Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alụmdi na Nwunye Pụrụ Ịga nke Ọma n’Ụwa nke Taa

Alụmdi na Nwunye Pụrụ Ịga nke Ọma n’Ụwa nke Taa

Alụmdi na Nwunye Pụrụ Ịga nke Ọma n’Ụwa nke Taa

“Yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—NDỊ KỌLỌSI 3:14.

1, 2. (a) Olee ihe na-agba ume a na-ahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst? (b) Olee ihe bụ alụmdi na nwunye na-aga nke ọma?

MGBE anyị lere anya n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ́ bụghị ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ọtụtụ ndị di na nwunye kwesịworo ntụkwasị obi nye onwe ha ruo afọ 10, 20, 30, ma ọ bụ karịa? Ha anọkọtawo ọnụ n’oge ihe siri ike na n’oge ihe dị mma.—Jenesis 2:24.

2 Ihe ka ọtụtụ ga-ekweta na alụmdi na nwunye ha agachabeghị nnọọ siriri werere. Otu ọkachamara dere, sị: “Alụmdi na nwunye ndị na-aga nke ọma na-enwekwa nsogbu. Ha na-enwe oge obi ụtọ na oge ihe isi ike . . . Ma n’ụzọ ụfọdụ . . . ndị a anọgidewo n’alụmdi na nwunye ha n’agbanyeghị [ọgba aghara] nke ndụ nke oge a.” Ndị di na nwunye na-enwe ihe ịga nke ọma amụtawo ụzọ isi nagide oge ihe isi ike na nchekasị bụ́ ndị na-aghaghị ibilite n’alụmdi na nwunye, karịsịa ma ọ bụrụ na ha zụrụ ụmụ. Site n’ahụmahụ ha, ndị di na nwunye dị otú ahụ amụtawo na ezi ịhụnanya “adịghị ada ada.”—1 Ndị Kọrint 13:8.

3. Olee ihe ọnụ ọgụgụ ndị e nwetaworo na-egosi banyere alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm, na-eduga n’ajụjụ ndị dị aṅaa?

3 N’ụzọ dị iche na nke a, ọtụtụ nde alụmdi na nwunye etisawo. Otu akụkọ na-ekwu, sị: “A na-atụ anya na ọkara nke ndị di na nwunye e nwere na United States taa ga-agba alụkwaghịm. Ọkara n’ime ha [ndị di na nwunye ahụ] ga-agbakwa ya tupu alụmdi na nwunye ha ana-eru afọ 8 . . . N’ime pasent 75 nke ndị lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye, pasent 60 ga-agba alụkwaghịm ọzọ.” Ihe amalitewo ịgbanwe ọbụna ná mba ndị a na-adịbughị agbakarị alụkwaghịm na ha. Dị ka ihe atụ, na Japan, ịgba alụkwaghịm fọrọ nke nta ka ọ rịa elu okpukpu abụọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Olee nsogbu ụfọdụ ndị dugara n’ọnọdụ a, bụ́ nsogbu ndị a na-ahụ mgbe ụfọdụ ọbụna n’ọgbakọ Ndị Kraịst? Olee ihe dị mkpa iji mee ka alụmdi na nwunye nwee ihe ịga nke ọma n’agbanyeghị mgbalị ndị Setan na-eme iji mebie ndokwa a?

Ọnyà Ndị A Ga-ezere

4. Olee ihe ụfọdụ pụrụ imebi alụmdi na nwunye?

4 Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịghọta ihe ndị pụrụ imebi alụmdi na nwunye. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Pọl onyeozi kwuru banyere ọnọdụ ndị a ga-enwe n’ụbọchị ikpeazụ ndị a: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya; gbakụtakwa ndị a azụ.”—2 Timoti 3:1-5.

5. N’ihi gịnị ka a ga-eji kwuo na ‘onye hụrụ onwe ya n’anya’ na-etinye alụmdi na nwunye ya n’ihe ize ndụ, gịnịkwa ka Bible dụrụ n’ọdụ n’akụkụ a?

