Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uru Ndị Dị n’Ime Udo

Uru Ndị Dị n’Ime Udo

Uru Ndị Dị n’Ime Udo

ED NỌ n’ọnụ ọnwụ, Bill kpọkwara ya asị. Afọ 20 tupu mgbe ahụ, Ed mere mkpebi nke mere ka ọrụ Bill funahụ ya, nke ahụ mekwara ka ndị a bụbu ezigbo enyi ghọọ ndị iro. Ed chọrọ ịrịọ mgbaghara ugbu a ka o wee nwụọ n’udo. Otú ọ dị, Bill jụrụ ige ya ntị.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 ka nke ahụ gasịrị, ka ọnwụ Bill na-erukwa nso, ọ kọwara ihe mere o ji jụ ịgbaghara Ed. “Ed ekwesịghị ime ihe ahụ o mere ezigbo enyi ya. Achọghị m ka mụ na ya kpezie mgbe iri afọ abụọ gacharala. . . . Ọ pụrụ ịbụ na ihe m mere adịghị mma, ma, ọ bụ otú o si dịrị m n’obi.” *

Esemokwu mmadụ na ibe ya adịchaghị arụpụta ihe dị oké njọ otú ahụ, ma ọ na-emekarị ka ndị mmadụ nwee obi mgbawa na obi ilu. Cheedị banyere onye nwere ụdị echiche Ed. N’ịghọta na mkpebi ya mebiri ihe, onye dị otú ahụ pụrụ ịdị na-enwe obi amamikpe na mmetụta nke oké mfu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-enwe obi mgbawa mgbe o chetara otú enyi ya o mejọrọ si tụfuo ọbụbụenyi ha dị nnọọ ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ.

Otú ọ dị, onye nwere ụdị echiche Bill na-ele onwe ya anya dị ka onye aka ya dị ọcha nke e mejọrọ, ọ pụkwara inwe obi ilu dị ukwuu ma na-ewe iwe. Nye ya, enyi ya mbụ ahụ ma ihe o mere, ọ pụkwara ịbụ na ọ ma ụma mejọọ ya. Ọtụtụ mgbe, mgbe mmadụ abụọ sere okwu, onye nke ọ bụla n’ime ha na-ekwenyesi ike na ikpe laara ya nakwa na ọ bụ onye nke ọzọ ka ụta dịịrị. N’ihi ya, a pụrụ ikwu na mmadụ abụọ bụbu enyi na-eburịta agha.

Ha na-eji ngwá agha a na-adịghị ahụ anya eburịta agha—otu bịawa onye nke ọzọ elefuo anya, ha na-emekwa ka à ga-asị na ha ahụghị ibe ha mgbe ha nọ n’etiti ndị ọzọ. Ha na-eji ọdụ anya ele ibe ha na nzuzo site n’ebe dị anya ma ọ bụ na-ele ibe ha anya ọjọọ. Ọ bụrụ na ha agwadị ibe ha okwu, ha na-eji olu ike, ma ọ bụ na-agwarịta ibe ha okwu mkparị ndị na-egbu mmụọ.

Ma, n’agbanyeghị na o yiri ka hà na-emegide onwe ha n’ihe nile, a pụrụ inwe ihe ụfọdụ ndị ha abụọ kwenyechara na ha. Ha pụrụ ikweta na ha nwere nnukwu nsogbu, nakwa na ọ bụ ihe mwute mmadụ na ezigbo enyi ya ise okwu. Ọnyá ahụ na-aba aba yiri ka ọ̀ ga na-ewute ha abụọ, ha abụọ amarakwa na e kwesịrị ime ihe iji gwọọ ya. Ma, ònye ga-ebute ụzọ n’imezi mmekọrịta ahụ mebiri emebi ma mee udo? Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha dị njikere ibute ụzọ.

