Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị

Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị

Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị

“[Kraịst] nwụkwara maka mmadụ nile ka ndị dị ndụ wee ghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe ha.”—2 NDỊ KỌRINT 5:15.

1, 2. Olee iwu Akwụkwọ Nsọ nke kpaliri ụmụazụ Jizọs nke narị afọ mbụ ịkwụsị ịchọ ọdịmma onwe ha nanị?

Ọ BỤ abalị ikpeazụ Jizọs ga-anọ n’ụwa. Ọ fọrọ awa ole na ole ka o nyefee ndụ ya n’ihi ndị nile ga-egosipụta okwukwe na ya. N’abalị ahụ, Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ọtụtụ ihe ndị dị mkpa. Otu n’ime ha bụ iwu banyere otu àgwà nke ga-aghọ ihe a ga-eji na-amata ụmụazụ ya. O kwuru, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:34, 35.

2 Ezi Ndị Kraịst ga-egosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’ebe ibe ha nọ ma na-ebute mkpa nke ndị kwere ekwe ibe ha ụzọ karịa nke ha. Ha ekwesịghị ịla azụ ọbụna ‘n’ịtọgbọ mkpụrụ obi ha n’ihi ndị enyi ha.’ (Jọn 15:13) Olee ihe Ndị Kraịst oge mbụ mere banyere iwu ọhụrụ ahụ? N’akwụkwọ ya a ma ama bụ́ Apology, onye edemede nke narị afọ nke abụọ bụ́ Tertullian hotara ihe ndị ọzọ kwuru banyere Ndị Kraịst, sị: ‘Lee otú ha si hụ ibe ha n’anya na otú ha si ọbụna dị njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ.’

3, 4. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịkwụsị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị? (b) Gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Anyị onwe anyị kwa aghaghị ‘ịnọgide na-eburịta ibu arọ nke ibe anyị, ma si otú a na-emezu iwu nke Kraịst ahụ.’ (Ndị Galeshia 6:2) Otú ọ dị, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ otu n’ime ihe ndị kasị egbochi anyị irube isi n’iwu nke Kraịst ahụ na ‘iji mkpụrụ obi na uche anyị dum hụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’anya, nakwa ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị.’ (Matiu 22:37-39) N’ihi ịbụ ndị na-ezughị okè, anyị na-achọkarị nanị ọdịmma onwe anyị. Nrụgide nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị na-eweta, mmụọ nke nsọrịta mpi n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ na ndọga iji nweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ, na-emekwa ka ọchịchọ a e bu pụta ụwa na-esiwanyekwa ike. Àgwà a nke mmadụ ịchọ ọdịmma onwe ya nanị adịghị ebelata ebelata. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ . . . ndị mmadụ ga-abụ nnọọ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị.”—2 Timoti 3:1, 2, Phillips.

4 Ka ozi elu ala ya na-eru ná ngwụsị, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe atọ na-aga ụkwụ na ụkwụ ha ga-eme bụ́ ndị pụrụ inyere ha aka ịkwụsị ịchọ ọdịmma onwe ha nanị. Gịnị ka ha bụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru site ná ntụziaka ndị o nyere?

Ihe Ngwọta E Ji n’Aka!

5. Ka ọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe ugwu Galili, gịnị ka Jizọs kpugheere ndị na-eso ụzọ ya, n’ihi gịnị ka nke ahụ ji wụọ ha akpata oyi?

5 Jizọs nọ na-eme nkwusa na nso Sesaria Filipaị nke dị n’ebe ugwu Galili. Ọmarịcha ógbè a dị jụụ pụrụ nnọọ iyi ebe ka kwesị ekwesị maka ntụrụndụ kama ịbụ maka ịnapụ onwe onye ihe. Otú ọ dị, ka ha nọ ebe ahụ, Jizọs malitere igosi ndị na-eso ụzọ ya na ya “aghaghị ịga Jeruselem wee taa ọtụtụ ahụhụ n’aka ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, a ga-egbukwa ya, n’ụbọchị nke atọ a ga-akpọlitekwa ya.” (Matiu 16:21) Lee nnọọ ka ihe a e kpugheere ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aghaghị isiwo wụọ ha akpata oyi, n’ihi na ha ka na-atụ anya mgbe ahụ na Onye Ndú ha ga-eguzobe Alaeze ya n’ụwa!—Luk 19:11; Ọrụ 1:6.

