Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye

Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye

Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye

“Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya.”—NDỊ EFESỌS 5:22, 25.

1. Olee ụzọ kwesịrị ekwesị isi lee alụmdi na nwunye anya?

JIZỌS kwuru na alụmdi na nwunye bụ Chineke ikekọta nwoke na nwanyị ịbụ “otu anụ ahụ́.” (Matiu 19:5, 6) Ọ na-agụnye mmadụ abụọ nwere àgwà dịgasị iche ịmụta inwe mmasị n’otu ihe na ịrụkọ ọrụ ọnụ iji ruo ihe mgbaru ọsọ ndị ha nwekọrọ ọnụ. Alụmdi na nwunye bụ nkwekọrịta na-adịru ogologo ndụ nile, ọ bụghị nke na-adịghị adịte aka nke a pụrụ ịgbahapụ n’ụzọ dị mfe. N’ọtụtụ mba, ịgba alụkwaghịm anaghị ara ahụ́, ma n’anya Onye Kraịst, alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ. Ọ bụ nanị ihe siri ezigbo ike ga-eweta ya ná njedebe.—Matiu 19:9.

2. (a) Olee enyemaka ndị di na nwunye pụrụ inweta? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịgbalịsi ike ime ka alụmdi na nwunye na-aga nke ọma?

2 Otu onye ndụmọdụ n’ihe metụtara alụmdi na nwunye kwuru, sị: “Ezigbo alụmdi na nwunye na-achọ ịnọgide na-eme mgbanwe ka ọnọdụ ndị ọhụrụ na-ebilite, ka a na-emeri nsogbu ndị ọhụrụ, ọ na-achọkwa ka e jiri ihe ndị e nwere n’oge nke ọ bụla ná ndụ na-eme ihe.” Nye ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst, ihe ndị ahụ ha ga-eji eme ihe gụnyere ndụmọdụ amamihe dị na ya nke sitere na Bible, nkwado nke Ndị Kraịst ibe ha, na mmekọrịta chiri anya ha na Jehova na-enwe site n’ekpere. Alụmdi na nwunye na-aga nke ọma na-anagide ọtụtụ nsogbu, ka ọtụtụ afọ na-agafekwa, ọ na-ewetara di na nwunye obi ụtọ na afọ ojuju. Nke ka mkpa, ọ na-ewetara Jehova Chineke, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, nsọpụrụ.—Jenesis 2:18, 21-24; 1 Ndị Kọrint 10:31; Ndị Efesọs 3:15; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

Ṅomienụ Jizọs na Ọgbakọ Ya

3. (a) Chịkọta ndụmọdụ Pọl nyere ndị di na nwunye. (b) Olee ezi ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ?

3 Puku afọ abụọ gara aga, Pọl onyeozi nyere ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ndụmọdụ amamihe dị na ya mgbe o dere, sị: “Dị ka ọgbakọ ahụ si na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst ahụ, ka ndị bụ́ nwunye sikwa otú ahụ na-edo onwe ha n’okpuru di ha n’ihe ọ bụla. Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Ndị Efesọs 5:24, 25) Lee ntụnyere magburu onwe ya e mere n’ebe a! Ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eji obi umeala edo onwe ha n’okpuru di ha na-eṅomi ọgbakọ n’ịghọta na irubere ụkpụrụ ịbụisi isi. Ndị di kwere ekwe bụ́ ndị na-anọgide na-ahụ nwunye ha n’anya, ma ọ bụ n’oge ihe dị mma ma ọ bụ n’oge ihe isi ike, na-egosipụta na ha na-agbasochi anya ihe nlereanya Kraịst nke ịhụ ọgbakọ ya n’anya na ilekọta ya.