Puku afọ abụọ gara aga, ndịozi Jizọs Kraịst rụrụ ụka n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ mgbe ụfọdụ. (Mak 10:35-41; Luk 9:46; 22:24) Mgbe ha sesịrị okwu kpụ ọkụ n’ọnụ n’otu oge, Jizọs jụrụ, sị: “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka ya n’okporo ụzọ?” N’ịbụ ndị ihere mechiri ọnụ, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha zara ya ihe ọ bụla. (Mak 9:33, 34) Ihe Jizọs kụziiri ha nyeere ha aka idozi esemokwu ha. Ndụmọdụ ya, na nke ndị na-eso ụzọ ya, anọgidewo na-enyere ndị mmadụ aka idozi esemokwu ha na imezi mmekọrịta ọbụbụenyi ndị tisaworo etisa. Ka anyị hụ otú nke ahụ siworo mee.

Gbalisie Ike Ime Udo

“Achọghị m ịtụpụrụ ya ọnụ ọzọ. Achọghị m ịhụ ya anya ọzọ.” Ọ bụrụ na ị gwawo mmadụ okwu dị otú ahụ, ọ dị gị mkpa ime ihe, dị ka akụkụ Bible ndị na-esonụ na-egosi.

Jizọs kụziri, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na ị na-ewega onyinye gị n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na o nwere ihe nwanne gị nwere megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, pụọkwa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo.” (Matiu 5:23, 24) O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na nwanna gị emee mmehie, gaa kpugheere ya mmejọ ya n’etiti nanị gị na ya.” (Matiu 18:15) Ma ì mejọrọ mmadụ ma mmadụ ò mejọrọ gị, okwu Jizọs na-emesi ike mkpa ọ dị gị ịgakwuru onye ahụ n’egbughị oge iji kwurịta ya. I kwesịrị iji “mmụọ nke ịdị nwayọọ” mee nke a. (Ndị Galeshia 6:1) Nzube nke nkwurịta okwu a abụghị iji mee ka a mara na i meziri emezi ma ọ bụ iji mee ka onye gị na ya na-ese okwu rịọ gị mgbaghara, kama ọ bụ iji mee udo. Ndụmọdụ Bible a ọ̀ dị irè?

Ernest bụ onye nlekọta n’otu nnukwu ụlọ ọrụ. * Ruo ọtụtụ afọ, ọrụ ya achọwo ka o soro ụdị mmadụ dị iche iche kwurịta okwu ndị chọrọ nlezianya ma hụ na ya na ha nọgidere na-enwe ezi mmekọrịta n’ụlọ ọrụ. Ọ hụwo otú esemokwu pụrụ isi bilite n’ụzọ dị mfe n’etiti mmadụ na ibe ya. O kwuru, sị: “Ọ dịla oge ndị mụ na ndị ọzọ nwere nghọtahie. Ma mgbe nke ahụ mere, mụ na onye ahụ na-anọdụ ala ma kwurịta nsogbu ahụ. Gakwuru ha ihu na ihu. Buru n’uche gị na ha ikpezi. Ọ dịghị mgbe nke ahụ na-adịghị arụpụta ihe.”

Alicia nwere ndị enyi si n’ọdịbendị dịgasị iche, ọ na-ekwukwa, si: “Mgbe ụfọdụ, m na-ekwu okwu ma mesịa chee na ekwujọọla m mmadụ. M na-aga rịọ onye ahụ mgbaghara. O nwere ike ịbụ na m na-arịọ mgbaghara karịa ka m kwesịrị n’ihi na ọ bụrụgodị na onye nke ọzọ eweghị iwe, ahụ́ na-eru m ala n’ihi na m rịọrọ mgbaghara. Mgbe ahụ, m na-ama na ọ dịghị onye ghọtahiere m.”

