Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Àgwà ‘Na-achọ Ozizi nke Chineke Mma’

Ezi Àgwà ‘Na-achọ Ozizi nke Chineke Mma’

Ezi Àgwà ‘Na-achọ Ozizi nke Chineke Mma’

MARIA na-eto eto nke bi na Kransnoyarsk, Russia, maara nnọọ otú e si abụ abụ nke na onye nkụzi ya tinyere ya n’òtù ukwe ụlọ akwụkwọ ya. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, Maria ji nkwanye ùgwù gakwuru otu n’ime ndị nkụzi ya iji kọwaara ya na ya apụghị ịbụ ụdị abụ ụfọdụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ịbụ abụ ndị na-adọrọ uche gaa n’okpukpe megidere nkwenkwe ya ndị dabeere na Bible. N’ịbụ onye nke ahụ tụrụ n’anya, onye nkụzi ahụ chere, sị, ‘Oleekwanụ ihe dị njọ n’iji abụ eto Chineke?’

Iji gosi ihe mere ọ na-agaghị eji bụọ abụ metụtara Chi Atọ n’Ime Otu, Maria mepere Bible ya ma kọwaa na Chineke na Jizọs Kraịst abụghị otu Chineke, nakwa na mmụọ nsọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ. (Matiu 26:39; Jọn 14:28; Ọrụ 4:31) Maria na-akọ, sị: “Ọbụbụenyi mụ na onye nkụzi ahụ emebighị. Ihe ka ọtụtụ ná ndị nkụzi anyị bụ ezigbo ndị nkụzi. Ha na-achọ ka ahụ́ ruo anyị ala.”

N’afọ ahụ nile n’ụlọ akwụkwọ, nguzo Maria mere ka ndị nkụzi na ụmụ klas ya na-akwanyere ya ùgwù. Maria na-ekwu, sị: “Ụkpụrụ Bible na-enyere m aka ná ndụ. Ná ngwụsị afọ ahụ, enwetara m ihe nrite maka ime ihe n’eziokwu na ime ihe n’usoro, ebe ndị mụrụ m nwetara akwụkwọ ozi site n’ụlọ akwụkwọ m iji kelee ha maka ịzụ nwa ha nwanyị nke ọma.”

E mere Maria baptizim n’August 18, 2001. Ọ na-ekwu, sị: “Enwere m obi ụtọ na m pụrụ ijere Chineke dị ebube, bụ́ Jehova, ozi!” Ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-ebi ndụ kwekọrọ n’okwu ndị dị na Taịtọs 2:10, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile.”

[Foto dị na peeji nke 32]

Akwụkwọ ozi e ji kelee ndị mụrụ ya na satifiketi ihe nrite

[Foto dị na peeji nke 32]

Maria na ndị mụrụ ya mgbe e mesịrị ya baptizim