4. Olee otú ndị bụ́ di pụrụ isi na-agbaso ihe nlereanya Jizọs?

4 Ndị di bụ́ Ndị Kraịst bụ isi nke ezinụlọ ha, ma ha onwe ha kwa nwere isi, ya bụ Jizọs. (1 Ndị Kọrint 11:3) Ya mere, dị ka Jizọs lekọtara ọgbakọ ya, ndị di na-ejikwa ịhụnanya elekọta ezinụlọ ha n’ụzọ ime mmụọ nakwa n’ụzọ anụ ahụ́, ọbụna ma ọ bụrụ na nke ahụ ga-achọ ka ha chụọ ihe ụfọdụ n’àjà. Ha na-eme ka ọdịmma ezinụlọ ha butere ọchịchọ na nhọrọ nke ha ụzọ. Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ụkpụrụ ahụ metụtara alụmdi na nwunye karịsịa. Pọl gosiri nke a mgbe o dere, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. . . . Ọ dịghị nwoke kpọtụworo anụ ahụ́ nke ya asị; kama ọ na-azụ ma na-elezi ya anya.” (Ndị Efesọs 5:28, 29) Nwoke kwesịrị ịgba mbọ ịzụ na ilezi nwunye ya anya dị nnọọ ka o si agba mbọ ịzụ na ilezi onwe ya anya.

5. Olee otú ndị bụ́ nwunye pụrụ isi ṅomie ọgbakọ Ndị Kraịst?

5 Ndị nwunye na-atụ egwu Chineke na-elegara ọgbakọ Ndị Kraịst anya dị ka ihe nlereanya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ụmụazụ ya gbahapụrụ ihe ndị ha na-emebu ma soro ya. Ka ọ nwụsịrị, ha nọgidere na-edo onwe ha n’okpuru ya, kemgbe ihe karịkwara puku afọ abụọ, ezi ọgbakọ Ndị Kraịst anọgidewo na-edo onwe ya n’okpuru Jizọs ma na-agbaso idu ndú ya n’ihe nile. N’otu aka ahụ, ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst adịghị elelị di ha ma ọ bụ na-eleda ndokwa Akwụkwọ Nsọ nke ịbụisi n’alụmdi na nwunye anya. Kama nke ahụ, ha na-akwado di ha ma na-edo onwe ha n’okpuru ya, na-ekwenyere ya, sikwa otú ahụ na-agba ya ume. Mgbe ma di ma nwunye na-akpa àgwà n’ụzọ ịhụnanya dị otú ahụ, alụmdi na nwunye ha ga-enwe ihe ịga nke ọma, ha abụọ ga-enwetakwa ọṅụ ná mmekọrịta ahụ.

Nọgidenụ Soro Ha Na-ebi

6. Olee ndụmọdụ Pita nyere ndị bụ́ di, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa?

6 Pita onyeozi nwekwara ndụmọdụ inye ndị bụ́ di na nwunye, ọ kapịkwara nnọọ ihe ọ gwara ndị di ọnụ. O kwuru, sị: “Nọgidenụ soro [ndị nwunye unu] na-ebi n’otu ụzọ ahụ dị ka ihe ọmụma si dị, na-ekenye ha nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike, ihe bụ́ nwanyị, ebe unu so ha bụrụ ndị nketa nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke ndụ, ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Okwu ikpeazụ dị n’amaokwu ahụ na-egosi otú ndụmọdụ Pita siruru n’ike. Ọ bụrụ na di asọpụrụghị nwunye ya, nke ahụ ga-emetụta mmekọrịta ya na Jehova. A ga-egbochi ekpere ya.

7. Olee otú di kwesịrị isi sọpụrụ nwunye ya?

7 Oleekwanụ otú ndị bụ́ di ga-esi na-asọpụrụ nwunye ha? Mmadụ ịsọpụrụ nwunye ya pụtara iji ịhụnanya emeso ya ihe, n’ụzọ nkwanye ùgwù. Mmadụ imeso nwunye ya ihe n’ụzọ obiọma dị otú ahụ ga-eyi ihe ọhụrụ nye ọtụtụ ndị. Otu ọkà mmụta bụ́ onye Gris na-ede, sị: “N’iwu ndị Rom, ọ dịghị ihe ruuru nwanyị. N’ụzọ iwu ọ na-anọgide na-abụ nwatakịrị. . . . Ọ ga-edo onwe ya kpamkpam n’okpuru di ya, na-eme nanị ihe ọ gwara ya mee.” Lee ka nke a si dị nnọọ iche n’ozizi Ndị Kraịst! Di bụ́ Onye Kraịst sọpụụrụ nwunye ya. Ihe kpebiri otú o si mesoo ya ihe abụghị ihe ọ bụla gbabatara ya n’uche kama ọ bụ ụkpụrụ Ndị Kraịst. Ọzọkwa, o chebaara ya echiche “dị ka ihe ọmụma si dị,” na-echeta na ọ bụ ihe ka bụrụ nke na-esighị ike.

