Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ule”

“Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ule”

“Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ule”

NÁ MMALITE nke April 1951, ọchịchị dị ike nke Soviet wakporo otu ìgwè Ndị Kraịst aka ha dị ọcha bụ́ ndị nọ n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Soviet Union—Ndịàmà Jehova. A kwabara ihe dị ka puku ezinụlọ atọ—gụnyere ụmụaka, ụmụ nwanyị dị ime na ndị agadi—n’ime ụgbọ okporo ígwè ndị na-ebu ibu maka njem na-agwụ ike nke ga-ewe ụbọchị 20 ịga Siberia. Ha na-aga ije biri n’ala ọzọ n’ọnọdụ dị oké njọ, n’ebe na-emepeghị emepe.

N’April 2001, e ji mwepụta nke vidio na-egosi mmegbu were ọtụtụ iri afọ e megburu Ndịàmà Jehova n’ebe bụbu Soviet Union malite ememe ncheta afọ 50 nke ihe omume a mere ihe akụkọ na Moscow. Na vidio ahụ, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị hụrụ ihe merenụ kọrọ otú Ndịàmà ahụ si lanahụ, ọbụnakwa nwee ihe ịga nke ọma n’agbanyeghị nrụgide siri oké ike.

Ọtụtụ nde mmadụ na Russia na n’ebe ndị ọzọ eleela vidio a bụ́, Faithful Under Trials—Jehovah’s Witnesses in the Soviet Union (Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ule—Ndịàmà Jehova Nọ na Soviet Union), ọha na eze na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme etookwala ya nke ukwuu. Okwu abụọ na-esonụ bụ nke ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Russia kwuru, bụ́ ndị bi n’ebe e bugara ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ Ndịàmà ahụ:

“Ihe nkiri vidio a tọrọ m ụtọ nke ukwuu. Ọ dịwo anya m nwewere mmasị ná ndị okpukpe unu, ma mgbe m lesịrị ihe nkiri ahụ, enwekwuru m nnọọ mmasị n’ebe unu nọ. Ihe nkiri ahụ bụ nnọọ ọkpọka! Enwere m mmasị karịsịa n’otú unu si gosi ndị mmadụ n’otu n’otu. Ọ bụ ezie na abụ m onye Ọtọdọks, ebughịkwa m n’obi ịgbanwe okpukpe m, enwere m mmasị n’ebe Ndịàmà nọ. Aga m achọ ka ngalaba ihe ọmụmụ anyị nwee otu ihe nkiri vidio a. Mụ na ndị òtù m ekpebiela igosi ya ụmụ akwụkwọ anyị na itinye ya n’usoro ihe ọmụmụ anyị.”—Prọfesọ Sergei Nikolayevich Rubtsov, onyeisi ngalaba na-amụ akụkọ ihe mere eme na Mahadum Mba Maka Ọzụzụ Ndị Nkụzi, nke dị n’Irkutsk, Russia.

“Enwere m obi ụtọ maka mwepụta nke vidio a. Mgbe mmadụ na-emepụta ihe nkiri banyere mmegbu, ọ na-esikarị nnọọ ike ịkọ akụkọ ahụ n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ma unu gbalịrị mee ya. Biko, unu nweere onwe unu iwetara m ihe nkiri vidio unu ndị ọzọ.”—Prọfesọ Sergei Ilyich Kuznetsov, onyeisi ngalaba na-amụ akụkọ ihe mere eme na Mahadum Mba nke dị n’Irkutsk, Russia.

Ndịàmà Jehova bi na Siberia nwekwara obi ụtọ dị ukwuu maka vidio a. Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru:

“Mgbe ihe ndị e gosiri na vidio a na-eme, ọtụtụ ndị na Russia nwere ihe ọmụma na-ezighị ezi banyere ọrụ Ndịàmà Jehova. Ma mgbe ha lesịrị vidio ahụ, ha hụrụ na nzukọ anyị abụghị ịrọ òtù nkịtị dị ka ha cheburu. Ndị ọzọ bụ́ ndị ghọrọ Ndịàmà n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu, sị: ‘Anyị amaghị na ụmụnna ndị anyị na ha bi ma na-arụkọ ọrụ ediela ihe dị ukwuu otú ahụ!’ Mgbe otu Onyeàmà lesịrị vidio ahụ, o kwuru na ya chọrọ ịghọ onye ozi ọsụ ụzọ oge nile.”—Anna Vovchuk, bụ́ onye a chụgara Siberia.