Imeri Ihe Mgbochi

Otú ọ dị, a na-enwekarị ihe ndị na-egbochi ime udo mgbe mmadụ abụọ sere okwu. Ọ̀ dịtụwo mgbe i kwuru, sị: “Olee ihe mere ọ ga-eji bụrụ m ga-ebute ụzọ n’ime udo? Ọ bụ ya kpatara nsogbu ahụ.” Ka ọ̀ dịwo mgbe ị gakwuuru mmadụ iji dozie esemokwu nanị ịnụ ka onye ahụ gwara gị, sị: “O nweghị ihe m nwere ịgwa gị”? Ụfọdụ mmadụ na-azaghachi otú ahụ n’ihi ihe mgbu ha gabigaworo. Ilu 18:19 na-ekwu, sị: “Nwanne e jehieworo megide dị ike iwere karịa obodo siri ike: iseokwu dịkwa ka ihe ntụchi nile nke ụlọ elu.” Ya mere, chebara mmetụta onye ahụ echiche. Ọ bụrụ na ọ jụ ige gị ntị, chetụ obere oge ma gaghachi. Mgbe ahụ, ‘obodo ahụ siri ike’ pụrụ imepe, a pụkwara iwepụ “ihe ntụchi” ahụ e ji tụchie ọnụ ụzọ nke ime udo.

Ihe ọzọ pụrụ ịbụ ihe mgbochi nye ime udo bụ ùgwù onwe onye. Nye ụfọdụ mmadụ, ịrịọ mgbaghara ma ọ bụ ọbụna ịtụpụrụ onye ha na ya sere okwu ọnụ bụ iweda onwe ha ala. Inwe nchegbu banyere ùgwù onwe onye kwesịrị ekwesị, ma ịjụ ime udo ọ̀ na-eme ka mmadụ nwee ùgwù ka ọ̀ na-ebelata ya? Nchegbu a a na-enwe maka ùgwù onwe onye ọ̀ pụrụ ịbụ n’ezie mpako?

Jems onye so dee Bible na-egosi na mmụọ nke iseokwu na mpako nwere njikọ. Mgbe o kpughesịrị “agha” na “ọgụ” dị n’etiti Ndị Kraịst ụfọdụ, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.” (Jems 4:1-3, 6) Olee otú mpako, ma ọ bụ ibuli onwe onye elu si egbochi ime udo?

Mpako na-eduhie ndị mmadụ, na-eme ka ha kwere na ha ka ndị ọzọ mma. Ndị na-ebuli onwe ha elu na-eche na ha nwere ikike ikpebi ma mmadụ ibe ha ọ̀ bụ ezigbo mmadụ ka ọ̀ bụ onye ọjọọ. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe ha na ndị ọzọ nwere nghọtahie, ha na-elekarị ndị ha na ha sere okwu anya dị ka ndị na-apụghị ịgbanwe agbanwe, ndị na-enweghịzi mmekwata. Mpako na-eme ka ụfọdụ na-ele ndị nwere echiche dị iche na nke ha anya dị ka ndị a na-ekwesịghị ịtụpụrụ ọnụ, ma ya fọdụzie ịrịọ ha mgbaghara site n’ala ala obi. N’ihi ya, ndị mpako na-ekwekarị ka esemokwu dịgide kama idozi ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Dị ka osisi e ji tụchie ụzọ, mpako na-egbochikarị ime udo. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-egbochi mgbalị onye ọzọ na-eme iji mee ka gị na ya dị n’udo, ọ pụrụ ịbụ na gị na mpako na-alụ. Olee otú ị pụrụ isi merie mpako? Ọ bụ site n’ịzụlite àgwà dị nnọọ iche na ya—umeala n’obi.

Mee Nnọọ Ihe Dị Iche na nke Ahụ

Bible na-agba anyị nnọọ ume ịdị umeala n’obi. “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.” (Ilu 22:4) N’Abụ Ọma 138:6, anyị na-agụ banyere otú Chineke si ele ndị dị umeala n’obi na ndị mpako anya, sị: “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka Ọ na-ahụ anya: ma onye mpako, Ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.”

Ọtụtụ mmadụ na-ele ịdị umeala n’obi anya dị ka mmechuihu. O yikwara ka ọ̀ bụ otú ahụ ka ndị ọchịchị ụwa si ele ya anya. Ọ bụ ezie na ndị nile bi ná mba ha na-achị na-eme ihe ha gwara ha mee, ndị isi ọchịchị na-ala azụ iji obi umeala nakwere mmejọ ha. Ịnụ ka onyeisi ọchịchị sịrị, “Ihe m mere wutere m” bụ ihe akụkọ. Mgbe onye bụbu onye ọrụ gọọmenti rịọrọ mgbaghara n’oge na-adịbeghị anya n’ihi na ya egbochilighị otu ọdachi, okwu ya gbara n’isi akụkọ.