“Ihe Ka Bụrụ nke Na-esighị Ike” n’Ụzọ Dị Aṅaa?

8, 9. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ha nhata?

8 Mgbe Pita sịrị na nwanyị bụ “ihe ka bụrụ nke na-esighị ike,” ihe ọ na-ekwu abụghị na ụmụ nwanyị dị ala karịa ụmụ nwoke n’ọgụgụ isi ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ. N’eziokwu, ọtụtụ ụmụ nwoke bụ́ Ndị Kraịst nwere ihe ùgwù ndị ụmụ nwanyị na-adịghị atụ anya inweta n’ọgbakọ, n’ezinụlọ kwa, ụmụ nwanyị na-anọ n’okpuru di ha. (1 Ndị Kọrint 14:35; 1 Timoti 2:12) Otú o sina dị, a chọrọ otu okwukwe, ntachi obi, na ụkpụrụ omume dị elu n’aka mmadụ nile, ma nwoke ma nwanyị. Dịkwa ka Pita kwuru, ma di ma nwunye bụcha “ndị nketa nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke ndụ.” A bịahaala n’ihe metụtara nzọpụta, ha ha nhata n’ihu Jehova Chineke. (Ndị Galeshia 3:28) Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ dịrị ndụ na narị afọ mbụ ka Pita nọ na-edegara akwụkwọ. N’ihi ya, okwu ya chetaara ndị di bụ́ Ndị Kraịst na dị ka “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,” ha na nwunye ha nwere otu olileanya eluigwe ahụ. (Ndị Rom 8:17) Otu ụbọchị, ha abụọ ga-eje ozi dị ka ndị nchụàjà na ndị eze n’Alaeze eluigwe nke Chineke!—Mkpughe 5:10.

9 Ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ adịghị otú ha si dị ala karịa ndị di ha bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Otu ụkpụrụ ahụ metụtakwara ndị nwere olileanya elu ala. Ma ndị nwoke ma ndị nwanyị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ na-asa uwe mwụda ha ma na-eme ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ. “Ehihie na abalị,” ma ndị nwoke ma ndị nwanyị na-ekere òkè ná mkpu otuto a na-etigara Jehova n’ụwa nile. (Mkpughe 7:9, 10, 14, 15) Ma ndị nwoke ma ndị nwanyị na-atụ anya “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke,” bụ́ mgbe ha ga-enwe obi ụtọ ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (Ndị Rom 8:21; 1 Timoti 6:19) Ma hà so ná ndị e tere mmanụ ma hà so n’atụrụ ọzọ ahụ, Ndị Kraịst nile na-ejekọrọ Jehova ozi ọnụ dị ka “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu Onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Lee ka nke ahụ si bụrụ ezigbo ihe mere ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ga-eji na-enye ibe ha nsọpụrụ ruuru ha!

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ụmụ nwanyị bụ “ihe ka bụrụ nke na-esighị ike”?

10 N’ụzọ dịzi aṅaa ka ụmụ nwanyị bụ “ihe ka bụrụ nke na-esighị ike”? O yiri ka ihe Pita nọ na-ezo aka na ya ọ̀ bụ eziokwu ahụ bụ́ na, n’ozuzu, ụmụ nwanyị na-adị obere karịa ụmụ nwoke ma nwee ike ọkpụkpụ aka dị ala karịa nke ụmụ nwoke. Tụkwasị na nke ahụ, n’ihi ezughị okè anyị, ihe ùgwù pụrụ iche nke ịmụ nwa na-emetụta ahụ́ ike ụmụ nwanyị. Ụmụ nwanyị ka nọ n’afọ ndụ ịmụ nwa pụrụ ịdị na-enwe mgbakasị ahụ́ site n’oge ruo n’oge. N’ezie, nlebara anya pụrụ iche dị ha mkpa mgbe ha na-enwe mgbakasị ahụ́ dị otú ahụ ma ọ bụ na-edi ahụmahụ na-agwụ ike nke ịtụrụ ime na ịmụ nwa. Di nke na-asọpụrụ nwunye ya, nke na-aghọta nkwado dị ya mkpa, ga-atụnye ụtụ buru ibu n’ihe ịga nke ọma nke alụmdi na nwunye ha.