5 Ọ bụrụ na anyị enyochaa okwu Pọl, anyị ga-ahụ na ọtụtụ n’ime ihe ndị o depụtara pụrụ itisa alụmdi na nwunye. Dị ka ihe atụ, “ndị hụrụ onwe ha n’anya” na-eche nanị banyere ọdịmma onwe ha, ha adịghịkwa echebara ndị ọzọ echiche. Ndị di ma ọ bụ ndị nwunye hụrụ nanị onwe ha n’anya na-ekpebisi ike inweta ihe ha chọrọ. Ha adịghị ekwe ekwe. Àgwà dị otú ahụ ọ̀ ga-eme ka e nwee alụmdi na nwunye obi ụtọ? Ọ dịghị ma ọlị. Pọl onyeozi nyere Ndị Kraịst, gụnyere ndị di na nwunye ndụmọdụ a amamihe dị na ya: “[Unu ekwesịghị] ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama site n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara unu, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.

6. Olee otú ịhụ ego n’anya pụrụ isi mebie alụmdi na nwunye?

6 Ịhụ ego n’anya pụrụ ikewa di na nwunye. Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.” (1 Timoti 6:9, 10) Ọ bụ ihe dị mwute na ihe Pọl dọrọ aka ná ntị banyere ya emewo n’ọtụtụ alụmdi na nwunye taa. N’ihi ịchụ ego, ọtụtụ ndị di na nwunye na-eleghara mkpa nwunye ma ọ bụ di ha anya, gụnyere mkpa bụ́ isi nke ịkwado nwunye ma ọ bụ di ha n’ụzọ mmetụta uche na iji obi ụtọ na-anọnyere ya n’ụzọ chiri anya.

7. N’ọnọdụ ụfọdụ, olee àgwà dugaworo n’ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye?

7 Pọl kwukwara na ụfọdụ ndị n’ụbọchị ikpeazụ ndị a ga-abụ “ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla.” Nkwa alụmdi na nwunye bụ nkwa siri ike nke kwesịrị iduga ná nkekọ na-adịgide adịgide, ọ bụghị n’aghụghọ. (Malakaị 2:14-16) Otú ọ dị, ụfọdụ amalitewo inwe mmasị mmekọahụ n’ebe ndị na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha nọ. Otu nwanyị dị afọ 30 na ụma, bụ́ onye di ya hapụrụ kọwara na ọbụna tupu di ya ahapụ ya, ọ na-akpa ụmụ nwanyị ndị ọzọ nso ma na-egosi mmasị n’ebe ha nọ gabiga ókè. Ọ ghọtaghị ihe bụ́ àgwà kwesịịrị nwoke lụrụ nwanyị. Nwunye ya nwere mwute dị ukwuu mgbe ọ hụrụ ihe na-emenụ ma nwaa iji akọ dọọ ya aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ọ na-etinye aka na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, nwoke ahụ kwara iko. Ọ bụ ezie na e ji obiọma dọọ nwoke ahụ na-emejọ emejọ aka ná ntị, ọ chọghị ịṅa ntị. Ọ dabara nnọọ n’ọnyà ahụ.—Ilu 6:27-29.

8. Olee ihe pụrụ iduga n’ịkwa iko?

8 Lee ka Bible si na-enye ịdọ aka ná ntị doro anya megide ịkwa iko! “Onye [na-akwaso] nwanyị iko, obi amamihe kọrọ ya: onye na-emebi mkpụrụ obi nke aka ya ka onye na-eme ya bụ.” (Ilu 6:32) Ịkwa iko anaghị abụkarị ihe a na-eme n’otu ntabi anya, ná ndapụta. Dị ka Jems onye so dee Bible kwuru, a na-emekarị mmehie dị ka ịkwa iko mgbe ọ batasịrị mmadụ n’uche, onye ahụ echeekwa echiche banyere ya ruo oge ụfọdụ. (Jems 1:14, 15) Di ma ọ bụ nwunye ahụ na-emejọnụ na-eji nwayọọ nwayọọ kwụsị ikwesị ntụkwasị obi nye nwunye ma ọ bụ di ya bụ́ onye o kwere nkwa ikwesị ntụkwasị obi nye ruo ogologo ndụ ya nile. Jizọs kwuru, sị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma asị m unu na onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.”—Matiu 5:27, 28.

