Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Agha Ndị E Ji Ọnụ Alụ—N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Emerụ Ahụ́?

Agha Ndị E Ji Ọnụ Alụ—N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Emerụ Ahụ́?

Agha Ndị E Ji Ọnụ Alụ—N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Emerụ Ahụ́?

“Olee ebe agha sitere, oleekwa ebe ọgụ ndị a na-alụ n’etiti unu sitere?”—JEMS 4:1.

Ọ BỤGHỊ ìgwè ndị agha Rom, bụ́ ndị nọ mgbe ahụ na-alụ agha iweghara obodo dị iche iche, ka Jems onye so dee Bible jụrụ ajụjụ a; ọ nọghịkwa na-achọ ịmata ihe kpatara agha okpuru nke ndị Sicarii nke ndị Juu, ma ọ bụ Ndị Ikom Na-eji Mma Daga, na narị afọ mbụ O.A. Ihe Jems bu n’uche bụ esemokwu nke pụrụ ịdị nanị n’etiti mmadụ abụọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na dị nnọọ ka agha, agha nke mmadụ abụọ na-alụ na-ebibi ihe. Tụlee akụkọ Bible ndị a.

Ụmụ nke nna ochie ahụ bụ́ Jekọb kpọrọ nwanne ha nwoke bụ́ Josef asị nke ukwuu nke na ha rere ya ịbụ ohu. (Jenesis 37:4-28) Mgbe nke ahụ gasịrị, Eze Sọl nke Izrel gbalịrị igbu Devid. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ nọ na-enwere Devid anyaụfụ. (1 Samuel 18:7-11; 23:14, 15) Na narị afọ mbụ, arụmụka nke ndị inyom abụọ bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ Yuodia na Sintiki, kpaghasara udo nke ọgbakọ.—Ndị Filipaị 4:2.

N’oge ndị na-adịchabeghị anya, ndị mmadụ jiri ọgụ ihu na ihu nke mmadụ abụọ dozie esemokwu ha, na-amarịta onwe ha mma ma ọ bụ na-agbarịta onwe ha égbè. A na-egbukarị otu n’ime ha ma ọ bụ nye ya nkwarụ nke ga-adịgide ogologo ndụ ya nile. Taa, ngwá agha ndị na-ese okwu na-ejikarị eme ihe bụ okwu ndị na-akpasu iwe ma na-egbu mmụọ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na a kwafughị ọbara, ọgụ ndị e ji ọnụ alụ na-emebi obi mmadụ na aha ọma ya. Ọ bụ ndị aka ha dị ọcha na-atakarị ahụhụ ‘n’agha’ ndị a.

Tụlee ihe mere afọ ole na ole gara aga mgbe otu ụkọchukwu Anglịkan boro ụkọchukwu ọzọ ebubo na o riri ego chọọchị. Ndị mmadụ nụrụ banyere esemokwu ha, ndị chọọchị ha kewakwara gaa n’ìgwè abụọ na-eburịta agha. Ụfọdụ ndị chọọchị ahụ adịghị aga chọọchị ma ọ bụrụ na ọ bụ ụkọchukwu nke ha na-emegide ga-ekwu okwuchukwu. Ha kpọrọ ibe ha asị nke ukwuu nke na ha adịghịzi atụpụrụ ibe ha ọnụ ma ha bịa chọọchị. Mgbe e kwuru na ụkọchukwu nke ahụ na-ebo nke ọzọ ebubo akwaala iko, esemokwu ahụ rịrị elu.

Achịbishọp nke Canterbury rịọrọ ndị ụkọchukwu abụọ ahụ arịrịọ ka ha kpezie, na-akpọ ọgụ ha “ọrịa cancer” na “akụkọ ọjọọ nke na-ewetara aha Onyenwe Anyị nkọcha.” Na 1997, otu n’ime ndị ụkọchukwu ahụ kwetara ịla ezumike nká. Onye nke ọzọ nọgidere n’ọkwá ya ruo mgbe o ruru afọ e ji ala ezumike nká. Otú ọ dị, ọ nọgidere ruo nnọọ ụbọchị ikpeazụ o nwere ike ịnọ, ọ lara ezumike nká n’ụbọchị ọ gbara afọ 70, n’August 7, 2001. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Church of England Newspaper kwuru na ụbọchị ọ lara ezumike nká bụ ụbọchị oriri “Sentị” Victricius. Ònye bụ “Sentị” Victricius? Ọ bụ bishọp dịrị ndụ na narị afọ nke anọ bụ́ onye e kwuru na a pịara ihe n’ihi na ọ jụrụ ịga agha. N’ikwu banyere ihe dị iche n’àgwà “sentị” ahụ na nke ụkọchukwu ahụ na-ala ezumike nká, akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “[Ụkọchukwu ahụ na-ala ezumike nká] ajụghị ịlụ ọgụ chọọchị.”

Ndị ụkọchukwu ahụ pụrụ izerewo imerụ onwe ha na ndị ọzọ ahụ́ ma a sị na ha tinyere ndụmọdụ dị ná Ndị Rom 12:17, 18 n’ọrụ, nke bụ́: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Na-emenụ ndokwa maka ihe ndị dị mma n’anya mmadụ nile. Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.”

Gịnị banyere gị? Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ gị, iwe ọ̀ na-eduga gị n’iji ọnụ alụ ọgụ? Ka ị̀ na-ezere iji okwu ọjọọ eme ihe ma na-achọ ime udo? Ọ bụrụ na i mejọọ mmadụ, ị̀ na-ezere onye ahụ ma nwee olileanya na onye ahụ ga-echefu ya ka oge na-aga? Ka ị̀ na-arịọ mgbaghara n’egbughị oge? Ma ị̀ na-arịọ mgbaghara ma ị̀ gbaghaara onye ọzọ, ịgbalị ime udo ga-eme ka i nwekwuo ahụ́ ike. Ndụmọdụ Bible pụrụ inyere anyị aka idozi ọbụna esemokwu ndị dịterela aka, dị ka isiokwu na-esonụ na-egosi.