N’ezinụlọ Kewara Ekewa n’Ụzọ Okpukpe

11. N’ụzọ dị aṅaa ka alụmdi na nwunye pụrụ isi na-aga nke ọma ma ọ bụrụgodị na di na nwunye nọ n’okpukpe dịgasị iche?

11 Ma, gịnị ma ọ bụrụ na di na nwunye nwere nkwenkwe okpukpe dịgasị iche n’ihi na otu n’ime ha ghọrọ Onye Kraịst mgbe ha lụsịrị ebe nke ọzọ na-aghọghị? Alụmdi na nwunye dị otú ahụ ọ̀ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma? Ahụmahụ nke ọtụtụ ndị na-egosi na ọ pụrụ. Di na nwunye nwere nkwenkwe okpukpe dịgasị iche ka pụrụ inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma n’echiche bụ́ na alụmdi na nwunye ha pụrụ ịdịgide ma wetara ha abụọ obi ụtọ. E wezụga nke ahụ, alụmdi na nwunye ahụ ka dị irè n’anya Jehova; ha ka bụ “otu anụ ahụ́.” N’ihi ya, a dụrụ ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ọdụ ka ha nọgide na-ebinyere nwunye ma ọ bụ di ha na-ekweghị ekwe ma ọ bụrụ na onye nke ahụ na-ekweghị ekwe kwere ka ha na ya biri. Ọ bụrụ na ha nwere ụmụ, ụmụ ha na-erite uru site n’ikwesị ntụkwasị obi nke nne ma ọ bụ nna ha bụ́ Onye Kraịst.—1 Ndị Kọrint 7:12-14.

12, 13. Site n’ịgbaso ndụmọdụ Pita, olee otú ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst pụrụ isi nyere di ha na-ekweghị ekwe aka?

12 Pita ji obiọma nye ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst bi n’ezinụlọ ndị kewara ekewa n’ụzọ okpukpe ndụmọdụ. Ụkpụrụ dị n’okwu ya metụtakwara ndị di bụ́ Ndị Kraịst nọ n’otu ọnọdụ ahụ. Pita na-ede, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, ka, ọ bụrụ na o nwere ndị na-adịghị erubere okwu ahụ isi, e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nke nwunye ha, n’ihi ịbụ ndị jiworo anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi.”—1 Pita 3:1, 2.

13 Ọ bụrụ na nwunye pụrụ iji akọ kọwaara di ya nkwenkwe okpukpe ya, nke ahụ dị mma. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na di ya achọghị ige ntị? Nwoke ahụ nweere onwe ya ime mkpebi dị otú ahụ. Ma, nke ahụ apụtaghị na olileanya adịghịzi, ebe ọ bụ na àgwà Ndị Kraịst na-agbakwa àmà dị ike. Ọtụtụ ndị di bụ́ ndị na-enwebughị mmasị n’okpukpe nwunye ha ghọrọ ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi” mgbe ha hụsịrị omume ọma nke nwunye ha. (Ọrụ 13:48) Ọ bụrụgodị na di aghọghị Onye Kraịst, àgwà nwunye ya ka pụrụ ịmasị ya, nke ahụ ga-arụpụtakwa ezi ihe n’alụmdi na nwunye ha. Otu di nke nwunye ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova kwetara na ya apụghị ịgbaso ụkpụrụ dị elu ndị ha na-agbaso. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ kpọrọ onwe ya “di nwere obi ụtọ nke nwanyị ọma” ma jiri obi ya nile too nwunye ya na Ndịàmà ibe ya n’akwụkwọ ozi o degaara ndị na-ebipụta otu akwụkwọ akụkọ.