“Mgbe vidio ahụ gosiri ebe ndị uwe ojii nzuzo na-akụ aka n’ụzọ otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà, akụjara m. O yiri aka a kụrụ n’ụzọ anyị, echetakwara m mgbe mama m kwuru, sị: ‘Eleghị anya, o nwere ebe ọkụ na-agba.’ Ma vidio ahụ na-echetakwara m na ọtụtụ Ndịàmà tara ahụhụ karịa m. Ihe ọmụma a nile na-eme ka anyị nwekwuo ume na ịnụ ọkụ n’obi iji nọgide na-ejere Jehova ozi.”—Stepan Vovchuk, bụ́ onye a chụgara Siberia.

“Abụ m nwa nke Ndịàmà a chụgara Siberia. N’ihi ya, echere m na anụla m ọtụtụ ihe mere n’oge ahụ. Ma mgbe m lesịrị vidio a, achọpụtara m na o nwedịghị ihe m ma. Ka m nọ na-ege ajụjụ ọnụ ndị ahụ, anya mmiri juru m anya. Ugbu a, ahụmahụ ndị ahụ abụghịziri m nanị akụkọ kama ihe mere eme. Vidio a ewusikwuola mmekọrịta mụ na Chineke ike ma nye aka kwadebe m ịnagide ihe isi ike nile ga-abịa n’ọdịnihu.”—Vladimir Kovash, Irkutsk.

“Nye m, vidio a na-emetụ n’ahụ́ karịa akụkọ e dere ede. Mgbe m nọ na-ele ya ma na-anụ ajụjụ ọnụ ndị a gbara ụmụnna ahụ, ọ dị m ka à ga-asị na mụ na ha so taa ahụhụ ahụ. Ihe nlereanya nke nwanna ahụ seere ụmụ ya nwanyị na-eto eto ihe osise n’akwụkwọ mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ kpaliri m ịgbalị iji eziokwu Bible ruo n’obi ụmụ m. Unu emeela! Vidio a emeela ka Ndịàmà Jehova nọ na Russia nwekwuo mmetụta nke ịbụ akụkụ nke nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ.”—Tatyana Kalina, Irkutsk.

“Okwu ahụ bụ́, ‘Ịhụ ihe otu ugboro dị mma karịa ịnụ ya otu narị ugboro’ metụtara nnọọ vidio a. O doro nnọọ anya, bụrụ nnọọ ihe mere eme, metụtakwa anyị nnọọ! Mgbe m lesịrị ya, ejiri m oge dị ukwuu chebara ya echiche. Vidio ahụ mere ka m nwee ike itinye nnọọ onwe m n’ọnọdụ Ndịàmà ahụ a chụgara mba ọzọ. Ugbu a, mgbe m jiri ọnọdụ m tụnyere nke ha, ọ na-enyere m aka ile nsogbu ndị anyị na-enwe n’oge a anya n’ụzọ dị iche.”—Lidia Beda, Irkutsk.

E wepụtala vidio ahụ bụ́ Faithful Under Trials ugbu a n’asụsụ 25, a na-anabatakwa ya nke ọma n’ụwa nile. * Ụlọ ọrụ telivishọn ndị dị na St. Petersburg, Omsk, na n’obodo ndị ọzọ dị na Russia, nakwa n’obodo Vynnytsya, Kerch na Melitopol bụ́ ndị dị na Ukraine, na n’ógbè Lviv, egosila ihe nkiri vidio a. O nwetakwala ọtụtụ ihe nrite site ná ngalaba dị iche iche na-ahụ maka ihe nkiri vidio ná mba nile.

A na-ahụ ike nke ozi dị na vidio a n’ihe atụ nke ihe dị ka puku mmadụ atọ bụ́ ndị nkịtị gosipụtara obi ike na ume ime mmụọ pụrụ iche mgbe a kpagburu ha ruo ọtụtụ afọ. Ndịàmà Jehova nọ na Soviet Union gosiri na ha kwesịrị ntụkwasị obi n’ezie n’ule. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ikiri vidio a, Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ iwetara gị ya. Biko kpọtụrụ otu n’ime ha n’ógbè gị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 E nwere vidio ahụ n’asụsụ Bekee, Bulgarian, Cantonese, Czech, Danish, Dutch, Finnish, French, German, Grik, Hungarian, Indonesian, Italian, Japanese, Korean, Lithuanian, Mandarin, Norwegian, Polish, Romanian, Russian, Slovak, Slovenian, Spanish, nakwa na Swedish.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 8]

Stalin: Foto Ndị Agha U.S.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 9]

Stalin: Foto Ndị Agha U.S.