Ịdị umeala n’obi bụ mmadụ iweda onwe ya ala, ọ dị iche ná mpako na mmadụ ibuli onwe ya elu. Ya mere, ịdị umeala n’obi na-egosi otú mmadụ si ele onwe ya anya, ọ bụghị otú ndị ọzọ si ele ya anya. Mmadụ iji obi umeala anakwere mmejọ ya ma jiri ezi obi rịọ mgbaghara adịghị emechu ya ihu; kama nke ahụ, ọ na-akwalitekwu aha ọma onye ahụ. Bible na-ekwu, sị: “N’ihu ntipịa ka obi mmadụ dị elu, ọ bụkwa n’ihu nsọpụrụ ka obi umeala na-aga.”—Ilu 18:12.

Banyere ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ ndị na-adịghị arịọ mgbaghara maka ihe ha mejọrọ, otu ọkachamara kwuru, sị: “Ọ bụ ihe dị mwute na ha na-eche na ikweta mmejọ ha na-egosi na ha adịghị ike. Ọ na-esiri ndị na-adịghị ike na ndị na-ejighị onwe ha n’aka ike ịsị, ‘Ndo.’ Ọ bụ ndị nwere obi sara mbara na obi ike bụ ndị na-adịghị ele ya anya dị ka ire ùgwù ha ịsị, ‘Emejọrọ m.’” Nke ahụ bụkwa eziokwu banyere ndị na-anọghị n’ọkwá ọchịchị. Ọ bụrụ na i tinye mgbalị n’iji umeala n’obi dochie mpako, ọ ga-adịrị gị mfe karị ime ka gị na ndị ọzọ dịghachi ná mma mgbe gị na ha sere okwu. Lee otú otu ezinụlọ si chọpụta ịdị irè nke okwu a.

Nghọtahie kpatara nsogbu n’etiti Julie na nwanne ya nwoke bụ́ William. William wesoro nnọọ Julie na di ya, bụ́ Joseph, iwe nke na ọ kwụsịrị iso ha akpakọrịta n’ụzọ ọ bụla. Ọbụna o weghachiri onyinye nile Julie na Joseph nyetụrụla ya. Ka ọtụtụ ọnwa gafere, obi ilu nọchiri mkpakọrịta chiri anya nke ụmụnne a nweburu.

Otú ọ dị, Joseph kpebiri itinye Matiu 5:23, 24 n’ọrụ. Ọ gbalịrị iji mmụọ ịdị nwayọọ n’obi gakwuru ọgọ ya nwoke ma degara ya akwụkwọ ozi bụ́ ndị o ji rịọ ya mgbaghara. Joseph gbara nwunye ya ume ịgbaghara nwanne ya nwoke. Ka oge na-aga, William hụrụ na Julie na Joseph ji ezi obi chọọ ime udo, àgwà ya gbanwere. William na nwunye ya na Julie na Joseph zukọrọ; ha rịọrịtara mgbaghara, makụọ onwe ha, ma bụrụghachi ndị enyi.

Ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ idozi esemokwu nke dị n’etiti gị na mmadụ, jiri ndidi tinye ihe ndị Bible na-akụzi n’ọrụ ma gbalịa iso onye ahụ mee udo. Jehova ga-enyere gị aka. Ihe Chineke gwara Izrel oge ochie ga-emezu n’ọnọdụ gị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri.”—Aịsaịa 48:18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ dabeere n’akwụkwọ bụ́ The Murrow Boys—Pioneers on the Front Lines of Broadcast Journalism, nke Stanley Cloud na Lynne Olson dere.

^ par. 12 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ịrịọ mgbaghara na-emekarị ka a dịghachi ná mma