Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Jiri Ọnọdụ Anyị Na-agbanwe Agbanwe Gbaa Àmà n’Ebe Nile

Anyị Jiri Ọnọdụ Anyị Na-agbanwe Agbanwe Gbaa Àmà n’Ebe Nile

Akụkọ Ndụ

Anyị Jiri Ọnọdụ Anyị Na-agbanwe Agbanwe Gbaa Àmà n’Ebe Nile

DỊ KA RICARDO MALICSI SI KỌỌ

Mgbe m kwụsịrị ọrụ m n’ihi nnọpụiche m dị ka Onye Kraịst, mụ na ezinụlọ m rịọrọ Jehova ka o nyere anyị aka ime atụmatụ maka ọdịnihu anyị. N’ekpere anyị, anyị kwupụtara ọchịchọ anyị ịmụba ozi anyị. N’oge na-adịghị anya, anyị biri ndụ nkwagharị nke kpọgara anyị ná mba asatọ dị ná mpaghara ụwa abụọ. N’ihi ya, anyị nwere ike iwere ozi anyị gaa n’ebe ndị dị anya.

A MỤRỤ M na Philippines na 1933 n’ezinụlọ na-ekpe Philippine Independent Church. Ndị òtù ezinụlọ anyị nile dị mmadụ 14 na-aga chọọchị ahụ. Mgbe m dị ihe dị ka afọ 12, arịọrọ m Chineke n’ekpere ka o duzie m ịchọta ezi okpukpe. Otu n’ime ndị nkụzi m debara aha m na klas a na-akụzi ihe metụtara okpukpe, aghọkwara m onye na-anụrụ okpukpe Katọlik ọkụ n’obi. Ọ dịghị mgbe m ghara nkwupụta a na-eme n’ụbọchị Saturday na Mas Sunday. Otú ọ dị, amalitere m inwe obi abụọ, ihe ha na-eme adịghịzikwa eju m afọ. Ajụjụ ndị metụtara ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ, ọkụ ala mmụọ na Atọ n’Ime Otu nyere m nsogbu n’obi. Azịza ndị ndú okpukpe na-enye anaghị enwe isi, ha adịghịkwa eju afọ.

Inweta Azịza Ndị Na-eju Afọ

Mgbe m nọ na kọleji, esonyeere m otu òtù nke mere ka m na-alụ ọgụ, na-agba chaa chaa, na-ese siga ma na-eme omume ndị ọzọ rụrụ arụ. Otu mgbede, ezutere m mama nwa klas m. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ajụrụ m ya ajụjụ ndị ahụ m jụrụla ndị nkụzi nke okpukpe m. O ji Bible zaa ajụjụ m nile, ekwenyesikwara m ike na ihe o kwuru bụ eziokwu.

Azụtara m Bible ma malite iso Ndịàmà na-amụ ya. N’oge na-adịghị anya, amalitere m ịga nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova. N’ịgbaso ndụmọdụ Bible amamihe dị na ya bụ́ na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru,” akwụsịrị m iso ndị enyi m na-eme omume rụrụ arụ na-akpakọrịta. (1 Ndị Kọrint 15:33) Nke a nyeere m aka inwe ọganihu n’ọmụmụ Bible m na imesị rara onwe m nye Jehova. Mgbe e mesịrị m baptizim na 1951, ejere m ozi dị ka onye ozi oge nile (ọsụ ụzọ) ruo nwa oge. Mgbe ahụ, na December 1953, alụrụ m Aurea Mendoza Cruz, bụ́ onye ghọọrọ m onye ibe mụ na ya ga-anọ ná ndụ m nile, na onye ọrụ ibe kwesịrị ntụkwasị obi n’ozi ahụ.

Azịza Nye Ekpere Anyị

N’ezie, anyị na-achọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ. Otú ọ dị, ọchịchọ anyị ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị emezughị ozugbo. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị akwụsịghị ịrịọ Jehova ka o megheere anyị ohere iji jee ozi ya. Ma ihe na-esiri anyị ike. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị bu ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ anyị n’obi, mgbe m dịkwa afọ 25, a họpụtara m ịbụ ohu ọgbakọ, onyeisi oche ndị nlekọta nke otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova.