14. Olee otú ndị di pụrụ isi nyere nwunye ha na-ekweghị ekwe aka?

14 Ndị di bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị tinyeworo ụkpụrụ nke okwu Pita n’ọrụ eritewokwa nwunye ha n’uru site n’àgwà ha. Ndị nwunye na-ekweghị ekwe ahụwo na di ha na-ejizi ibu ọrụ ya akpọrọ ihe, kwụsị imefusị ego na siga, mmanya, na n’ịgba chaa chaa, hụkwa na ọ naghịzi eji okwu mkparị eme ihe. Ụfọdụ ndị nwunye a amatawo ndị ọzọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Òtù ụmụnna anyị na-ahụ n’anya dọọrọ mmasị ha, ihe ha hụkwara n’etiti ụmụnna anyị dọtara ha n’ebe Jehova nọ.—Jọn 13:34, 35.

“Mmadụ Zoro Ezo nke Obi”

15, 16. Olee ụdị àgwà ọ ga-abụ nwunye bụ́ Onye Kraịst kpawa ya erite di ya n’uru?

15 Olee ụdị àgwà a pụrụ iji rite di n’uru? N’ezie, ọ bụ àgwà ụmụ nwanyị Ndị Kraịst na-azụlitekarị. Pita na-ekwu, sị: “Unu ekwekwala ka ịchọ mma unu bụrụ nke ịkpa isi efu na nke iyikwasị ihe ịchọ mma ọlaedo ma ọ bụ iyi uwe elu, kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ, bụ́ nke bara oké uru n’anya Chineke. N’ihi na n’oge gara aga, otú ahụkwa ka ụmụ nwanyị dị nsọ ndị na-enwe olileanya na Chineke siri chọọ onwe ha mma, na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha, dị ka Sera si erubere Ebreham isi, na-akpọ ya ‘onyenwe m.’ Unu aghọwokwa ụmụ ya, ma ọ bụrụhaala na unu anọgide na-eme ihe ọma, gharakwa ịtụ egwu ihe ọ bụla na-akpata oké ụjọ.”—1 Pita 3:3-6.

16 Pita na-adụ nwanyị bụ́ Onye Kraịst ọdụ ka ọ ghara ịdabere n’ọdịdị elu ahụ́. Kama nke ahụ, ka di ya hụ mmetụta ozizi Bible na-enwe n’ụdị mmadụ ọ bụ n’ime. Ka ọ hụ ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ n’ime ya. Ma eleghị anya, ọ ga-ahụ otú o si dị iche n’ụdị mmadụ ochie nwunye ya bụbu. (Ndị Efesọs 4:22-24) N’ezie, “mmụọ [ya] dị jụụ na nke dị nwayọọ” ga-eme di ya obi ụtọ ma dọrọ mmasị ya. Ọ bụghị nanị na mmụọ dị otú ahụ na-amasị onye bụ́ di kamakwa ọ “bara oké uru n’anya Chineke.”—Ndị Kọlọsi 3:12.

17. Olee otú Sera si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst?

17 E zoro aka n’ebe Sera nọ dị ka ihe nlereanya, ọ bụkwa ihe nlereanya kwesịrị ekwesị nye ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst ma di ha hà bụ ndị kwere ekwe ma ọ bụ na ha abụghị. O doro anya na Sera lere Ebreham anya dị ka isi ya. Ọbụna n’obi ya, ọ kpọrọ ya “onyenwe m.” (Jenesis 18:12) Ma, nke ahụ ewedaghị ya ala. O doro anya na ọ bụ nwanyị siri ike n’ụzo ime mmụọ site n’okwukwe siri ike nke ya onwe ya nwere na Jehova. N’ezie, o so ‘n’oké ìgwè ndị àmà’ bụ́ ndị ihe nlereanya nke okwukwe ha na-akpali anyị ‘iji ntachi obi na-agba ọsọ ahụ nke e setịpụrụ n’ihu anyị.’ (Ndị Hibru 11:11; 12:1) Ọ bụghị ihe na-eweda n’ala nwunye bụ́ Onye Kraịst ịdị ka Sera.