6. Gịnị mere Jizọs ji basiere Pita mba ike?

6 Ozugbo ahụ, Pita “kpọpụrụ [Jizọs] n’akụkụ wee bido ịbara ya mba, na-asị: ‘Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.’” Gịnị ka Jizọs mere? ‘Ọ gbanyere Pita azụ, sị ya: “Gaa n’azụ m, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”’ Lee nnọọ ọdịiche dị n’echiche Jizọs na nke Pita! Jizọs ji obi ya nakwere ụzọ ndụ ịchụ onwe onye n’àjà nke Chineke nyeworo ya—bụ́ nke ga-eduga n’ọnwụ ya n’elu osisi ịta ahụhụ n’ọnwa ole na ole na-abịanụ. Pita tụụrụ ya aro ibi ndụ ntụsara ahụ́. O kwuru, sị: “Meere onwe gị ebere.” Obi abụọ adịghị ya na Pita bu ezi ihe n’obi. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs baara ya mba n’ihi na Pita ekwewo ka Setan metụta echiche ya n’oge ahụ. Ihe Pita “na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Matiu 16:22, 23.

7. Dị ka e dekọrọ na Matiu 16:24, olee ihe Jizọs tụrụ aro ka ụmụazụ ya mee?

7 A ka pụrụ ịnụ ụdị okwu ndị ahụ Pita gwara Jizọs taa. Ụwa na-agbakarị mmadụ ume ‘imere onwe ya ebere’ ma ọ bụ ‘ịgbaso ụzọ kasị mfe.’ N’aka nke ọzọ, Jizọs tụrụ aro iche echiche n’ụzọ dị nnọọ iche. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24) Akwụkwọ bụ́ The New Interpreter’s Bible na-ekwu, sị: “Okwu ndị a abụghị iji kpọọ ndị nọ n’èzí òkù ịghọ ndị na-eso ụzọ kama nke ahụ, e ji ha kọwaara ndị zaworo ọkpụkpọ òkù Kraịst ihe ịbụ ndị na-eso ụzọ ya pụtara.” Ndị kwere ekwe ga-eme ihe atọ ahụ Jizọs tụrụ aro ka ha mee, dị ka e dekọrọ ha n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Ka anyị tụlee ihe ndị ahụ otu otu.

8. Kọwaa ihe ịjụ onwe gị pụtara.

8 Nke mbụ, anyị aghaghị ịjụ onwe anyị. Okwu Grik e ji mee ihe maka “mmadụ ịjụ onwe ya” na-egosi ịdị njikere ịjụ ọchịchọ onwe onye ma ọ bụ ntụsara ahụ́. Ịjụ onwe anyị apụtaghị nanị ịjụ ihe ụtọ ụfọdụ site n’oge ruo n’oge; ọ pụtaghịkwa ịnapụ onwe anyị ihe ụtọ nile ma ọ bụ ịghara iji ndụ anyị akpọrọ ihe. Anyị ‘enweghịzi onwe anyị’ n’echiche nke na anyị ji obi anyị nyefee Jehova ndụ anyị dum nakwa na ihe nile anyị ga-eji ya eme bụ maka Jehova. (1 Ndị Kọrint 6:19, 20) Kama ịbụ nke e ji achọ ọdịmma onwe onye nanị, ndụ anyị na-abụ nke e ji ejere Chineke ozi. Ịjụ onwe anyị pụtara ikpebisi ike ime uche Chineke, n’agbanyeghị na nke a pụrụ imegide ọchịchọ anyị na-ezughị okè. Anyị na-egosi na anyị enyefeela Chineke onwe anyị kpamkpam mgbe anyị raara onwe anyị nye ya, e meekwa anyị baptizim. Anyị na-agbalịzi ime ihe kwekọrọ ná nraranye anyị ná ndụ anyị nile.

9. (a) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, gịnị ka osisi ịta ahụhụ na-anọchi anya ya? (b) Olee otú anyị si ebuli osisi ịta ahụhụ anyị?

9 Nzọụkwụ nke abụọ bụ na anyị aghaghị ibuli osisi ịta ahụhụ anyị. Na narị afọ mbụ, osisi ịta ahụhụ na-anọchi anya ahụhụ, ihere na ọnwụ. Ọ bụ nanị ndị omekome ka a na-akwụgbukarị n’osisi ịta ahụhụ ma ọ bụ kwụba ozu ha n’osisi. Jizọs ji okwu a gosi na Onye Kraịst aghaghị ịdị njikere ịnabata mkpagbu, nlelị, ma ọ bụ ọbụna ọnwụ, ebe ọ bụ na ọ bụghị akụkụ nke ụwa. (Jọn 15:18-20) Ụkpụrụ Ndị Kraịst anyị na-eme ka anyị pụọ iche, n’ihi ya, ụwa pụrụ ‘ikwujọ anyị.’ (1 Pita 4:4) Nke a pụrụ ime n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ anyị, ma ọ bụ ọbụna n’ime ezinụlọ. (Luk 9:23) Otú ọ dị, anyị dị njikere idi nlelị nke ụwa na-elelị anyị n’ihi na anyị anaghịzi adị ndụ maka onwe anyị. Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m. Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:11, 12) N’ezie, ihe ka mkpa bụ inweta nnwapụta Chineke.