Ka m nọ na-enwe ọganihu n’ihe ọmụma Bible ma na-aghọtakwu ụkpụrụ Jehova nke ọma, aghọtara m na ọrụ m na-emegide nnọpụiche m n’ihi akọ na uche m dị ka Onye Kraịst. (Aịsaịa 2:2-4) Ekpebiri m ịkwụsị ọrụ ahụ. Nke a lere okwukwe anyị ule. Olee otú m ga-esi gboo mkpa ezinụlọ m? Anyị gakwughachiri Jehova Chineke n’ekpere. (Abụ Ọma 65:2) Anyị gwara ya nchegbu na ụjọ anyị, ma anyị gwakwara ya maka ọchịchọ anyị ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Anyị amatụghị na ohere dị iche iche ga-emeghere anyị!

Ịmalite Njem Anyị

N’April 1965, amalitere m ịrụ ọrụ dị ka onye na-elekọta ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na ndị na-anapụta ndị nwere ihe ọghọm n’Ọdụ Ụgbọelu Mba Nile nke Vientiane dị na Laos, anyị kwagakwara ebe ahụ. Na Vientiane, e nwere Ndịàmà 24, anyị na ndị ozi ala ọzọ na ụmụnna ole na ole bụ́ ndị ebe ahụ sokwa kwusaa ozi ọma. Ka e mesịrị, e zigara m n’Ọdụ Ụgbọelu Udon Thani, Thailand. O nweghị Ndịàmà ọzọ nọ n’Udon Thani. Dị ka ezinụlọ, anyị duziri nzukọ ọgbakọ nile n’onwe anyị. Anyị kwusara ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mee nletaghachi, malitekwa ọmụmụ Bible.

Anyị chetara ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịdị “na-amị mkpụrụ hie nne.” (Jọn 15:8) N’ihi ya, anyị kpebisiri ike ịgbaso ihe nlereanya ha ma nọgide na-akpọsa ozi ọma ahụ. N’oge na-adịghị anya, mgbalị anyị rụpụtara ihe. Otu nwa agbọghọ bụ́ onye Thailand natara eziokwu ma ghọọ nwanna ime mmụọ anyị. Mmadụ abụọ bụ́ ndị si Ebe Ugwu America natara eziokwu, mesịakwa ghọọ ndị okenye ọgbakọ. Anyị nọgidere na-ekwusa ozi ọma ruo ihe karịrị afọ iri n’ebe ugwu Thailand. Lee obi ụtọ anyị nwere ịmara na ọgbakọ dị n’Udon Thani ugbu a! Ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke eziokwu ndị anyị kụrụ ka na-amịpụta mkpụrụ.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, anyị kwapụkwara ọzọ, anyị rịọkwara ka “Nna Nwe owuwe ihe ubi ahụ” nyere anyị aka ịnọgide na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. (Matiu 9:38) E zigara anyị Tehran, bụ́ isi obodo Iran. Nke a bụ n’oge ọchịchị Shah.

Ikwusa Ozi Ọma n’Ókèala Ndị Siri Ike

Mgbe anyị rutere Tehran, anyị chọtara ụmụnna ime mmụọ anyị ozugbo. Anyị sonyeere otu ìgwè nta nke Ndịàmà nke ihe mejupụtara ya bụ ndị si ná mba 13 dị iche iche. Anyị mere mgbanwe ụfọdụ iji nwee ike ikwusa ozi ọma n’Iran. Ọ bụ ezie na e megideghị anyị n’ụzọ pụtara ìhè, anyị aghaghị ịkpachara anya.

N’ihi oge ọrụ nke ndị nwere mmasị, mgbe ụfọdụ, anyị na-eduzi ọmụmụ Bible n’etiti abalị ma ọ bụ ma ọ gafee ya—ruo n’isi ụtụtụ. N’agbanyeghị nke ahụ, lee obi ụtọ anyị nwere ịhụ mkpụrụ nke ịrụsi ọrụ ike anyị mịpụtara! Ọtụtụ ezinụlọ ndị Philipines na ndị Korea nabatara eziokwu Ndị Kraịst ma rara onwe ha nye Jehova.