9. Olee ndụmọdụ amamihe dị na ya dị n’Ilu 5:18-20?

9 N’ihi ya, ihe amamihe dị na ya ime, bụ́kwa nke na-egosi ikwesi ntụkwasị obi bụ ihe e dere n’akwụkwọ Ilu: “Ka isi iyi gị bụrụ ihe a gọziri agọzi; ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa. Dị ka nne ele nke na-ahụ n’anya na nne ewu ọhịa mara mma, ka ara ya abụọ na-eju gị afọ na mgbe nile; nanị n’ịhụnanya ya ka ị ga na-awagharị mgbe nile. Ma n’ihi gịnị ka ị ga-eji nwanyị na-abụghị nwunye gị wagharịa, nwa m? N’ihi gịnị ka ị ga-agbakụ nwanyị na-abụghị nwunye gị obi?”—Ilu 5:18-20.

Ejila Ọsọ Agbaba n’Alụmdi na Nwunye

10. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya mmadụ iwepụta oge iji mata onye ọ na-achọ ịlụ nke ọma?

10 Nsogbu pụrụ ibilite n’alụmdi na nwunye mgbe mmadụ abụọ ahụ ji ọsọ gbaba na ya. Ọ pụrụ ịbụ na ha etorubeghị ya ma ọ bụ na ha enwebeghị ahụmahụ zuru ezu. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha ewepụtaghị oge iji mata onwe ha nke ọma—mata ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị na-adịghị amasị ha, ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ, ụdị ezinụlọ ha si na ya. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya mmadụ inwe ndidi, iwepụta oge iji mata onye ọ na-achọ ịlụ nke ọma. Chee echiche banyere Jekọb, bụ́ nwa Aịzik. Ọ rụụrụ onye gaje ịbụ ọgọ ya nwoke ọrụ ruo afọ asaa tupu e kwe ka ọ lụọ Rechel. Ọ dị njikere ime nke ahụ n’ihi na ọ hụrụ Rechel n’anya n’ezie, ọ bụghị nanị ná mma elu ahụ́ ya ka o nwere mmasị.—Jenesis 29:20-30.

11. (a) Gịnị ka alụmdi na nwunye na-ejikọ? (b) N’ihi gịnị ka iji ire eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya n’alụmdi na nwunye ji dị ezigbo mkpa?

11 Alụmdi na nwunye abụghị nanị mmekọrịta mmekọahụ. Alụmdi na nwunye na-ejikọ mmadụ abụọ a zụlitere n’ụzọ dịgasị iche, bụ́kwa ndị nwere àgwà, mmetụta, na mgbe ụfọdụ ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ dịgasị iche. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ejikọ omenala abụọ, ọbụna asụsụ abụọ. Ma ọ́ dịghị nnọọ ihe ọzọ, ọ na-ejikọ olu abụọ, bụ́ ndị pụrụ ikwupụta echiche dịgasị iche n’okwu dị iche iche. A na-enwe olu abụọ a n’alụmdi na nwunye nile. A pụrụ iji ha na-akatọ ma na-eme mkpesa banyere onye nke ọzọ mgbe nile, ma ọ bụkwanụ jiri ha na-enye onye nke ọzọ agbamume sitere n’obi ma na-ewuli ya elu. Ee, anyị pụrụ iji okwu anyị merụọ di ma ọ bụ nwunye anyị ahụ́ ma ọ bụkwanụ jiri ya gwọọ ya. Akwaghị ire nga pụrụ ịkpata ezigbo nsogbu n’alụmdi na nwunye.—Ilu 12:18; 15:1, 2; 16:24; 21:9; 31:26.