10. Gịnị ka ịnọgide na-eso Jizọs gụnyere?

10 Nke atọ, Jizọs Kraịst kwuru na anyị aghaghị ịnọgide na-eso ya. Dị ka akwụkwọ bụ́ An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere si kwuo, iso pụtara ịghọ onye ibe—“onye na-aga otu ebe ahụ onye nke ọzọ na-aga.” Jọn nke Mbụ 2:6 na-ekwu, sị: “Onye na-asị na ya na [Chineke] nọgidere na-adị n’otu jikwa ụgwọ n’onwe ya ịnọgide na-eje ije kpọmkwem dị ka onye ahụ [Kraịst] jere.” Olee otú Jizọs si jee ije? Ịhụnanya Jizọs nwere maka Nna ya nke eluigwe na maka ndị na-eso ụzọ ya mere ka ọ ghara ịchọ ọdịmma onwe ya nanị. Pọl dere, sị: “Kraịst ahụ emeghị ihe masịrị ya onwe ya.” (Ndị Rom 15:3) Jizọs mere ka mkpa ndị ọzọ butere nke ya ụzọ ọbụna mgbe ike gwụrụ ya ma ọ bụ mgbe agụụ na-agụ ya. (Mak 6:31-34) Jizọs rụsikwara ọrụ ike n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na nke izi ihe. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iṅomi ya ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ anyị nke ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile Jizọs nyere n’iwu’? (Matiu 28:19, 20) N’omume ya nile, Kraịst setịpụụrụ anyị ihe nlereanya, anyị aghaghịkwa ‘ịgbasochi nzọụkwụ ya anya.’—1 Pita 2:21.

11. Gịnị mere o ji dị mkpa na anyị ga-ajụ onwe anyị, bulie osisi ịta ahụhụ anyị, nọgidekwa na-eso Jizọs Kraịst?

11 Ọ dị oké mkpa na anyị ga-ajụ onwe anyị, bulie osisi ịta ahụhụ anyị, nọgidekwa na-eso Onye Nlereanya anyị. Anyị ime otú ahụ bụ ihe ngwọta nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị—nke pụrụ nnọọ igbochi anyị inwe ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà. Ọzọkwa, Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-achọta ya. N’ihi na olee uru ọ ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o rite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya? ma ọ bụ gịnị ka mmadụ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya?”—Matiu 16:25, 26.

Anyị Apụghị Ịbụ Ohu nke Nna Ukwu Abụọ

12, 13. (a) Gịnị na-echegbu nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị nke rịọrọ Jizọs maka ndụmọdụ? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jizọs nyere nwa okorobịa ahụ, n’ihi gịnịkwa?

12 Ọnwa ụfọdụ ka Jizọs mesichara ike mkpa ọ dị ndị na-eso ụzọ ya ịjụ onwe ha, otu nwa okorobịa bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya bịakwutere ya ma sị ya: “Onye Ozizi, olee ihe ọma m na-aghaghị ime iji wee nweta ndụ ebighị ebi?” Jizọs gwara ya ka ọ “nọgide na-edebe ihe ndị e nyere n’iwu” ma kwuo ụfọdụ n’ime ha. Nwa okorobịa ahụ kwuru, sị: “Edebewo m ihe ndị a nile.” Nwoke ahụ yiri onye nwere obi eziokwu nke mekwarala ike ya nile irube isi n’Iwu ahụ. Ya mere, ọ jụrụ, sị: “Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” Ná nzaghachi, Jizọs kpọrọ nwa okorobịa ahụ òkù pụrụ iche, na-asị ya: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka i zuo okè [“zuo ezuo,” New American Standard Bible], gaa ree ihe i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.”—Matiu 19:16-21.