Ebe ọzọ m rụrụ ọrụ bụ na Dhaka, Bangladesh. Anyị rutere ebe ahụ na December 1977. Nke a bụ mba ọzọ ebe ọ na-adịghịrị anyị mfe ikwusa ozi ọma. Otú ọ dị, anyị na-ebu n’obi mgbe nile na anyị aghaghị ịdị na-ejechi ozi anya. Site ná nduzi nke mmụọ Jehova, anyị chọtara ọtụtụ ezinụlọ sịrị na ha bụ Ndị Kraịst. Akpịrị na-akpọ ụfọdụ n’ime ha nkụ maka mmiri na-enye ume ọhụrụ nke dị n’Akwụkwọ Nsọ. (Aịsaịa 55:1) N’ihi ya, anyị malitere ọtụtụ ọmụmụ Bible.

Anyị bu n’obi na uche Chineke bụ ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile.” (1 Timoti 2:4) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ dịghị onye nwara inye anyị nsogbu. Iji merie ịkpọasị ọ bụla, anyị hụrụ na anyị na-eji omume enyi agakwuru ndị mmadụ. Dị ka Pọl onyeozi, anyị gbalịrị ịghọ “ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Kọrint 9:22) Mgbe a jụrụ anyị ihe mere anyị ji bịa, anyị na-eji obiọma akọwa ya, anyị chọpụtakwara na ihe ka ọtụtụ n’ime ha nwere nnọọ omume enyi.

Anyị hụrụ otu Onyeàmà na Dhaka ma gbaa ya ume isonyere anyị ná nzukọ Ndị Kraịst anyị nakwa n’ọrụ nkwusa anyị ka e mesịrị. Mgbe nke ahụ gasịrị, nwunye m duziiri otu ezinụlọ ọmụmụ Bible ma kpọọ ha òkù ịbịa nzukọ anyị. Site n’obiọma sitere n’ịhụnanya Jehova, ezinụlọ ahụ nile batara n’eziokwu. Mgbe e mesịrị, ụmụ ha nwanyị abụọ nyere aka n’ịsụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ Bengali, ọtụtụ n’ime ndị ikwu ha bịakwara mara Jehova. Ọtụtụ ndị ọzọ a na-amụrụ Bible natara eziokwu. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-eje ozi ugbu a dị ka ndị okenye ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ.

Ebe ọ bụ na Dhaka bụ obodo nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu, anyị kpọrọ ụfọdụ n’ime ndị ezinụlọ anyị inyere anyị aka n’ọrụ nkwusa ahụ. Ụfọdụ bịara sonyere anyị na Bangladesh. Lee ọṅụ anyị nwere na otú anyị si ekele Jehova n’ihi ohere anyị nwere ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ná mba ahụ! Site ná mmalite mgbe e nwere nanị otu onye, e nwere ọgbakọ abụọ na Bangladesh.

Na July 1982, anyị kwapụrụ na Bangladesh. Anya mmiri juru anyị anya ka anyị na-ahapụ ụmụnna ndị ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, enwetara m ọrụ n’Ọdụ Ụgbọelu Mba Nile nke Entebbe, Uganda, bụ́ ebe anyị ga-anọ afọ anọ na ọnwa asaa. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji sọpụrụ aha ukwu Jehova n’ala a?

Ijere Jehova Ozi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa

Mgbe anyị bịarutere n’Ọdụ Ụgbọelu Mba Nile nke Entebbe, otu ọkwọ ụgbọala kwọọrọ mụ na nwunye m gawa ebe e nyere anyị ụlọ. Mgbe anyị na-ahapụ ọdụ ụgbọelu ahụ, amalitere m izi ọkwọ ụgbọala ahụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ jụrụ m, sị: “Ị̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?” Mgbe m zara ya ee, ọkwọ ụgbọala ahụ kwuru, sị: “Otu n’ime ụmụnna unu na-arụ n’ụlọ nduzi ụgbọelu.” Ozugbo ahụ, agwara m ya ka ọ kwọga anyị ebe ahụ. Anyị hụrụ nwanna ahụ, o nwekwara obi ụtọ ịhụ anyị, e mekwara ndokwa maka nzukọ na ozi ubi.

