka anyị nwee nnọọ nchebe ime mmụọ bụ́ nke a pụrụ ịnụ ụtọ ya nanị ná nzukọ Jehova. (Abụ Ọma 91:1, 2) Ịtụleghachi ihe ndị dị ịrịba ama merenụ n’akụkọ ihe mere eme nke nzukọ Jehova nke oge a pụrụ ime ka anyị ghọta na ọ dịghị onye ma ọ bụ ihe pụrụ ikpochapụ ndị Jehova n’ụwa.—Aịsaịa 54:17; Jeremaịa 1:19.

17. Olee ihe ọzọ dị mkpa ma e wezụga nanị ịdabere n’ihe nketa ime mmụọ anyị?

17 N’ezie, anyị apụghị ịdabere nanị n’ihe nketa ime mmụọ anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịzụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe Chineke nọ. Mgbe Pọl tinyesịrị mgbalị siri ike n’iwulite okwukwe Ndị Kraịst nọ na Filipaị, o degaara ha akwụkwọ ozi, sị: “N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, otú ahụ unu siworo rube isi mgbe nile, ọ bụghị nanị mgbe m nọ ya, kama site n’obi unu n’ụzọ ka nnọọ ukwuu ugbu a m na-anọghị ya, nọgidenụ jiri egwu na ịma jijiji na-arụpụta nzọpụta nke onwe unu.” (Ndị Filipaị 2:12) Anyị apụghị ịdabere n’ebe onye ọzọ nọ maka nzọpụta anyị.

18. Olee otú ọrụ Ndị Kraịst si eme ka anyị na-egosipụtakwu onwe anyị dị ka Ndị Kraịst?

18 Mikpuo onwe gị n’ozi Ndị Kraịst. E kwuwo na “ọrụ mmadụ na-ekpebi ụdị onye ọ bụ.” E nyela Ndị Kraịst nke taa ọrụ dị oké mkpa nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobere eguzobe. Pọl kwusara, sị: “Ebe m bụ n’ezie onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m eme ka ije ozi m nwee ùgwù.” (Ndị Rom 11:13) Ọrụ nkwusa anyị na-eme ka anyị pụọ iche site n’ụwa, ikere òkè na ya na-emekwu ka a mata anyị dị ka Ndị Kraịst. Imikpu onwe anyị n’ihe omume ọchịchị Chineke ndị ọzọ, dị ka nzukọ Ndị Kraịst, owuwu nke ebe ofufe, ọrụ nke inyere ndị nọ ná mkpa aka na ihe ndị yiri ha pụrụ ime ka anyị na-egosipụtakwu onwe anyị dị ka Ndị Kraịst.—Ndị Galeshia 6:9, 10; Ndị Hibru 10:23, 24.

Ime Ka A Mata Gị nke Ọma Dị Ka Onye Kraịst Na-eweta Ngọzi Ndị A Na-ahụ Anya

19, 20. (a) Olee abamuru ndị i nwetaworo n’onwe gị n’ihi ịbụ Onye Kraịst? (b) Olee ihe na-enyere anyị aka inwe nnọọ echiche dị mma banyere onwe anyị?

19 Jiri obere oge tụgharịa uche n’ọtụtụ abamuru ndị anyị na-enweta n’ihi na anyị bụ ezi Ndị Kraịst. Anyị nwere ihe ùgwù nke ịbụ ndị Jehova maara n’otu n’otu. Malakaị onye amụma kwuru, sị: “Ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.” (Malakaị 3:16) Chineke pụrụ ile anyị anya dị ka ndị enyi ya. (Jems 2:23) Anyị nwere ezi nzube na ihe mgbaru ọsọ ná ndụ. E nyewokwa anyị olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:9.

20 Cheta na ọ bụ Chineke, ọ bụghị ihe ndị mmadụ na-eche banyere gị, na-ekpebi ụdị onye ị bụ n’ezie. Ndị ọzọ pụrụ ile anyị anya dabere n’ụkpụrụ na-ezughị okè nke ụmụ mmadụ. Ma ịhụnanya Chineke na mmasị o nwere n’ebe anyị nọ na-eme ka anyị lee onwe anyị anya dị ka ndị bara uru—anyị bụ ndị nke ya. (Matiu 10:29-31) N’aka nke ya, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ pụrụ ime ka anyị nwee echiche kasị mma banyere onwe anyị ma nwee ihe mgbaru ọsọ ndị kasị mma ná ndụ. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya, onye a bụ onye Ọ maara.”—1 Ndị Kọrint 8:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Okwu ndị ahụ pụrụ izo aka n’ọrụ onyeisi nke ugwu ụlọ nsọ dị na Jeruselem. N’oge nche abalị, ọ na-agagharị n’ụlọ nsọ iji hụ ma ndị Livaị na-eche nche hà mụ anya ka hà na-ehi ụra n’ebe ha na-eche nche. A na-apịa onye nche ọ bụla a hụrụ ka ọ na-ehi ụra ihe, a pụkwara ịgba uwe elu ya ọkụ dị ka ntaramahụhụ iji menye ya ihere.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka Ndị Kraịst chekwaa ihe e ji mara ha n’ụzọ ime mmụọ?

• Olee otú anyị pụrụ mee ka a mara anyị nke ọma dị ka Ndị Kraịst?

• Mgbe anyị na-aghaghị ikpebi onye anyị ga-eme ihe ga-amasị ya, olee ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ziri ezi?

• Olee otú ime ka a mata anyị nke ọma dị ka Ndị Kraịst pụrụ isi kpụzie ọdịnihu anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Imikpu onwe anyị n’ihe omume Ndị Kraịst na-eme ka anyị na-egosipụtakwu onwe anyị dị ka Ndị Kraịst