13 Jizọs hụrụ na ka nwa okorobịa ahụ nwee ike iji obi ya dum jeere Jehova ozi, ọ dị ya mkpa iwepụ nnukwu ihe ndọpụ uche o nwere—akụ̀ na ụba ya. Ezi onye na-eso ụzọ Kraịst apụghị ijere nna ukwu abụọ ozi. Ọ ‘pụghị ịbụ ohu Chineke na Akụ̀ na Ụba.’ (Matiu 6:24) ‘Anya na-elegide otu ebe’ bụ́ nke lekwasịrị n’ihe ime mmụọ dị ya mkpa. (Matiu 6:22) Mmadụ ire ihe onwunwe ya ma nye ya ndị ogbenye bụ ịchụ onwe onye n’àjà. Jizọs nyere nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ịkpakọba akụ̀ n’eluigwe iji dochie ihe onwunwe ya ndị a ọ ga-achụ n’àjà—akụ̀ dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke ga-apụtara ya ndụ ebighị ebi na atụmanya nke imesị soro Kraịst chịa n’eluigwe. Nwa okorobịa ahụ adịghị njikere ịjụ onwe ya. “Ọ pụrụ ná mwute, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe onwunwe.” (Matiu 19:22) Otú ọ dị, ụmụazụ Jizọs ndị ọzọ meghachiri omume n’ụzọ dị iche.

14. Olee ihe ndị ọkụ azụ anọ ahụ mere mgbe Jizọs kpọrọ ha òkù iso ya?

14 Ihe dị ka afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Jizọs kpọrọ mmadụ anọ na-akụ azụ aha ha bụ Pita, Andru, Jems na Jọn òkù yiri nke ahụ. Abụọ n’ime ha nọ na-akụ azụ n’oge ahụ, abụọ ndị nke ọzọ nọkwa na-emezi ụgbụ ha. Jizọs gwara ha, sị: “Soronụ m, m ga-emekwa unu ndị na-akụta mmadụ.” Ha anọ mesịrị hapụ ọrụ ịkụ azụ ha ma jiri oge ndụ ha fọdụrụnụ soo Jizọs.—Matiu 4:18-22.

15. Olee otú otu Onyeàmà Jehova nke oge a si chụọ ihe ụfọdụ n’àjà iji soo Jizọs?

15 Ọtụtụ Ndị Kraịst taa eṅomiwo ihe nlereanya nke ndị ọkụ azụ anọ ahụ kama iṅomi nke nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị. Ha achụwo akụ̀ na ohere nke ịbụ ndị a ma ama n’ụwa a n’àjà iji nwee ike ijere Jehova ozi. Deborah na-ekwu, sị: “Mgbe m dị afọ 22, otu nnukwu mkpebi chere m ihu.” Ọ na-akọwa, sị: “Amụwo m Bible ruo ihe dị ka ọnwa isii, achọkwara m ịrara ndụ m nye Jehova, ma ndị ezinụlọ m megidere m n’ụzọ siri ike. Ha bụ ndị aka ji akụ̀, ha chekwara na mụ ịghọ Onyeàmà ga-abụrụ ha ihe ihere n’obodo. Ha nyere m awa 24 ịhọrọ otu n’ime ụzọ ihe abụọ—ndụ okomoko ma ọ bụ eziokwu ahụ. Ọ bụrụ na egbubighị m ihe ọ bụla jikọrọ mụ na Ndịàmà, ndị ezinụlọ m ga-ajụ m. Jehova nyeere m aka ime mkpebi ziri ezi ma nye m ike iji mezuo ya. Ejewo m ozi oge nile ruo afọ 42, o nweghịkwa nnọọ ihe m na-akwara ụta. Site n’ịjụ ụzọ ndụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na nke ịchụso ihe ụtọ, ezeere m ndụ enweghị nzube na obi ụtọ nke m na-ahụ n’etiti ndị ezinụlọ m. Mụ na di m enyeworo ihe karịrị otu narị mmadụ aka ịmụta eziokwu ahụ. Ụmụ ime mmụọ a dị nnọọ oké ọnụ ahịa nye m karịa akụ̀ na ụba ọ bụla.” Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nwere otu echiche ahụ. Gịnị banyere gị?

16. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosi na anyị anaghị adị ndụ ọzọ maka onwe anyị?

16 Ọchịchọ nke ịghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe ha akpaliwo ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile nke Alaeze ahụ. Ndị ọzọ ọnọdụ ha na-enyeghị ohere ikere òkè n’ozi oge nile na-azụlite mmụọ ịsụ ụzọ ma na-akwado ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ruo n’ókè o kwere ha mee. Ndị nne na nna na-egosipụta mmụọ yiri nke ahụ mgbe ha na-etinye ihe ka ukwuu n’oge ha ma na-achụ ihe ndị na-amasị ha n’àjà iji nye ụmụ ha ọzụzụ ime mmụọ. N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ọzọ, anyị nile pụrụ igosi na anyị na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị.—Matiu 6:33.