12, 13. Olee atụmanya a pụrụ inweta enweta nke a na-agba ume ka mmadụ nwee n’ihe banyere alụmdi na nwunye?

12 N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya mmadụ iwepụta oge iji mata onye ọ na-achọ ịlụ nke ọma. Otu nwanna nwanyị nweworo ahụmahụ kwuru n’otu oge, sị: “Mgbe i lere onye ị na-aga ịlụ anya, chee banyere ma eleghị anya ihe iri bụ́ isi ị ga-achọ ịhụ n’onye ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ nanị asaa ka ị hụrụ, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ ga-elegharali atọ ahụ fọrọ afọ anya? M̀ ga-elegharali erughị eru ndị ahụ anya kwa ụbọchị?’ Ọ bụrụ na ọ kachaghị gị obi, cheregodị ma chebakwuoro ya echiche.” N’ikwu eziokwu, ọ dị gị mkpa ịtụ anya ihe a pụrụ inweta enweta. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, mara na ọ dịghị mgbe ị ga-achọta di ma ọ bụ nwunye zuru okè. Ma, ị gaghịkwa abụ di ma ọ bụ nwunye zuru okè nye onye ị ga-emesị lụọ!—Luk 6:41.

13 Alụmdi na nwunye na-achọ ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Pọl mere ka nke a pụta ìhè mgbe o kwuru, sị: “Achọrọ m ka unu nwere onwe unu pụọ ná nchegbu. Onye na-alụghị nwanyị na-echegbu onwe ya maka ihe nke Onyenwe anyị, otú ọ pụrụ isi nweta nnwapụta nke Onyenwe anyị. Ma onye lụrụ nwanyị na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa, otú ọ pụrụ isi nweta nnwapụta nke nwunye ya, ọ bụkwa onye e kewara ekewa. Ọzọkwa, nwanyị nke na-alụghị di, na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, na-echegbu onwe ya maka ihe nke Onyenwe anyị, ka o wee dị nsọ ma n’ahụ́ ya ma ná mmụọ ya. Otú ọ dị, nwanyị lụrụ di na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa, otú ọ pụrụ isi nweta nnwapụta nke di ya.”—1 Ndị Kọrint 7:32-34.

Ihe Mere Ụfọdụ Alụmdi na Nwunye Ji Etisa

14, 15. Olee ihe ndị pụrụ ime ka nkekọ alụmdi na nwunye gharazie isi ike?

14 Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst nwere obi mgbawa na nso nso a n’ihi ịgba alụkwaghịm mgbe di ya hapụrụ ya ka ha lụsịworo ruo afọ 12 ma malite iso nwanyị ọzọ enwe mmekọrịta. Nwanna nwanyị ahụ ọ̀ hụrụ ihe mgbaàmà ọ bụla tupu ha agbasaa? Ọ na-akọwa, sị: “O mechara kwụsị ikpe ekpere. Ọ na-agha nzukọ Ndị Kraịst na ọrụ nkwusa n’ihi ihe ndị na-enweghị ihe ha bụ. Ma ọ́ sịghị na ya ji nnọọ ọrụ n’aka mụ na ya ịnọrị ya asị na ike gwụchara ya. Ọ naghị atụpụrụ m ọnụ. Ọ kwụsịrị iso m ekwurịta ihe ime mmụọ. Ọ dị nnọọ mwute. Ọ bụghịzi nwoke ahụ m lụrụ.”

15 Ndị ọzọ na-ekwukwa na ha hụrụ otu ihe ndị ahụ tupu nke ha emee, ihe ndị gụnyere ileghara ọmụmụ Bible onwe onye, ekpere, ma ọ bụ ịga nzukọ Ndị Kraịst, anya. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọtụtụ ndị mesịrị hapụ di ma ọ bụ nwunye ha kwere ka mmekọrịta ha na Jehova nyụọ ka ọkụ. N’ihi nke ahụ, ha kwụsịrị ịhụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Jehova abụghịziri ha Chineke dị ndụ. Ha kwụsịrị ile ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa anya dị ka ihe ga-abịa abịa n’ezie. N’ọnọdụ ụfọdụ, di ma ọ bụ nwunye ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi buru ụzọ ghọọ onye na-adịghịzi ike n’ụzọ ime mmụọ tupu ya amalite iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwewe mmekọrịta.—Ndị Hibru 10:38, 39; 11:6; 2 Pita 3:13, 14.

