Akụkọ Banyere Africa
Akụkọ Banyere Africa
Ọnụ ọgụgụ ala: 56
Ọnụ ọgụgụ mmadụ: 770,301,093
Ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa: 983,057
Ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible: 1,769,182
Ị̀ MAARA na a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ógbè Sahara? Nafissatou dị afọ 17 bi n’obodo a na-egwupụta ihe na ya nke dị n’ebe ugwu Niger. Mgbe mkparịta ụka nke dị n’etiti ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe ya gafeere n’ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, Nafissatou si ebe ahụ pụọ. Otu nwa akwụkwọ sooro ya ma jụọ ya ihe na-eme ya. Nafissatou zaghachiri na ya enweghị mmasị n’ụdị mkparịta ụka ahụ. Na mbụ, nwata nwanyị ahụ kwara ya emo, na-ekwu na nanị ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ apụghị ịkpatara mmadụ ihe ọjọọ. Nafissatou zaghachiri na ọ dị nnọọ njọ ikiri ihe ndị dị otú ahụ n’ihi na Onye Okike adịghị anabata ha. O wepụtaziri akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè n’akpa akwụkwọ ya ma gosi nwata nwanyị ahụ ebe kwuru banyere ihe ize ndụ ndị dị n’ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. O wepụtakwara Bible ya ma gụọrọ nwata nwanyị ahụ 2 Ndị Kọrint 7:1. Nwata nwanyị ahụ kwetara na ya na-enwe mkpali ndị siri ike ya na-apụghị ịkọwa mgbe ọ bụla ya kiriri vidio ndị na-egosi omume rụrụ arụ. Ọ rịọrọ ka e nye ya otu akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ. Nafissatou nyere ya otu, o mesịrị kwuo, sị: “Mgbe ọzọ m hụrụ ya, nanị ya nọ, ya mere m jụrụ ebe ndị enyi ya nọ. O kwuru, sị, ‘Ọ bụ akwụkwọ a bụ enyi m.’ Amalitere m ịmụrụ ya ihe, ọ bịakwara Ememe Ncheta.”
Ihe karịrị afọ 15 gara aga, otu nwanna nwanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ mụụrụ otu nwanyị Bible na Tanzania. E duziri ọmụmụ ihe ahụ ruo ọtụtụ afọ. Nwanyị ahụ lara azụ iguzosi ike n’eziokwu ahụ n’ihi mmegide sitere n’aka ndị ezinụlọ ya, e mesịkwara kwụsị ọmụmụ ihe ahụ. Otú ọ dị, ụmụ ya nwanyị abụọ na-eto eto na-anọ jụụ ma na-ege ntị ka nne ha na-amụ ihe. Mgbe nwa ya nwanyị nke ka okenye pụrụ n’ụlọ ha mgbe ọ gbara afọ 18, ọ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ozugbo ma rịọ ka a mụwara ya ihe. O nwere ọganihu dị ngwa, e meekwa ya baptizim. Nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ rịọkwara ka a mụwara ya Bible, e mekwara ya baptizim. Nne ha, bụ́ onye nguzo ụmụ ya weere maka eziokwu gbara ume, kpebiri ịmaliteghachi ịmụ Bible. N’oge a, o meriri ụjọ mmadụ bụ́ nke dọghachiburu ya azụ, e mekwara ya baptizim ná mgbakọ sekit e nwere na May 2004.
Mgbe ọgbakọ rubere isi n’iwu nke “ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha,” Jehova na-agọzi ha n’ezie. (Jems 1:27) Nke a bụ nnọọ ihe mere n’otu ọgbakọ dị na Lesotho. Otu n’ime ndị nkwusa e mere baptizim n’ọgbakọ ahụ bụ nne nanị ya na-azụ ụmụ aha ya bụ Mapolo, bụ́ onye nwere ụmụ nwoke anọ na-eto eto. Mapolo maara na ya na-arịa ọrịa ga-egbu ya, ọ kwadebekwara ụmụ ya ilekọta onwe ha. O sooro ha mụọ Bible, kpọrọ ha gaa nzukọ, kụziekwara ha ka e si apị ázị́zà, bụ́ nke ha ga na-ere n’akụkụ ụzọ. Mgbe Mapolo nwụrụ na 1998, nne nne ụmụ mgbei ahụ lekọtawaziri ha. Nwanna nwanyị onye ozi ala ọzọ ahụ nke nyeere Mapolo aka ịghọ Onyeàmà e mere baptizim gakwuuru ụlọ ọrụ na-ahụ maka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ n’ihi ụmụ mgbei ahụ ma nata ha ego e ji akwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ. Ndịàmà ndị ọzọ nyere ụmụaka ahụ uwe. Nne nne ha mechara nwụọ. Otu nwanna nwoke nọ n’ọgbakọ ahụ mụụrụ ha Bible ma na-akwụrụ ha ụgwọ ụlọ. Ụmụaka anọ ahụ na-agachi nzukọ anya. Abụọ bụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, nke tọchara ha, bụ́ Rantso, dị afọ 20 ugbu a, e mere ya baptizim ná mgbakọ sekit e nwere na March 2004. O duziiri nwa nwanne nne ya, bụ́ Retselisitsoe, ọmụmụ Bible, bụ́ onye e mere baptizim n’ụbọchị ahụ e mekwara ya. Rantso kwupụtara ekele miri emi o nwere maka nlekọta ịhụnanya ụmụnna nyeworo ya na ụmụnne ya ruo ọtụtụ afọ.