18. Olee ụkpụrụ ndị e kwesịrị iburu n’uche n’ezinụlọ kewara ekewa?

18 N’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe, ọ bụ di ka bụ isi. Ọ bụrụ na ọ bụ ya bụ onye nke kwere ekwe, ọ ga na-echebara nkwenkwe nwunye ya echiche ma ghara imebi okwukwe nke ya. Ọ bụrụ na ọ bụ nwunye bụ onye nke kwere ekwe, ya onwe ya kwa agaghị emebi okwukwe ya. (Ọrụ 5:29) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gaghị ama ịbụisi nke di ya aka. Ọ ga-akwanyere ọnọdụ di ya ùgwù ma nọgide n’okpuru ‘iwu nke di ya.’—Ndị Rom 7:2.

Nduzi Amamihe Dị na Ya nke Bible

19. Olee nsogbu ụfọdụ na-emetụta alụmdi na nwunye, ma olee otú a pụrụ isi mee ihe banyere nsogbu ndị dị otú ahụ?

19 Taa, e nwere ọtụtụ ihe pụrụ iweta nsogbu ná nkekọ alụmdi na nwunye. Ụmụ nwoke ụfọdụ anaghị arụ ọrụ dịịrị ha. Ụfọdụ ụmụ nwanyị anaghị anabata ịbụisi nke di ha. N’alụmdi na nwunye ụfọdụ, a na-emekpọ di ma ọ bụ nwunye ọnụ. Nsogbu akụ̀ na ụba, ezughị okè mmadụ, na mmụọ nke ụwa na omume rụrụ arụ ya na ụkpụrụ ya ndị a gwagburu agwagbu pụrụ ile ikwesị ntụkwasị obi nke Onye Kraịst ule. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-agbaso ụkpụrụ Bible, n’agbanyeghị ọnọdụ ha nọ na ya, na-enweta ngọzi Jehova. Ya bụrụgodị na ọ bụ nanị otu onye n’alụmdi na nwunye na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ihe na-adị mma karịa mgbe ọ na-adịghị onye n’ime ha na-eme otú ahụ. Ọzọkwa, Jehova na-ahụ ndị ohu ya na-anọgide na-emezu nkwa ọlụlụ ha ọbụna n’ọnọdụ ndị siri ike n’anya, ọ na-akwadokwa ha. Ọ naghị echefu iguzosi ike n’ihe ha.—Abụ Ọma 18:25; Ndị Hibru 6:10; 1 Pita 3:12.

20. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pita nyere Ndị Kraịst nile?

20 Mgbe o nyesịrị ndị di na nwunye ndụmọdụ, Pita onyeozi ji agbamume si n’ala ala obi mechie. O kwuru, sị: “N’ikpeazụ, ka unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko, na-adị umeala n’obi, ghara ịkwụghachi ihe ọjọọ maka ihe ọjọọ, nkwujọ maka nkwujọ, kama, n’ụzọ dị iche, na-agọzi agọzi, n’ihi na a kpọrọ unu n’ụzọ a, ka unu wee keta ngọzi.” (1 Pita 3:8, 9) Nke ahụ bụ nnọọ ndụmọdụ amamihe dị na ya nye mmadụ nile, karịsịa ndị di na nwunye!

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú ndị di bụ́ Ndị Kraịst si eṅomi Jizọs?

• Olee otú ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst si eṅomi ọgbakọ?

• N’ụzọ dị aṅaa ka ndị bụ́ di pụrụ isi sọpụrụ nwunye ha?

• Olee ihe kasị mma nwunye bụ́ Onye Kraịst nke di ya bụ onye na-ekweghị ekwe ga-eme?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Di bụ́ Onye Krasịt na-ahụ nwunye ya n’anya ma na-elekọta ya

Nwunye bụ́ Onye Kraịst na-asọpụrụ ma na-akwanyere di ya ùgwù

[Foto dị na peeji nke 17]

N’adịghị ka iwu ndị Rom, ozizi Ndị Kraịst chọrọ ka di na-asọpụrụ nwunye ya

[Foto dị na peeji nke 18]

Ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bụ́ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ ahụ’ na-atụ anya ndụ ebighị ebi na Paradaịs

[Foto dị na peeji nke 20]

Sera weere Ebreham dị ka onyenwe ya