E nwere nanị narị ndị nkwusa Alaeze abụọ na iri abụọ na asatọ na Uganda n’oge ahụ. N’afọ mbụ anyị n’ebe ahụ, anyị sonyeere ihe dị ka ụmụnna abụọ bi n’Entebbe n’ịkụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ. Ebe ọ bụ na ndị bi n’ebe ahụ na-agụkarị akwụkwọ, anyị nyefere ọtụtụ akwụkwọ, gụnyere ọtụtụ narị magazin. Anyị kpọrọ ụmụnna ndị Kampala, bụ́ isi obodo ahụ, òkù inyere anyị aka ikwusa ozi ọma n’ókèala Entebbe ná ngwụsị izu ọ bụla. N’okwu ihu ọha mbụ m, mmadụ ise bịara—tinyere mụ onwe m.

N’ime afọ atọ sochirinụ, anyị hụrụ ụfọdụ n’ime oge ndị anyị kasị nwee obi ụtọ ná ndụ anyị, anyị hụrụ ndị anyị mụụrụ ihe ka ha na-anakwere eziokwu ahụ ma na-enwe ọganihu dị ngwa. (3 Jọn 4) N’otu mgbakọ sekit, e mere mmadụ isii n’ime ndị anyị duziiri ọmụmụ Bible baptizim. Ọtụtụ n’ime ha kwuru na a gbara ha ume ịchụso ozi oge nile n’ihi na ha hụrụ ka anyị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ọ bụ ezie na anyị na-arụ ọrụ oge nile.

Anyị ghọtara na ebe ọrụ anyị nwekwara ike ịbụ ókèala na-amịpụta mkpụrụ. N’otu oge, agakwuuru m otu onye ọrụ mgbanyụ ọkụ ọdụ ụgbọelu ma soro ya kwurịta olileanya dabeere na Bible nke ndụ n’ime paradaịs elu ala. Eji m Bible nke ya gosi ya na ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-ebi n’udo na n’ịdị n’otu, ha agaghịzi ata ahụhụ n’ihi ịda ogbenye, enweghị ụlọ, agha, ọrịa ma ọ bụ ọnwụ. (Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 33:24; 65:21, 22; Mkpughe 21:3, 4) Ịgụ nke a na Bible nke ya kpaliri mmasị ya. A maliteere ya ọmụmụ Bible ozugbo. Ọ bịara nzukọ anyị nile. N’oge na-adịghị anya, ọ raara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim. Ka e mesịrị, o sonyere anyị n’ozi oge nile.

Ọgba aghara ọchịchị tiwapụrụ ugboro abụọ na Uganda ka anyị nọ ebe ahụ, ma nke ahụ akwụsịghị ihe omume ime mmụọ anyị. A kpọfere ndị ezinụlọ na ndị ikwu nke ndị na-arụrụ òtù ụlọ ọrụ mba nile ọrụ na Nairobi, Kenya, ruo ọnwa isii. Anyị bụ́ ndị fọdụrụnụ na Uganda nọgidere na-aga nzukọ Ndị Kraịst anyị ma na-arụ ọrụ nkwusa ahụ, ọ bụ ezie na anyị ga-eji akọ na nlezianya na-eme ihe.

N’April 1988, arụzuru m ọrụ m, anyị kwapụkwara ọzọ. Anyị hapụrụ Ọgbakọ Entebbe, na-enwe afọ ojuju n’ihi ọganihu e nweworo ebe ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Na July 1997, anyị nwere ohere nke iletaghachi Entebbe. Tupu mgbe ahụ, ụfọdụ n’ime ndị anyị mụụrụ Bible na-ejezi ozi dị ka ndị okenye. Lee obi ụtọ anyị nwere ịhụ otu narị mmadụ na isii ná Nzukọ Ihu Ọha!

Ịga n’Ókèala A Na-akpabeghị Aka

Ànyị ga-enwe ike iji ohere ọhụrụ ndị pụtaranụ mee ihe? Ee, ebe ọzọ e nyere m ọrụ bụ n’Ọdụ Ụgbọelu Mba Nile nke Mogadishu, Somalia. Anyị kpebisiri ike iji ohere ọhụrụ a mee ezigbo ihe iji jee ozi n’ókèala a na-akpabeghị aka.