Ònye Ka Ịhụnanya Ya Na-arụgide Anyị?

17. Gịnị na-akwali anyị ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà?

17 Igosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà abụghị ụzọ kasị dị mfe ịgbaso. Ma cheedị echiche banyere ihe ọ bụ ya na-arụgide anyị. Pọl dere, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst ahụ nwere na-arụgide anyị, n’ihi na nke a bụ ihe anyị kwubiworo, na otu onye nwụrụ maka mmadụ nile . . . Ọ nwụkwara maka mmadụ nile ka ndị dị ndụ wee ghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe ha, kama maka onye ahụ nke nwụrụ maka ha, e wee kpọlite ya.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Ọ bụ ịhụnanya nke Kraịst ahụ na-arụgide anyị ịghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe anyị. Lee ihe nkwali dị ike nke ahụ bụ! Ebe ọ bụ na Kraịst nwụrụ n’ihi anyị, ọ̀ bụ na anyị ejighị ya ụgwọ ibi ndụ maka ya? A sị ka e kwuwe, ọ bụ ekele miri emi anyị nwere maka ịhụnanya Chineke na Kraịst gosiri anyị rụgidere anyị ịrara ndụ anyị nye Chineke na ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.—Jọn 3:16; 1 Jọn 4:10, 11.

18. N’ihi gịnị ka ụzọ ndụ nke ịchụ onwe onye n’àjà ji baa uru?

18 Ịghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe anyị ọ̀ bara uru? Mgbe nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya jụsịrị òkù Kraịst kpọrọ ya ma pụọ, Pita sịrị Jizọs: “Lee! Anyị ahapụwo ihe nile ma soro gị; gịnịkwanụ gaje ịbụ nke anyị?” (Matiu 19:27) Pita na ndịozi ndị ọzọ ajụwo onwe ha n’ezie. Gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ ha? Jizọs bu ụzọ kwuo banyere ihe ùgwù ha ga-enweta bụ́ iso ya chịa n’eluigwe. (Matiu 19:28) N’otu oge ahụ, Jizọs zoro aka ná ngọzi ndị nke ọ bụla n’ime ụmụazụ ya pụrụ inweta. O kwuru, sị: “Ọ dịghị onye hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma ahụ, nke na-agaghị enweta okpukpu otu narị ugbu a n’ime oge a, ụlọ na ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na ụmụ na ubi . . . nakwa ndụ ebighị ebi n’usoro ihe na-abịanụ.” (Mak 10:29, 30) Anyị na-enweta ihe karịrị ihe ndị anyị chụrụ n’àjà. Ọ̀ bụ na ndị nne na nna, ụmụnne ndị ikom, ụmụnne ndị inyom, na ụmụ ime mmụọ anyị adịghị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla anyị hapụrụ n’ihi Alaeze ahụ? Ònye na-ebi ndụ kasị akwụghachi ụgwọ—ọ̀ bụ Pita ka ọ̀ bụ nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya?

19. (a) Na gịnị ka ezi obi ụtọ na-adabere? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Site n’ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere, Jizọs gosiri na obi ụtọ na-abịa site n’inye ihe na site n’ijere ndị ọzọ ozi, ọ bụghị site n’ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. (Matiu 20:28; Ọrụ 20:35) Mgbe anyị ghaara ịdị ndụ ọzọ maka onwe anyị ma nọgide na-eso Kraịst, anyị na-achọta ezi afọ ojuju ná ndụ ugbu a ma nwee atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. N’ezie, mgbe anyị jụrụ onwe anyị, Jehova na-aghọ Onye Nwe anyị. Anyị na-aghọzi ndị ohu Chineke. Gịnị mere ụdị ịgba ohu a ji na-akwụghachi ụgwọ? Olee otú o si emetụta mkpebi ndị anyị na-eme ná ndụ? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere anyị ji kwesị imeri ịchọ ọdịmma onwe onye nanị?

• Gịnị ka ọ pụtara bụ́ anyị ịjụ onwe anyị, bulie osisi ịta ahụhụ anyị, nọgidekwa na-eso Jizọs?

• Gịnị na-akpali anyị ịghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe anyị?

• N’ihi gịnị ka ụzọ ndụ nke ịchụ onwe onye n’àjà ji baa uru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

“Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị”

[Foto dị na peeji nke 13]

Gịnị gbochiri nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị iso Jizọs?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ịhụnanya na-arụgide Ndịàmà Jehova ije ozi dị ka ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke Alaeze ahụ