16. Olee ihe na-ewusi alụmdi na nwunye ike?

16 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, otu di na nwunye nwere nnọọ obi ụtọ kwuru na ihe mere alụmdi na nwunye ha ji aga nke ọma bụ nkekọ siri ike ha nwere n’ụzọ ime mmụọ. Ha na-ekpekọ ekpere ọnụ ma na-amụkọ ihe ọnụ. Nke nwoke na-ekwu, sị: “Anyị na-agụkọ Bible ọnụ. Anyị na-ejekọ ozi ọnụ. Anyị na-emekọ ihe ọnụ.” Ihe mmụta dị na nke a doro anya: Ịnọgide soro Jehova na-enwe ezi mmekọrịta ga-eme nnọọ ka alụmdi na nwunye sikwuo ike.

Na-atụnụ Anya Ihe Ndị A Pụrụ Inweta Enweta Ma Na-enwenụ Nkwurịta Okwu

17. (a) Olee ihe abụọ na-eme ka alụmdi na nwunye na-aga nke ọma? (b) Olee otú Pọl si kọwaa ịhụnanya Ndị Kraịst?

17 Ihe abụọ ndị ọzọ na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye bụ: ịhụnanya Ndị Kraịst na inwe nkwurịta okwu. Mgbe mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n’anya, ha na-elegharakarị amaghị eme ibe ha anya. Di na nwunye ahụ pụrụ ibu atụmanya ndị dịbigara elu ókè n’obi banye n’alụmdi na nwunye, ikekwe n’ihi ihe ndị ha gụrụ n’akwụkwọ ndị na-akọ akụkọ ịhụnanya. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, di na nwunye ahụ aghaghị ịhụ ihe otú ha dị n’ezie. Mgbe ahụzi, obere amaghị eme ma ọ bụ àgwà ndị na-agbakasịtụ ahụ́ pụrụ ịghọ nnukwu nsogbu. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ọ dị Ndị Kraịst mkpa igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ndị otu n’ime ha bụ ịhụnanya. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’ezie, ịhụnanya siri nnọọ ike—ọ bụghị ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ kama ịhụnanya Ndị Kraịst. Pọl kọwara ịhụnanya Ndị Kraịst dị otú ahụ, na-asị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. . . . Ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. . . . Ọ na-edi ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-enwe olileanya ihe nile, na-atachiri ihe nile obi.” (1 Ndị Kọrint 13:4-7) O doro anya na ezi ịhụnanya na-eleghara adịghị ike mmadụ anya. N’ihi na ọ naghị atụ anya ihe a na-apụghị inweta enweta, ọ naghị achọ ka mmadụ zuo okè.—Ilu 10:12.

18. Olee otú nkwurịta okwu pụrụ isi wusie mmekọrịta ike?

18 Ịdị na-enwe nkwurịta okwu dịkwa ezigbo mkpa. N’agbanyeghị afọ ole ha lụrụla, di na nwunye kwesịrị ịdị na-enwe nkwurịta okwu ma na-ege ibe ha ntị n’ezie. Otu nwoke lụrụ nwanyị na-ekwu, sị: “Anyị na-agwa ibe anyị ihe dị anyị n’obi ma anyị na-ekwu ya n’ụzọ dị nro.” Ka ọ na-enwekwu ahụmahụ, di ma ọ bụ nwunye na-amụta ịnụ ọ bụghị nanị ihe e kwuru ekwu kamakwa nke a na-ekwughị ekwu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ka ọtụtụ afọ na-agafe, di na nwunye nwere obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha na-amụta ịghọta ihe onye ibe ha na-eche n’echiche nke ọ na-ekwupụtaghị ekwupụta ma ọ bụ mmetụta o nwere nke ọ na-egosipụtaghị egosipụta. Ụfọdụ ụmụ nwanyị na-ekwu na di ha anaghị ege ha ntị nke ọma. Ndị di ụfọdụ emewo mkpesa na o yiri ka ọ̀ bụ nnọọ n’oge na-ekwesịtụghị ekwesị ka nwunye ha na-achọ ịgwa ha okwu. Nkwurịta okwu na-achọ ọmịiko na nghọta. Nkwurịta okwu dị irè na-abara ma di ma nwunye uru.—Jems 1:19.