Ndị anyị kasị ekwusara ozi ọma bụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ nke onye nnọchianya mba, ndị Philipines na ndị mba ọzọ. Anyị na-ezutekarị ha n’ọma ahịa. Anyị na-eletakwa ha n’ụlọ dị ka ndị enyi. Site n’ịdị nkọ n’ichepụta ihe na ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam, anyị kụziiri ndị ọzọ eziokwu Bible, nke a mịpụtakwara mkpụrụ n’etiti ndị si ná mba dị iche iche. Mgbe afọ abụọ gasịrị, anyị hapụrụ Mogadishu—kpọmkwem tupu agha etiwapụ n’ebe ahụ.

Ebe ọzọ Òtù Ndị Ọrụ Ụgbọelu Mba Nile zigara m bụ na Yangon, Myanmar. Ọzọkwa, anyị nwere ohere ọma ndị ọzọ inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmụta banyere nzube Chineke. Mgbe anyị nọsịrị na Myanmar, e zigara anyị na Dar es Salaam, Tanzania. Ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Dar es Salaam dị nnọọ mfe n’ihi na e nwere ógbè na-asụ Bekee ebe ahụ.

Ná mba nile anyị rụrụ ọrụ na ha, anyị enwekarịghị nsogbu n’ozi anyị, ọ bụ ezie na n’ọtụtụ ebe, e tinyere ihe mgbochi ụfọdụ n’ọrụ Ndịàmà Jehova. N’ihi ọnọdụ ọrụ m, bụ́ nke ya na ụlọ ọrụ gọọmenti ma ọ bụ nke mba ọzọ na-enwekarị njikọ, ndị mmadụ enyoghị ọrụ anyị enyo.

Ọrụ m chọrọ na mụ na nwunye m ga-ebi ndụ nkwagharị ruo iri afọ atọ. Otú ọ dị, anyị weere ọrụ m dị ka nanị ohere iji ruo ihe mgbaru ọsọ anyị. Ihe mgbaru ọsọ mbụ anyị anọwo na-abụ ịkwalite ihe ndị metụtara Alaeze Chineke. Anyị na-ekele Jehova maka inyere anyị aka iji ọnọdụ anyị na-agbanwe agbanwe mee ihe nke ọma na inwe ihe ùgwù magburu onwe ya nke ịgbasa ozi ọma ahụ n’ebe nile.

Ịlaghachi n’Ebe Anyị Si Malite

Mgbe m dị afọ 58, ekpebiri m ịgba arụkwaghịm n’oge ma laghachi Philippines. Mgbe anyị lọtara, anyị rịọrọ Jehova ka o duzie nzọụkwụ anyị. Anyị malitere ije ozi n’ọgbakọ dị na Trece Martires City, n’ógbè Cavite. Mgbe anyị lọtara ọhụrụ, e nwere nanị ndị nkwusa 19 nke Alaeze Chineke. A haziri ịdị na-aga ozi ọma kwa ụbọchị, a malitekwara iduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible. Ọgbakọ ahụ malitere ito. N’otu oge, nwunye m nwere ihe ruru mmadụ 19 ọ na-eduziri ọmụmụ Bible ebe obibi, enwekwara m mmadụ 14.

N’oge na-adịghị anya, Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị anaghịzi aba anyị. Anyị kpegaara Jehova ekpere maka nke a. Otu nwanna anyị nwoke na nwunye ya kpebiri inye anyị ala, alaka ụlọ ọrụ binyekwara anyị ego iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. Ihe owuwu ahụ enweela mmetụta dị ukwuu n’ebe ọrụ nkwusa ahụ dị, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ na-amụbakwa kwa izu. Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eji ihe karịrị awa abụọ, uje na ụla, aga enyere ọgbakọ ọzọ nwere ndị nkwusa 17 aka.

Mụ na nwunye m ji ihe ùgwù anyị nwere nke ije ozi n’ọtụtụ mba dị iche iche kpọrọ ihe. N’ileghachi anya azụ ná ndụ nkwagharị anyị biri, anyị nwere nnọọ afọ ojuju ịmara na anyị ji ya mee ihe n’ụzọ kasị mma kwere omume—inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova!

[Map dị na peeji 24, 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

TANZANIA

UGANDA

SOMALIA

IRAN

BANGLADESH

MYANMAR

LAOS

THAILAND

PHILIPPINES

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na nwunye m, bụ́ Aurea