Otu onye ozi ala ọzọ na Cameroon na-akọ, sị: “Kwa izu, ka m na-amụrụ otu nwa okorobịa Bible, m na-anụ ka otu onye na-agụ egwu chọọchị n’ime ụlọ. Ajụrụ m onye ahụ m na-amụrụ ihe, sị, ‘Ònye bụ ọgụ egwu a a na-adịghị ahụ anya?’ Ọ bụ nwanne ya nwoke kpuru ìsì, bụ́ Stephen. N’iji kaseti a na-egere egere nke broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? eme ihe, amalitere m iduziri Stephen ọmụmụ Bible. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ibu otu amaokwu Bible n’isi n’oge ọ bụla anyị mụrụ ihe. Stephen na-echeta ihe nke ọma, ọ mụtakwara ọtụtụ amaokwu Bible. Ọ na-agachikwa nzukọ anya ma na-aza ajụjụ mgbe mgbe. N’oge na-adịchabeghị anya, o mere ihe omume mbụ ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ bụ ọgụgụ Bible, ebe ọ bụkwa na Stephen amaghị ka e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, o buru ya n’isi. Ana m atụ anya mgbe m ga-esere Stephen n’aka ma soro ya gaa ozi n’oge na-adịghị anya. Otu n’ime amaokwu Bible ndị kasị amasị Stephen bụ Aịsaịa 35:5, bụ́ nke na-ekwu, sị: ‘A ga-emeghe anya ndị ìsì.’ Stephen na-aṅụrị ọṅụ na e megheworị anya ime mmụọ ya, ọ na-abụkwa abụ otuto ugbu a nye Jehova, na-ekele ya n’ihi na a ga-emeghekwa anya nkịtị ya n’ọdịnihu.”
Na Liberia nke agha tisasịrị, otu nwanyị aha ya bụ Nancy gakwuuru otu Onyeàmà ma rịọ ya ka ọ mụwara ya Bible. Pastọ chọọchị ya gwara ya na Chineke ga-atụba Ndịàmà Jehova na hel n’ihi na ha bụ Ndị Kraịst ụgha. Otú ọ dị, o bidebere ụfọdụ Ndịàmà, ọ hụkwara na mgbe ọ bụla a kwụsịtụrụ ịgba égbè, ndị okenye nke ọgbakọ dị n’ebe ahụ na-agakarị ele otú ụmụnna ha mere. Ọ chọpụtakwara na Ndịàmà na-eji oge ọ bụla dịtụ jụụ ekwusara ndị ọzọ ozi ọma. A kpaliri mmasị Nancy na nke ọtụtụ ndị ọzọ n’obodo ahụ mgbe ọ bụ ụgbọala si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova bụ ụgbọala mbụ butere ihe enyemaka ndị dị nnọọ mkpa, bụ́ ndị Ndịàmà nọ na France na Belgium nyere n’afọ ofufo. O kwuru, sị: “Echere m na ihe unu na-akụzi bụ eziokwu.” O nwere nnọọ ọganihu n’ọmụmụ ihe ya.
Otu nwa okorobịa bụ́ onye na-edo ụlọ bịara n’otu obodo nta dị na Uganda ịrụ ọrụ n’ụlọ ebe ụmụnna na-enwe nzukọ. Otu n’ime ndị ọsụ ụzọ jiri ohere ahụ gbaara onye ahụ na-edo ụlọ àmà, o nwekwara mmasị n’ihe ọ nụrụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọ laghachiri n’obodo ya bụ́ nke dị n’ugwu. Ebe ọ bụ na e nweghị Ndịàmà n’ebe nwoke ahụ bi, onye ọsụ ụzọ ahụ kọwaara ya ebe ọ pụrụ ịchọta Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị dịrị ya nso. Nwa okorobịa ahụ gbaara ịnyịnya ígwè ya gaa ihe dị ka kilomita 30 n’ụzọ dị warara nke uzuzu jupụtara na ya bụ́ nke dị ná mkpọda ugwu ịga chọọ ụmụnna. Ebe ọ na-ahụghị onye ọ bụla n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, o dere ihe ná mpempe akwụkwọ ma si n’oghere dị n’okpuru ụzọ mịba ya, na-arịọ ka a bịa mụọrọ ya Bible. O juru onye ọsụ ụzọ mesịrị gaa ịchọ ya n’obodo ya anya ịhụ na ihe dị ka narị mmadụ abụọ nọ na-eche ịnụ ozi Bible! Ọtụtụ n’ime ha gosiri ezi mmasị n’ịmụ Bible. A na-enwe nzukọ ugbu a n’ebe a dịpụrụ adịpụ.
N’otu uhuruchi n’otu obodo nta nke ihe dị ka narị mmadụ isii bi na ya bụ́ nke dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria, ndị obodo ahụ hụrụ onyinyo nke ọkụ na-enwu n’elu n’ime osimiri. O yiri ka ọkụ ahụ ọ̀ nọ na-abịa ebe ha nọ, n’ihi ya ndị obodo ahụ gbara ọsọ maka ndụ ha. Ọtụtụ chere na ọ bụ mbibi ahụ Ndịàmà Jehova nọworo na-ekwusa banyere ya, ya mere, ha gbagara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-ekwu, sị, “Amagedọn agaghị ebibi ụlọ a.” Mgbe e mesịrị, n’ihe dị ka elekere anya iri nke abalị, ndị obodo ahụ chọpụtara na onyinyo ahụ bụ nke ọkụ nọ na-agba n’oké ọhịa. Mgbe ụmụnna jụrụ ndị obodo ahụ ihe mere na ha agbagaghị n’ụlọ chọọchị ndị dị nso, otu nwoke zaghachiri, sị: “Chọọchị ndị ọzọ bụ chọọchị iberibe. Amagedọn unu ga-ebibi ha ma ọ gaghị ebibi Ụlọ Nzukọ Alaeze.”