19. (a) N’ihi gịnị ka ịrịọ mgbaghara pụrụ iji sie ike? (b) Olee ihe ga-akpali anyị ịrịọ mgbaghara?

19 Mgbe ụfọdụ, nkwurịta okwu na-agụnye ịrịọ mgbaghara. Nke ahụ anaghị adị mfe mgbe nile. Mmadụ ga-adị umeala n’obi iji kweta na ya mejọrọ. Ma, lee nnọọ ka nke ahụ si enye aka n’alụmdi na nwunye! Mgbaghara e si n’obi rịọ pụrụ iwepụ ihe pụrụ ịkpata esemokwu n’ọdịnihu ma mee ka o kwe omume ịgbaghara onye mejọrọnụ na inweta ihe ngwọta nye nsogbu ahụ. Pọl kwuru, sị: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a nile, yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:13, 14.

20. Olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi emeso di ma ọ bụ nwunye ya mgbe nanị ha abụọ nọ na n’ihu ndị ọzọ?

20 Ihe ọzọ dịkwa mkpa n’alụmdi na nwunye bụ inyerịta nkwado. Di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị inwe ike ịtụkwasị ibe ha obi, ịdabere n’ebe ibe ha nọ. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị iweda onye nke ọzọ ala ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla ọzọ mee ka ọ gharazie inwe obi ike n’onwe ya. Anyị na-esi n’ala ala obi anyị eto ndị di ma ọ bụ nwunye anyị; anyị anaghị akatọ ha n’ụzọ siri ike. (Ilu 31:28b) Anyị anatụghị eweda ha ala site n’ịma ha njakịrị iberibe. (Ndị Kọlọsi 4:6) Anyị na-emekwa ka nkwado dị otú ahụ anyị na-enyerịta onwe anyị sikwuo ike site n’ịdị na-ekwupụta ịhụnanya anyị nwere maka di ma ọ bụ nwunye anyị mgbe nile. Mmadụ iji nwayọọ bitụ di ma ọ bụ nwunye ya aka ma ọ bụ ịgwa ya okwu dị nro pụrụ ịgwa ya, sị: “M ka hụrụ gị n’anya. Obi dị m ụtọ na mụ na gị nọ.” Ihe ndị a bụ ihe ụfọdụ pụrụ imetụta mmekọrịta ma mee ka alụmdi na nwunye nwee ihe ịga nke ọma n’ụwa nke taa. E nwekwara ihe ndị ọzọ, isiokwu na-esonụ ga-enyekwa anyị nduzi Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ banyere otú a pụrụ isi mee ka alụmdi na nwunye nwee ihe ịga nke ọma. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Iji nweta ihe ọmụma ka zuo ezuo, lee akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ihe ụfọdụ ndị pụrụ imebi alụmdi na nwunye?

• N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe amamihe dị na ya iji ọsọ agbaba n’alụmdi na nwunye?

• Olee otú ọnọdụ ime mmụọ si emetụta alụmdi na nwunye?

• Olee ihe ndị na-enye aka eme ka alụmdi na nwunye kwụsie ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 12]

Alụmdi na nwunye abụghị nanị mmekọrịta mmekọahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Di na nwunye na Jehova inwe mmekọrịta siri ike na-enyere ha aka ime ka alụmdi na nwunye ha nwee ihe ịga nke ọma